Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ọgwụ Ekechi Mmadụ Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

Iji Ọgwụ Ekechi Mmadụ Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

Echiche nke Bible

Iji Ọgwụ Ekechi Mmadụ Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?

“A gaghị ahụta n’etiti gị onye . . . na-akọ ndị ọzọ ọgwụ.”—DEUTERỌNỌMI 18:10, 11, NW.

I JI ọgwụ ekechi mmadụ abụwo ihe a rụrịtaworo nnukwu ụka banyere ya. * Ọ na-esiri ọbụna ndị ọkachamara n’ihe banyere ya ike nkọwa. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ maara na onye e ji ọgwụ kechie na-eme ka onye iberibe ma ọ bụ onye na-amakwaghị onwe ya. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nwere mmasị karị n’ihe iji ọgwụ kechie mmadụ pụrụ ịrụzu karịa n’ihe ọ bụ.

N’afọ ndị a, ọ ghọọla ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị ọrụ ahụ́ ike ịtụ aro ka e jiri usoro ikechi mmadụ gwọọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Psychology Today na-ekwu, sị: “Usoro ọgwụgwọ nke ikechi mmadụ pụrụ ịgwọ isi ọwụwa, belata ihe mgbu nke ime omume, nyere gị aka ịkwụsị ise siga, nọchie anya ọgwụ nkụnwụ ahụ́, meekwa ka otú mmadụ si amụ ihe ka mma—ha nile n’enweghị mmetụta ọjọọ ọ bụla.” N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị na-ekwu na e nwere ihe jikọrọ ikechi mmadụ na mgbaasị na anwansi.

Gịnị bụ́ echiche nke Bible? N’ezie, Bible abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, ọ dịghị ihe o kwuru kpọmkwem banyere iji ọgwụ ekechi mmadụ. Ma ụkpụrụ ndị dị n’ime Okwu Chineke pụrụ inyere anyị aka ịmata echiche Chineke.

Iji Ọgwụ Ekechi Mmadụ na Anwansi —È Nwere Ihe Jikọrọ Ha?

A na-asị na e nwere ihe jikọrọ iji ọgwụ ekechi mmadụ na anwansi, ọ̀ bụ echiche nkịtị mmadụ chepụtara n’onwe ya? Ọ pụrụ ịbụ akụkọ ndị e chepụtara echepụta n’ihe nkiri sinima nakwa n’akwụkwọ ọgụgụ mere ka echiche ahụ gaa n’ihu, ma e nwere n’ezie ihe jikọrọ iji ọgwụ kechie mmadụ na mgbaasị. Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Occultism and Parapsychology na-akọwa banyere iji ọgwụ ekechi mmadụ, sị: “Ya na mgbaasị malitekọtara n’otu ebe.” A na-elekarị uche mkpapụ nke ndị okpukpe na-eme ka e nwee, nke bụworo otu akụkụ nke ịgba afa na majik kemgbe ụwa, anya dị ka otu ụdị nke iji ọgwụ ekechi mmadụ. Ọzọkwa, ndị dibịa afa n’Ijipt na Gris oge ochie ji otu ụdị nke ikechi mmadụ na-eme ihe mgbe ha na-anwa ịgwọ ọrịa n’aha chị ụgha ha.

Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ e hotara n’elu na-ekwu, sị: “Ọbụna taa, a na-ele ọtụtụ n’ihe omume ikechi mmadụ anya dị ka nke ‘Ndị Mmụọ.’” Ọ bụ ezie na o siri ike ịmata ókè ụdị dịgasị iche iche nke ikechi mmadụ na anwansi nweruru njikọ, nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke katọrọ ụdị mgbaasị nile n’ụzọ doro anya. (Deuterọnọmi 18:9-12; Mkpughe 21:8) N’ihi ya, Ndị Kraịst apụghị ileghara akụkụ nke iji ọgwụ kechie mmadụ ndị o doro anya na Akwụkwọ Nsọ megidere anya.

Mmetụta Ọ Na-enwe n’Akparamàgwà

Gịnị banyere mmetụta nke iji ọgwụ ekechi mmadụ na-enwe n’uche na àgwà mmadụ? È nwere ihe ize ndụ ndị dị na ya? Ezi nchegbu e nwere bụ na mgbe e ji ọgwu kechie mmadụ, onye ahụ agaghị enwechazi ike ịchịkwa àgwà ya. Ndị na-egosi ihe omume nke iji ọgwụ ekechi mmadụ dị ka ihe ngosi na-ejikarị akụkụ a eme ihe, ha na-amanye ndị wepụtara onwe ha ime ihe ndị ha na-agaaraghị eme ma ọ bụrụ na anya doro ha edo, ọbụna ime ka o yie ka hà ṅụbigara mmanya ókè.

Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu banyere iji ọgwụ ekechi mmadụ n’ihu ọha, sị: “Onye e ji ọgwụ kechie pụrụ ịgbaso ngwa ngwa ọbụna aro na-apụtachaghị ìhè nke onye kechiri ya tụrụ, ọ pụrụ inwe mkpalị ndị na-apụtachaghị ìhè ngwa ngwa, mgbe e kechikwara ya, ọ pụrụ iche na e wepụwo iwu nile na-achịkwa akparamàgwà n’etiti ọha mmadụ nakwa mgbe nanị ya nọ.” Akwụkwọ bụ́ Collier’s Encyclopedia na-ekwu, sị: “Onye e ji ọgwụ kechie na-etinye uche ya nile n’ihe, bụ́ nke na-eme ka uche ya nile dịrị n’ebe aro nke onye ahụ kechiri ya dị ma na-agbaso ha.”

Nke a ò yiri ihe na-adịghị emerụ ahụ́? Ò kwesịrị ekwesi ka ezi Onye Kraịst kwere ka ndị ọzọ chịkwaa uche ya site n’iji ọgwụ kechie ya ma na-atụrụ ya aro ihe ọ ga-eme? Nke a ga-emegide ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu. Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.”—Ndị Rom 12:1, 2.

Onye Kraịst ọ̀ pụrụ ‘inwe ezi akọ na uche,’ ma ọ bụrụ na o kwere ka e tinye ya n’ọnọdụ nke ọ na-enwekwaghị ike ịchịkwa echiche ya ma ọ bụ ọchịchọ ya ma ọ bụ ọbụna omume ya n’ụzọ zuru ezu? (1 Pita 3:16) Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:4) N’ụzọ doro anya, iji ọgwụ ekechi mmadụ ga-egbochi ikike mmadụ nwere ịgbaso ndụmọdụ dị otú ahụ.

Olileanya Maka Ahụ́ Ike Zuru Ezu

N’ihi ụkpụrụ Bible ndị a kpọtụrụ aha n’elu, Ndịàmà Jehova na-ezere usoro ndị metụtara iji ọgwụ kechie mmadụ ma ọ bụ mmadụ iji aka ya kechie onwe ya. Ha na-erube isi n’iwu ahụ dị na Deuterọnọmi 18:10, 11: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye . . . na-akọ ndị ọzọ ọgwu.” Maka ndị nwere nsogbu ahụ́ ike, e nwere ọtụtụ ọgwụgwọ ndị ọzọ na-adịghị etinye mmadụ n’ihe ize ndụ nke anwansi ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ chịkwaa uche mmadụ.

Site n’izere omume ndị megidere ụkpụrụ Bible, Ndị Kraịst pụrụ inwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. Mgbe ahụ ka ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe ahụ́ ike na uche zuru ezu, mgbe a na-agaghị eji ọgwụ kechie mmadụ.—Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A na-akọwa iji ọgwụ ekechi mmadụ dị ka ọnọdụ nke mmadụ amaghị onwe ya bụ́ nke onye ọzọ kpatara, onye e kechiri adịghịzi enwe amamihe nke ya ma ọ bụ ọ na-emezi iberibe iberibe, na-anụ ma na-ahụ ihe ndị na-adịghị adị, ma na-emezi nnọọ ihe onye ahụ kechiri ya gwara ya ka o mee.