Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ụkpụrụ Omume Ji Agbanwe

Ihe Mere Ụkpụrụ Omume Ji Agbanwe

Ihe Mere Ụkpụrụ Omume Ji Agbanwe

“Gịnị kasị mkpa ná ndụ?”

A jụrụ mmadụ 50,000 nọ ná mba 60 ajụjụ ahụ. Ndị njụta echiche ahụ na-akọ na azịza a na-enwetakarị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ụwa bụ “inwe ndụ ezinụlọ obi ụtọ” na “ezi ahụ́ ike.”

E LEE ya anya elu elu, ọ ga-eyi ka ndị mmadụ n’ụwa nile hà nwechara ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ma, ọnọdụ ahụ adịchaghị mma otú ahụ. N’oge gara aga, ụkpụrụ omume ndị mmadụ dabeere n’ụkpụrụ ndị na-achịkwa ọdịnala, okpukpe na omume. Otú ọ dị, ihe na-agbanwe ọsọ ọsọ. Onye na-eme nnyocha, bụ́ Marisa Ferrari Occhionero na-ekwu banyere Ịtali, sị: “Ndị na-eto eto na-agbaso ụkpụrụ ndị nne na nna, ọdịnala, na okpukpe ha na-emetụta n’ụzọ na-adịwanye ala.” A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ndị mmadụ—ma nwata ma okenye—n’ụwa nile.

Prọfesọ Ronald Inglehart, bụ́ onye nhazi nke otu ọrụ nnyocha a kpọrọ Nnyocha Maka Ụkpụrụ Omume Ụwa, na-ekwu, sị: “Ihe àmà na-ebuwanye ibu na-egosi na a na-enwe mgbanwe ndị gbanyesiri mkpọrọgwu ike n’ihe banyere echiche dị iche iche nke ụwa.” Gịnị na-akpata mgbanwe ndị dị otú ahụ? Inglehart na-ekwu, sị: “Mgbanwe ndị a na-egosipụta mgbanwe ndị e nwere n’ọnọdụ akụ̀ na ụba nakwa na nkà na ụzụ.”

Dị ka ihe atụ, njụta echiche e mere gosiri na n’ala ndị bara ọgaranya, e debere inwe ọrụ “n’ala ala” nke ihe ndị kasị mkpa ná ndụ. Ma n’ala ndị ka na-emepe emepe, e debere inwe ọrụ n’ọnọdụ mbụ! Ee, mgbe ndị mmadụ dara ogbenye, a na-ewere igbo mkpa ụbọchị dị ka ihe kasị mkpa. Ka mba dị iche iche na-amalite inwe ọganihu n’ụzọ akụ̀ na ụba, ndị mmadụ na-ewere ihe ndị dị ka ahụ́ ike, ndụ ezinụlọ obi ụtọ, na mmadụ inwere onwe ya ikwu uche ya dị ka ihe ndị kasị mkpa.

N’ihi ọganihu e nwere na nkà na ụzụ, ụkpụrụ omume ndị a na-apụta apụta ga-emetụtarịrị ala ndị ka na-emepe emepe. Magazin bụ́ The Futurist na-ekwu, sị: “Ihe ndị anyị na-ahụ ma na-anụ na-akpụzi nkwenkwe na ụkpụrụ omume anyị.” N’ihi ya, ụlọ ọrụ mgbasa ozi enwewo mmetụta dị ukwuu n’ụkpụrụ omume nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Magazin ahụ bụ́ The Futurist na-ekwu, sị: “Usoro mgbasa ozi a na-enwe mmetụta n’ụzọ zuru ụwa ọnụ.”

N’ihi ya, olee mgbanwe ndị anyị na-ahụ n’àgwà ndị mmadụ? Olee otú ụkpụrụ ndị a na-agbanwe agbanwe si emetụta gị na ezinụlọ gị?