Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bịaghachi?

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bịaghachi?

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bịaghachi?

IHE dị ka afọ 40 gara aga, e chere na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e kpochapụwo ọrịa ndị a ma ama ụmụ ahụhụ na-ekesa dị ka ịba, ịba anya odo, na ọrịa dengue, n’akụkụ dị ukwuu nke ụwa. Ma ihe a na-atụghị anya ya meziri—ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa malitere ịbịaghachi.

N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ụfọdụ n’ime ụmụ ahụhụ ndị ahụ na ụmụ nje ndị ha na-ebu amalitewo iguzogide ọgwụ ndị e ji achịkwa ha. Usoro a ha ketara eketa nke ịnagide ihe abụwo nke e mere ka ọ dị ike karị, ọ bụghị nanị site n’iji ọgwụ ndị e ji egbu ụmụ ahụhụ eme ihe gabiga ókè, kamakwa site n’ịṅụ ọgwụ n’ụzọ ndị na-ezighị ezi. “N’ọtụtụ ezinụlọ dara ogbenye,” ka akwụkwọ bụ́ Mosquito na-ekwu, “ndị mmadụ na-enweta ọgwụ, ṅụọ nanị ole zuru ibelata mgbaàmà ndị ha na-enwe, ma debezie ndị fọrọ afọ maka mgbe ọzọ ọrịa ga-ejitu ha.” Mgbe e nwere ọgwụgwọ na-ezughị ezu otú ahụ, ụmụ nje ndị siri ike karị pụrụ ịdịgide ndụ n’ahụ́ mmadụ, wee mụjupụta ụmụ ọhụrụ ndị na-eguzogide ọgwụ.

Mgbanwe Ihu Igwe

Ihe bụ́ isi na-akpata mbịaghachi nke ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa bụ mgbanwe—n’okike nakwa n’etiti ọha mmadụ. Otu ihe atụ bụ mgbanwe nke ihu igwe gburugburu ụwa. Ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ anya na mkpowanye ọkụ nke ụwa ga-eme ka ógbè a na-ahụ ụmụ ahụhụ ndị na-ekesa ọrịa gbasaruo ebe ndị ka jụtụrụ oyi ka ọ dị ugbu a. E nwere ihe àmà ụfọdụ na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na nke a emewala. Dr. Paul R. Epstein nke nọ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Gburugburu Ụwa, Ụlọ Akwụkwọ Ahụ́ Ike Harvard, na-ekwu, sị: “Taa, a na-akọ na a hụwala ma ụmụ ahụhụ ma ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa (gụnyere ịba na ahụ́ ọkụ dengue) n’ebe ugwu n’Africa, Eshia, nakwa na Latin America.” Na Costa Rica, ọrịa dengue agbasawo gafee ebe ndị dị n’ugwu, bụ́ ugwu ndị meburu ka ha ghara isi n’Ụsọ Oké Osimiri Pacific gafeta, ugbu a o jupụtara ná mba ahụ dum.

Ma ebe na-ekpo ọkụ karị pụrụ inwe mmetụta karịrị nke ahụ. N’ebe ụfọdụ, ọ na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka osimiri takọọ, n’ebe ndị ọzọ, ọ na-akpata mmiri ozuzo na idei mmiri ndị na-eme ka e nwegasịa ọdọ mmiri ndị na-esi ísì. N’ọnọdụ abụọ ahụ, mmiri fọdụrụnụ na-aghọrọ anwụnta ebe magburu onwe ya ha ga-anọ mụbaa. Ebe na-ekpo ọkụ karị na-ebelatakwa oge ọ na-ewe anwụnta ịmụba, na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ha ji amụba rịa elu, ọ na-agbatịkwu oge anwụnta na-eju eju. Anwụnta na-akpa ike karị n’ebe ndị na-ekpo ọkụ karị. Okpomọkụ dị ukwuu karị na-eru ọbụna n’afọ anwụnta ma mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ ụmụ nje ndị na-akpata ọrịa ji amụba rịa elu, wee si otú ahụ mụbaa ohere e nwere na mmadụ ga-ebute ọrịa ma ọ taa ya nanị otu ugboro. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ na-akpata nchegbu.

Ileba Anya n’Ọrịa

Mgbanwe ndị a na-enwe n’etiti ọha mmadụ pụkwara iso kpata ọrịa ụmụ ahụhụ na-ekesa. Iji ghọta otú ọ pụrụ isi mee otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị lebakwuo anya n’òkè ụmụ ahụhụ na-ekere. N’ọtụtụ ọrịa, ahụhụ pụrụ nanị ịbụ otu n’ime ihe ndị na-ekere òkè n’usoro nke ikesa ọrịa. Anụmanụ ma ọ bụ nnụnụ pụrụ ibu ọrịa site n’inwe ụmụ ahụhụ n’elu ahụ́ ya ma ọ bụ inwe ụmụ nje anya nkịtị na-adịghị ahụ n’ọbara ya. Ọ bụrụ na ụmụ anụmanụ ma ọ bụ nnụnụ ndị ahụ adịgide ndụ n’agbanyeghị na ha bu ha, ha pụkwara ịghọ ebe ọrịa ahụ na-esite.

Tụlee ọrịa Lyme, bụ́ nke a chọpụtara na 1975 ma kpọkwasị ya aha Lyme, Connecticut, U.S.A., bụ́ ebe a hụrụ ya na nke mbụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na nje bacteria na-akpata ọrịa Lyme batara n’Ebe Ugwu America otu narị afọ gara aga site n’ahụ́ òké ma ọ bụ anụ ụlọ ndị nọ n’ụgbọ mmiri si Europe. Ọ bụrụ na otu obere akọrọ amịrị ọbara nke anụ nwere nje ahụ, nje bacteria ahụ na-adịgide n’afọ akọrọ ahụ ná ndụ ya nile. Ọ bụrụ na akọrọ ahụ emesịa taa anụmanụ ọzọ ma ọ bụ mmadụ, ọ pụrụ ibufe nje bacteria ahụ n’ọbara mmadụ ma ọ bụ anụmanụ ahụ ọ tara.

N’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ United States, ọrịa Lyme jupụtara ejupụta—e nwewo ya n’ebe ahụ ruo ogologo oge. Anụ bụ́ isi nke nje bacteria na-akpata ọrịa Lyme na-anọ n’ahụ́ ya amụba bụ ọgịnị. Akọrọ na-ebikwa n’ahụ́ ọgịnị ahụ, karịsịa akọrọ ndị na-akabeghị aka. Akọrọ ndị kaworo aka na-ahọrọ ibi n’ahụ́ mgbada, bụ́ ebe ha na-eri nri, oké agbaakwa nne. Ozugbo nne akọrọ tozuworo okè ṅụjuru ọbara afọ, ọ na-ada n’ala iji yie àkwá ya, bụ́ ebe erùrù na-esi apụta n’oge na-adịghị anya iji maliteghachi usoro ndụ ahụ n’isi.

Mgbanwe Ọnọdụ

Nje ndị na-akpata ọrịa na ụmụ anụmanụ na ụmụ ahụhụ ebikọwo ruo ọtụtụ afọ n’akpataraghị ụmụ mmadụ ọrịa. Ma mgbanwe ọnọdụ pụrụ ime ka ọrịa e ji mara otu ndị bụrụ nke zuru ọha—ọrịa nke na-arịa ọtụtụ mmadụ n’otu ógbè. Gịnị gbanwere n’ihe banyere ọrịa Lyme?

N’oge gara aga, anụ ndị na-eri ibe ha nyere aka n’ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ akọrọ ndị na-adị n’ahụ́ mgbada ji eru ụmụ mmadụ ahụ́ site n’ibelata ọnụ ọgụgụ mgbada e nwere. Mgbe ndị mbụ biri na Europe sụrụ ọhịa iji kọọ ugbo, ọnụ ọgụgụ mgbada e nwere belatakwuru, anụ ndị na-eri mgbada sikwa n’ebe ahụ pụọ. Ma n’etiti afọ ndị nke 1800, a gbahapụrụ ọtụtụ ugbo ka ndị ọrụ ugbo gawara ebe ọdịda anyanwụ iji na-akọ ugbo ha, ọhịa malitekwara itojupụta n’ala ahụ. Mgbada bịaghachiri, ma anụ ndị na-eri ha abịaghachighị. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ mgbada rịkwara elu ọzọ n’ụzọ dị ngwa, otú ahụkwa ka ọnụ ọgụgụ akọrọ rịrị.

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nje bacteria na-akpata ọrịa Lyme pụtara ma biri n’ahụ́ ụmụ anụmanụ ruo ọtụtụ iri afọ tupu ha abụrụ ihe na-eyi ụmụ mmadụ egwu. Otú ọ dị, mgbe a malitere iwu ógbè ndị dịpụrụ adịpụ n’akụkụ oké ọhịa dị iche iche, ụmụaka na ndị okenye ọnụ ọgụgụ ha dị nnọọ ukwuu karị malitere ịbanye n’ógbè ndị e nwere akọrọ ndị ahụ. Akọrọ ndị ahụ hụrụ ụmụ mmadụ ha ga na-atagide n’ahụ́, ụmụ mmadụ malitekwara ịrịa ọrịa Lyme.

Ọrịa n’Ụwa nke Na-akwụsighị Ike

Ihe ndị ahụ e buru ụzọ kwuo na-egosi nanị otu n’ime ọtụtụ ụzọ ọrịa si amalite ma na-agbasa nakwa nanị otu ihe atụ nke ụzọ ihe omume ụmụ mmadụ si emetụta mmalite ya. “Ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata mbịaghachi nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrịa ọhụrụ nile bụ́ ndị na-akpa ike karị,” ka ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi bụ́ Eugene Linden na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ The Future in Plain Sight. Ihe atụ ole na ole ndị ọzọ: Ime njem nke oge a bụ́ nke na-ewu ewu na nke na-adị ngwa pụrụ ime ka nje ndị na-akpata ọrịa na ndị bu ya gazuo gburugburu ụwa. Mbibi nke ebe obibi nke ihe ndị e kere eke, ma ndị ukwu ma ndị nta, na-emetụta ụdị ihe dị iche iche dị ndụ n’ụzọ dị njọ. “A na-emetọ ikuku na mmiri,” ka Linden na-ekwu, “na-ebelata ikike nke usoro ahụ́ mmadụ na ahụ́ anụmanụ ji alụso ọrịa ọgụ.” Ọ gbakwụnyere ihe Dr. Epstein kwubiri, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, otú ụmụ mmadụ si emeso gburugburu ebe obibi nke ihe ndị dị ndụ ebelatawo ikike ụwa nwere ịchịkwa ọrịa, na-eme ka e nwee ọnọdụ ndị dịịrị ụmụ nje mma.”

Ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-eduga n’agha bụ́ nke na-emebi usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha ma bibie ihe owuwu ndị na-eme ka e nwee nlekọta ahụ́ ike na nkesa ihe oriri. Tụkwasị na nke ahụ, akwụkwọ bụ́ Biobulletin nke Ebe Ndebe Ihe Ochie Ndị Sitere n’Okike nke America na-ekwu, sị: “A na-amanyekarị ndị gbara ọsọ ndụ, bụ́ ndị na-enwe nsogbu si n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ma bụrụkwa ndị na-agbasighị ike, ịgbaga n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ebe ndị mmadụ jubigara ókè, ebe na-adịghịkwa ọcha, na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa dịgasị iche iche.”

Nsogbu nke ọnọdụ akụ̀ na ụba na-eme ka ụmụ mmadụ si n’obodo ha kwaga n’obodo ọzọ ma ọ bụkwanụ si ná mba ha kwaga ná mba ọzọ, nke na-abụkarị ebe ndị mepere emepe bụ́ ndị ndị mmadụ karịworo akarị na ha. “Nje ndị na-akpata ọrịa na-achọ ebe ndị mmadụ karịrị akarị,” ka Biobulletin na-akọwa. Ka ọnụ ọgụgụ nke ndị bi n’obodo ukwu na-arị elu n’ike n’ike, “dị ka ọ na-adịkarị, ihe omume ndị dị oké mkpa a na-eme iji hụ na ọha na eze nwere ahụ́ ike ka mma, ihe ndị dị ka agụmakwụkwọ bụ́ isi, iri ihe ndị na-edozi ahụ́, na usoro ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa, adịghị eso ya arị elu otú ahụ.” Njubiga ókè nke ụmụ mmadụ na-emekwa ka e jiri mmiri, usoro mkpofu mmiri nsị, na usoro mkpofu unyi na-eme ihe gabiga ókè, nke a na-emekwa ka idebe ihe ọcha na ịdị ọcha onwe onye bụrụ ihe siri ike, n’otu oge ahụkwa, na-eme ka e nwee ọnọdụ ndị na-eme ka ụmụ ahụhụ na ihe ndị ọzọ na-ebu ọrịa na-amụba. Ka o sina dị, ọnọdụ ahụ abụghị nke olileanya na-adịghị na ya, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

“Ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata mbịaghachi nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrịa ọhụrụ nile bụ́ ndị na-akpa ike karị”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]

Nje Virus Bụ́ West Nile Awakpoo United States

A chọpụtara nje virus bụ́ West Nile, nke ọ bụ anwụnta kasị ebunye ya mmadụ, n’afọ 1937 na Uganda, e mesịkwara hụ ya n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Eshia, Oceania, na Europe. A chọpụtaghị nje virus ahụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ruo n’afọ 1999. Otú ọ dị, kemgbe ahụ, a kọrọ na ihe karịrị mmadụ 3,000 ebutewo ya na United States, ihe karịkwara mmadụ 200 anwụwo.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị butere ya adịghị ama na ha bu ya, ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịmalite inwe mgbaàmà ndị yiri ahụ́ ọkụ. Ma pasent dị nta nke ndị butere ya na-ada oké ọrịa, gụnyere ikpo ọkụ nke ụbụrụ na ọrịa meningitis ọkpụkpụ azụ. Ruo ugbu a, e nwebeghị ọgwụ mgbochi ma ọ bụ ọgwụgwọ ọ bụla dịnụ kpọmkwem maka nje virus bụ́ West Nile. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States na-adọ aka ná ntị na a pụkwara ibute nje virus bụ́ West Nile site n’idochi akụkụ ahụ́ ma ọ bụ site n’ịmịnye mmadụ ọbara nke e si n’ahụ́ onye bu ya nweta. “Ka ọ dị ugbu a, e nweghị ụzọ e si enyocha ọbara iji chọpụta ma ò nwere nje virus bụ́ West Nile,” ka ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ bụ́ Reuters kọrọ n’afọ 2002.

[Ebe E Si Nweta Foto]

CDC/James D. Gathany

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chebe Onwe Gị? Aro Ụfọdụ

Teta! kpọtụụrụ ndị bi n’ógbè ụwa ebe ndị ụmụ ahụhụ na ọrịa jupụtara iji nweta aro ụfọdụ banyere ụzọ mmadụ pụrụ isi nọgide na-enwe ahụ́ ike. Ị pụrụ ịhụ ndụmọdụ ha dị ka ihe na-enye aka n’ógbè unu.

Ịdị Ọcha—Ihe Kasị Mkpa Ị Ga-eme Iji Chebe Onwe Gị

Debe ebe obibi gị ọcha

“Kwuchie arịa ndị a na-eji etinye ihe oriri ekwuchi. Kwuchie nri e siri esi ekwuchi ruo mgbe a ga-eri ya. Hichaa nri ndị wụsara n’ala ozugbo. Ahapụla efere ndị e ji rie ihe ka ha nọbọọ chi n’asaghị ha asa ma ọ bụ tụpụ ihe oriri n’èzí iji wee kpofuo ha n’ụtụtụ. Kpuchie ya ekpuchi ma ọ bụ lie ya n’ala, ebe ọ bụ na ụmụ ahụhụ na anụ ndị dị ka òké na-apụta n’abalị iji kpara nri. Ọzọkwa, ite ala simenti na-eme ka ọ dịkwuo mfe idebe ebe obibi ọcha ma mee ka a ghara inwe ụmụ ahụhụ na ya.” —Africa.

“Echekwala mkpụrụ osisi ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adọta ụmụ ahụhụ n’ụlọ. Edebela anụ ndị a na-akpa akpa—ewu, ezì, ọkụkọ—n’ụlọ. Kpuchie ụlọ mposi ndị dị n’èzí ekpuchi. Lie nsị anụ n’ala ngwa ngwa ma ọ bụ jiri ntụ lime wụchie ya iji chụọ ụmụ ahụhụ. Ọ bụrụgodị na ndị agbata obi gị adịghị eme ihe ndị a, i nwere ike ịchụ ụmụ ahụhụ ruo n’ókè ị pụrụ ịnagide ma setịpụkwa ezi ihe nlereanya.”—Ebe Ndịda America.

[Foto]

Ịhapụ nri ma ọ bụ ihe mkpofu n’ekwuchighị ha ekwuchi yiri ịkpọ ụmụ ahụhụ òkù ịbịa soro gị rie nri

Ịdị ọcha onwe onye

“Ncha adịghị oké ọnụ, ya mere na-asa aka gị na ákwà gị mgbe mgbe, karịsịa mgbe i metụsịrị ndị mmadụ ma ọ bụ ụmụ anụmanụ aka. Zere imetụ anụ ndị nwụrụ anwụ aka. Zere imetụ ọnụ, imi, na anya gị aka. E kwesịrị ịdị na-asa uwe mgbe mgbe ọ bụrụgodị na ha yiri ka hà ka dị ọcha. Otú ọ dị, ísìsì ọma ụfọdụ na-adọta ụmụ ahụhụ, ya mere zere ncha na ihe ndị ọzọ mmadụ na-eji edote onwe ya ọcha bụ́ ndị na-esi ísì ụtọ.”—Africa.

Usoro Mgbochi

Mee ka a ghara inwe ebe ndị anwụnta na-anọ amụba

Kwuchie tankị mmiri na ọkwá isa ihe ekwuchi. Tụfuo kom kom nile ghere oghe bụ́ ndị mmiri pụrụ ịdọrọ n’ime ha. Ekwela ka mmiri dọrọ n’ite ndị a kụrụ okooko osisi na ha. Anwụnta pụrụ ịmụba n’ọdọ mmiri ọ bụla nọfere ụbọchị anọ.—Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia.

Belata ókè ị na-ekpughepụru onwe gị nye ụmụ ahụhụ

Zere oge na ebe ndị ụmụ ahụhụ na-akpakarị nri. Anyanwụ na-ada ngwa ngwa n’ebe okpomọkụ ụwa, ya mere ọtụtụ ihe ndị a na-eme n’ụbọchị na-ewere ọnọdụ n’ọchịchịrị, mgbe ọtụtụ ụmụ ahụhụ na-arụ ọrụ karị. Ịnọdụ ma ọ bụ ihi ụra n’èzí na-eme ka ị nọrọkwuo n’ihe ize ndụ n’oge ọrịa ụmụ ahụhụ na-ekesa jupụtara ebe nile.—Africa.

[Foto]

Ihi ụra n’èzí n’ebe anwụnta juru eju yiri ịkpọ anwụnta òkù iri gị nri n’ahụ́

Na-eyi uwe ndị na-ekpuchi ahụ́ gị ruo n’ókè dị ukwuu, karịsịa mgbe ị nọ n’ọhịa. Tee ihe ndị na-achụ ụmụ ahụhụ n’uwe nakwa n’ahụ́ gị, na-agbaso mgbe mgbe ntụziaka ndị e dere n’akwụkwọ a mapawara ná mkpọ ya. Nyochaa ahụ́ gị na nke ụmụ gị iji mara ma ò nwere onye butere akọrọ mgbe unu si esi bata. Mee ka anụ ndị unu ji mere enyi nwee ahụ́ ike ma ghara ibu ụmụ ahụhụ n’ahụ́ ha.—Ebe Ugwu America.

Belata ókè ị na-emetụru anụ ndị a na-akpa akpa aka ma ọ bụ ahụ́, ebe ọ bụ na ụmụ ahụhụ pụrụ isi n’ahụ́ ha bunye mmadụ ọrịa.—Ebe Etiti Eshia.

Jiri ákwà mgbochi anwụnta na-eme ihe—ọ ga-akasị mma ma ọ bụrụ nke e tere ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ—maka ndị òtù ezinụlọ nile. Jiri ákwà ndị na-egbochi ụmụ ahụhụ kụchie windo nile, ma hụ na i meziri ebe ndị mebiri emebi. Mechie oghere ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ụmụ ahụhụ pụrụ isi bata. Usoro mgbochi dị otú ahụ na-efutụ ego, ma ị ga-emefu ọbụna ego karịrị nke ahụ ma ọ bụrụ na ị ghaghị ịkpọrọ nwatakịrị gaa ụlọ ọgwụ ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na onye na-akpa afọ ezinụlọ adaa nnọọ ọrịa nke na ọ pụghị ịrụ ọrụ.—Africa.

[Foto]

Ákwà mgbochi anwụnta e tere ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ dị ọnụ ala karịa ọgwụ na ego a ga-akwụ ndị ụlọ ọgwụ

Mee ka a ghara inwe ebe ọ bụla ụmụ ahụhụ na-ezo n’ụlọ gị. Tee ahụ́ ụlọ gị simenti, tinyekwa uko n’ime ụlọ gị, mechiekwa ebe ndị gbawara agbawa na ebe ndị nwere oghere. Jiri ákwà ụmụ ahụhụ na-adịghị agafe mechie okpuru uko ụlọ akịrịka. Kpochaa ebe ndị a tụkọtara ihe—dị ka ikpo akwụkwọ ma ọ bụ ákwà ma ọ bụ ìgwè foto ndị e kowere n’ahụ́ ụlọ—bụ́ ebe ụmụ ahụhụ na-ezo.—Ebe Ndịda America.

Ụfọdụ ndị na-ewere ụmụ ahụhụ na anụ ndị dị ka òké dị ka ndị ọbịa n’ụlọ ha. Ha abụghị! Ekwela ka ha bata. Jiri ọgwụ ndị na-achụ ụmụ ahụhụ na ndị na-egbu ha mee ihe—kama ka ọ bụrụ dị ka ntụziaka e dere na ha si dị. Jiri ngwá ndị na-ejide na ndị na-egbu ijiji na-eme ihe. Bụrụ onye na-echepụta ihe: Otu nwanyị ji ákwà dụọ akpa, wụjuo ya ájá, ma dọnye ya n’oghere dị n’okpuru ibo ụzọ ya iji gbochie ụmụ ahụhụ ịbata.—Africa.

[Foto]

Ụmụ ahụhụ ekwesịghị ịbụ ndị ọbịa n’ụlọ anyị. Chụpụ ha!

Ọgwụ mgbochi

Mee ka ị nọgide na-enwe ikike nke iguzogide ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa site n’iri ihe ndị na-edozi ahụ́, izu ike nke ọma, na inwe mmega ahụ́ n’ụzọ dị mma. Belata nchekasị.—Africa.

Ndị njem: Buru ụzọ nweta ihe ọmụma kasị ọhụrụ banyere ihe ize ndụ ndị e nwere banyere ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa n’ebe ị na-aga. Ngalaba na-ahụ maka ahụ́ ike ọha na eze nwere ihe ọmụma dị otú ahụ, e nwekwara ya n’ebe gọọmenti na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. Tupu i mee njem, nata ọgwụ mgbochi ndị kwesịrị ekwesị dabere n’ebe ị na-aga.

Ọ Bụrụ na Ị Daa Ọrịa

Nweta nlekọta ahụ́ ike n’egbughị oge

Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ọrịa na-adị mfe ọgwụgwọ ma ọ bụrụ na a chọpụta ha n’oge.

Kpachara anya maka nchọpụta na-ezighị ezi

Chọọ ndị dọkịta bụ́ ndị ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa nakwa ndị ọrịa ndị a na-enweta n’ebe okpomọkụ ụwa doro anya ma ọ bụrụ na ị gara ebe ahụ. Gwa dọkịta gị mgbaàmà nile ị na-enwe, na ebe ị gara, ọbụna n’oge gara aga. Jiri ọgwụ nje mee ihe nanị mgbe ọ dị mkpa, narakwa ọgwụgwọ ahụ ruo n’isi.

[Foto]

Ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa pụrụ iyi nrịanrịa ndị ọzọ. Kọọrọ dọkịta gị ihe zuru ezu banyere ebe ị gara

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Ụmụ Ahụhụ Hà Na-ekesa Nje HIV?

Mgbe ndị ọkà mmụta banyere ụmụ ahụhụ na ndị ọkà mmụta ahụ́ ike mesịrị nchọpụta na nnyocha ruo ihe karịrị afọ iri, ha achọpụtaghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na anwụnta ma ọ bụ ụmụ ahụhụ ndị ọzọ pụrụ ibufe nje HIV—nje virus na-akpata ọrịa AIDS.

Dị ka ihe atụ, a bịa n’ihe banyere anwụnta, ọnụ ahụhụ ahụ adịghị ka ntụtụ bụ́ nke nwere nanị otu oghere a pụrụ isi mịnyeghachi ọbara n’ahụ́. Kama nke ahụ, anwụnta na-esi n’otu oghere dị n’ọnụ ya amịrị ọbara ma si n’oghere nke ọzọ amịnye asọ mmiri. Mgbe nke ahụ gasịrị, ka Thomas Damasso, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere nje HIV nke so n’Òtù nke Onyeisi Nlekọta Ahụ́ Ike na Mongu, Zambia na-akọwa, usoro mgbari nri nke anwụnta na-agbari ọbara ahụ, na-ebibi nje virus ahụ. Nje HIV adịghị adị na nsị ahụhụ ahụ. N’adịghịkwa ka nje ndị na-akpata ịba, nje HIV adịghị abanye n’akụkụ ahụ́ anwụnta ndị na-emepụta asọ mmiri.

Iji bute nje HIV, mmadụ aghaghị inweta ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ọbara nje ahụ dị na ya. Ọ bụrụ na a chụpụ anwụnta mgbe ọ na-amịrị ọbara, o wee fega kpọmkwem n’ahụ́ onye ọzọ, ọbara ọ bụla pụrụ ịfọdụ n’ọnụ ya ga-adị nnọọ obere nke na ọ gaghị enwe mmetụta ọ bụla. Dị ka ndị ọkachamara si kwuo, ọbụna itigbu anwụnta nke ọbara nwere nje HIV juru n’afọ ya n’elu ọnyá ghere oghe, agaghị eme ka mmadụ bute nje HIV.

[Ebe E Si Nweta Foto]

CDC/James D. Gathany

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Akọrọ ndị na-adị n’ahụ́ mgbada (nke e gosiri ebe o buru ibu karịa otú ọ hà n’ezie) na-ebunye ụmụ mmadụ ọrịa Lyme

Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Nne nke tozuworo etozu, oké nke tozuworo etozu, na ọtị, bụ́ ndị e gosichara otú ha hà n’ezie

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụdị akọrọ nile: CDC

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Idei mmiri, edebeghị ihe ọcha, na nkwaga ụmụ mmadụ na-esi n’otu ebe akwaga n’ebe ọzọ socha akpata mgbasa nke ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa

[Ebe E Si Nweta Foto]

FOTO UNACIONES (site n’aka Usuu Ndị Agha United States)