Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwee Ngwụsị Izu Dị Ụtọ!

Nwee Ngwụsị Izu Dị Ụtọ!

Nwee Ngwụsị Izu Dị Ụtọ!

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-atụ anya ya, mgbe o rukwara, ọ na-abụkarị akụkụ kasị ụtọ n’izu. Ụfọdụ ndị na-eme njem na ya, ụfọdụ na-egwuri egwu na ya, ụfọdụ na-efe ofufe na ya, ndị ọzọkwa na-anọ n’ụlọ ma hie ụra na ya.

Anyị na-ekwu banyere oge ahụ na-adị n’agbata njedebe nke otu izu ọrụ (ma ọ bụ izu ụlọ akwụkwọ) na mmalite nke ọzọ—ngwụsị izu! N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ngwụsị izu na-amalite na Friday ruo Sunday. Ma olee ebe echiche nke ngwụsị izu sitere? Ọ bụrụkwa na i bi ebe a na-enwekarị ụbọchị ọrụ ise n’izu, olee ụzọ ndị ị pụrụ isi jiri ngwụsị izu mee ihe n’ụzọ bara uru?

Site n’Ụbọchị Izu Ike Gaa ná Ngwụsị Izu

Iwu Ụbọchị Izu Ike ndị e nyere mba Izrel n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga kwuru, sị: “Ụbọchị isii ka a ga-eje ozi; ma n’ụbọchị nke asaa ụbọchị izu ike nke idebe ụbọchị izu ike dị, ọ bụ ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bụla nke na-eje ozi n’ụbọchị izu ike, a ghaghị ime ka ọ nwụọ.” (Ọpụpụ 31:15) Ụbọchị Izu Ike bụkwa ohere ụmụ Izrel bụ́ ndị nne na nna nwere iji lebara mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha anya.

Ụbọchị Izu Ike ndị Juu na-esite na mgbe anyanwụ dasịrị na Friday ruo mgbe anyanwụ dasịrị na Saturday. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, “ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst mere ka ụbọchị Sunday bụrụ ụbọchị pụrụ iche maka ofufe, n’ihi na ha kweere na Jizọs bilitere n’ọnwụ n’ụbọchị ahụ. Ka ọ na-erule n’afọ ndị sochiri A.D. 300, ma ndị chọọchị ma ndị ọchịchị nabatara ya dị ka ụbọchị izu ike na Europe.”

Ọ dị mma ịmara na mgbatị a gbatịrị oge izu ike ahụ ịkarị nanị otu ụbọchị ka malitere nnọọ ọhụrụ. Malite na Britain n’afọ ndị sochiri 1870, izu ọrụ na-abịa ná njedebe n’oge nri ehihie na Saturday. Ọkara ụbọchị ezumike ehihie ahụ na Sunday na-emejupụta ngwụsị izu. Ehihie Saturday na-eji oge nri ezinụlọ amalite, bụ́ nke, dị ka magazin bụ́ Atlantic Monthly si kwuo, “ịsa ahụ́ n’ụlọ ịsa ahụ́ dị n’agbata obi na-esochikarị.”

Na United States, a gbatịkwuru ngwụsị izu ọbụna karị, gaa n’ịbụ ezumike ụbọchị abụọ. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ọ bụ otu ụlọ ọrụ mmepụta ihe dị na New England malitere izu ọrụ nwere ụbọchị ise n’afọ 1908. Ma ndị Juu ma “Ndị Kraịst” na-arụ ọrụ nabatara ndokwa ahụ, ebe ọ bụ na ìgwè nke ọ bụla nwere ụbọchị izu ike nke ya—Saturday maka ndị Juu na Sunday maka “Ndị Kraịst.” Izu ọrụ ahụ nwere ụbọchị ise bịara bụrụ nke a ma ama n’egbughị oge. Onye na-arụpụta ụgbọala bụ́ Henry Ford kwalitere ya, ebe ọ bụ na o kwubiri n’ụzọ amamihe na ezinụlọ ime mkpapụ ná ngwụsị izu ga-eme ka ndị mmadụ chọọ inwekwu ụgbọala.

Ọ̀ Dị Ihe I Mere Atụmatụ Ime ná Ngwụsị Izu?

Taa, ngwụsị izu dị ụbọchị abụọ aghọwo ihe a ma ama ná ndụ ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọ bụrụ na i bi n’akụkụ ụwa ahụ, ka izu ọrụ ọ bụla na-abịa ná njedebe, o yikarịrị ka ndị ọrụ ibe gị hà ga-ajụ gị, sị, “Gịnị ka i mere atụmatụ ime ná ngwụsị izu?” Ajụjụ ahụ pụrụ ime ka i chewe banyere ihe ụfọdụ na-akpali akpali.

N’ịbụ onye onye were gị n’ọrụ chịkwara oge ya n’otu izu zuru ezu, ngwụsị izu pụrụ ịbụ ohere i nwere ịchịkwa ndụ gị. Ọ pụrụ ime ka i nwee nkwụsịtụ n’ihe ndị ị na-eme kwa izu. Ọ pụrụ ịbụ ohere i nwere izurutụ ike dị gị mkpa ma ọ bụ isoro ndị ị hụrụ n’anya nọrịa. Ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ nnọọ ịbụ ohere i nwere ikere òkè n’otu n’ime ihe mkpori ndụ kasị ewu ewu a na-enwe ná ngwụsị izu—iji ịga ahịa mere ihe ntụrụndụ. “Ịga site n’otu ụlọ ahịa ruo n’ọzọ atọgbuola onwe ya,” ka Brigitte, bụ́ onye bi na Germany, na-ekwu.

Nnyocha ndị e mere na-egosi na ọtụtụ mmadụ na-ahọrọ iji oge ntụrụndụ ha zuo ike. Nye ndị na-adịghị ahapụ ịnọ n’ụlọ ná ngwụsị izu, e nwere ọtụtụ ihe ndị ha pụrụ imegasị: ilekọta okooko osisi ndị dị n’ime ụlọ ma ọ bụ n’èzí, ịtụ kaadị, ịkpọ ma ọ bụ ige egwú, ikiri vidio, isi nri, ide akwụkwọ ozi, ịgụ akwụkwọ, ịkwa ákwà, ịkpa ihe, ime egwuregwu, na ise ihe, n’ịkpọtụ nanị ihe ole na ole aha. Ụfọdụ ndị na-ahọrọ ihe omume ndị ga-eme ka ha soro ụmụ ha na di ma ọ bụ nwunye ha mekọrịta ihe, dị ka igwu ludo, ịzụ okwe ma ọ bụ iti draft. *

Bible ọ̀ katọrọ mmadụ iji oge ya eme ihe ndị dị otú ahụ yiri ka ha adịghị mkpa? Ọ dịchaghị eme otú ahụ. Solomọn dere, sị: “Ọ dị mma, bụ́ otu njuaka n’izu ike, karịa njuaka abụọ n’ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:6) Ọ bụrụ na e meruo ha n’ókè kwesịrị ekwesị, egwuregwu, izu ike, na ntụrụndụ na-arụ ọrụ kwesịrị ekwesị n’ezie ná ndụ Onye Kraịst.

Imebiga Ihe Ókè

N’aka nke ọzọ, imebiga ọbụna ihe ọma ókè pụrụ ịrụpụta ihe na-adịghị mma ma ọ bụ mebie ihe. Dị ka ihe atụ, ọzụzụ nke ahụ́ nwere abamuru nke ya. (1 Timoti 4:8) Ma ọ na-afọdụ nke nta ka ụfọdụ ndị na-eme egwuregwu ná ngwụsị izu jiri ịnụ ọkụ n’obi yiri nke okpukpe na-eme egwuregwu. N’ịbụ ndị kpebisiri ike imeri site n’ịzụlite nkà ziri ezi, ụfọdụ na-etinye oge na ego dị ukwuu n’inweta ọzụzụ na ngwá egwuregwu ndị bụ́ ọkpọka.

E nwekwara ihe ize ndụ ahụ́ ike ndị dị na mmadụ ịmanye onwe ya ime ihe ndị ọ na-azụghị ahụ́ ya ime. Otu magazin akụkọ kọrọ banyere ndị katatụworo ahụ́ “na-eji ịnụ ọkụ n’obi eme egwuregwu nanị ná ngwụsị izu,” bụ́ ndị kpebisiri ike inweghachi ike ntorobịa, ma bụrụ ndị na-emesị nwee mmerụ ahụ́ na ahụ́ mgbu. Ndị ọzọ na-etinye ndụ na ahụ́ ha n’ihe ize ndụ site n’ime ihe ndị a sị na ha bụ egwuregwu ndị na-akpali akpali ma ọ bụ egwuregwu ndị dị ize ndụ. * Ya mere, ndụmọdụ Bible banyere “imeru ihe n’ókè” kwesịrị nnọọ ekwesị. (Taịtọs 2:2) Mmega ahụ́ kwesịrị ime ka e nwee ume ọhụrụ, ọ bụghị iweta ike ọgwụgwụ ma ọ bụ ihe ize ndụ.

N’ihi ya, ụfọdụ na-ahọrọ inwe mmega ahụ́ na-agabigaghị ókè. Dị ka ihe atụ, ịga ije na ịga mkpagharị na-ewu nnọọ ewu na Germany. N’ezie, otu ihe omume ntụrụndụ nke na-ewu nnọọ ewu na Europe bụ nke a na-akpọ ịga ije ịma aka. Mgbe ị na-eme ya, ọ bụghị ndị ọzọ ka ị ga na-anwa ịgbanahụ, kama ọ bụ oge. Ihe ọ pụtara bụ na ị ga-agacha otu ụzọ dị n’ime obodo n’oge a kara aka. Lee ụzọ magburu onwe ya nke isi enwe mmega ahụ́, n’otu oge ahụkwa na-ekiri ebe ndị mara mma ọ bụ! Ọ bụkwa ihe ezinụlọ n’ozuzu ya pụrụ ịnụ ụtọ ya.

Ngwụsị Izu Ndị Ihe Omume Karịrị Akarị na Ha

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ahazi ọtụtụ ihe omume n’otu ngwụsị izu nke na ha na-emesị nụ ụtọ nanị ole na ole ma ọ bụ gharadị ịnụ ụtọ nke ọ bụla n’ime ha. Mgbe izu ọhụrụ malitere, ha na-enwe nnọọ ike ọgwụgwụ kama inwe ume ọhụrụ. Magazin Germany bụ́ Focus kọrọ banyere otu nnyocha e mere bụ́ nke pasent 27 nke ndị a jụrụ ajụjụ na ya chọpụtara na ihe ndị ha mere iji tụrụ ndụ siri ike ma kpatara ha ike ọgwụgwụ.

“Ezumike bụ ihe na-echebe ime ihe n’ụzọ dị irè,” ka magazin bụ́ Time, kwuru. N’otu aka ahụ, Jizọs Kraịst ghọtara mkpa ọ dị anyị inwe ezumike na ntụrụndụ. Mak 6:31 na-akọ na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “‘Unu onwe unu, bịanụ nanị unu n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma zurutụ ike.’ N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị na-abịa ma na-ala, ha enweghịkwa oge izurutụ ike ọbụna iji rie nri.” N’ihi ya, ọ bụ ezie na mmega ahụ́, ịga ahịa, na ihe ndị yiri ha bara uru, ịhazi oge maka ịgụ akwụkwọ, izu ike, ma ọ bụ ihi ụra n’ụzọ ntụrụndụ pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ime ka i nwee ume ọhụrụ. Otú ọ dị, ọ dị ihe ọzọ pụrụ ime ka ị nụkwuo ụtọ ngwụsị izu ọ bụla.

Mkpa Ime Mmụọ

Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Otu n’ime nzube ndị e ji nwee Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ nwee ike igbo mkpa ime mmụọ ha. À pụrụ iji ngwụsị izu mezuo otu nzube ahụ taa? Tụlee ihe banyere Ndịàmà Jehova. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ọgbakọ ha na-enwe nzukọ Ndị Kraịst ha bụ́ isi na Saturday ma ọ bụ na Sunday. Ha na-ejikwa ngwụsị izu eme ihe maka mgbakọta ndị buru ibu karị, dị ka mgbakọ dị iche iche. Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-etinyekarị oge ná ngwụsị izu na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, na-esoro ndị agbata obi ha atụle Bible.

N’ezie, dịkwa ka onye ọ bụla ọzọ, Ndịàmà Jehova nwere ọrụ, ebe obibi, na ezinụlọ ndị ha ga-elekọta. N’ihi ya, mgbe o kwere mee, ha na-emekwa atụmatụ maka ihe omume ntụrụndụ maka onwe ha na maka ezinụlọ ha. Ma ha na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ. Ime otú ahụ ọ̀ na-aghọrọ ha ibu arọ? Tụlee ahụmahụ na-esonụ nke mmadụ ndị a.

Tupu ha aghọọ Ndịàmà, otu di na nwunye bụ́ ndị Germany aha ha bụ Jürgen na Doris na-eji ngwụsị izu ha enwe mmega ahụ́ n’ebe a na-eme egwuregwu. Melle na Helena jiri oge ha na-eme nleta n’ebe ndị a na-akpọsa ọrụ nkà. Nye otu nwoke aha ya bụ Helmut, ngwụsị izu bụ oge e ji apụ apụ iji kirie ihe ndị e kere eke. Otu nwanyị aha ya bụ Silvia na-ejikwa ngwụsị izu ya aga egwú disko. Otú ọ dị, kemgbe ha ghọrọ Ndịàmà Jehova, otú ha si enwe ntụrụndụ agbanwewo nke ukwuu.

Jürgen na Doris na-akọwa, sị: “Ihe omume ntụrụndụ anyị na-ewepụbu ịtụ ọ̀bọ̀, ma ị pụghị ikwu na ha mere ka ndụ anyị kawanye mma. N’ụbọchị ndị a, inyere ndị ọzọ aka ịghọta Bible na-eme ka ma ndụ ha ma nke anyị nwekwuo nzube.” Gịnị banyere Melle na Helena? “Bible na-enye nduzi maka ụzọ ndụ nke kasị mma, ịgwa ndị ọzọ banyere ya na-ewetakwa ọṅụ dị ukwuu.” N’ihi gịnị ka Helmut ji enweta afọ ojuju dị ukwuu ná ndụ ugbu a? “Amaara m na ihe m na-eme n’ozi a na-eje maka ọha dị mkpa nye Jehova,” ka ọ na-ekwu. Silvia na-ekwukwa, sị: “Ime nkwusa pụtara ịkpọtụrụ ndị mmadụ na inwe mkparịta ụka ndị na-akpali mmasị, ha abụọ na-amasịkwa m.”

Gịnị ma i soro Ndịàmà Jehova kwurịta okwu oge ọzọ ha ga-abịa na nke gị? Isoro otu onye n’ime ha nwee nkwurịta okwu dị mkpirikpi pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ n’ime ka ndụ gị nwekwuo nzube, ọ bụghị nanị ná ngwụsị izu kamakwa n’ụbọchị nile n’izu!

N’agbanyeghị ụzọ ị chọrọ isi nwee ntụrụndụ, mee ka ngwụsị izu gị bụrụ nke na-ewuli elu na nke na-enye obi ụtọ. Ọ bụrụ na i bi ná mba na-asụ asụsụ German, anyị na-asị gị “schönes Wochenende.” Ọ bụrụ na ị na-asụ asụsụ Spanish, mgbe ahụ, “¡Buen fin de semana!” Ọ bụrụ na ị bụ onye Ukraine, anyị pụrụ ikwu, sị, “Бажаю вам приємно провести вихідні.” Ebe ọ bụla i bi, ihe ọ bụla ị na-emekwa, nwee ngwụsị izu dị ụtọ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Iji nweta ihe ọmụma banyere ihe ize ndụ pụrụ ịdị n’egwuregwu electronic ụfọdụ, lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa Ma Ọ Bụ nke Vidio?” nke dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke August 22, 1996, nakwa usoro isiokwu bụ́ “Egwuregwu Electronic—È Nwere Ihe Ize Ndụ Dị na Ya?” nke dị ná mbipụta (Bekee) nke December 22, 2002.

^ par. 16 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Egwuregwu Ndị Na-akpali Akpali—M̀ Kwesịrị Ime Ha?” nke dị ná mbipụta (Bekee) nke July 8, 1994, nakwa “Ndị Na-achụso Ihe Omume Na-akpali Akpali—N’ihi Gịnị Ka Ihe A Na-egbu Egbu Ji Adọrọ Mmasị?” nke dị ná mbipụta (Bekee) nke October 8, 2002.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ngwụsị izu dị ụtọ bụ nke e ji zuo ike, tụrụ ndụ, ma mee ihe ime mmụọ n’ụzọ dị mma