Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?

Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?

Echiche nke Bible

Ịkpọasị Agbụrụ Ọ̀ Ziri Ezi?

OLEE otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na a na-ele gị anya dị ka onye aghụghọ, onye na-eme ihe ike, onye nzuzu, ma ọ bụ onye na-eme omume rụrụ arụ nanị n’ihi na i si n’otu agbụrụ? * N’ezie, ọ ga-ewe gị iwe. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ otú ahụ ka e si ele ọtụtụ nde mmadụ anya. Ọzọkwa, n’akụkọ ihe mere eme nile, e metọwo ma ọbụna gbuo ọtụtụ ndị ọ na-adịghị ihe ha mere nanị n’ihi agbụrụ ma ọ bụ mba ha si na ya. N’ezie, ọ bụ ịkpọasị agbụrụ na-akpata ihe ka ọtụtụ n’agha ndị a na-awụfu ọbara na ha. Ma, ọtụtụ ndị na-akwado ime ihe ike dị otú ahụ na-ekwupụta n’ezie na ha kwere na Chineke na Bible. E nwekwara ndị na-asị na ịkpa ókè agbụrụ ga-adịgide—na ọ bụ otu n’ime ihe ndị ụmụ mmadụ bu pụta ụwa.

Bible ọ̀ na-anabata ịkpọasị agbụrụ dị otú ahụ? È nwere ọnọdụ ndị ga-eme ka ịkpọ ndị ọdịbendị ma ọ bụ agbụrụ ha dị iche na nke anyị asị zie ezie? Ọ̀ dị olileanya ọ bụla dịnụ na a gaghị enwe ịkpọasị agbụrụ n’ọdịnihu? Gịnị bụ echiche nke Bible?

Ndị A Mara Ikpe n’Ihi Omume Ha

Ntụle na-emighị emi nke ụzọ Chineke si mesoo ihe a kpọrọ mmadụ n’oge mbụ pụrụ ime ka mmadụ ruo ná nkwubi okwu na-ezighị ezi—na Chineke kwadoro ịkpọasị agbụrụ n’ezie. Ọ̀ bụ na ihe ndekọ Bible adịghị egosi Chineke dị ka onye gbuchapụrụ agbụrụ na mba dị iche iche? Ha na-egosi, ma ọ bụrụ na e lerukwuo ha anya, ha na-egosi na Chineke mara ndị a ikpe n’ihi nleghara ha leghaara iwu ya anya n’ụzọ dị njọ, ọ bụghịkwa n’ihi agbụrụ ha si na ya.

Dị ka ihe atụ, Jehova Chineke mara ndị Kenan ikpe n’ihi ememe ha ndị gụnyere mmekọahụ rụrụ arụ na ife ndị mmụọ ọjọọ. Ọbụna ha na-akpọ ụmụaka ọkụ iji chụọrọ chi ụgha àjà! (Deuterọnọmi 7:5; 18:9-12) Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị Kenan ụfọdụ gosipụtara okwukwe n’ebe Chineke nọ ma chegharịa. N’ihi ya, Jehova hapụrụ ha ndụ ma gọzie ha. (Joshua 9:3, 25-27; Ndị Hibru 11:31) Otu nwanyị onye Kenan, bụ́ Rehab, ghọrọ ọbụna nne ochie nke Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Jizọs Kraịst.—Matiu 1:5.

Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gosiri na ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-egosipụta ezi nchegbu maka ọdịmma nke mmadụ nile. Na Levitikọs 19:33, 34, anyị na-ahụ iwu na-esonụ Chineke nyere ụmụ Izrel, bụ́ nke na-egosipụta ọmịiko: “Mgbe ọbịa ga-anọnyere gị dị ka ọbịa n’ala unu, unu emela ya ihe ike. Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” Iwu ndị yiri ya dị n’akwụkwọ Ọpụpụ na Deuterọnọmi. O doro anya na Jehova ekwughị na ịkpọasị agbụrụ ziri ezi. O kwuru na a ghaghị inwe ịdị n’otu nke agbụrụ.

Jizọs Kwadoro Agbụrụ Ịnagiderịta Ibe Ha

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu na ndị Sameria na-elelị ibe ha anya. N’otu oge, ndị nọ n’obodo nta dị na Sameria anabataghị Jizọs nanị n’ihi na ọ bụ onye Juu nke na-aga Jeruselem. Olee otú ị gaara esi emeghachi omume n’ọjụjụ dị otú ahụ? Ọ pụrụ ịbụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs gosipụtara ajọ mbunobi jupụtara ebe nile n’oge ahụ mgbe ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” (Luk 9:51-56) Jizọs ò kwere ka ajọ mbunobi nke ndị na-eso ụzọ ya metụta ya? N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ baara ha mba ma chọọ ebe ha ga-ehi n’obodo nta ọzọ ka udo wee dị. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs tụrụ ilu banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi. Nke a na-egosipụta n’ụzọ siri ike na agbụrụ mmadụ adịghị eme ka ọ bụrụ onye iro. N’eziokwu, ọ pụrụ imesị bụrụ ezigbote onye agbata obi!

Ndị Si n’Agbụrụ Dị Iche Iche Nọ n’Ọgbakọ Ndị Kraịst

N’oge ọ na-eje ozi n’elu ala, Jizọs lekwasịrị anya karịsịa n’ime ndị na-eso ụzọ n’etiti ndị obodo ya. Ma o gosiri na ndị ọzọ ga-emesịa ghọọ ụmụazụ ya. (Matiu 28:19) À ga-anabata ndị si n’agbụrụ nile? Ee! Pita onyeozi kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Pọl onyeozi mesịrị kwado echiche a site n’ikwu n’ụzọ doro anya na agbụrụ mmadụ si na ya adịghị mkpa n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:11.

Ihe ọzọ na-egosi na Chineke na-anabata ndị si n’agbụrụ nile dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. N’ọhụụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta,” bụ́ ndị Chineke zọpụtara. (Mkpughe 7:9, 10) “Oké ìgwè mmadụ” a ga-abụ ntọala nke ọha mmadụ ọhụrụ bụ́ ebe ndị sitere n’ebe nile ga-ebikọ n’udo, bụrụ ndị ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ mere ka ha dịrị n’otu.

Ka ọ dịgodị, Ndị Kraịst ga-eme nke ọma iguzogide mkpali nke ịma ndị ọzọ ikpe n’ihi agbụrụ ha si na ya. Ile ndị mmadụ anya n’otu n’otu, n’ụzọ Chineke si ele ha, ọ bụghịkwa nanị dị ka ndị si n’otu agbụrụ bụ ihe ziri ezi ma na-egosi ịhụnanya. Nke ahụ ọ́ bụghị otú ị chọrọ ka e si na-ele gị anya? Jizọs na-adụ anyị ọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ibi ndụ n’enweghị ịkpọasị agbụrụ dị mma. Ọ na-eme ka e nwee udo nke uche ka ukwuu ma mee ka e soro ndị ọzọ dịrị n’udo. Nke ka mkpa, ọ na-eme ka anyị na Onye Okike anyị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, bụ́ Jehova Chineke, dịrị n’otu. Lee ezi ihe ọ bụ mere anyị ga-eji jụ ịkpọasị agbụrụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 “Agbụrụ,” dị ka e si jiri ya mee ihe n’isiokwu a, pụtara ndị sitere n’otu ebo, mba, ma ọ bụ ndị nwere ọdịbendị yiri ibe ha.