Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abamuru Nye Obodo

Abamuru Nye Obodo

Abamuru Nye Obodo

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SPEN

RUO ọtụtụ narị afọ obodo ukwu ndị dị na Spen anọwo na-ewepụta ala maka iwu ebe ofufe. Ndị ọchịchị obodo kweere na okpukpe ga-abara obodo ha uru. Ebe ọ bụ na okpukpe Katọlik bụ okpukpe Ọchịchị kwadoro, a nọwo na-enye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị Chọọchị Katọlik onyinye ala. Ma ihe agbanweela.

N’afọ 1980, iwu Spen nke na-echekwa nnwere onwe ikpe okpukpe kwuru na “ọ dịghị okpukpe ga-abụ okpukpe Ọchịchị kwadoro.” Nke a akpaliwo ụfọdụ ndị ọchịchị obodo ikwu n’ihu ọha na ha nabatara ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ. Dị ka ihe àmà nke nnabata a, ha enyewo onyinye ala maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ndị ọchịchị obodo dịgasị iche iche ekwupụtawo echiche nke bụ́ na onyinye ndị dị otú ahụ ziri ezi n’ihi “na ọrụ [Ndịàmà] metụtara izi ihe,” nakwa n’ihi “uru ọrụ dị otú ahụ na-abara ọha na eze na ndị mmadụ n’otu n’otu.” Ndị ọzọ ezowo aka “n’ọnụnọ dị ịrịba ama Ndịàmà Jehova nọ n’obodo ukwu ahụ” na “ojiji a na-ejighị ọrụ ha na-akpa ego.”

E wuwo ọtụtụ n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ n’ime awa 48 site n’ịgbaso usoro owuwu ihe pụrụ iche bụ́ nke ìgwè Ndịàmà na-arụ ọrụ afọ ofufo nke iwu ihe owuwu na-eji eme ihe. Onyeisi obodo La Línea, nke dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Spen, kwuru, sị: “Àgwà nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke ndị ọrụ afọ ofufo ahụ dọọrọ mmasị m, echekwara m na ha kwesịrị inweta nkwado anyị. Ụdị mmụọ a dị anyị mkpa karị n’ụwa nke taa kewara ekewa.” Ọ kpọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ “ihe ncheta nke mmụọ imekọ ihe ọnụ.”

Ndị agbata obi ahụwokwa mmụọ a nke imekọ ihe ọnụ. Mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ dịkọtara ọnụ na Vitoria, nke dị n’ebe ugwu Spen, Marian, bụ́ onye bidewere ebe ahụ, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ nile na-egosipụta ụdị ịhụnanya a, anyị agaghị enwe nsogbu ndị anyị na-enwe taa.” Mgbe otu onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ nke nọ n’obodo ahụ kirisịrị ka a na-ewu ụlọ ahụ, o kwuru, sị: “Ọ ga-amasị m ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova iji nwee ike inweta ọṅụ unu na-enweta!”

N’obodo Zaragoza, nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Spen, ndị ọchịchị nyere Ndịàmà ala dị square mita 600 n’efu. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ahụ kọwara ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu ahụ dị ka “ọnụ ụmụ ahụhụ nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ọtụtụ narị ụmụ obere ahụhụ na-arụkọ ọrụ ọnụ.” Ndị agbata obi nabatara ndị ọrụ ahụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ndị ụkọchukwu mere ka okwukwe m gharazie isi ike, ma unu emewo ka o sighachi ike.”

Ndịàmà nwere obi ekele maka nkwado nke ma ndị agbata obi ma ndị ọchịchị obodo nyere n’owuwu nke ebe ofufe ha dị iche iche. Ha kpebisiri ike iji Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-eme ihe maka ọrụ izi ihe kasị mma—ikwusa na ịkụzi Okwu Chineke—ruo ókè o kwere mee maka obodo ahụ.

[Foto dị na peeji nke 31]

La Línea, Cádiz, Spen