Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ Ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 28. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee alaeze nke Saịrọs, Daraịọs, Ahasuerọs, na Ataksakses chịchara? (Ezra 4:5-7)

2. N’ịkọwa ike dị ukwuu nke ire nwere n’ịchịkwata ahụ́ nile nke mmadụ, gịnị ka Jems ji tụnyere ire? (Jems 3:3, 4)

3. Olee onye mbụ a kọrọ ji aha Chineke mee ihe (Jenesis 4:1)

4. Na gịnị ka a kọrọ na e dere aha ndị gosiworo onwe ha ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na ndị na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova? (Mkpughe 20:12)

5. Olee anụ a kọwara nke ọma na Job 41:1-34

6. Gịnị ka Eze Nwanyị bụ́ Vashti mere nke kpasuru Eze Ahasuerọs iwe, na-eduga n’iwepụ ya dị ka Eze Nwanyị? (Esta 1:12, 19)

7. N’etiti ndị ikom 12 ahụ Mozis zipụrụ iledo ala Kenan, olee ndị kọrọ akụkọ ọma mgbe ha lọghachiri? (Ọnụ Ọgụgụ 14:6-8)

8. Ruo oge ha aṅaa ka a ga-akpọchi Setan n’ime abis? (Mkpughe 20:1-3)

9. Gịnị ka Ịlaịja ji mee ihe n’ịhọpụta Ịlaịsha dị ka onye ga-anọchi ya? (1 Ndị Eze 19:16, 19)

10. Mgbe a mara ịbụisi Mozis na Erọn aka, olee otú Jehova si gosipụta na ya họọrọ Erọn na ezinụlọ ya ịbụ ndị nchụàjà? (Ọnụ Ọgụgụ 17:1-11)

11. Olee onye mbụ Sọl kwere nkwa ịkpọnye Devid ka ọ bụrụ nwunye ya? (1 Samuel 18:17-19)

12. Ụdị azịza dị aṅaa “na-eme ka ọnụma laghachi azụ”? (Ilu 15:1)

13. Dị ka Jizọs rụtụrụ aka, ònye kwuru na nwoke na nwunye ya “ga-abụ otu anụ ahụ́”? (Matiu 19:4-6)

14. Mgbe ndị Juu boro Pọl ebubo na ọ na-eduga ndị mmadụ na nkwenkwe dị iche n’ife Chineke ofufe, ònye kagburu okwu ahụ n’ọnọdụ na o megideghị iwu ndị Rom? (Ọrụ 18:12-16)

15. N’ihe atụ Jizọs banyere otu nwoke nke sitere n’usoro ọmụmụ onye eze bụ́ onye hapụrụ ụlọ ‘ịga nweta ikike ịbụ eze,’ gịnị bụ ihe o nyere ndị ohu ya? (Luk 19:12-24)

16. Olee ọnwa Solomọn wuchara ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem? (1 Ndị Eze 6:38)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Peasia

2. Obere ụmara ụgbọ

3. Iv

4. “Akwụkwọ mpịakọta nke ndụ”

5. Agụ iyi

6. Ọ jụrụ ịbịa n’ihu eze

7. Jọshụa na Keleb

8. Otu puku afọ

9. Uwe mwụda ya

10. N’ime mkpanaka nile nke ndị isi nke ebo 12 ahụ, ọ bụ nanị mkpanaka Erọn mara ifuru, mịakwa almọnd chara acha

11. Ada ya nwanyị, bụ́ Mirab

12. Azịza dị nro

13. Chineke

14. Galio, bụ́ onye ọchịchị ógbè Akea

15. Maịna

16. Bul, bụ́ ọnwa nke asatọ na kalenda nsọ