Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ilu Ndị Akan—Ihe Na-egosi Ụzọ Ndị Obodo Si Ebi Ndụ

Ilu Ndị Akan—Ihe Na-egosi Ụzọ Ndị Obodo Si Ebi Ndụ

Ilu Ndị Akan—Ihe Na-egosi Ụzọ Ndị Obodo Si Ebi Ndụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GHANA

GỊNỊ bụ ilu? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara ilu dị ka “ahịrịokwu dị nkenke nke ndị mmadụ na-ehotakarị, bụ́ nke na-enye ndụmọdụ ma ọ bụ na-agwa gị ihe banyere ndụ.” Ndị Yoruba nke Nigeria na-akọwa ilu n’ụzọ na-adọrọ mmasị karị, ha na-akpọ ya “ịnyịnya nke pụrụ iji oké ọsọ buru mmadụ gaa n’ịchọta echiche dị iche iche.”

E gosipụtara mkpa ilu dị n’ilu a, bụ́ nke ndị Akan nke Ghana maara nke ọma: “Ilu ka e ji agwa onye maara ihe okwu.” Isi ihe dị na ya bụ na ọ dịghị mkpa ịgwa onye maara ihe ọtụtụ okwu iji mee ka ọ mata ihe ziri ezi ime. Ilu dabara adaba na-akpali iche echiche, ọ na-enyere mmadụ aka ịghọta ihe, ọ pụkwara ịkpali mmadụ ime ihe ziri ezi.

Na Ghana, a na-atụkarị ilu mgbe a na-eme ememe alụmdi na nwunye na ememe olili ozu, a na-ejikwa ya agụ egwú ọdịnala. Ha dịkwa oké mkpa ná nkwurịta okwu ndị chọrọ nlezianya. Ọnụ na-ekwuchitere ndị ọzọ ma ọ bụ onye ozi na-ejikarị nkà atụ ilu.

N’etiti ndị Akan, a na-eji ịtụ ilu nke ọma amata onye nwere amamihe. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’ime Bible, a kọrọ na Eze Solomọn—nwoke a ma ama n’ihi amamihe ya, mmụta ya, na ojiji ọ na-eji akọ ekwu okwu—maara ilu 3,000. Otú ọ dị, ilu Bible sitere n’ike mmụọ nsọ, ha bụkwa eziokwu mgbe nile, n’adịghị ka ilu ndị dabeere n’ahụmahụ na nghọta mmadụ. E kwesịghị iji ilu ndị mmadụ na-atụ, n’agbanyeghị otú amamihe dịruru na ha, tụnyere nke Bible. Ma ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ilu ndị Akan.

Echiche Banyere Chineke

Na Ghana, ilu na-egosipụtakarị na Chineke dị adị, nke a na-apụtakwa ìhè n’ọtụtụ ilu ndị Akan. Ndị Akan enweghị echiche ọ bụla na-egosi na Chineke adịghị. Dị ka ihe atụ, otu ilu na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye na-egosi nwatakịrị Chineke.” O doro ọbụna nwatakịrị anya na Chineke dị adị. A na-atụkarị ilu a mgbe a na-ezo aka n’ihe nwatakịrị ga-amụta n’onwe ya ma e nye ya obere ntụziaka.

Ilu ndị Akan ọzọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na i si n’ebe Chineke nọ gbapụ, ị ka nọ n’okpuru ya.” N’ihi ya, mmadụ na-aghọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na ọ nwaa ileghara Chineke anya. Ogologo oge gara aga, Bible kwuru ihe yiri ya, na-ekwu na anya Chineke dị ‘n’ebe nile ọ bụla na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ́ ezi mmadụ nche.’ (Ilu 15:3) Anyị nile ga-aza Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ajụjụ.

Ihe Na-egosi Ụzọ Ndị Obodo Si Ebi Ndụ na Ihe Ndị Ha Ji Kpọrọ Ihe

Dị ka ọ dị n’ihe banyere ilu ndị sitere n’ọdịbendi ndị ọzọ, ilu ndị Akan na-eme ka ụzọ ndị obodo si ebi ndụ na ihe ndị ha ji kpọrọ ihe dịgide. Dị ka ihe atụ, ike nke okwu e kwuru ekwu nwere na-apụta nnọọ ìhè n’ihe atụ a: “Ikwuhie ọnụ dị njọ karịa ịzọhie ụkwụ.” Ire a na-akwaghị nga pụrụ n’ezie imebi ihe dị ukwuu, ọ pụkwara ịkpatara mmadụ ọnwụ.—Ilu 18:21.

Otú ọ dị, mgbe a kwara ya nga, ire pụrụ ịbụ ihe e ji eme udo n’ezie, dị ka a na-egosipụta n’ilu, bụ́ “Ezé adịghị eserịta okwu ma ire nọrọ ya.” Isi ihe a na-ekwu n’ebe a bụ na ndị na-ese okwu—dị ka ihe atụ, nwoke na nwunye ya—pụrụ ikpezi site n’iji obi dị jụụ nwee nkwurịta okwu. Ọbụna mgbe nke a na-adịghị irè, iji ire eme ihe n’ụzọ nkà n’ikpeziri ha pụkwara ime ka ha kwụsị ise okwu.

Ezi Amamihe

E gosipụtara n’ụzọ doro anya, uru nghọta na ibu ụzọ chebara ihe echiche bara, n’ọtụtụ ilu ndị na-ekwu banyere ezi amamihe. Onye na-eme ihe n’echeghị echiche, ma na-esi ọnwụ, bụ́ onye na-adịghị echebara ihe ga-esi n’omume ya pụta echiche, pụrụ ịnara ndụmọdụ dị n’ilu a, “Buru ụzọ chọta ụzọ mgbapụ tupu ị chọọ ubí okwu.”

Nne ma ọ bụ nna nke chọpụtara àgwà ọjọọ ụfọdụ nwa ya na-akpa ga-achọ irube isi n’ilu a, “Ọ bụrụ na ị hụ ókpòrò osisi na-etolite etolite nke pụrụ ịrụkpọ gị anya, ị ga-efopụ ya, ị gaghị apị ya ọnụ.” Ee, e kwesịrị ime ka a kwụsị àgwà ọjọọ ọ bụla—ma ọ bụ gbochie ya ibilite—tupu ọ ghọọ nnukwu nsogbu.

Izo Aka n’Omenala na Ọdịbendị

Mgbe ụfọdụ, ọ dị mkpa ịghọta ọdịnala mba iji ghọta echiche dị n’ilu ha. Dị ka ihe atụ, n’etiti ndị Akan, a na-ele mmadụ imegharị aka ekpe mgbe ọ na-ekwu okwu n’ihu ndị ọzọ, karịsịa n’ihu ndị okenye, anya dị ka àgwà ọjọọ. A na-ezo aka n’ụkpụrụ a na-achịkwa omume ọma n’ilu bụ́ “Mmadụ adịghị eji aka ekpe egosi ụzọ e si aga obodo ya.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmadụ kwesịrị iji ihe o nwere kpọrọ ihe, gụnyere ebe a mụrụ ya.

Otu ilu nke na-ezo aka n’otú ezinụlọ ndị Akan nke dị otú o kwesịrị na-esi eri nri n’ụzọ omenala na-ekwu, sị: “Nwata kwọọ aka, ya esoro ndị okenye rie nri.” N’oge a na-eri nri, ndị òtù ezinụlọ na-anọ n’ìgwè n’ìgwè dabere n’afọ ndụ ha. Otú ọ dị, a pụrụ ime ka nwatakịrị nke na-eme nke ọma, karịsịa n’akụkụ metụtara ịdị ọcha anụ ahụ́ na àgwà ọma, soro nna ya na ndị okenye ndị ọzọ rie nri na tebụl ha. Ilu ahụ na-eme ka ọ pụta ìhè na mmadụ ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù na-adabere n’àgwà ya karịa ka ọ na-adabere n’afọ ndụ ya.

Ị̀ na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Mgbe ahụ tụlee ilu ndị Akan a, “Alụmdi na nwunye abụghị mmanya ngwọ a na-akpụrụtụ akpụrụtụ.” Ndị na-ere mmanya ngwọ, na-ekwekarị ka ndị chọrọ ịzụrụ mmanya ha kpụtụ ya ọnụ tupu ha ekpebie ókè ha ga-azụrụ ma ọ bụ ọbụna ma hà ga-azụ ma ọ bụ na ha agaghị azụ. Otú ọ dị, a pụghị ịkpụtụ alụmdi na nwunye ọnụ otú ahụ. Ilu a na-eme ka ịdịgide adịgide nke nkekọ alụmdi na nwunye pụta ìhè nakwa ịdị njọ nke alụmdi na nwunye nnwale.

Ileru Ihe Anya

Ọtụtụ ilu ndị Akan na-egosi na ndị nna nna ha leruru ndị mmadụ na anụmanụ anya. Dị ka ihe atụ, ileru nne ọkụkọ na ụmụ ya anya nke ọma mere ka ha chepụta ilu a, “Nwa ọkụkọ nke na-anọdebe nne ya na-eri apata ụkwụ ụkpara.” Gịnị ka ọ pụtara? Ọ bụrụ na mmadụ adịghị eso ndị ọzọ akpakọrịta, a ga-echezọ ya ngwa ngwa ma e kewe ezi ihe.

Onye ọ bụla hụrụla akịrị nwụrụ anwụ ga-aghọta nke ọma eziokwu dị n’ilu, bụ́ “Akịrị nwụọ, a hụ ókè o toruru n’ogo.” A na-ezokarị aka n’ilu a mgbe a na-ejighị mmadụ kpọrọ ihe. N’ọnọdụ dị otú a, onye ahụ a na-ejighị kpọrọ ihe na-enweta nkasi obi site n’eziokwu ahụ bụ́ na mgbe ọ na-agaghị anọ ya, ndị mmadụ pụrụ ịhụ àgwà ya ndị dị mma n’ụzọ zuru ezu.

Ilu Ndị E Gburu Nkenke

Ọ bụ ezie na a tụrụwo ilu ndị Akan si n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ, e chekwawo ọtụtụ ilu n’ọrụ nkà. A na-ahụ ọrụ nkà ndị dị otú ahụ n’osisi a tụrụ atụ, na mkpọ, n’ihe ndị a na-eji atụ ọlaedo n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nakwa n’uwe ọdịnala na ụdị uwe ọgbara ọhụrụ dị iche iche. Ndị gara n’ebe ndị a na-egosi ọrụ nkà na Ghana pụrụ ịhụ ihe osise nke otu nwoke na-arị elu osisi ka nwoke ọzọ na-enyere ya aka. Nke ahụ bụ ngosipụta a na-ahụ anya nke ilu a, “Ọ bụrụ na ị na-arị osisi dị mma, a pụrụ inutụ gị aka.” Ihe mmụta dị na ya doro anya—ọ bụrụ na ị na-achụso ihe mgbaru ọsọ bara uru, a pụrụ ịkwado gị.

Ememe olili ozu na-emeghekarị ohere maka ihe otu onye edemede kpọrọ “iji ákwà ezi ozi.” Iru újú a na-enwe n’oge ahụ, na-akpali iche echiche banyere ndụ n’ezie. N’ihi ya, ihe ndị a na-ese n’ákwà ndị a na-eyi mgbe a na-eli ozu na-ebu ozi ndị dabeere n’ihe ndị e kwesịrị ichebara echiche. Dị ka ihe atụ, ákwà na-egosi ubube ma ọ bụ steepụ na-eme ka e cheta ilu, bụ́ “Nanị otu onye adịghị arị ubube ọnwụ.”  * Nke a na-eme ka mmadụ nile mata mkpa ọ dị ile onwe ha anya n’ụzọ obi umeala, ọ bụghịkwa ibi ndụ dị ka a ga-asị na ha agaghị anwụ anwụ.—Eklisiastis 7:2.

N’etiti ndị Akan, ndị ozi ma ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị eze ọdịnala na-abụ ndị nwere nnọọ nkà n’ịtụ ilu, ha na-ejikwa mkpọ ndị a tụrụ atụ, bụ́ ndị na-egosi ụfọdụ n’ime ihe ndị mmadụ ji akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, nnụnụ ji agwọ n’isi bụ ngosipụta e gburu nkenke nke ilu, bụ́ “Ọ bụrụ na i jide agwọ n’isi, ahụ́ ya ndị ọzọ bụ eriri nkịtị.” Gịnị bụ echiche dị na ya? Jiri mkpebisi ike mee ihe maka nsogbu ọ bụla—n’alaghị azụ.

Iji Ilu Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Dịkwa ka ọ dị n’ihe atụ ọ bụla, mgbe na otú e kwesịrị isi tụọ ilu na-adabere ma n’ihe a na-ekwu ma ná ndị a na-agwa okwu. Ịtụjọ ilu pụrụ ime ka ihe a na-ekwu gharazie inwe mmetụta kwesịrị ekwesị. Ebe ọ bụkwa na iji ilu eme ihe n’ọdịbendị ụfọdụ bụ akụkụ dị mkpa nke ụzọ ikwu okwu nke a na-anabata n’ụzọ ọdịnala, iji ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ ime ka ndị mmadụ lewa onye na-ekwu okwu anya n’ụzọ na-adịghị mma.

Na Ghana, a na-ewere ndị okenye obodo dị ka ndị nchepụta na ndị nchekwa nke ilu. Ya mere, tupu a tụọ ilu, a na-ebu ụzọ kwuo, sị, “Ndị ichie na-asị . . . ” Mgbe onye na-ekwu okwu na-agwa ndị meworo nnọọ okenye karịa ya okwu, ọ bụ ihe nkwanye ùgwù ma o buru ụzọ kwuo, sị, “Ọ bụ unu bụ́ ndị ichie na-asị . . ,” tupu ọ tụọ ilu. Iji kwanyere ha ùgwù, onye na-ekwu okwu, nke bụ́ nwata karịa ndị ọ na-agwa okwu agaghị achọ ime ka e lee ya anya dị ka onye na-anwa ịkụziri ndị okenye okwu amamihe ndị dị n’ilu ya.

Ụfọdụ Okwu Ndị Kwesịrị Ịrịba Ama

A pụrụ ịtụ ilu tupu e wepụta ihe a na-ekwu banyere ya ma ọ bụ mgbe e wepụtasịrị ya. Ọzọkwa, a pụrụ iji nkà tinye ya n’ihe a na-ekwu nke na ọ pụrụ ịchọ nghọta n’ebe mmadụ nọ iji mata na e ji ilu mee ihe n’okwu ahụ. Dị ka ihe atụ, onye Akan pụrụ ikwu banyere onye dị umeala n’obi nke hụrụ udo n’anya, sị: “Ọ bụrụ ma onye dị otú a, a gaghị anụ ụda égbè n’obodo a.” Nke a na-ezo aka n’ilu, bụ́ “Ọ bụrụ ma eju na mbe, a gaghị anụ ụda égbè n’ọhịa.” A na-ele anụ abụọ ahụ anya dị ka ndị dị umeala n’obi nakwa ndị na-adịghị eme oké ngosi, ha adịghịkwa achọ ịlụ ọgụ. Ndị nwere àgwà ndị a na-eme udo.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọọ ka onye Akan tụọ ọtụtụ ilu n’otu mgbe, ọ pụrụ nanị iji otu ilu zaghachi gị, “A dịghị arọ nrọ ma e highị ụra.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmadụ apụghị ịtụ ilu na nkịtị dị ka mmadụ na-apụghị ịrọ nrọ mgbe ọ mụ anya. Ọnọdụ na-ekpebi ilu a ga-atụ na mgbe e kwesịrị ịtụ ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 25 Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịkpọtụ uche na a na-ahụ ihe osise a n’ákwà nwere ụdị àgwà ọ bụla, ọ dịghị adị nanị ná ndị na-eji oji a na-ejikarị eme ememe olili ozu.