Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Nagide Mgbe E Nwere Ọdachi?

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Nagide Mgbe E Nwere Ọdachi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Ụzọ M Pụrụ Isi Nagide Mgbe E Nwere Ọdachi?

“Gịnị mere ndị na-eyi ọha egwu ji gbuo nne m?” —Kevin. *

“[Tupu September 11], ana m enwebu mmasị ime njem n’ụzọ okpuru ala. Ugbu a ọ na-adị m ka m ga-anwụ n’ime ụzọ okpuru ala n’ihi na a ga-eji bọmbụ gbarie ya.”—Peter.

E GBURU nne Kevin mgbe a wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa nke dị na New York City na September 11, 2001. Oké ihe dị otú ahụ emeghị Peter, ma ihe ahụ merenụ metụtakwara ya nke ukwuu.

Otu akụkọ na-ekwu, sị: “Ọtụtụ puku ụmụaka ndị bi na New York na-agbaso nsogbu ụfọdụ nke uche ndị ha na-enwe n’ihi [mwakpo ahụ] weere ọnọdụ na September 11 mgba, ndị pụrụ ịdịgide nye ọtụtụ n’ime ha ruo mgbe ha toruru ogo mmadụ.” N’ụzọ na-akpata oké nchegbu, ‘ụmụaka ndị na-ebidebeghị Ebe Azụmahịa Ụwa ahụ ma ọlị nwekwara ihe àmà ndị na-egosi nsogbu mmetụta uche dịkwa ka ndị ji anya ha hụ mwakpo ahụ.’ *

A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ọdachi ndị ọzọ, dị ka bọmbụ ndị a na-atụ n’Izrel, bụ́ ndị na-egbu ma onye tụrụ ya ma ndị ọzọ nakwa ịgba égbè aghara aghara ndị na-ewere ọnọdụ n’ebe ndị ọzọ. Banyere ịgba égbè dị otú ahụ, otu onye ọkachamara n’ihe banyere uche mkpaghasị kwuru, sị: “Ọ bụrụgodị na [ụmụaka ahụ] bi maịl 2,000 [kilomita 3,219] site n’ebe ndị ahụ a gbara égbè, ihe ndị a ka pụkwara ime ka nchegbu [ha] ka njọ.”

Gịnị na-akpata ya? Mgbe e nwere ọdachi, a na-eme ka ndị na-eto eto na-ekiri ma ọ bụ na-anụ ọtụtụ akụkọ ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agbasa n’ezochighị ihe ọ bụla. A na-egosi onyinyo ndị na-emenye ụjọ nke ebe ndị na-eyi ọha egwu tụrụ bọmbụ, ịgba égbè n’ụlọ akwụkwọ na ọdachi ndị na-emere onwe ha ugboro ugboro, na-eme ka o siere ọtụtụ ndị ntorobịa ike iwepụ onyinyo ndị a n’uche ha. Ka a sịkwa ihe mere otu nnyocha e meere Bọọdụ Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ na New York ji kpughee, sị: “Ọnwa isii ka a kwatusịrị Ebe Azụmahịa Ụwa pasent 76 nke ụmụ akwụkwọ 8,266 na-aga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti ka na-echeta site n’oge ruo n’oge, mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere.”

Anyị bi n’ihe Bible kpọrọ “oge jọgburu onwe ya.” (2 Timoti 3:1-5, New International Version) Olee otú anyị pụrụ isi nagide mgbe e nwere ọdachi ndị na-emenye ụjọ? *

Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme

Otu ụzọ isi merie nsogbu mmetụta uche, bụ́ ndị yiri ka ha na-erikpu gị, bụ ikpali “ezi ikike iche echiche gị.” (2 Pita 3:1) Gbalịa ile ihe anya n’ụzọ ezi uche dị na ya, dị ka Chineke si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i chetara onwe gị na ọtụtụ ọdachi na-eme nanị n’ihi “mgbe na ihe ndapụta.” (Eklisiastis 9:11) Jizọs Kraịst nyere ihe atụ banyere nke a mgbe o kwuru banyere ọdịda nke otu ụlọ elu dị na Silom. Mmadụ 18 nwụrụ n’ọdachi ahụ mere n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụghị ahụhụ ka Chineke na-ata ndị ahụ nwụrụ n’ọdachi ahụ. Ha nwụrụ nanị n’ihi na ha nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị, n’oge na-ekwesịghị ekwesị. (Luk 13:1-5) Ịtụgharị uche n’eziokwu a pụrụ inyere gị aka ile ọdachi anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Iche echiche nke ọma pụkwara ime ka ị ghara iwe “iwe megide Jehova onwe ya” na ikwu na ọ bụ ya na-akpata ajọ ihe ndị ahụ. (Ilu 19:3) Kama ịbụ ya na-akpatara anyị nhụjuanya, Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Mgbe e nwere ọdachi, ọ dị anyị mkpa ịbịaru ya nso—ọ bụghị iji iwe kewapụ onwe anyị n’ebe ọ nọ. Tụgharịa uche n’ihe Bible kwuru na Jems 1:13: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” *

Otu ọdachi nke mere ọtụtụ narị afọ gara aga n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwere ike inye aka mee ka a ghọtakwuo nke a. Bible na-akọrọ anyị na nanị otu onye lanarịrị ọdachi ahụ kwuru, sị: “Ọkụ nke Chineke esiwo n’eluigwe daa, rechapụ ìgwè ewu na atụrụ, na ndị na-ejere gị ozi, ripịa ha.” (Job 1:16) Lee nnọọ ajọ ọdachi nke ahụ bụ! O dokwara anya na nwoke a ụjọ ji chere na ọ bụ Chineke kpatara ya. Ma, ọ bụghị Chineke. Job 1:7-12 kpughere na ọ bụghị Chineke zitere ọkụ ahụ, kama na ọ bụ Onye Mmegide Chineke—Setan bụ́ Ekwensu, zitere ya!

Nke ahụ bụ ọnọdụ a na-adịghị ahụkebe: N’ụzọ pụrụ iche Jehova kwere ka Setan nwalee iguzosi ike n’ezi ihe Job. Ya mere, ekwubila na ọ bụ Setan kpọmkwem na-akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha dị ka oké ifufe na idei mmiri. * N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:9) N’ihi ya, ọ pụrụ iji ụmụ mmadụ ndị o ji arụ ọrụ kpata ọgba aghara na mbibi.

Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịdị na-eche na anyị enweghị onye inyeaka. Tụlee ihe ọzọ merenụ, bụ́ nke e dekọrọ na Bible na 1 Samuel 22:12-23. N’ebe ahụ ka anyị na-agụ banyere mgbuchapụ e ji obi ọjọọ gbuchapụ otu ìgwè ndị nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ezinụlọ ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Setan so kpalie ajọ Eze Sọl ime omume obi ọjọọ a. Otú ọ dị, Devid kwesịrị ntụkwasị obi, onye mechara ghọọ eze n’onwe ya, dere Abụ Ọma nke 52, bụ́ ebe o kwupụtara obi ike o nwere na Chineke ga-ala ndị ọjọọ kpatara ọdachi a n’iyi.—Abụ Ọma 52:5.

N’otu aka ahụ taa, ị pụrụ ijide n’aka na Chineke agaghị agbachi nkịtị ka igbu ọchụ na ime ihe ike ndị Ekwensu na-akpali nọgide na-aga n’ihu ruo mgbe ebighị ebi. Bible na-ekwe nkwa na n’isi nso Chineke ga-eji Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, “tipịasịa ọrụ Ekwensu”! (1 Jọn 3:8) N’ikpeazụ, a gaghị enwekwa ihe ọ bụla ga-afọdụ ná mbibi nile Setan kpatara. Site ná mbilite n’ọnwụ, Chineke pụrụ ọbụna ime ka ndị nwụrụ n’ọdachi nke ime ihe ike ma ọ bụ iyi ọha egwu dị ndụ ọzọ.—Ọrụ 24:15.

Ụzọ Ndị Dị Irè Isi Nagide

Olileanya a nke dabeere na Bible pụrụ inyere gị aka izere ịbụ onye ụjọ rikpuru. Ma e nwekwara ihe ụfọdụ dị irè ị pụrụ ime. Dị ka ihe atụ, rịba ama ụkpụrụ Bible ahụ dị n’Ilu 12:25. Ọ bụ nanị site n’ịkọrọ ndị ọzọ mmetụta gị ka ị pụrụ inweta “okwu ọma” nke agbamume. Ime otú ahụ ga-enyekwara gị aka ịmara na ị nọghị nanị gị ka ị na-agabiga ọnọdụ a. Ya mere, ọ bụrụ na ị na-enwe nchegbu, gbalịa ịkọrọ ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye tozuru okè n’ọgbakọ Ndị Kraịst mmetụta ị na-enwe. *

Aro ọzọ: Adịla na-ekiri akụkọ banyere ọdachi bụ́ ndị a na-egosi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi gabiga ókè. Ime otú ahụ ga-eme nanị ka o siere gị ike karị iwepụ n’uche gị onyinyo ndị ahụ na-enye gị nsogbu.—Abụ Ọma 119:37.

Ị̀ bụ Onye Kraịst? Mgbe ahụ nọgide n’usoro ihe omume Ndị Kraịst gị. (Ndị Filipaị 3:16) Ihe omume ndị ahụ na-agụnye iso Ndị Kraịst ibe gị na-aga nzukọ na ikere òkè n’ịkọrọ ndị ọzọ ihe i kweere. (Ndị Hibru 10:23-25) Nke ahụ ga-enye aka mee ka uche gị ghara ịdị mgbe nile n’ihe ndị na-akụda mmụọ. Nanị ihe ikewapụ onwe gị iche ga-eme bụ imerụ gị ahụ́—ma ná mmetụta uche ma n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 18:1.

Ịnọgide na-agụ Bible kwa ụbọchị pụrụ inyere gị aka karịsịa n’ọnọdụ ọ bụla siri ike. Nne nke otu onye ntorobịa aha ya bụ Loraine nọ n’ọnụ ọnwụ n’ihi ọrịa cancer. Rịba ama ụzọ Loraine si nagide ọdachi a: “Ana m echeta na m gụrụ akwụkwọ Job ugboro ugboro n’oge ahụ ihe siiri anyị ike. Akwụkwọ Abụ Ọma nyekwara m nkasi obi dị ukwuu. Ka m nọ na-agụ okwu ndị ahụ na-akasi obi dị n’Akwụkwọ Nsọ, ọ dị ka a ga-asị na Jehova na-amakụ m.” Nwanne ya nwanyị bụ́ Mishael na-echetakwa, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị ụbọchị m na-agụghị Bible, ọ na-emetụ m n’ahụ́. Uche m na-agaghachi ozugbo n’iche echiche ndị na-akụda mmụọ. Ịgụ Bible nyere m ihe ndị na-edozi ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị dị m mkpa iji gafere ụbọchị nke ọ bụla.”

Ọ bụrụ na e nweela onye nwụnahụrụ gị—karịsịa onye ị hụrụ n’anya—ịgụ broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ * pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enye nkasi obi. Wepụta oge gụọ ma tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Tụgharịakwa uche n’olileanya nke mbilite n’ọnwụ. “Ana m eji anya nke uche ahụ nne m ka o si n’ọnwụ ebilite,” ka Loraine na-ekwu. “Ana m eche ka ọ ga-adị ịnụ olu ya mgbe ọ ga-asị m: ‘Alaghachila m. Gịnị ka i siri anyị ga-eri n’abalị a?’ Nke ahụ ga-eme m ka m mụmụọ ọnụ ọchị.”

Ịdabere n’ebe Jehova nọ site n’ekpere pụkwara inye gị ume dị gị mkpa iji die ọdachi ndị kasị njọ. Loraine na-echeta, sị: “Anọ m n’ime ụlọ ahụ mgbe nne m kubiri ume. Ozugbo ahụ, m rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nye m ume iji die ya na iji gabiga ọnọdụ a. Ozugbo ahụ, enwetara m udo nke Chineke.” Gwa Jehova ihe ị chọrọ kpọmkwem, n’ekpere. Mee ka ọ mara mmetụta ị na-enwe kpọmkwem. Onye ọbụ abụ ahụ gbara ume, sị: “Wụsịanụ obi unu n’ihu ya dị ka mmiri.”—Abụ Ọma 62:8.

Ka oge na-aga, o yiri ka nhụjuanya dị n’ụwa ọ ga-amụba. (2 Timoti 3:13) N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwe nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala, ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:9-11, 29) Ijigidesi olileanya a ike ga-enyere gị aka inwe ike ịnagide ya mgbe e nwere ọdachi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 6 Dị ka ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike nke uche si kwuo, ụdị ihe mgbaàmà ndị ahụ pụrụ ịgụnye ịbụ ndị ihe na-adịkwaghị emetụ n’ahụ́, nrọ ọjọọ, ikewapụ onwe onye iche, ịkwụsị ime ihe ndị a na-emebu, na inwe obi amamikpe na iwe.

^ par. 9 Ọ bụ ezie na isiokwu a na-ekwu okwu kpọmkwem banyere ọdachi ndị buru ibu, a pụkwara iji ndụmọdụ ndị e nyere n’ebe a mee ihe mgbe e nwere ọdachi ndị dakwasịrị mmadụ, dị ka mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ.

^ par. 12 Maka ebe a kọwara ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, lee isi nke 7 n’akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 14 Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche (Bekee) nke December 1, 1974.

^ par. 18 Mgbe e nwere nchegbu gabigara ókè ma ọ bụ ịda mbà n’obi, ma eleghị anya ọ ga-adị mkpa ịchọ ọgwụgwọ.

^ par. 22 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịkpara ihe ndị na-akpata oké nchegbu ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-egosi ị na-ekiri ókè