Ihe Ọ Na-adịghị Oké Mmiri Ozuzo Pụrụ Ịsachapụ Ya
Ihe Ọ Na-adịghị Oké Mmiri Ozuzo Pụrụ Ịsachapụ Ya
SITE N’AKA NDỊ EDEMEDE TETA! NA GERMANY, AUSTRIA, MEXICO, NA KOREA
N’AFỌ 2002, ọnọdụ ihu igwe mere ka ebelebe gbuo n’ọtụtụ ala. E nwere ọtụtụ idei mmiri ndị kpatara ọdachi na Europe. N’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo kpara Mexico na Korea aka ọjọọ. Ọ bụ ezie na ihe ndị a wetara ọdachi, ha mere ka nkekọ ịhụnanya dị n’etiti ezi Ndị Kraịst sikwuo ike.
Mgbe idei mmiri e nwere na Europe n’afọ 2002 gasịrị, a jụrụ onye bụbu onyeisi ọchịchị nke West Germany, bụ́ Helmut Schmidt, ajụjụ banyere ihe dị ndị ọdachi ahụ metụtara mkpa. Ọ zaghachiri, sị: “Nri na ebe obibi dị ndị mmadụ mkpa, ego dị ha mkpa, nlekọta ime mmụọ dịkwa ha mkpa.” Ndịàmà Jehova keere òkè dị ukwuu n’inyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ ime mmụọ. Tụlee ọrụ enyemaka ha rụrụ na Germany, Austria, Mexico, na Korea.
Ndị Dị Njikere Inye Aka na Germany
Mgbe a matara na idei mmiri na-aga iweta ọdachi na Germany, ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ ná mba ahụ sonyeere ọha na eze n’ịgbalị igbochi idei mmiri ahụ. Kathleen, onye dị afọ 19, bụ́ onye bi na Dresden na-ekwu, sị: “Apụghị m ịnọrọ nnọọ n’emeghị ihe ọ bụla. Ozugbo m nụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ihe nile ha nwere funahụrụ, ihe ọzọ m mere bụ nnọọ ịga nye aka.”
Ndị Germany bụ́ Ndịàmà malitere ịhazi onwe ha iji nye aka ngwa ngwa nakwa n’ụzọ bara uru. Dị ka Ndị Kraịst, ha ghọtara na ha nwere ibu ọrụ pụrụ iche inyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ha aka. Ma ha gosipụtakwara ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi ha nọ. (Mak 12:31) N’ihi ya, a haziri ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 2,000 gaa n’ìgwè ndị agbata mmadụ 8 na 12 mejupụtara nke ọ bụla, e nyere ìgwè nke ọ bụla kpọmkwem ọrụ ha ga-arụ n’ebe ahụ e nwere ọdachi. N’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Selters, Germany, e debere ụzọ telifon 13 iche iji na-aza ọtụtụ puku ndị na-akpọ fon bụ́ ndị na-ajụ ajụjụ banyere ọdachi ahụ ma na-achọ inye aka.
Ronnie na Dina bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-etinye oge ha n’inyere ndị enyi ha na ndị agbata obi ha aka ịmụta eziokwu
Bible. Mgbe ha nụrụ banyere idei mmiri ahụ na-erutenụ, ha bu ụzọ gaa n’isi obodo ahụ bụ́ Dresden iji nye aka ná mgbalị siri ike a na-eme iji chebe ihe ndị e wuru na ya bụ́ ndị meworo ihe akụkọ. Ozugbo idei mmiri ahụ talatara, Ronnie na Dina sonyeere Ndịàmà ndị ọzọ n’ịsacha Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Freital, bụ́ nke mmiri unyí sọjuworo. E mesịa, ìgwè ahụ malitere inyere ndị agbata obi ha aka. Otu onye nke nwere ụlọ nri n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ kudara ume mgbe Ndịàmà ahụ kpochara unyí ma sachapụ apịtị n’ụlọ ya.Siegfried na Hannelore bi na Colmnitz, bụ́ obodo nta dị ihe dị ka kilomita 40 n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Dresden. Iyi nke na-asọfe n’obodo nta ahụ tojuru ma ghọọ nke na-achị ọkụ, wee rikpuo ụlọ na ubi ha. Ozugbo mmiri ahụ talatara, ọ tụrụ ndị agbata obi Siegfried na Hannelore n’anya ịhụ ka ihe dị ka Ndịàmà 30, bụ́ ndị na-ebighị n’ógbè ahụ, bịara iji nyere Siegfried na Hannelore aka ikpocha ebe obibi ha. E mesịa, ìgwè ahụ malitere ikpocha ubi ndị agbata obi Siegfried na Hannelore. Ọtụtụ ndị obodo ahụ jụrụ ihe mere ha ji mee njem 100 kilomita iji bịa nyere ndị ha na-ahụtụbeghị mbụ aka. Ndịàmà ahụ si otú ahụ nye ndị ọdachi ahụ mere na Colmnitz metụtara agbamume ime mmụọ.
Idei mmiri ahụ rukwara ógbè ndị dịpụrụ adịpụ n’obodo Wittenberg. Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà, ndị aha ha bụ Frank na Elfriede, so ndị agbata obi ha rụọ ọrụ ruo ọtụtụ ụbọchị tupu e nwee idei mmiri ahụ, ha nọ na-awụju ájá n’akpa
ma na-atụsa ha n’ikperé mmiri iji gbochie mmiri ịdị na-asọfere. Ozugbo idei mmiri ahụ talatara, Frank na Elfriede gara leta ndị idei mmiri ahụ metụtara, na-ewegara ha nri ma na-akasi ha obi. Frank na-echeta, sị: “Ọ tụrụ otu nwanyị anyị letara n’anya na anyị, bụ́ ndị si esi bịa, wetaara ya nri n’anaghị ya ego. Ọ gwara anyị na ọ dịbeghị otu onye n’ime ndị chọọchị ya bịara leta ya. Na ụlọ ọrụ na-ewetara ya ihe oriri na-anara ya ego n’oge nke ọ bụla. Ọ tụrụ ndị mmadụ n’anya ịhụ ka Ndịàmà Jehova na-ewegara ndị mmadụ nri dị ọkụ kama iwegara ha akwụkwọ ndị dabeere na Bible.”Austria—Ime Ihe Ngwa Ngwa Maka Ọdachi
Idei mmiri kpakwara mkpamkpa n’Austria bụ́ nke dịdewere Germany. E guzobere kọmitii atọ ilekọta ọrụ enyemaka. E bu ụzọ rụzie Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ bụ́ ndị mebiri n’ụzọ dị ukwuu. Ọzọkwa, n’etiti Ndịàmà, idei mmiri ahụ metụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 ezinụlọ, mmiri ruchikwara ebe obibi 50. Ụfọdụ ndị bụ ndị ihe nile ha ji biri funahụrụ ma e wezụga uwe ha yi n’ahụ́. Alaka ụlọ ọrụ dị n’Austria gwara ọgbakọ ndị dị ná mba ahụ banyere ọnọdụ ahụ, a malitekwara ụtụ ego enyemaka. Ka ọ na-erule September, a tụtaworị ihe karịrị $34,000.
Otu nne dere, sị: “Nwa m nwoke nke dị afọ asatọ na-echekwa ego nke ọma, o chekwawokwa ihe dị ka $14. Otú ọ dị, mgbe ọ nụrụ na ihe onwunwe nile nke ụfọdụ ụmụnna anyị efunahụwo ha, o nwere ọchịchọ iji ego nile o chekwaworo nye onyinye n’ụtụ ego enyemaka ahụ.”
Ná nduzi nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè (RBC), bụ́ ndị na-elekọta owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, e guzobere ìgwè dị iche iche iji nye aka wughachi ebe obibi ndị idei mmiri ahụ bibiri. “Akwụkwọ akụkọ dị iche iche kwesịrị ịkọ banyere ọrụ unu na-arụ ebe a,” ka otu onye na-ekiri ihe na-emenụ kwuru. Ọbụna ụfọdụ ndị gbanwere echiche ha banyere Ndịàmà Jehova. “Ruo ugbu a,” ka otu nne bụ́ Onyeàmà na-ekwu, “ụmụ m, ndị na-abụghị Ndịàmà, adịghị ekwe ege ntị mgbe ọ bụla m nwara ịgwa ha ihe ndị m kweere na ha. Ma ugbu a, ha amalitela ige nti!”
E mekwara mgbalị inyere ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà aka. Dị ka ihe atụ, o metụrụ otu nwanyị n’ahụ́ nke ukwuu mgbe otu Onyeàmà bịara
n’ụlọ ya n’elekere anya 7:30 nke ụtụtụ ma jụọ ya ma ọ̀ chọrọ enyemaka. A kpọpụrụ nwanyị ahụ n’ụlọ ya, ebe ọ bụ na mmiri abatawalarị n’ụlọ ya. Otú ọ dị, mgbe ọ laghachiri, ọ hụrụ otu mpempe akwụkwọ Ndịàmà ahụ dere ihe na ya ma dewere ya n’ụzọ mbata nke ogige ya. Ọ na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ enyemaka, mee ka anyị mara ozugbo.” Ndịàmà nyeere ya aka ịsachapụ apịtị na ikpocha unyí n’ụlọ ya nakwa n’ogige ya.Otu ìgwè Ndịàmà dị 100 gara n’obodo ukwu bụ́ Au iji nyere Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ na ndị agbata obi ha aka. Ndị ndú nke ìgwè nke ọ bụla gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ajụ ndị bi na ya ma hà chọrọ enyemaka. Ọ tụrụ ndị mmadụ n’anya ịhụ ka Ndịàmà ahụ jikeere ejikere bịa, buruchaa ngwá ndị e ji ekupụ mmiri na ndị e ji ekpocha ihe, dị ka ígwè e ji akwọpụ mmiri, ázị́zà, na shọvel. Ọrụ gaara eweworị ndị nwe ụlọ otu izu ịrụcha, gwụsịrị n’ime nanị awa ole na ole. Anya mmiri gbara ndị mmadụ ka ha nọ na-ekiri ihe na-emenụ.
Ihe dị ka Ndịàmà 400 nọ n’ógbè ahụ keere òkè n’ọrụ ebere ahụ—mgbe mgbe, ha na-arụ ọrụ ehihie na abalị n’akwụsịghị akwụsị. Nye ndị nọ na-ekiri ihe na-emenụ, ọ bụ ihe akaebe pụtara ìhè nke ikike nke ezi Iso Ụzọ Kraịst.
Ajọ Ifufe na Oké Mmiri Ozuzo Bụ́ Isidore Akpaa Mkpamkpa na Mexico
Ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo bụ́ Isidore malitere dị ka oké mmiri ozuzo n’ebe ugwu Venezuela. Na September 22, 2002, ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo bụ́ Isidore kpara mkpamkpa na Yucatán nke dị na Mexico bụ́ ebe ala dịịrị banye na mmiri. N’ịbụ nke ifufe ya fesiri ike ruo ihe dị ka kilomita 190 n’otu awa na nke mmiri ya zosiri ike, ọ kpatara mbibi ụfọdụ kasị njọ e nwetụrụla na steeti Yucatán na Campeche bụ́ ndị dị na Mexico, mebiekwa ihe ụfọdụ na steeti Quintana Roo. Na Yucatán nanị, o bibiri ihe dị ka ụlọ 95,000 n’ụzọ dị njọ, bụ́ nke metụtara ihe dị ka mmadụ 500,000.
Ndịàmà Jehova keere òkè bara nnọọ uru n’ọrụ enyemaka na Yucatán nke na otu akụkọ nke akwụkwọ akụkọ dị n’ebe ugwu Mexico gụrụ, sị: “Ndịàmà Jehova Agbata Ọsọ Enyemaka.” E guzobere kọmitii enyemaka tupu oké ifufe na mmiri ozuzo ahụ ewere ọnọdụ. E mere ndokwa ọkụ ọkụ iji nwee ebe ọtụtụ narị Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ ga-ebi. Ọgbakọ ndị dị nso wetara ego maka enyemaka. E kere ndị lanarịrị oké ifufe ahụ, gụnyere ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà, uwe, ọgwụ, na ihe oriri karịrị tọn 22. E nyere ndị okenye nọ n’ógbè ahụ ọrụ ileta na ịgba ndị ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo bụ́ Isidore metụtara ume.
Mgbe oké ifufe na mmiri ozuzo ahụ kpasịrị ike, e guzobere kọmitii enyemaka ógbè iji nye aka ịchọ Ndịàmà na-efu efu. A chọtawo ọtụtụ ndị
nọworo n’ọhịa nakwa n’ebe ndị ọzọ ruo ụbọchị atọ n’erighị nri, n’aṅụghịkwa mmiri. N’ebe ụfọdụ, mmiri ahụ toro nnọọ nke na o rikpuru ọtụtụ poolu ọkụ eletrik! Ya mere, e nwetara ntakịrị ụgbọ mmiri ndị nwere injin ma jiri ha na-achọ ndị ọdachi ahụ metụtara, na-enye ha nri, ma na-ebuga ha n’ebe ndị na-adịchaghị ize ndụ.Ebe ọ bụ na Ndịàmà kwuru ka ha nye aka n’ebe ọtụtụ ndị na-anwatụghị anwa ịga, ndị na-achị ógbè ahụ gbazinyere Ndịàmà ụgbọ epeepe na ngwá ọrụ ndị ọzọ. Na mbụ, otu onyeisi ndị soja jụrụ ikwe ka Ndịàmà mee njem dị ize ndụ otú ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọ hụrụ na ụjọ adịghị atụ ha, o kwuru, sị: “O doola m anya na unu ga-eji helikọpta jee, ma ya dị mkpa, iji zọpụta ndị òtù unu. Ụgbọala anyị dị ya iji buru ndị òtù unu gaa n’ebe ọ bụla unu chọrọ.”
Otu onye nwere ụlọ ahịa chọrọ nnọọ ịmara ihe mere ụfọdụ Ndịàmà ji na-azụ mmiri ndị a gbanyere na karama ruo n’ókè dị nnọọ ukwuu. Ha kọwaara ya na ọ bụ maka ụmụnna ime mmụọ ha na ndị ọzọ bụ́ ndị ọ dị mkpa. Nwoke ahụ kpebiri inye ha mmiri nile o nwere bụ́ ndị a gbanyere na karama—n’anaghị ha ego ọ bụla. N’echi ya, o nyekwuru mmiri n’onyinye—n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu. N’ụlọ ahịa ọzọ, otu onye bịara ịzụ ihe jụrụ Ndịàmà ihe mere ha ji na-azụ nnọọ ihe oriri n’ókè dị nnọọ ukwuu. Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ maka ndị idei mmiri metụtara, o nyere ha onyinye ka ha were zụtakwuo ihe oriri.
Ọ bụ ezie na ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo bụ́ Isidore kpataara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ezinụlọ Ndịàmà dị 3,500 mfu ihe onwunwe, o mesịrị bụrụ na ọ dịghị onye furu efu ma ọ bụ nwụrụ anwụ n’etiti Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na e nwere ụlọ Ndịàmà dị 331 bibirinụ, usoro mwughachi bịara dị mkpa. Ndịàmà nwere nkà iwu ihe owuwu gara n’ụlọ nke ọ bụla nakwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla iji chọpụta ókè ha mebiruru. Rute taa, a rụziwo ụlọ dị 258 ma wuo ndị ọhụrụ dị 172. Ọzọkwa, e wughachiwala Ụlọ Nzukọ Alaeze 19 bibiri ebibi.
A kpaliri otu okenye nke otu ọgbakọ dị na steeti Yucatán ikwu, sị: “Agụwo m n’akwụkwọ anyị banyere ọrụ enyemaka ndị a rụrụ ná mba ndị ọzọ. Otú ọ dị, nke a m ji anya m hụ dị iche. Ịhụ ka nzukọ Jehova na ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya si jiri nchegbu mee ihe ngwa ngwa iji gbatara anyị ọsọ enyemaka emewo ka okwukwe m nakwa nke ndị ọzọ sikwuo ike.”
Otu nwanyị kwuru, sị: “Obi gaara atọ m ụtọ ma a sị na chọọchị m nyere aka dị ka unu bụ́ Ndịàmà nyeworo.” Nwanyị ọzọ, bụ́ onye Ndịàmà napụtara, kwukwara, sị: “A sị na ọ bụghị Ndịàmà Jehova, anyị gaara anwụ. Ha gosipụtara ịhụnanya ha, na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ iji napụta anyị mgbe mmiri rikpuru ụlọ anyị.”
Ajọ Ifufe na Oké Mmiri Ozuzo Akpaa Ike na Korea
N’August 31 nakwa na September 1, 2002, ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo kpara ike n’akụkụ dị ukwuu nke Korea. Song-pil Cho, bụ́ okenye ọgbakọ, kwuru, sị: “O yiri ịnọ n’okpuru mmiri si n’elu na-asụdata. Ọ nọgidere nnọọ na-awụdata.” Ihe karịrị mmiri dị milimita 870 zoro n’ihe na-erughị awa 24—mmiri kasị ukwuu zotụrụlanụ n’ebe ahụ n’ime otu ụbọchị.
Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Korea Herald si kwuo, ná mba ahụ nile, mmiri rikpuru ụlọ dị 28,100 na ala dị hekta 85,000. A manyere ihe dị ka mmadụ 70,000 ịgbahapụ ebe obibi ha. Ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo ahụ gburu anụ ụlọ dị 301,000, kpuo ụgbọ mmiri dị 126, ma kwatuo ọtụtụ narị poolu ọkụ eletrik. A kọrọ na ihe karịrị mmadụ 180 nwụrụ anwụ ma ọ bụ na-efu efu. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Ndịàmà Jehova.
Dị ka e mere na Europe nakwa na Mexico, Ndịàmà Jehova mere ihe ngwa ngwa. Ndịàmà si n’akụkụ nile nke mba ahụ weta onyinye. Onyinye ndị a gụnyere uwe, blanket, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ma, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ bi n’ebe ndị a na-apụghị ịgaru agaru na ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ụzọ na àkwà mmiri ndị dị n’ebe ahụ ebibisịwo. Ọkụ eletrik ma ọ bụ fon adịghị. Ya mere, a haziri ìgwè dị iche iche iji ụkwụ baa ebe ndị ahụ ma nyere ha aka dị ka ọ dị mkpa. Song-pil Cho, bụ́ onye so otu n’ime ìgwè ọrụ enyemaka ahụ rụọ ọrụ, na-akọwa otu ebe ha gara nye aka: “Àkwà mmiri asaa na akụkụ dị ukwuu nke ụzọ ahụ ebibiwo. Mgbe anyị mesịrị ruo obodo ahụ, ụlọ ndị bibiri ebibi na ndị dara ada juru ebe nile. Ísìsì e nwere n’ebe ahụ jọgburu nnọọ onwe ya, anụmanụ ndị nwụrụ anwụ tọgbọcha ebe nile. Ma lee ọṅụ anyị nwere mgbe anyị zutere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị isii! Ihe onwunwe
ha efunahụwo ha ma ha nile dị ndụ, ha anọghịkwa n’ihe ize ndụ.”N’ezie, Ndịàmà Jehova jikeere nke ọma maka ọdachi a. Ebe ọ bụ na a na-enwekarị idei mmiri n’udu mmiri, òtù RBC e nwere n’ógbè Seoul dị mbụ malite ịhazi ọrụ enyemaka maka ọdachi ndị ga-emenụ. Malite na 1997, ọ haziri ọzụzụ kwa afọ, bụ́ nke ga-eme ka ndị ọrụ afọ ofufo dịrị njikere ime ihe ma ọ bụrụ na e nwee ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa.
Na September 2, ndị ọrụ enyemaka nke RBC bịarutere n’obodo Kangnŭng nke dị n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ ma guzobe isi ụlọ ọrụ ha n’Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ. Gịnị bụ ihe mbụ ha kpebiri ime? Ibugara ndị lanarịrịnụ mmiri dị ọcha. Mgbe ọ bụla e nwere nnukwu idei mmiri, ọ na-ebibikarị paịpụ mmiri ndị e nwere; idei mmiri na-ebu nnọọ unyi dị ukwuu. Ndị RBC mere ndokwa ka nnukwu ụgbọala na-ebu mmiri buga mmiri n’ebe ndị ahụ ọdachi ahụ metụtara.
Mgbe idei mmiri talatara, apịtị ndị na-esi ajọ ísì na-adị n’elu ihe nile. Ka o sina dị, a chọpụtawo usoro nsacha dị irè. Ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e tere ụlọ nile dị n’ógbè ahụ simenti, a pụrụ ihicha ha site n’ịkpekapụ akwụkwọ ndị e ji machichaa ahụ́ ụlọ na linoleum ma jiri paịpụ na-eji ike agbapụta mmiri gbaa ọnụ ụlọ ndị ahụ mmiri.
Idei mmiri na-eme ka ihe ka ọtụtụ ná ngwá eletrik gharazie ịrụ ọrụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye maara nke a na-akọ n’ịrụzi ngwá eletrik atụghasịa ngwá ndị dị ka friji na ihe ndị na-eme ka mmiri dị ọkụ, ma hichaa ha nke ọma, mee ka ha kọọ akọ, ma jikọtaghachi ha n’ime ụbọchị ole na ole, n’ọnọdụ ka ukwuu, ha ga-anọgide na-arụ ọrụ. A haziri ndị RBC ịrụ ụdị ọrụ ahụ. A na-eji ngwá ndị na-eme ka mmiri dị ọkụ, bụ́ ndị ọ na-adịghị mkpa ka a gbanwee, mee ihe n’ime ka mmiri kọọ n’ụlọ ndị ahụ. Usoro ahụ na-ewe agbata izu abụọ na atọ.
Uwe na blanket ndị idei mmiri mebiri aghaghịkwa ịbụ ndị a sara nke ọma n’ime ụbọchị ole na ole ma ọ bụrụ na a ga-anọgide na-eji ha eme ihe. Ndị ọrụ afọ ofufo si n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ nyere aka n’ịchịkọtacha uwe ndị tetọrọ etetọ nke ụmụnna ha bụ́ Ndị Kraịst. Apịtị ndị juru n’ákwà ndị a siri nnọọ ike ịsapụ—a ghaghịkwa iji aka saa ha n’iyi jụrụ nnọọ ezigbo oyi. Mgbe otu onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ matara banyere ọrụ ịhụnanya a, foto buru ibu nke ebe Ndịàmà na-arụ ọrụ ahụ gbara n’akwụkwọ akụkọ e nwere n’ógbè ahụ.
Idei mmiri ndị kpatara ọdachi na Europe, n’Ebe Ugwu America, na Eshia buuru ọtụtụ ụlọ, ihe onwunwe, gbuokwa ọtụtụ ndị mmadụ na-enweghị ihe ha mere. N’agbanyeghị na ihe ndị a na-akpata ọdachi, ha bụ ihe ndị a na-ahụkarị “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a, bụ́ nke e ji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara. (2 Timoti 3:1) Ebelebe ndị dị otú ahụ gburunụ pụkwara ịbụ ihe pụtara ìhè na-eme ka e cheta eziokwu a: Ezi Ndị Kraịst nwere ịhụnanya n’ebe ibe ha na ndị agbata obi ha nọ. Ịhụnanya dị otú ahụ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị bụ ihe ọ na-adịghị oké mmiri ozuzo ọ bụla pụrụ ịsachapụ ya.
[Foto dị na peeji nke 22]
GERMANY—Ụlọ nke oké mmiri ozuzo bibiri
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
GERMANY—Ndị ọrụ afọ ofufo karịrị 2,000 nyere aka ngwa ngwa
[Foto ndị dị na peeji nke 24]
AUSTRIA—Ka ha na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze ha n’Ottensheim
N’aka ekpe: Ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo esi Au lọta, bụ́ ebe ha nyeere Ndịàmà nọ n’ebe ahụ na ndị agbata obi ha aka
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
MEXICO—N’aka nri: Kọmitii enyemaka ebugara ndị lanarịrị oké mmiri ozuzo mmiri ọṅụṅụ
N’okpuru: Iwu ụlọ ọhụrụ n’ọnọdụ nke dakpọrọ adakpọ
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
KOREA—Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Akụkụ obodo ebe mmiri rikpuru; paịpụ na-eji ike enupụta mmiri nke e ji asa ụlọ; ịsa ákwà n’iyi dị nso