Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Usuu Ndị Agha Azọlie Ije!

Usuu Ndị Agha Azọlie Ije!

Usuu Ndị Agha Azọlie Ije!

“Anyị bi n’otu obodo nta a ka na-ewu ewu na Belize, bụ́ nke ọhịa gbara gburugburu. Otu ụtụtụ, n’ihe dị ka elekere anya itoolu, usuu ndị agha wakporo ụlọ anyị. Oké ìgwè ijere si n’okpuru ibo ụzọ anyị nakwa ná mgbawara nile nubata n’ime ụlọ, na-achọ ụmụ ahụhụ ha ga-eri. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime ma e wezụga ịhapụrụ ahụhụ ndị ahụ ụlọ anyị ruo otu awa ma ọ bụ abụọ. Mgbe anyị lọghachiri, o nweghịzi ahụhụ fọdụrụ n’ụlọ ahụ.”

NYE ỌTỤTỤ NDỊ bi ná mba ndị dị n’ebe okpomọkụ dị ka Belize, nke a bụ ihe na-eme mgbe mgbe, ọ dịchaghịkwa ewe ha iwe. Ọ bụ ụzọ isi chụọ ahụhụ ndị dị ka ọchịcha na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ. Ha adịghịkwa anyụtọsị ebe nile.

N’ụzọ na-adọrọ mmasị, a na-akpọ ahụhụ ndị a na-ekwu banyere ha ebe a ijere. * Ụzọ ndụ ha na ihe omume ha na-eyi nke usuu ndị agha. Kama ịkpa akwụ́, usuu ndị agha a na-agagharị agagharị, bụ́ ndị na-eru ọtụtụ puku, na-ewu ebe obibi na-adịru nwa mgbe, bụ́ ìgwè ụmụ ahụhụ jikọtachara ụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe mkpuchi ma jiri ya gbaa ahụhụ nke nne na-eyi àkwá na nwa ya gburugburu. A na-esi n’ebe obibi ahụ ezipụ ìgwè ụmụ ahụhụ ndị na-aga n’ogologo ahịrị iji chọta ihe oriri, nke na-agụnye ụmụ ahụhụ na obere anụmanụ, ndị dị ka ngwere. Ndị ndú nke ìgwè ụmụ ahụhụ ahụ na-eme ka ụzọ ha wasasịa awasasị iji gbaa ụmụ ahụhụ gburugburu. Ha na-eme nke a mgbe, n’ịbụ ndị na-enweghị ihe ọ bụla ha nụrụ ísìsì ya, ndị ọrụ ahụ bụ́ ndị nọ n’ihu kwụsịrị ịga n’ihu. Ụmụ ahụhụ ndị nọ n’azụ na-anọgide na-aga n’ihu, ọ na-emekwa ka ahịrị dị n’ihu waa ngalaba, bụ́ nke na-eme ka e nwere ọtụtụ ụzọ ha na-aga na ya.

Ihe omume ijere na-ewe ụbọchị 36, ha na-agagharị ruo ihe dị ka ụbọchị 16, mgbe ahụkwa ha anọrọ otu ebe ruo ụbọchị 20, bụ́ mgbe ahụhụ nke nne na-eyi àkwá ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, agụụ na-eme ka ìgwè ahụhụ ahụ zọpụkwa ije ọzọ. N’akụkụ mbara ala ebe ha na-aga, nke na-adị ihe dị ka mita iri n’obosara, a na-ahụ ududo, akpị, ébé, mbara, na ngwere ndị na-agbalaga agbalaga, na nnụnụ ndị na-eri ụmụ anụmanụ ndị a na-agbalaga agbalaga, ndị ọ na-eyighị ka hà na-eri ụmụ ahụhụ ndị ahụ.

Ụmụ ahụhụ, bụ́ ndị a kọwara dị ka ndị “maara ihe nke ukwuu” na Bible n’Ilu 30:24, 25, bụ otu n’ime ihe ndị e kere eke dị ebube.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Isiokwu a na-atụle ijere Eciton genus nke Etiti na Ndịda America.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ijere

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Frederick D. Atwood

[Foto dị na peeji nke 25]

Iwu àkwà site n’ijikọta ụkwụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Tim Brown/www.infiniteworld.org