Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mpụ Ime Ihe Ike—N’ihi Gịnị Ka O Jizi Adịwanye Njọ?

Mpụ Ime Ihe Ike—N’ihi Gịnị Ka O Jizi Adịwanye Njọ?

Mpụ Ime Ihe Ike—N’ihi Gịnị Ka O Jizi Adịwanye Njọ?

FRANK na Gabriella nọ na-akpagharị n’ụsọ oké osimiri dị n’Oregon, U.S.A., n’oge ụtụtụ, na-ekiri mwapụta nke anyanwụ. Ha amatụdịghị na ọ dị ihe gaje ime. Minit ole na ole mgbe e mesịrị, ha abụọ nwụrụ, mmadụ nọ n’ebe dị nso gbaa ha égbè n’isi. À gbagburu ha iji bọọ ọ́bọ̀? Ka ọ̀ bụ n’ihi ekworo? Ọ dịghị nke ọ bụ. Onye gbagburu ha, bụ́ onye na-amaghịdị ha, mezuru ihe ọ chọsiworo ike ime—ịmara otú igbu mmadụ na-adị.

“Na Sunday bụ́ abalị 28 nke ọnwa April 1996, Martin Bryant mere ka Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa lekwasị ya anya site n’ime otu n’ime ihe ndị kasị tọọ ya ụtọ ná ndụ. Site n’ịgba onye ọ bụla o zutere égbè ka ọ na-agagharị n’obodo bụ́ Port Arthur, Tasmania, o nwetara obi ụtọ dị egwu na ike.” (Akwụkwọ bụ́ A Study of Our Decline, nke Philip Atkinson dere) O gbukwara mmadụ 35!

Otu nwoke dị afọ 65 nke laworo ezumike nká na Canada nọ na-agba ịnyịnya ígwè ya n’isi ụtụtụ dị ka ọ na-adị eme. Ka ọ gbaara na-aga, otu ọkwọ ụgbọala si n’azụ kụtuo ya ma hapụ ya ebe ahụ, ebe ọ maara na ọ pụrụ ịnwụwo. E sekpụụrụ ịnyịnya ígwè ya gbadaa n’ụzọ ahụ ruo ihe karịrị mita 700. Na mbụ, e chere na ọ bụ ihe ọghọm a kụtuo a gbalaga, ma nnyocha ndị e mekwuru gosiri na ọ bụ onye zuuru otu obere ụgbọala, nke ji ya na-agbagharị dị ka mkpori ndụ, kụturu ya. O doro anya na nkụtu ọ kụturu onye ahụ na-agba ịnyịnya ígwè so n’ime “ihe ụtọ ahụ na-akpali akpali.”

Ọ̀ Bụ Ụdị Mpụ Dị Iche?

Mpụ adịwo n’etiti anyị ruo ọtụtụ narị afọ, ma ụdị ndị a kpọtụrụ aha n’elu na-eme ka ndị mmadụ na-eti, sị: “Olee ihe mere ndị mmadụ ji akpa àgwà otú a? Olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi chetụdị echiche ime ihe dị otú ahụ?” Ọ bụ ezie na mpụ ndị a na-ahụkarị, dị ka izu ohi ma ọ bụ igwu wayo nwere ike ghara ịdọta uche ndị mmadụ, a na-enwewanye ụdị omume ndị na-adọta mmasị ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ ma na-eme ka ndị mmadụ na-agwa onwe ha, sị, ‘Nke a bụ ịwị ara! Gịnị ka ụwa a na-aghọ?’

Mpụ ndị a dị iche. Ha na-awụkarị akpata oyi n’ahụ́ ma na-egosipụta obi ịta mmiri. Dị ka ọ dị n’ihe atụ ndị dị n’elu, a na-emekarị ha megide ndị ọ na-adịghị ihe ha mere bụ́ ndị na-amaghịdị ndị ahụ na-akpa arụ ahụ. Tụkwasị na nke a, ọ dịghị eyikarị ka è nwere ihe ọ bụla doro anya e bu n’obi mee mpụ ihe ike ndị a. E nwere imerime mpụ na-enweghị isi na ọdụ e meworo.

N’April 1999 na Colorado, U.S.A., ụmụ akwụkwọ 2 gbagburu ụmụ akwụkwọ 12 na otu onye nkụzi tupu ha agbagbuo onwe ha n’otu ụlọ akwụkwọ. Otu nwoke nwụrụ na California n’afọ 1982 mgbe ọ ṅụsịrị ọgwụ ọ zụtara n’ụlọ ahịa bụ́ nke mmadụ tinyere nsí òké. N’afọ 1993, ụmụntakịrị nwoke abụọ dịcha afọ iri ratara James Bulger nke dị afọ abụọ isi n’ụlọ ahịa dị na Bootle, Merseyside, England, bụ́ ebe nne ya nọ n’ebe a na-ere anụ, pụta. Ha duuru ya gbadaa otu ụzọ ụgbọ okporo ígwè ma were okpiri kụgbuo ya.

A pụrụ ịkpọ mpụ ụfọdụ iyi ọha egwu, dị ka mgbe a gbanyere nsí n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị n’okpuru ala nke Tokyo n’afọ 1995. Akpata oyi wụrụ ndị Japan n’ahụ́, mgbe ndị òtù nzuzo gbanyere nsí gas n’otu ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị n’okpuru ala nke Tokyo, gbuo mmadụ 12 ma merụọ ọtụtụ puku mmadụ ahụ́. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole pụrụ ichefu mbibi e bibiri Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York nakwa mwakpo e mere na Pentagon, dị na Washington, D.C., bụ́ nke ihe dị ka mmadụ 3,000 nwụrụ na ya, nakwa bọmbụ a tụrụ n’afọ gara aga na Bali, Indonesia, bụ́ nke gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 200.

O doro anya na mpụ ime ihe ike ndị dị otú ahụ abụrụwo nke a na-ahụ n’ebe nile. Nsogbu ahụ zuru ụwa ọnụ, na-emetụta ọtụtụ mba na ụdị mmadụ dị iche iche.

N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ na-afọdụ nke nta ka o yie ka ndị na-akpa arụ ndị a hà na-amarịta aka, na-anwa ịhụ onye pụrụ ịkpa arụ kasị awụ akpata oyi n’ahụ́. Ọzọkwa, mpụ ndị ịkpọasị na-akpata na-ejupụtawanye n’ebe nile. A na-eme mpụ arụrụala a megide ndị nanị “iwu ha dara” bụ na ha si n’agbụrụ, ma ọ bụ n’okpukpe dị iche—dị ka ọ dị n’afọ 1994 mgbe e gburu ihe dị ka ndị Tutsi 800,000 na Rwanda.

Ihe a nile na-eme ka ọtụtụ ndị na-eche, sị: ‘Gịnị na-emedị? Ọ̀ bụ otú a ka ọ dịbu? Olee ihe ndị pụrụ ịdị na-akpata ime mpụ ndị na-emenye egwu otú a? È nwere olileanya ọ bụla dịnụ maka ibelata ma ọ bụ ịkwụsị mpụ obi ịta mmiri ndị a?’ Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

A na-emekarị mpụ ihe ike megide ọtụtụ mmadụ dịgasị iche iche, ọ dịghịkwa ebumnobi doro anya a na-eji eme ya