Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nsogbu Ndị Na-adị n’Ịbụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nsogbu Ndị Na-adị n’Ịbụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nsogbu Ndị Na-adị n’Ịbụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

“Ọ dịghị ihe m maara n’ezie banyere ndị mụrụ m, nke a na-ewutekwa m nke ukwuu.”—Barbara, onye dị afọ 16.

“Ọ dịghị ihe ọ bụla m maara banyere ebe a mụrụ m, ma ọ bụ ndị mụrụ m. Mgbe ụfọdụ m na-adị na-eche banyere ya ma m lakpuo n’abalị.”—Matt, onye dị afọ 9.

“Mgbe mụ na nne na nna kuchiri m malitere ise okwu, ana m eche na ma eleghị anya ‘ndị mụrụ m’ ga na-enwe obiọma karị n’ebe m nọ. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya iche otú ahụ, agwatụbeghịkwa m ha otú ahụ.”—Quintana, onye dị afọ 16.

OBI abụọ adịghị ya—e nwere ọtụtụ nsogbu ndị dị n’ịbụ nwa e kuchiri ekuchi. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwe ụdị mmetụta ndị ahụ a kọwara n’elu. Ọtụtụ n’ime ha na-eche ma hà kwesịrị ịchọta ndị mụrụ ha, ma ọ bụ na-eche ma hà ga-enwe ndụ obi ụtọ karị ma a sị na ha na ndị mụrụ ha bi. Ọ bụghịkwa nanị ihe ndị a bụ nsogbu ndị dị na ya.

N’isiokwu bu ụzọ n’usoro isiokwu a, anyị tụlere ụfọdụ echiche na-ezighị ezi ụfọdụ ndị ntorobịa e kuchiri ekuchi na-enwe banyere onwe ha. * Ịlụso echiche ndị dị otú ahụ na-akụda mmụọ ọgụ dị mkpa iji nwee obi ụtọ ná ndụ dị ka nwa e kuchiri ekuchi. Otú ọ dị, gịnị bụ ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ọzọ pụrụ ibilite, oleekwa ihe ndị dị irè ị pụrụ ime iji merie ha?

Ọ̀ Bụ Ha Bụ “Ezigbo” Nne na Nna M?

Jake dị afọ 13 na-ekwu na ọ dị mgbe ya na-eche echiche banyere nne mụrụ ya. Nke a mere ka ya na nne na nna kuchiri ya na-enwe nsogbu. Ọ na-echeta, sị: “Oge ọ bụla iwe were m, ana m asị ya, ‘Ọ bụghị gị bụ ezigbo nne m—ị gaghị esi otú ahụ na-enye m ahụhụ!’”

Dị ka ị pụrụ ịhụ, Jake aghaghị ichebara otu ajụjụ dị oké mkpa echiche: Ònye bụ “ezigbo” nne ya? Ọ bụrụ na e kuchiri gị ekuchi, otu ajụjụ ahụ pụrụ ịdị na-enye gị nsogbu n’obi, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-eche ma ndị mụrụ gị hà pụrụ ịdị na-emeso gị nke ọma karịa otú nne na nna kuchiri gị si emeso gị. Ma ọ̀ bụ nanị usoro nke ịmụ nwa bụ ihe pụrụ ime ka ndị mmadụ ghọọ “ezigbo” nne na nna mmadụ?

Nne kuchiri Jake echeghị otú ahụ. Jake na-ekwu, sị: “Nne kuchiri m na-ekwu sị, ‘Ee, ọ bụ m bụ “ezigbo” nne gị. Ọ bụ ezie na i nwere nne mụrụ gị n’afọ ya, ugbu a ọ bụ m bụ ezigbo nne gị.’” Mgbe ndị toruworo ogo mmadụ kpọọrọ nwatakịrị ka ha na ya biri ma kwere ịhụ maka ebe obibi, nri, na ịzụlite nwatakịrị ahụ, na-egbo mkpa nwatakịrị ahụ, ha na-aghọ ‘ezigbo’ nne na nna ya. (1 Timoti 5:8) Ma eleghị anya ọ bụ otú ahụ ka ndị ọchịchị nọ n’obodo i bi na ya si ele ya anya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka Chineke si ele ya anya?

Tụlee ihe pụrụ ịbụ ikuchi nwa a kasị mara n’akụkọ ihe mere eme—nkuchi nke Jizọs Kraịst. Ọ bụghị Josef, bụ́ onye ọkwa nkà, mụrụ Jizọs kpọmkwem, n’agbanyeghị nke ahụ, Josef kuchiri nwa ahụ dị ka nwa ya. (Matiu 1:24, 25) Mgbe Jizọs na-etolite, ò nupụụrụ Josef isi? Kama nke ahụ, Jizọs ghọtara na ọ bụ uche Chineke ka o rubere nna kuchiri ya isi. Jizọs maara nnọọ nke ọma iwu Jehova nyere ụmụaka bụ́ ndị Izrel. Gịnị bụ iwu ahụ?

Sọpụrụ Nna Gị na Nne Gị

Akwụkwọ Nsọ na-agwa ndị na-eto eto, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Deuterọnọmi 5:16) A na-ejikarị okwu bụ́ “sọpụrụ” eme ihe n’ime Bible iji gosi nkwanye ùgwù, iji mmadụ akpọrọ ihe, na nchebara echiche. Ị pụrụ igosi nne na nna kuchiri gị nsọpụrụ dị otú ahụ site n’imeso ha ihe n’obiọma, ịkwanyere ọnọdụ ha n’ime ezinụlọ ùgwù, ige ntị n’echiche ha, na ịdị njikere ime ihe ọ bụla ezi uche dị na ya ha chọrọ ka i mee.

Gịnịkwanụ banyere oge ndị ahụ mgbe ọ na-eyi ka nne na nna kuchiri gị ha achọghị ichebara mmetụta gị echiche? N’ezie, nke ahụ ga-eme. Ọ dịghị nne na nna zuru okè, ma hà bụ ndị nke kuchiri nwa ekuchi ma ha abụghị. Amaghị eme ha pụrụ ime ka irubere ha isi bụrụ ihe siri nnọọ ike. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya ma ọ bụrụ na n’oge ndị dị otú ahụ, uche gị agaa n’ọbụbụ ị bụ nwa e kuchiri ekuchi, ị malitekwa iche ma ọ na-eme ka ọ ghara ịbụcha iwu na ị ga-erubere ha isi. Ma nke ahụ ọ̀ dị otú ahụ n’ezie?

Ịtụgharị uche n’ọnọdụ Jizọs pụrụ inyere gị aka. Cheta na ọ bụ onye zuru okè. (Ndị Hibru 4:15; 1 Pita 2:22) Ma nna kuchiri ya ezughị okè; nne mụrụ ya ezughịkwa okè. Ebe ọ dị otú ahụ, ikekwe ọ dị mgbe ụfọdụ Jizọs hụrụ na ndị mụrụ ya na-emehie ihe. Ò nupụrụ isi n’ịchịisi na-ezughị okè nke Josef, ma ọ bụ nduzi nwere ntụpọ nke Meri? Ee e. Bible na-agwa anyị na ka Jizọs na-etolite, “ọ nọgidekwara na-edo onwe ya n’okpuru” ndị mụrụ ya.—Luk 2:51.

Mgbe gị na nne na nna kuchiri gị nwere nghọtahie, ị pụrụ ikweta na ha mehiere ihe. Otú ọ dị, ị ghaghị ikweta na gị onwe gị kwa ezughị okè. Ya mere, ọ pụkwara ịbụ na ọ bụ gị mehiere ihe. N’agbanyeghị onye ọ bụ ya mehiere ihe, ọ̀ bụ na ọ kasịghị mma ịgbaso ihe nlereanya Jizọs? (1 Pita 2:21) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka irube isi. Ma e nwere ọbụna ihe ka ukwuu mere ị ga-eji na-erubere nne na nna gị isi.

Bible na-ekwu, sị: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe ọ bụla, n’ihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Ee, nrubeisi gị na-eme ka Nna gị nke eluigwe nwee obi ụtọ. (Ilu 27:11) Ọ chọrọ ka ị mụta irube isi ma nwee obi ụtọ. Okwu ya na-agba ndị na-eto eto ume ịdị na-erube isi, na-agbakwụnye, “ka o wee gaara gị nke ọma, ka i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.”—Ndị Efesọs 6:3.

Iwusi Mmekọrịta Gị na Nne na Nna Kuchiri Gị Ike

Gị na nne na nna kuchiri gị inwe ezi mmekọrịta na-agụnye ihe karịrị nanị ịsọpụrụ ha na irubere ha isi. Ma eleghị anya, ị chọrọ ebe obibi nke ịhụnanya dị na ya. Ọ bụ ọrụ dịịrị nne na nna kuchiri gị ime ka e nwee ebe obibi dị otú ahụ. Ma ị pụkwara ịtụnye ụtụ dị mkpa na nke a. N’ụzọ dị aṅaa?

Nke mbụ, chọọ ụzọ isi mee ka gị na nne na nna kuchiri gị nwee mmekọrịta chiri anya karị. Jụọ ha ajụjụ banyere onwe ha, ndụ ha na ihe ndị na-amasị ha. Nweta ndụmọdụ site n’aka ha mgbe i nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi, na-ahọrọ oge ahụ́ ruru ha ala, na mgbe ha dị njikere ige gị ntị. (Ilu 20:5) Nke abụọ, chọọ ụzọ isi tụnye ụtụ n’ime ka ezinụlọ ahụ na-aga nke ọma, dị ka site n’inye aka n’ịrụ ọrụ ụlọ na ihe ndị ọzọ n’echereghị ka a gwa gị agwa.

Gịnịkwanụ banyere ndị mụrụ gị n’ezie? Ọ bụrụ na i kpebie ịchọ ha, ma ọ bụ ọ bụrụ na ha ekpebie ịchọ gị, ọ̀ bụ iwu na ọ ga-etisa mmekọrịta dị n’agbata gị na nne na nna kuchiri gị? N’oge mbụ, ụlọ ọrụ ndị na-eme ndokwa maka ikuchi ụmụaka anaghị ekwe akọrọ ndị nne na nna ọ bụ ha mụrụ nwa ihe ga-enyere ha aka ịchọta nwa ha kpọnyere ha ka onye ọzọ kuchie ma ọ bụkwanụ kọọrọ ya nwa ahụ. Taa, iwu dị n’ala ụfọdụ esighị ike otú ahụ, ọtụtụ ụmụaka e kuchiri ekuchi achọtawo ndị mụrụ ha, bụ́ ndị ha na-echetaghị ndị ha bụ ma ọlị. Otú ọ dị, iwu na-achịkwa ikuchi nwa pụrụ ịdị iche n’ebe i bi.

Ka o sina dị, mmadụ ịchọ nne na nna mụrụ ya ma ọ bụ ịhapụ ịchọ ha bụ okwu aka ya, o nwere ike ọ gaghị abụ mkpebi dị mfe. Ndị ntorobịa e kuchiri ekuchi nwere echiche dịgasị iche iche banyere okwu a. Ọ na-agụsi ụfọdụ agụụ ike ịchọta ndị mụrụ ha n’ezie; ebe ndị ọzọ kpebisiri ike na ha agaghị achọ ha. Otú ọ dị, ị pụrụ ijide n’aka na ọtụtụ ndị ntorobịa e kuchiri ekuchi achọtawo ndị mụrụ ha n’emebighị mmekọrịta chiri anya nke ha na nne na nna kuchiri ha.

Nweta ndụmọdụ site n’aka nne na nna kuchiri gị nakwa ma eleghị anya site n’aka ndị enyi gị tozuru okè n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ilu 15:22) Jiri nlezianya tụlee ihe ndị i nwere ike ime, kwekwa ka oge ụfọdụ gafee tupu i mee ihe ọ bụla. Dị ka Ilu 14:15 si kwuo, “onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”

Ọ bụrụ na i kpebie ka gị na nne na nna mụrụ gị na-emekọrịta ihe, gbalịa imesi nne na nna kuchiri gị obi ike na ị ga-anọgide na-ahụ ha n’anya ma na-asọpụrụ ha. N’ụzọ dị otú ahụ, ka i ji nwayọọ nwayọọ na-amatakwu ndị mụrụ gị ma kpọrọ gị kpọnye onye ọzọ ka o kuchie gị ogologo oge gara aga, gị na nne na nna zụlitere gị ga-anọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya.

Wusie Mmekọrịta Gị na Nna Gị nke Eluigwe Ike

Ọtụtụ ndị ntorobịa e kuchiri ekuchi na-atụ egwu na a ga-agbahapụ ha. Ha na-echegbu onwe ha ma e nwere ike ikewapụ ha n’ebe ezinụlọ kuchiri ha nọ dị nnọọ ka e kewapụrụ ha n’ebe ezinụlọ mụrụ ha nọ. A pụrụ ịghọta ihe kpatara egwu dị otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, cheta okwu ndị a amamihe dị na ha: “Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya, kama ịhụnanya zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí.” (1 Jọn 4:18) Ekwela ka egwu na-enweghị isi nke bụ́ na a ga-ekewapụ gị n’ebe ndị ị hụrụ n’anya nọ na-enye gị nsogbu mgbe nile. Kama nke ahụ, mụbaa ịhụnanya gị n’ebe ndị ọzọ nọ, gụnyere ndị ezinụlọ unu nile. Otú ọ dị, karịsịa, mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Nna gị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, nọ sikwuo ike. N’ihi na ọ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ nile, ọ dịghị mgbe ọ na-agbahapụ ụmụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ pụrụ ime ka egwu gị belata.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Catrina, bụ́ onye e kuchiri ekuchi mgbe ọ bụ obere nwa na-ekwu na ịgụ Bible nyeere ya aka nke ukwuu n’ịbịarukwu Chineke nso na ibi ndụ na-enye obi ụtọ, nke na-arụpụta ihe. Ọ na-ekwu na iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya “dị oké mkpa n’ihi na Nna anyị nke eluigwe maara mmetụta anyị na-enwe.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-amasị Catrina karịsịa bụ Abụ Ọma 27:10, bụ́ ebe kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Foto dị na peeji nke 31]

Chọọ ụzọ isi mee ka gị na nne na nna kuchiri gị nwee mmekọrịta chiri anya karị