Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Njupụta nke Ụmụaka Ndị Bubigara Ibu Ókè n’Ụwa Nile

“Ụmụaka ibubiga ibu ókè na-aghọwanye ihe a na-ahụ n’ụwa nile, a ghaghịkwa ịlụso nsogbu ahụ ọgụ site n’igbochi isi ihe na-akpata ya, bụ́ nri ratụ ratụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ. “Dị ka Òtù Ọrụ Gbalụ Gbalụ Maka Ndị Bubigara Ibu Ókè si kwuo, ihe karịrị pasent 25 nke ndị dị afọ 10 n’ọtụtụ mba n’ụwa nile bubigara ibu ókè.” Mọlta (pasent 33), Ịtali (pasent 29), nakwa United States (pasent 27) kasị nwee ọnụ ọgụgụ ụmụaka bubigara ibu ókè. Otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụmụaka dị n’agbata afọ anọ na afọ iri na Chile, Mexico, na Peru bubigara ibu ókè. N’ebe ụfọdụ n’Africa, e nwere ụmụaka bubigara ibu ókè karịa ka e nwere ndị dị gịrịgịrị. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji bubiga ibu ókè? “Nwatakịrị [nọ na United States] nọ n’ọnọdụ dị otú o kwesịrị na-ahụ mkpọsa ihe oriri 10,000 n’otu afọ, pasent 95 n’ime ha na-abụ maka nri onye ọ dị ngwa, mmanya ọtọ bịrịbịrị, ihe nracha na mkpụrụ akụ́kụ́ e tinyere shuga—ha nile na-enye nnukwu uru ego ma ha adịghị enye ihe n’ahụ́,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post na-aza. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-ejikọta nri onye ọ dị ngwa, mmanya ọtọ bịrịbịrị na ihe ụmụaka ji egwuri egwu, egwuregwu dị iche iche, ihe ndị a na-atụtụkọta dị ka ihe mkpori ndụ, ihe nkiri na ndị a ma ama. . . . Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ụmụaka na-enwetazi ihe dị ka pasent 15 nke calorie nile dị ha n’ahụ́ site ná nri onye ọ dị ngwa, pasent 10 site ná mmanya ọtọ bịrịbịrị ndị e ji shuga mee ka ha tọwanye ụtọ, na-erikwa nanị ọkara nke ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri a tụrụ aro ya?”

Aṅụ Ndị Na-achụ Enyí

nụ ọgụgụ enyí ndị nọ na Kenya na-arị elu, ma nke a akpatawo nsogbu. Ìgwè enyí ndị na-awagharị awagharị na-ebibi osisi na ihe ọkụkụ, ha na-azọgbukwa nkezi nke otu mmadụ kwa izu abụọ. Otú ọ dị, Fritz Vollrath bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ na Mahadum Oxford achọpụtawo ihe pụrụ ịchụ ha. Mgbe enyí kpasuru akpa aṅụ, ka ọ na-ekwu, “ha adịghị eleghara ya anya. Ha na-agba ọsọ, aṅụ ahụ na-achụrụkwa ha ruo ọtụtụ kilomita.” Aṅụ ndị ahụ na-agba enyí n’ebe ndị dị njọ gburugburu anya ha, n’azụ ntị ha, n’okpuru imi ha nakwa n’afọ ha. Vollrath debere akpa aṅụ Africa ndị aṅụ bi na ha na ndị aṅụ na-ebighị na ha n’elu osisi ụfọdụ ndị na-eto n’ọzara ebe enyí na-agakarị. Magazin bụ́ New Scientist na-akọ na anụmanụ ndị ahụ zeere osisi ndị ahụ nile nwere akpa aṅụ ndị aṅụ bi na ha nakwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nwere akpa aṅụ ndị aṅụ na-ebighị na ha. Ma ha bibiri ụzọ 9 n’ụzọ 10 nke osisi ndị na-enweghị akpa aṅụ. Vollrath chọpụtakwara na enyí na-ezere ụzụ aṅụ ndị iwe ji ọbụna mgbe a kpọrọ ụzụ ufe ha n’ígwè okwu na-eme ka okwu dapụta ụda.

Akụkọ Bịara n’Azụ Oge, Mmeghachi Omume Dị Ngwa

“Ụlọ elu ndị dị oké elu bụ ihe ọhụrụ n’anya ndị Masai bi n’ime obodo a [Enoosaen] dị na Kenya, bụ́ ebe ihe ndị kasị too ogo na gburugburu ebe ahụ bụ osisi acacia na anịgọ ndị na-ata akwụkwọ osisi ndị ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ. “N’ihi ya, n’oge na-adịbeghị anya, mgbe Kimeli Naiyomah si United States, bụ́ ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ, lọta n’obodo nta a, ọ chọpụtara na ndị Masai ibe ya maara nanị ihe dị nta banyere ihe ahụ mere n’ebe ahụ dị anya a na-akpọ New York na Sept. 11. Ụfọdụ ndị nọ n’ógbè a nke ndị na-awagharị awagharị, bụ́ ndị na-azụ ehi, mejupụtara anụtụbeghịdị akụkọ ahụ.” Mgbe Naiyomah, bụ́ onye gara Manhattan na September 11, gwara ndị obodo ahụ ihe o ji anya ya hụ n’ihe dị ka ọnwa asatọ gara aga, o wutere ha, ha achọọkwa ime ihe iji nye aka. Ihe ọ rụpụtara bụ na e nyere ehi 14 n’onyinye, nke bụ́ otu n’ime ihe ndị kasị dị oké ọnụ ahịa onye Masai pụrụ inye, iji nyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka. Ma ebe e nwere nsogbu banyere otú a ga-esi ebuga ehi ndị ahụ, onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ onye nnọchiteanya United States, bụ́ onye natara ha, kwuru na ya “nwere ike ire ehi ndị ahụ ma zụta ọla ndị Masai ya ga-enye America,” ka Times kọrọ.

Ụmụ Agbọghọ Ndị Na-achọ Okwu

“Ịchọ okwu nke ụmụaka nwoke na-ewerekarị ọnọdụ n’ụdị nke iti ihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star na-akọ, ebe “a bịa n’ebe ụmụ agbọghọ nọ, ụzọ ha na-esi eme ya na-emetụta nnọọ uche karị.” A na-ekwu na ka ụmụ agbọghọ na-abanye n’afọ iri na ụma, ha na-atụwanye ụjọ ma na-enwewanye nchegbu, gụnyere nchegbu banyere otú ụmụ nwoke si ele ha anya. Ndị ọkachamara n’ihe banyere àgwà kwenyere na “ụmụ agbọghọ pụrụ ịsọ mpi n’ihe banyere ‘onye ga-akasị dọrọ mmasị ụmụ nwoke,’ bụ́ nke ihe omume usoro mgbasa ozi ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-akwalite.” Denise Andrea Campbell, onye bụ́bu president nke Kọmitii Mba nke Na-ahụ Maka Ọnọdụ Ụmụ Nwanyị, na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ amaghị otú ha ga-esi na-achịkwa iwe na ekworo ha kpọmkwem.” N’ihi ya, mmetụta ndị ahụ na-abụ ndị “a na-esi n’ụzọ ụfọdụ na-akpata mmerụ ahụ́ egosipụta.” Ụmụ agbọghọ pụrụ ịdị na-emeso ya ụmụ agbọghọ ndị ọzọ, na-eji ụzọ ndị dị ka ekwunyereghị ha okwu, ile ha anya dị ka ndị a na-asọ oyi, na ịgba asịrị, eme ihe.

Nrụgide n’Ebe Ọrụ

“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu onye n’ime ndị Canada ise kwuru na ha na-enwe nnọọ nchekasị nke na ha echewo echiche igbu onwe ha iji nwere onwe ha pụọ ná nrụgide ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail na-akọ. Gịnị na-akpata nrụgide a? Ná nnyocha e mere n’ebe mmadụ 1,002 nọ, pasent 43 kwuru na ọ bụ ọrụ ha. “N’ebe ọrụ nke oge a, anyị na-amanye ndị mmadụ ime ihe ha na-agaghị anagideli n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche,” ka Shimon Dolan, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere akparamàgwà ndị ọrụ nakwa prọfesọ na Mahadum Montreal, na-ekwu. “Nrụgide a na-enwe ka a rụzuo ihe a chọrọ na-adị nnọọ ukwuu ma, n’otu oge ahụ, e jighị ihe ọ bụla n’aka—ị maghị ma a ga-achụ gị n’ọrụ echi.” Olee otú ndị Canada si anagide nrụgide? Ụzọ kasị ewu ewu bụ inwe mmega ahụ́, ka Globe na-ekwu, “ụzọ ndị ọzọ bụ ịgụ akwụkwọ, ime ihe omume ntụrụndụ na igwuri egwu, isoro ndị ọzọ nọkọọ na iwepụta oge iji soro ezinụlọ gị nọrịa.”

Ụmụaka Isoro Ndị Mụrụ Ha Gụọ Ihe Na-eme Ka Ha Ghara Ịkpaghasị Ihe

“Ụmụaka ndị na-akpaghasị ihe, bụ́ ndị na-alụ ọgụ, na-ezu ohi ma na-agha ụgha pụrụ ibelata nnọọ àgwà na-emebi mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke ha na-akpa ma ọ bụrụ na ha esoro nne ma ọ bụ nna ha na-agụchi ihe anya,” ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Times na-akọ. Ná nnyocha were izu iri nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nkà Mmụta Ọrịa Uche mere n’ebe ihe karịrị 100 ụmụaka dị afọ ise na afọ isii bi n’Ime Ime London nọ, e nyere ndị mụrụ ụmụ ntụziaka ka ha “na-agbanyụ fon ha na-eji agagharị agagharị tupu ha anọdụ ala iji soro ụmụ ha gụọ ihe, kwuo isi ihe ndị dị n’akụkọ tupu ha amalite, ma jiri nwayọọ na-asapeta akwụkwọ ma na-ekiri ihe osise ndị dị na ya.” Ihe ndị ọ rụpụtara “gosiri n’ụzọ doro anya na atụmatụ inye ụmụ ọzụzụ nke dị mfe, nke e ji nlezianya mee, pụrụ ịdị nnọọ irè n’ime ka àgwà nke ọbụna obere ụmụaka dịwanye mma,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. “Ihe ụmụaka chọrọ n’ezie bụ nlebara anya,” ka onye nduzi nnyocha bụ́ Dr. Stephen Scott, kwuru. “Ha pụrụ inweta nke a site n’isoro nne na nna ha na-agụ ihe.”

Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Nwere Obi Ụtọ

“Ndị na-etinye oge ha n’ọrụ a na-adịghị akwụ ụgwọ na ya na-ekwu na ha na-enwe nnọọ obi ụtọ n’ọrụ ha, n’awa ndị ha na-eji arụ ọrụ, ná mmekọrịta ha na ndị obodo nakwa n’ọnọdụ ime mmụọ ha karịa ìgwè ọ bụla ọzọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sydney Morning Herald na-akọ. Otu nnyocha nke otu ìgwè ndị nnyocha mere n’Australia chọpụtara na ndị ọrụ afọ ofufo “nwere nnọọ afọ ojuju n’ahụ́ ike ha, n’oge ha ji enwe ntụrụndụ nakwa n’otú ha na-esi enwe ya,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Prọfesọ Bob Cummins nke Mahadum Deakin kwuru na e nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo n’Australia—pasent 32 nke ndị Australia na-arụ ọrụ ụfọdụ a na-adịghị akwụ ụgwọ na ha. Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Herald kọkwara na ndị rụfere awa 60 n’izu—ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ nwanyị na-enye nlekọta—“nwere afọ ojuju n’ahụ́ ike ha nakwa n’ọrụ ha karịa ndị rụrụ ọrụ ruo awa ndị na-erughị otú ahụ.”

Iji Ụgbọ Mmiri Gaa n’Ụzọ Oké Osimiri nke Ebe Ugwu Ọwụwa Anyanwụ

Ná mgbalị nke ugboro anọ ha, otu ìgwè ndị nchọpụta si Germany nwere ihe ịga nke ọma n’iji ụgbọ mmiri nke na-eji ákwà ifufe arụ ọrụ nke dị mita 18 gaa n’Ụzọ Oké Osimiri Ebe Ugwu Ọwụwa Anyanwụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent nke London na-ekwu. Ụzọ oké osimiri a dị nso n’ikperé mmiri dị n’ebe ugwu nke Russia, nke ice na-ejupụtakarị na ya. Ọ bụ onye na-eme nchọpụta bụ́ Adolf Nordenskjöld, nke si Sweden, bụ onye mbụ ji ụgbọ mmiri na-eji uzu ọkụ na ákwà ifufe arụ ọrụ gaa na ya n’afọ 1879. “Ahụtụbeghị m mgbe ụzọ ahụ na-enweghị ice dị ka ọ na-enweghị n’oge okpomọkụ a,” ka onye ndú nke ìgwè ahụ bụ́ Arved Fuchs, kwuru. “Anyị na-eche na ihe kpatara nke a bụ ikpo ọkụ nke ụwa nakwa ifufe na-enweghị atụ, bụ́ nke gbazere ice kpụkọtara akpụkọta n’ikperé mmiri ahụ ma mee ka anyị gafere.” Site n’enyemaka nke ụgbọelu dị nnọọ fere fere nke na-ada n’elu mmiri nakwa foto ebe ndị ice kpụkọtara akpụkọta dịgasị bụ́ ndị e si na satellite seta, ha jiri ụgbọ mmiri gachaa kilomita 15,000 ahụ site na Hamburg, Germany, ruo Provideniya, Russia, n’Oké Osimiri Bering, n’ime ụbọchị 127, n’ejighị ụgbọ mmiri na-akpọwa ice mee ihe. N’ime ụgbọ mmiri ahụ, e nyere ndị ikom ahụ ụdị nri a na-enye ndị na-aga na mbara igwe. Ma, otu onye n’ime ha kwuru, sị: “Nanị ihe isi ike anyị nwere bụ isoro mmadụ 11 ndị ọzọ biri n’ebe nwere ohere dị nta ruo ọnwa anọ.”