Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya

Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya

Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Onye Mmadụ Hụrụ n’Anya

Otu onye si New York nke na-agụ akwụkwọ anyị ji akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso tụnyere akwụkwọ ozi nke sitere n’aka onye mmadụ hụrụ n’anya, na-akọwa, sị: “Isiakwụkwọ nke ọ bụla na-akpali akpali nke ukwuu ma na-eme ka mmadụ nwee ịhụnanya dị ukwuu n’ebe Jehova nọ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ugbu a m gụchaworo akwụkwọ ahụ, agaghị m egbu oge ọ bụla ịmaliteghachi ịgụ ya ọzọ, dị nnọọ ka ị ga-esi gụghachi akwụkwọ ozi sitere n’aka onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu.” Tụlee ihe ndị ọzọ kwuru.

Otu onye si Kansas nke na-agụ akwụkwọ anyị kwuru, sị: “Apụrụ m ịhụ onwe m ka m na-abịarukwu Nna m nke eluigwe nso karị. Obi m jupụtara nnọọ n’ịhụnanya . . . Ọ na-agụsi m agụụ ike ịgụkwu ya n’ụtụtụ ọ bụla, m na-agụghachikwa ya ọtụtụ ugboro.”

Otu nwanyị si Maine dere, sị: “O mewo ka m ghọtakwuo nke ukwuu na Jehova bụ onye dị adị n’ezie! Lee ihe nkasi obi okwu ahụ dị na peeji nke 74 bụ: ‘Nye ndị nwụrụ anwụ, ọ dịghị ebe dị nchebe ịnọ karịa ịnọ n’ikike ncheta nke Chineke.’” Otu onye edemede n’Alaska kwetakwara, na-asị: “O metụrụ m n’obi nke ukwuu nke na m malitere ibe ákwá.” O kwukwasịrị: “N’ezie, aga m na-agụ ma na-ezo aka na ya ugboro ugboro.”

Anyị kwenyere na ị ga-enwekwa ụdị mmetụta ahụ ma ị gụọ akwụkwọ a. Mgbe isiakwụkwọ atọ ndị mbụ dị na ya gasịrị, e kewara akwụkwọ a ná nkebi anọ ndị a kpọrọ “O Nwere Ume n’Ike,” “Onye ‘Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya,’” “O Nwere Obi nke Maara Ihe,” na “Chineke Bụ Ịhụnanya.” O ji isiokwu bụ́ “Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso” mechie.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 320 nke nwere mkpo na-esighị ike, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.