Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 25. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. N’ihi gịnị ka onye mkpọkọta ahụ ji kwuo na “ụdọ atọ nke a tụkọtara n’otu, a dịghị adọbi ya ngwa ngwa”? (Eklisiastis 4:12)

2. N’okpuru Iwu Mozis, olee njimara abụọ anụmanụ ndị e kwere ka a na-eri eri na-aghaghị inwe? (Deuterọnọmi 14:6)

3. Ònye bụ nna Jọshụa? (Joshua 1:1)

4. Mgbe Jehova kwere ka Setan tie Job ihe otiti, gịnị ka o mere Job? (Job 2:7)

5. Ònye gwara Eze Ahasuerọs banyere osisi ahụ ịdị elu ya dị kubit 50 nke Heman mere maka Mọdekaị, bụ́ nke kpaliri eze ahụ ịkwụgbu Heman na ya? (Esta 7:9)

6. Olee otú Jizọs kwuru na a ga-esi mata ndị amụma ụgha? (Matiu 7:15, 16)

7. Olee utu aha Jehova, nke na-eme ka ọrụ ya dị ka Onyeikpe dị ebube nke e kwesịrị ịkwanyere ùgwù karịsịa, pụta ìhè, nke a na-achọta nanị n’akwụkwọ Daniel? (Daniel 7:22)

8. Olee ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nke ìgwè ụgbọ mmiri Eze Solomọn ndị si Tashish na-ebutere ya kwa afọ atọ? (1 Ndị Eze 10:22)

9. Ònye ka ya na Erọn jidere aka Mozis weliri elu ruo mgbe Jehova mere ka ndị Izrel merie ndị Amalek? (Ọpụpụ 17:12)

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ si kpebie onye ga-anọchi Judas Iskarịọt? (Ọrụ 1:23-26)

11. Ònye bụ nnukwu onye nchụàjà nke Izrel n’oge Samuel ghọrọ onye amụma? (1 Samuel 3:1)

12. N’oge e guzobere òtù ndị nchụàjà n’Izrel, olee ebe atọ Mozis mesara ọbara n’ahụ Erọn na ụmụ ya ndị ikom? (Levitikọs 8:23, 24)

13. Kama ike Iv iche site n’ájá ala, gịnị ka Chineke ji kpụọ ya? (Jenesis 2:21, 22)

14. Gịnị ka Pọl kwuru na ọ bụ “mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile”? (1 Timoti 6:10)

15. Dị ka e gosiri n’Akwụkwọ Nsọ, mbara ala ha aṅaa ka oké ehi abụọ pụrụ ịkọ n’otu ụbọchị? (1 Samuel 14:14)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Iji mesie ya ike na ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu maka otu nzube na-enwe ume na ikike ka ukwuu iji nagide nsogbu

2. Ụkwụ ha aghaghị ịwa njakpa, ha aghaghịkwa ịbụ anụmanụ ndị na-atagharị ọnụ

3. Nun

4. O ‘weere ihe ofifi ọjọọ tie Job, site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya’

5. Habona, otu n’ime ndị ọnaozi na-anọ n’ihu eze

6. “Site ná mkpụrụ ha”

7. “Onye ochie ahụ”

8. Ọlaedo, ọlaọcha, ọdụ́, enwe, na ekwuru ụlọ

9. Hua

10. Ha kpere ekpere ma fee nza

11. Ịlaị

12. Ná ntị aka nri ha, n’isi aka nke aka nri ha, nakwa n’isi ụkwụ nke ụkwụ aka nri ha

13. Ọgịrịga o wepụtara n’ahụ́ Adam

14. “Ịhụ ego n’anya”

15. Hekta