Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zere Ikwu Okwu Na-emerụ Ahụ́

Zere Ikwu Okwu Na-emerụ Ahụ́

Echiche nke Bible

Zere Ikwu Okwu Na-emerụ Ahụ́

“N’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ịbụ ọnụ si apụta. O kwesịghị ekwesị, ụmụnna m, ka ihe ndị a nọgide na-ewere ọnọdụ otú a.”—JEMS 3:10.

IKIKE ikwu okwu bụ otu n’ime ihe ndị pụrụ iche nke mere ka anyị dị iche n’ebe ụmụ anụmanụ nọ. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị na-eji onyinye a eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Mkparị, ịkpọ iyi, okwu rere ure, okwu nkwulu, okwu na-adịghị ọcha, na okwu rụrụ arụ pụrụ igbu mgbu n’obi—mgbe ụfọdụ, karịa mmerụ ahụ́ nkịtị. Bible na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.”—Ilu 12:18.

Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-arịwanye elu na-ekwukarị okwu ịkpọ iyi. Ụlọ akwụkwọ dị iche iche na-akọ na e nwere ịrị elu n’ojiji ụmụaka na-eji okwu rụrụ arụ eme ihe. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ekwu na okwu na-emerụ ahụ́ pụrụ ịba uru mgbe e kwuru ya iji gosi iwe dị mmadụ n’obi. Otu nwa akwụkwọ na-amụ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị dere, sị: “Ikwu okwu rụrụ arụ kwesịrị ịbụ omume dị irè, mgbe okwu ndị a na-ejikarị eme ihe na-enweghị nnọọ ike igosipụtacha mmetụta anyị.” Ndị Kraịst hà kwesịrị inwe àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe dị otú a banyere okwu na-emerụ ahụ́? Olee ihe bụ́ echiche Chineke banyere ya?

Zere Okwu Njakịrị Rụrụ Arụ

Okwu rụrụ arụ abụghị ihe ọhụrụ. Ọ̀ ga-eju gị anya ịmata na ndị mmadụ na-ekwu okwu rụrụ arụ n’oge ndịozi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga? Dị ka ihe atụ, o yiri ka ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Kọlọsi ha na-ekwu okwu rụrụ arụ mgbe a kpasuru ha iwe. O nwere ike ịbụ na ha na-ama ụma ekwu ya iji kpasuo ndị ọzọ iwe ma ọ bụ iji mee ihe ga-ewute ha, ikekwe iji gwagwara ha ihe ha gwara ha. N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị taa na-ekwu okwu rụrụ arụ mgbe iwe ji ha. N’ihi ya, akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara Ndị Kọlọsi metụtakwara oge anyị a. Pọl dere, sị: “Wepụnụ ha nile n’ezie n’ebe unu nọ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” (Ndị Kọlọsi 3:8) N’ụzọ doro anya, a dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha zere iwe iwe ọkụ na okwu rụrụ arụ nke ya na iwe na-agakọtakarị.

N’ezie, ọtụtụ ndị na-ekwu okwu rụrụ arụ n’ebughị n’obi iji ya kpasuo ndị ọzọ iwe ma ọ bụ iji mee ihe ga-ewute ha. O yiri ka a na-ekwukarị okwu rụrụ arụ n’echeghị echiche. N’ihi ya, okwu ọjọọ na-esi otú a agbanyesi mkpọrọgwụ ike n’okwu a na-ekwu kwa ụbọchị. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ọbụna ikwu okwu n’etinyeghị ya okwu rụrụ arụ. Ọtụtụ mgbe, a na-ekwu okwu rụrụ arụ ọbụna iji kpaa ọchị. Ma, è kwesịrị ile okwu njakịrị rụrụ arụ dị otú a anya dị ka ihe na-adịchaghị njọ, nke a pụrụ ileghara anya? Tụlee ihe na-esonụ.

Okwu njakịrị rụrụ arụ bụ okwu na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nke e zubere iji kpaa ndị ọzọ ọchị. Taa, okwu njakịrị rụrụ arụ na-abụkarị banyere mmekọahụ. Ọtụtụ ndị kwa, bụ́ ndị na-eche na ha bụ ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù na-enwe mmasị n’ụdị okwu ahụ. (Ndị Rom 1:28-32) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ma omume mmekọahụ kwesịrị ekwesị ma ndị nke na-ekwesịghị ekwesị bụcha ihe ọtụtụ ndị ji ime ihe nkiri na-atọ ọchị mere aka ọrụ na-akọkarị maka ha. A na-egosi ndị na-ekwu okwu njakịrị rụrụ arụ n’ọtụtụ ihe nkiri sinima nakwa n’ihe omume telivishọn na nke redio.

Bible agbachighị nkịtị n’okwu banyere okwu njakịrị rụrụ arụ. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ, sị: “Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ omume ihere ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:3 4) N’ụzọ doro anya, okwu rụrụ arụ adịghị amasị Chineke n’agbanyeghị ihe bụ́ nzube e ji kwuo ya. Ọ dị njọ. Ọ bụ okwu na-emerụ ahụ́.

Okwu Ọjọọ Ndị Na-adịghị Amasị Chineke

N’ezie, okwu na-emerụ ahụ́ gụnyere ihe karịrị okwu rụrụ arụ. Okwu mkparị, okwu njakịrị, ịkwa emo, na ajọ nkatọ pụrụ iwute mmadụ nke ukwuu. Ọ bụ ezie na anyị nile na-eji ire anyị eme mmehie, karịsịa n’ebe ndị a na-amakarị njakịrị ma na-ekwu okwu azụ. (Jems 3:2) N’agbanyeghị nke ahụ, ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ịzụlite àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe n’ihe banyere okwu mkparị. Bible na-eme ka o doo anya na Jehova Chineke anaghị anabata okwu ọ bụla na-egbu mmụọ.

Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Eze nke Abụọ, a kọọrọ anyị banyere ìgwè ụmụ okoro ndị kwara Ịlaịsha onye amụma emo. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na ha malitere ‘ịkwa ya emo’ ma “sị ya, rịgoo, onye isi nkwọcha; rịgoo, onye isi nkwọcha.” Jehova, bụ́ onye pụrụ inyocha obi ụmụ okoro ndị a ma mata nzube ọjọọ ha, lere ịkwa emo ha anya dị ka ihe na-abụghị ihe egwuregwu. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Chineke mere ka ụmụ okoro 42 nwụọ n’ihi okwu mkparị ha.—2 Ndị Eze 2:23, 24.

Ndị Izrel nọgidere “na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:16) Ọ bụ ezie na ihe kpasuru Chineke iwe karịsịa bụ omume ikpere arụsị na nke nnupụisi nke ndị ya, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Bible kwuru kpọmkwem banyere mkparị ahụ ha kparịrị ndị amụma Chineke. Nke a na-eme ka ọ pụta ìhè na Chineke adịghị anabata omume dị otú ahụ ma ọlị.

N’ihi ya, Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Akatọla nwoke meworo okenye n’ụzọ dị njọ.” (1 Timoti 5:1) A pụrụ iji ụkpụrụ a mee ihe n’ụzọ anyị si emeso onye ọ bụla. Bible na-agba anyị ume “ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ịghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka [anyị] nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:2.

Igbochi Egbugbere Ọnụ Anyị

Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike imeri ọchịchọ ịgwa mmadụ okwu ọjọọ. Mgbe e mejọrọ mmadụ, ọ pụrụ iche na o ziri ezi ya ịgwa onye ahụ mejọrọ ya okwu ọjọọ—n’ihu ya ma ọ bụ n’azụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst na-eguzogide ọchịchọ dị otú a. Ilu 10:19 na-ekwu, sị: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.”

Ndị mmụọ ozi Chineke na-esetịpụ ezi ihe nlereanya. Ha maara ihe ọjọọ nile ihe a kpọrọ mmadụ na-eme. Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ụmụ mmadụ ike, ha adịghị eji okwu ọjọọ ebo ha ebubo, “n’ihi ùgwù ha na-akwanyere Jehova.” (2 Pita 2:11) Ebe ha maara na Chineke maara ihe ọjọọ nile onye ọ bụla na-eme, na o nwekwara ike zuru ezu idozi ya, ndị mmụọ ozi na-egbochi egbugbere ọnụ ha. Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi nile, jụrụ ikwu okwu ọjọọ, ọbụna megide Ekwensu.—Jud 9.

Ndị Kraịst na-agbalịsi ike iṅomi ndị mmụọ ozi. Ha na-agbaso ndụmọdụ Bible bụ́: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile. Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, si: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’”—Ndị Rom 12:17-19.

Ọ dị mma ịmara na ọbụna ụda olu anyị pụrụ ime ka ihe anyị na-ekwu na-akpasu ndị ọzọ iwe. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka ndị di na nwunye na-agwakasị ibe ha okwu ahụ́ n’ịba mbá. Ọtụtụ ndị nne na nna na-etikarịrị ụmụ ha mkpu. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa iti mkpu mgbe anyị na-ekwupụta mmetụta anyị. Bible na-agba ume, sị: “Ka e wepụ obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ.” (Ndị Efesọs 4:31) Bible na-ekwukwa na “ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro.”—2 Timoti 2:24.

Okwu Ndị Na-ewuli Elu

N’ihi njupụta okwu mkparị na okwu rụrụ arụ jupụtara ebe nile taa, Ndị Kraịst kwesịrị inwe atụmatụ ha ga-eji na-eguzogide mmetụta ọjọọ a. Bible kọwapụtara otu atụmatụ, nke bụ́, ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. (Matiu 7:12; Luk 10:27) Inwe ezi nchegbu na ịhụnanya maka ndị agbata obi ga-akwali anyị ikwu okwu ndị na-ewuli elu mgbe nile. Bible na-ekwu, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama okwu ọ bụla dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.”—Ndị Efesọs 4:29.

Ọzọkwa, ịkụnye Okwu Chineke n’uche anyị na-enyere anyị aka izere okwu na-emerụ ahụ́. Ịgụ Akwụkwọ Nsọ na ịtụgharị uche na ya pụrụ inyere anyị aka ‘iwepụ iru unyi nile.’ (Jems 1:21) Ee, Okwu Chineke pụrụ iwuli anyị elu n’uche.