N’ihi Gịnị Ka E Ji Enwe Ọtụtụ Mpụ Ime Ihe Ike Ugbu A?
N’ihi Gịnị Ka E Ji Enwe Ọtụtụ Mpụ Ime Ihe Ike Ugbu A?
MPỤ nile dị njọ. Ma mpụ ndị na-enweghị isi ma ọ bụ ndị na-enweghị nzube ọ bụla e ji mee ha, na-aka esi ike nghọta. Eziokwu ahụ bụ́ na a dịkarịghị enwe ihe ọ bụla doro anya e bu n’obi mee ha na-eju ndị nchọpụta anya. Ka usoro mgbasa ozi na-adịwanye irè karị n’afọ ndị a, ọtụtụ nde, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ ijeri mmadụ na-anụ banyere mpụ ndị dị otú ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ime awa ole na ole. Akụkọ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa bipụtara na-ekwu na “ọ dịghị kọntinent, ọ dịghị mba ime ihe ike na-adịghị emetụta, ọ bụ ógbè ole na ole ka ọ na-adịghị emetụta.”
Ọbụna ebe ndị e leburu anya dị ka ebe ndị na-adịchaghị ize ndụ n’afọ ndị gara aga, abụrụwo ndị e nwere ọtụtụ mpụ na-enweghị isi na ọdụ na ha na nso nso a. Dị ka ihe atụ, ruo ogologo oge, Japan nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke mpụ ime ihe ike. Otú ọ dị, n’Ikeda, na June 2001, otu nwoke nke ji mma igbu anụ banyere n’otu ụlọ akwụkwọ wee malite ịma na igbu ndị mmadụ mma. N’ime minit 15, o gburu ụmụaka 8 ma merụọ 15 ndị ọzọ ahụ́. E were nke a tinyere akụkọ ndị ọzọ sitere Japan, dị ka ndị a kọrọ banyere ndị na-eto eto gburu ndị ha na-amatụghị ma ọlị nanị iji nwee mkpali, mmadụ na-aghọta n’ụzọ doro anya na ihe agbanweela.
Ọbụna ná mba ndị nọworo na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ mpụ dị elu, mpụ ụfọdụ na-enweghị isi na ọdụ awụwo ọha na eze akpata oyi n’ahụ́. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị mgbe a wakposịrị Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York na September 11, 2001. Ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ bụ́ Gerard Bailes kwuru, sị: “Ọ na-eme ka ụwa ghọọ ebe na-edoghị anya, ebe dị ize ndụ nke anyị na-apụghị ikwu ihe na-aga ime na ya.”
N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Eme Ya?
Ọ dịghị otu isi ihe na-egosi ihe mere e ji eme ụdị nile dị iche iche nke ihe ike ndị na-enweghị isi na ọdụ. Ọ bụ n’ihi enweghị isi na ọdụ ha na-eme ka mpụ ụfọdụ sikwuo ike nghọta. Dị ka ihe atụ, o siri ike ịghọta ihe mere mmadụ ga-eji gakwuru ndị ọ na-amaghị ma ọlị ma magbuo ha ma ọ bụ ihe mere mmadụ ga-eji gbafewa otu ụlọ ma malite ịgba égbè na ya aghara aghara.
Ụfọdụ ndị na-asị na ime ihe ike bụ ihe mmadụ bu pụta ụwa. Ndị ọzọ na-ekwu na a pụghị
ikwu na mpụ ndị na-enweghị isi bụ akụkụ a na-apụghị izere ezere nke ebumpụta ụwa.—Lee igbe bụ́ “Ime Ihe Ike Ọ̀ Bụ Ihe E Bu Pụta Ụwa?”Ọtụtụ ndị ọkachamara kweere na e nwere ọtụtụ ihe na ọnọdụ ndị na-akpali ụmụ mmadụ ime mpụ ihe ike ndị ezi uche na-adịghị na ha. Otu akụkọ nke Ụlọ Ọrụ FBI (Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti nke Na-eme Nchọpụta) bipụtara na United States ruru n’ókè nke ikwu, sị: “Igbu ọchụ abụghị omume nke onye anya doro, nke isi dị mma.” Ndị ọkachamara ụfọdụ agaghị anabata okwu ndị e ji mee ihe n’ahịrịokwu ahụ. Otú o sina dị, ọtụtụ ndị na-ekwenyere echiche okwu ndị ahụ na-enye. N’ihi ihe ụfọdụ, echiche nke ndị na-eme mpụ ndị na-enweghị isi na ọdụ ezughị okè. Ọ dịwo ihe metụtara echiche ha ruo n’ókè nke ime ihe ndị jọgburu onwe ha. Olee isi ihe ndị na-eso akpali ndị mmadụ ime ihe ndị dị otú ahụ? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ndị ọkachamara kwuru pụrụ ịkpata ya.
Ndakpọ nke Ndụ Ezinụlọ
Otu onye edemede Teta! jụrụ Marianito Panganiban, bụ́ ọnụ na-ekwuchitere Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti nke Na-eme Nchọpụta na Philippines ajụjụ banyere ụzọ e si zụlite ndị na-eme mpụ ndị jọgburu onwe ha. O kwuru, sị: “Ha na-esi n’ezinụlọ ndị tisara etisa. Ọ dịghị onye na-elekọta ha ma ọ bụ na-egosi ha ịhụnanya. E nwere ndakpọ nke ikike ime ihe ọma nke ndị mmadụ n’echiche bụ́ na ọ dịghị onye na-eduzi ha, ha ewee kpafuo.” Ọtụtụ ndị nnyocha na-enye echiche na ndị omempụ na-eme ihe ike na-esitekarị n’ezinụlọ ndị na-enweghị mmekọrịta chiri anya nakwa n’ezinụlọ ndị a na-eme ihe ike na ha.
Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti Maka Nnyocha nke Mpụ Ime Ihe Ike na United States wepụtara otu akụkọ nke depụtara ihe ndị a pụrụ iji mata ndị ntorobịa pụrụ ime ihe ike na-akpata ọnwụ n’ụlọ akwụkwọ. A gụnyere ihe ndị na-esonụ bụ́ ndị metụtara ezinụlọ: mmekọrịta na-adịghị mma nke nne ma ọ bụ nna na nwa ya, ndị nne na nna na-enweghị ike ịmata nsogbu ụmụ ha nwere, akpachighị anya, ndị nne na nna akparaghị omume nwatakịrị ókè, na ụmụaka na-anọkarịrị onwe ha, ndị na-ebi ụdị ndụ abụọ wee na-ezochiri nne na nna ha ụfọdụ n’ime ụzọ ndụ ha.
Taa, ọtụtụ ụmụaka si n’ezinụlọ ndị tisara etisa. Ndị ọzọ nwere ndị nne na nna na-adịghị ewepụta oge ọ bụla iso ha nọkọọ. Ọtụtụ puku ndị ntorobịa etolitewo n’enweghị nduzi omume na nduzi ezinụlọ dị otú ha kwesịrị. Ndị ọkachamara ụfọdụ na-eche na gburugburu ebe dị otú ahụ pụrụ ime ka ụmụaka ghara ịzụlite ikike nke isoro ndị ọzọ na-akpakọrịta nke ọma, wee si otú ahụ na-eme ka ọ dịrị ha mfe karị ime mpụ megide mmadụ ibe ha, ọtụtụ mgbe n’egosighị mwute ọ bụla.
Òtù Ndị Na-akwalite Ịkpọasị na Òtù Nzuzo Dị Iche Iche
Ihe àmà na-egosi na òtù ụfọdụ na-akwalite ịkpọasị ma ọ bụ òtù nzuzo ụfọdụ enwewo mmetụta
siri ike n’ịkpata ime mpụ ụfọdụ. N’Indiana, U.S.A., otu nwa okorobịa isi ojii dị afọ 19 ji ụkwụ si n’otu ụlọ ahịa na-ala n’ebe obibi ya. Obere oge mgbe e mesịrị, a gbanyere ya mgbọ égbè n’ụbụrụ o wee tọgbọrọ n’akụkụ okporo ámá. Ọ bụ otu nwa okorobịa nke họọrọ ya n’etiti ọtụtụ ndị, gbara ya égbè. N’ihi gịnị? A kọrọ na ogbu ọchụ ahụ chọrọ ka a nabata ya n’òtù kweere na ndị ọcha ka ndị isi ojii mma nakwa ka e gbuo ya egbugbu ọnyà ududo maka igbu onye isi ojii.Mwakpo e ji gas na-akpaghasị ịrụ ọrụ nke akwara mee n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị n’okpuru ala na Tokyo na 1995; ogbugbu ndị mmadụ gburu onwe ha n’ìgwè na Jonestown, Guyana; na ọnwụ nke mmadụ 69 so n’òtù Order of the Solar Temple nwụrụ na Switzerland, Canada, na France bụcha ndị ndị òtù nzuzo kpatara. Ihe atụ ndị a na-egosi mmetụta siri ike nke òtù ụfọdụ nweworo n’echiche ndị ụfọdụ. Ndị ndú na-adọrọ adọrọ emewo ka ndị mmadụ mee ihe ndị “jọgburu onwe ha” site n’iji abamuru a sịrị ha ga-enweta na ya rata ha.
Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi na Ime Ihe Ike
Ụfọdụ ndị na-arụtụ aka n’ihe àmà na-egosi na ụdị dị iche iche nke nzirịta ozi ọgbara ọhụrụ pụrụ iso na-akpata ime ihe ike. A sịrị na ikiri ime ihe ike ndị a na-egosi na telivishọn, n’ihe nkiri sinima, n’egwuregwu vidio, nakwa n’Intanet ugboro ugboro, na-eme ka akọ na uche gharazie inwe mmetụta ma na-akpali mpụ ime ihe ike. Dr. Daniel Borenstein, bụ́ president nke Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Uche n’America, kwuru, sị: “N’oge a, e nwere ihe karịrị 1,000 nnyocha ndị e jiworo ihe karịrị afọ 30 mee, bụ́ ndị na-egosi na e nwere ihe jikọrọ ime ihe ike ndị a na-egosi n’usoro mgbasa ozi na àgwà ime ihe ike nke ụmụaka ụfọdụ.” Dr. Borenstein gbara akaebe n’ihu Kọmitii Ndị Ome Iwu nke United States, sị: “Anyị kwenyesiri ike na ikiri ime ihe ike a na-egosi dị ka ihe ntụrụndụ ugboro ugboro n’ụdị ya nile na-enwe nnọọ mmetụta na-adịghị mma n’ahụ́ ike ọha na eze.”—Lee igbe bụ́ “Ime Ihe Ike n’Egwuregwu Kọmputa—Uche Otu Dọkịta.”
A na-ezokarị aka n’ihe ụfọdụ meworonụ kpọmkwem iji gosi na nke a bụ eziokwu. N’ihe banyere nwoke ahụ obi tara mmiri nke gbagburu di na nwunye nọ n’ụsọ mmiri na-ekiri mwapụta nke anyanwụ, bụ́ nke e kwuru banyere ya n’isiokwu bu ụzọ, ndị wegara okwu ahụ n’ụlọikpe gosiri ihe akaebe na-egosi na ọ bụ ikiri ihe nkiri sinima na-egosi ime ihe ike ugboro ugboro kpatara ọchụ ahụ e gburu iji nwee mkpali. N’ọgbụgba égbè ahụ e gburu mmadụ 15 na ya, a sịrị na ụmụ akwụkwọ
abụọ kpara arụ ahụ ejiwo ọtụtụ awa kwa ụbọchị na-egwu egwuregwu vidio ndị na-egosi ime ihe ike. Tụkwasị na nke a, ha kiriri ihe nkiri ugboro ugboro, bụ́ ebe ndị a na-egosi ime ihe ike na igbu ọchụ dị ka omume ndị dike.Ọgwụ Ọjọọ
Na United States, ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị nọ n’afọ iri na ụma gburu rịrị elu okpukpu atọ n’ime afọ asatọ. Gịnị ka ndị ọkachamara na-arụtụ aka na ọ bụ otu n’ime isi ihe ndị na-akpata ya? Ọ bụ òtù ndị omempụ, karịsịa òtù ndị omempụ na-ese cocaine. N’ime ihe karịrị mmadụ 500 e gburu na nso nso a na Los Angeles, California, “ndị uwe ojii kwuru na ọ bụ ndị òtù ndị omempụ kpatara pasent 75 n’ime ha.”
Otu akụkọ Ụlọ Ọrụ FBI bipụtara na-ekwu, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị na-egbu ọchụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe.” Ụfọdụ ndị ọgwụ ọjọọ kpaghasịworo echiche ha na-adị egbu ọchụ mgbe ọgwụ ọjọọ ji ha aka. Ndị ọzọ na-eme ihe ike iji chebe ojiji ha ji ọgwụ ọjọọ eme ihe. N’ụzọ doro anya, ọgwụ ọjọọ bụ ihe dị ike na-akpali ndị mmadụ ịkpa arụ ndị jọgburu onwe ha.
Ịdị Mfe nke Inweta Ngwá Ọgụ Ndị Na-ebibi Ihe
Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, otu nwoke nọ na Tasmania, Australia, nke nanị ya na-aga, gbagburu mmadụ 35. O merụrụ mmadụ 19 ndị ọzọ ahụ́. Nwoke ahụ bu ngwá ọgụ na-awụ mgbọ bụ́ nke yiri nke ndị agha. Nke mere ka ọtụtụ ndị kwubie na ịdị mfe nke inweta ngwá ọgụ ndị dị otú ahụ bụ ihe ọzọ so akpata ịrị elu nke mpụ ime ihe ike.
Otu akụkọ na-egosi na e nwere nanị mmadụ 32 ndị e ji égbè gbagbuo na Japan n’afọ 1995, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime ha bụ ndị nọ n’òtù ndị omempụ bụ́ ndị ndị nọ n’òtù ndị omempụ ọzọ gburu. N’ụzọ dị iche, United States nwere ọnụ ọgụgụ karịrị mmadụ 15,000 e ji égbè gbagbuo. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche ahụ? Ụfọdụ ndị ekwuwo na ọ bụ n’ihi iwu siri ike Japan tiri maka inwe égbè.
Ndị Mmadụ Anagidelighị Ihe
Mgbe ụfọdụ ndị nụrụ banyere mpụ ndị jọgburu onwe ha, ha pụrụ imeghachi omume site n’ikwu, sị, ‘Ara na-agba onye ahụ!’ Otú ọ dị, ọ bụghị
mmadụ nile na-eme mpụ ndị dị otú ahụ ka isi mebiri. Ma, ụfọdụ ndị na-enwe ihe isi ike n’ịnagide ihe ndụ na-eweta. Ndị ọkachamara na-arụtụ aka ná ntụpọ nke àgwà bụ́ ndị pụrụ iduga mmadụ n’ime ihe ndị dị otú ahụ jọgburu onwe ha. Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ha: enweghị ikike ịmụ ihe na iso ndị ọzọ na-akpakọrịta; mmetụta na-adịghị mma nke mmetọ anụ ahụ́ ma ọ bụ n’ụzọ mmekọahụ; àgwà ndị na-emebi mmekọrịta mmadụ na ibe ya; ịkpọ ìgwè mmadụ ụfọdụ asị, dị ka ndị inyom; enweghị mwute mgbe a na-eme ihe ọjọọ; na ọchịchọ nke ịchịkwa ndị ọzọ.Ihe ọ sọrọ nsogbu ha ya bụrụ, ụfọdụ ndị na-abụ ndị ihe isi ike ha rikpuru nnọọ nke na ọ na-akpaghasị echiche ha, nke a pụkwara ime ka ha kpaa arụ ndị na-ekweghị nghọta. Otu bụ banyere otu nọọsụ nke chọsiri nnọọ ike ịdọta mmasị n’onwe ya. Ọ gbara ụmụntakịrị ọgwụ na-akụnwụ uru ahụ́ bụ́ nke mere ka ha kwụsị iku ume. Mgbe ahụ, o nwere obi ụtọ dị ukwuu ná mmasị e gosiri ya ka ọ “na-azọpụta” nwata nke ọ bụla. N’ụzọ dị mwute, o melighị ka ha nile maliteghachi iku ume. A mara ya ikpe igbu ọchụ.
Site n’ihe ndị e kwuworo, o doro anya na e nwere ihe ndị na-ejikọ aka akpali ndị mmadụ ime mpụ ihe ike. Otú ọ dị, ndepụta anyị agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na anyị atụleghị otu isi ihe ọzọ dị nnọọ mkpa.
Azịza Bible
Bible na-enyere anyị aka ịghọta ihe na-eme ugbu a nakwa ihe mere ndị mmadụ ji eme omume n’ụzọ ndị dị otú ahụ jọgburu onwe ha. Ọ na-akọwa n’ụzọ ziri ezi àgwà ndị anyị na-ahụkarị. Dị ka ihe atụ, ndepụta dị na 2 Timoti 3:3, 4 na-ekwu na ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-enweghị obi mmadụ” nakwa na ha ga-abụ “ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe,” na “ndị isi ike.” N’akwụkwọ Bible ọzọ, e hotara ihe Jizọs kwuru, sị: “Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.”—Matiu 24:12.
Bible na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” (2 Timoti 3:1) Ee, ihe anyị na-ahụ bụ ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi ná ngwụsị nke usoro ihe a. Ọnọdụ ndị e nwere ugbu a, tinyere àgwà ụmụ mmadụ, na-akawanye njọ. Ànyị pụrụ ịtụ anya ihe ngwọta dị ngwa? Bible na-aza, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ.”—2 Timoti 3:13.
Nke a ọ̀ pụtara na ihe a kpọrọ mmadụ tọrọ atọ n’usoro ime ihe ike na mpụ na-enweghị ngwụsị nke na-arịwanye elu? Ka anyị tụlee ajụjụ ahụ n’isiokwu anyị na-esonụ.
[Igbe dị na peeji nke 6]
IME IHE IKE Ọ̀ BỤ IHE E BU PỤTA ỤWA?
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọchịchọ ime ihe ike ma ọ bụ igbu ọchụ bụ ihe ụmụ mmadụ ketara eketa. Ndị na-akwado ozizi evolushọn anọgidewo na-ekwu na anyị sitere n’ụmụ anụ ọhịa, nakwa na anyị ketara àgwà nke ime ihe ike ha. Echiche dị otú ahụ ga-apụta na anyị tọrọ atọ n’usoro ime ihe ike na-enweghị nkwụsị bụ́ nke a na-enweghị olileanya ọ bụla na anyị ga-esi na ya nwere onwe anyị.
Otú ọ dị, e nwere ihe àmà dị ukwuu na-egosi na ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Echiche ndị a kpọtụrụ uche n’elu adịghị akọwa ihe mere e ji enwe ọ̀tụ̀tụ̀ na ụdị dịgasị nnọọ iche iche nke ime ihe ike site n’otu ọdịbendị gaa n’ọzọ. Ha adịghị egosi ihe mere ndị mmadụ na-eji emeghachikarị omume site n’ime ihe ike n’ọdịbendị ụfọdụ, ebe a na-enwe nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ime ihe ike ná mba ndị ọzọ, nke na-afọdụ nke nta ka a ghara inwe igbu ọchụ ọ bụla. Onye na-agwọ ọrịa mmetụta uche bụ́ Erich Fromm kpughere ntụpọ ndị dị n’echiche ahụ bụ́ na anyị ketara ime ihe ike n’aka ụmụ anụmanụ site n’ikwu na ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe ike n’ihi mkpa anụ ahụ́ ha ma ọ bụ iji chebe onwe ha, ọ bụ nanị ụmụ mmadụ ka a maara na-egbu ọchụ nanị iji nweta mkpali.
N’akwụkwọ ha bụ́ The Will to Kill—Making Sense of Senseless Murder, ndị Prọfesọ bụ́ James Alan Fox na Jack Levin na-ekwu, sị: “Ọ na-adịkarị mfe mmadụ ụfọdụ ime ihe ike karịa ndị ọzọ, ma ha ka nweere onwe ha ime mkpebi. Ọchịchọ nke igbu ọchụ, ọ bụ ezie na ọ bụ ikike dị ukwuu ndị dị n’ime na ndị sitere n’ebe ọzọ na-achịkwa ya, ka na-agụnye nhọrọ na mkpebi mmadụ, nke ahụ sikwa otú ahụ na-eme ka ha bụrụ ndị ga-aza ajụjụ na ndị ụta dịịrị.”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
IME IHE IKE N’EGWUREGWU KỌMPUTA—UCHE OTU DỌKỊTA
Dr. Richard F. Corlin, onye bụbu president nke Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America, gwara ìgwè ndị dọkịta na-agụsị akwụkwọ na Philadelphia, Pennsylvania, U.S.A., okwu. N’okwu ahụ, o kwuru banyere egwuregwu kọmputa ndị na-akwado ime ihe ike. N’ụfọdụ n’ime egwuregwu ndị a, a na-enye onye merụrụ mmadụ ahụ́ akara ụfọdụ, nye onye gbara mmadụ égbè n’ahụ́ akara ka ukwuu, nyekwa mmadụ ọbụna akara karịrị nke ahụ maka ịgba mmadụ égbè n’isi. Ọbara na-agbapụta, ụbụrụ efesasịakwa ebe nile.
Dr. Corlin kwuru na a dịghị ekwe ka ụmụaka kwọọ ụgbọala, a dịghị ekwe ka ha ṅụọ mmanya ndị na-aba n’anya, a dịghịkwa ekwe ka ha see siga mgbe ha ka dị nnọọ obere. O kwuziri, sị: “Ma anyị na-ekwe ka ha bụrụ ndị a zụrụ ịgba égbè n’afọ ndụ ha na-amụtabeghị ịchịkwa mkpali ha, mgbe ha na-etozubeghịkwa okè ma ọ bụ nwee ọzụzụ onwe onye iji jiri ngwá ọgụ ndị ahụ ha ji egwuri egwu mee ihe n’ụzọ na-adịghị ize ndụ. . . . Ọ dị mkpa ka anyị site ná mmalite kụziere ụmụ anyị na ime ihe ike nwere ihe ndị na-esi na ya apụta—ihe ndị na-adịghị mma na-esi na ya apụta—mgbe nile.”
N’ụzọ dị mwute, kama ụmụaka ịbụ ndị a kụziiri na e nwere ihe ndị na-esite n’ime mpụ apụta, ọ bụ ha, bụ́ ndị ọ na-adịghị ihe ha mere, ka mpụ ihe ike na-emetụtakarị. Ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na a na-eji égbè agbagbu ụmụaka iri kwa ụbọchị na United States. Dr. Corlin na-ekwu, sị: “United States gbara ndị mbụ n’ụwa—n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka ndị a na-eji égbè agbagbu.” Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Iji égbè eme ihe ike bụ ihe ize ndụ n’ahụ́ ike nke ndị mba anyị. Nke a bụ eziokwu.”
[Igbe dị na peeji nke 9]
IHE NDỊ NA-ESO AKPATA MPỤ IME IHE IKE
Ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na ihe ndị na-esonụ pụrụ iso kpata mpụ ndị na-enweghị isi:
Ndakpọ ezinụlọ
Òtù ndị na-akwalite ịkpọasị, ndị na-emebiga ihe ókè
Òtù nzuzo ndị dị ize ndụ
Ime ihe ike n’ihe nkiri
Ikiri ebe a na-eme ihe ike n’ìhè
Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe
Anagidelighị nsogbu
Ịdị mfe nke inweta ngwá ọgụ ndị na-ebibi ihe
Ụdị ọrịa uche ụfọdụ
[Foto dị na peeji nke 8]
Otu n’ime bọmbụ ndị a tụrụ bụ́ nke gburu ma ọ dịkarịa ala mmadụ 12 ma merụọ ihe karịrị mmadụ 80 ndị ọzọ ahụ́, Quezon City, Philippines
[Ebe E Si Nweta Foto]
AP Photo/Aaron Favila December 30, 2000
[Foto dị na peeji nke 8]
Ụmụ akwụkwọ abụọ gburu otu onye nkụzi, ụmụ akwụkwọ 12, nakwa onwe ha na Columbine High School, Colorado, U.S.A.
[Ebe E Si Nweta Foto]
AP Photo/Jefferson County Sheriff’s Department April 20, 1999
[Foto dị na peeji nke 8, 9]
Bọmbụ e tinyere n’obere ụgbọala gburu ma ọ dịkarịa ala mmadụ 182 ma merụọ mmadụ 132 ahụ́ n’otu ụlọ oriri na nkwari abalị dị na Bali, Indonesia
[Ebe E Si Nweta Foto]
Maldonado Roberto/GAMMA October 12, 2002