Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ịgbà nke Na-ada Ọtụtụ Ụda”

“Ịgbà nke Na-ada Ọtụtụ Ụda”

“Ịgbà nke Na-ada Ọtụtụ Ụda”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SENEGAL

“Ọ NA-ETI mkpu, na-ebe ụrịa, na-akwakwa ákwá. Ọ na-atakwuri atakwuri, na-abụkwa abụ. . . . Ọ bụ ịgbà nke na-ada ụdị ụda ọ bụla, ịgbà nke na-ada ọtụtụ ụda.” Olee ihe kpaliri onye edemede a ichepụta ihe a? Ọ bụ ịgbà Africa a na-ebu n’aka bụ́ nke a na-akpọ djembe.

Djembe na-ekere ókè bụ́ isi n’ememe ndị a na-eji ịgbà eme n’agbụrụ ụfọdụ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Dị ka ọ na-adịkarị, a na-ejikọta egwú djembe na ememe ọdịnala ndị a na-eme n’ime obodo, site n’alụmdi na nwunye, ọnwụ, na ịmụ nwa ruo n’ememe dị iche iche, iwe ihe ubi, na ọbụna ịzụta uwe ọhụrụ.

E nwere ụdị dị iche iche nke djembe. N’eziokwu, Burkina Faso, Guinea, Mali, na Senegal nwechara ụdị djembe nke ha. A na-eji ogwe osisi siri ike atụ ngwá egwú ahụ, bụ́ nke a na-eme ka etiti ya ghere oghe dị ka drọm. A na-achọtụ ụfọdụ mma, ebe a na-atụ ihe ndị mara ezigbo mma n’ahụ́ ndị ọzọ.

Ozugbo a kwadebechara okpokoro ya, onye nwere nkà n’ime ịgbà na-eji okpokoro osisi ahụ emepụta ngwá egwú pụrụ iche. Nke mbụ, onye na-eme ịgbà na-eji chisel akpuchasị ahụ́ ya ma mee ka ahụ́ okpokoro osisi ahụ na-akwọ mụrụmụrụ ruo mgbe ọ ga-aha otú ọ ga na-ada ụda a chọrọ. Omenkà a pụkwara ite mmanụ nri n’ime ịgbà ahụ ma hapụ ya n’anwụ ka ọ gbakọọ. Nke a na-enye aka echekwa osisi ahụ.

A na-eji akpụkpọ ewu ekwe djembe ma jiri ọla jigide ya. A na-eji ọtụtụ eriri ekegide ya n’ọla abụọ ọzọ iji mee ka o kwedo ekwedo. Olee ókè onye ahụ na-eme ịgbà na-adọtịru eriri ndị ahụ? Ọ na-adabere n’otú ọ chọrọ ka ịgba ahụ na-ada. Ka omenkà ahụ na-adọtị eriri ịgbà ahụ iji mee ka ọ daa otú ọ chọrọ, ọ na-akụ ụdị egwú kasị amasị ya site n’oge ruo n’oge iji mara ma ọ dịwo mma.

Djembe na-amasị ma ndị Africa ma ndị ọbịa. N’ezie, ozugbo ndị nwere nkà n’iti egwú jiri ya kụọrọ gị egwú, ọ ga-esi ike ka i chezọọ “ịgbà nke na-ada ọtụtụ ụda.”