Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọjọọ Ikiri Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-akpata

Ihe Ọjọọ Ikiri Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-akpata

Ihe Ọjọọ Ikiri Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-akpata

A PỤRỤ inweta ụdị ihe ọmụma nile banyere mmekọahụ n’ụzọ dị mfe na telivishọn, n’ihe nkiri sinima, na vidio egwú nakwa n’Intanet. Mwabata a onyinyo ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na nke mmekọahụ nọgidere na-awabata n’uche mmadụ ọ̀ bụ ihe na-adịghị emerụ ahụ́, dị ka ọtụtụ ndị chọrọ ka anyị kwere? *

Mmetụta Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Na-enwe n’Ahụ́ Ndị Toworo Eto

N’agbanyeghị ihe ndị na-akwado ya na-ekwu, ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-enwe nnọọ mmetụta na-adịghị mma n’otú ndị mmadụ si ele mmekọahụ anya. Ndị nnyocha nke Òtù Na-ahụ Maka Nnyocha Ezinụlọ na Mmụta ná Mba kwubiri na “ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-etinye ndị na-ekiri ya n’ihe ize ndụ ka ukwuu nke ịmalite ịkpa àgwà ndị na-adịghị mma banyere mmekọahụ.” Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, “ọtụtụ ụmụ nwoke ndị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ riri ahụ́ na-enwe echiche ụgha banyere ndina n’ike (nkwenkwe bụ́ na ọ bụ ndị inyom na-akpata idina ha n’ike, nakwa na ọ na-atọ ha ụtọ, nakwa na ndị na-edina mmadụ n’ike enweghị nsogbu).”

Ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwu na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ugboro ugboro pụrụ imebi ikike mmadụ nwere ịnụ ụtọ na ikere òkè ná mmekọrịta chiri anya nke alụmdi na nwunye, bụ́ nke dị otú o kwesịrị. Dr. Victor Cline, bụ́ ọkachamara n’ịgwọ ndị mmekọahụ riri ahụ́, achọpụtawo ịrị elu na-aga n’ihu nke ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, ihe na-amalite dị ka igwuru anya n’ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ imesị duga n’ikiri ihe ndị jọgburu onwe ha na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị a na-ezoghị ihe ọ bụla na ha. Ọ na-azọrọ na nke a pụrụ iduga n’inwe mmekọahụ ndị na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị na-enyocha akparamàgwà mmadụ kwenyere na nke ahụ. Dr. Cline na-akọ na “a pụrụ isi otú a mụta ịkpa ụdị àgwà ọ bụla rụrụ arụ n’oge a na-enwe mmekọahụ . . . nakwa na ọbụna oké obi amamikpe apụghị ime ka a kwụsị ya.” Onye na-ekiri ya pụrụ imesị nwaa ime ihe ndị ahụ rụrụ arụ ọ na-ekiri, bụ́ ndị na-emebikarị ihe.

Nsogbu a na-eji nke nta nke nta amalite n’ụzọ a na-apụghị ịchọpụta achọpụta, ka Cline kwubiri. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ na-anọgide na-amụba ma na-agbasawanye dị ka ọrịa cancer. Ọ dịkarịghị akwụsị akwụsị, ọ na-esikwa nnọọ ike ọgwụgwọ. Nkweta ndị ikom o riri ahụ́ na-adịghị ekweta na ha nwere nsogbu ahụ na ọjụjụ ha na-ajụ ịlụso ya ọgụ bụ ihe e ji mara ya, bụ́kwa nke a pụrụ ịtụ anya ya, ọ na-afọdụkwa nke nta ka nke a na-akpata esemokwu n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ n’etiti nwoke na nwanyị mgbe nile, mgbe ụfọdụ ọ na-akpata nkewa, mgbe ụfọdụkwa ọ kpata ntisa nke mmekọrịta ndị ọzọ chiri anya.”

Mmetụta Dị Njọ Ọ Na-enwe n’Ebe Ndị Na-eto Eto Nọ

Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na ndị kasị ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ụmụ nwoke ndị dị n’agbata afọ 12 na afọ 17. N’eziokwu, nye ọtụtụ ndị, ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ụzọ bụ́ isi ha si enweta ihe ọmụma banyere mmekọahụ. E nwere ọtụtụ ihe ndị dị njọ na-esi na nke a apụta. “Ntụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, dị ka AIDS,” ka otu akụkọ na-ekwu, “na-abụ ndị a na-adịghị egosi ma ọlị n’ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, na-eme ka e nwee nkwenkwe ụgha bụ́ na e nweghị ihe ọjọọ ndị na-esi n’àgwà ndị a na-egosi n’ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ apụta.”

Ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwu na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụkwara imetụta uto nke ụbụrụ nwatakịrị. Dr. Judith Reisman, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mmụta Banyere Usoro Mgbasa Ozi, na-ekwubi, sị: “Nchọpụta ahụ́ ike ndị e mere banyere mmeghachi omume nke ụbụrụ n’ebe foto na ụda ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dị, na-egosi na ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-akpata ihe na-akpaghasị usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ bụ́ nke na-emebi ikike mmadụ nwere ime mkpebi dabere n’ihe ọ maara—nke ahụ dị ize ndụ n’ebe ụbụrụ dị mfe, [a pụrụ ịkpụgharị akpụgharị] nke ụmụaka dị, n’ihi na ọ na-etinye ikike ha nwere ịghọta ihe ndị mere eme n’ihe ize ndụ ma si otú a na-emebi ahụ́ ike ha n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́, ọdịmma ha na nchụso ha na-achụso obi ụtọ.”

Mmetụta Ọ Na-enwe ná Mmekọrịta

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-akpụgharị ma na-emetụta akparamàgwà. Ozi dị na ya na-akpali akpali n’ihi na n’ụzọ bụ́ isi ha bụ echiche efu, n’ihi ya bụrụkwa ndị a na-egosi dị ka ihe ndị na-akpali akpali karịa ka ha dị n’ìhè. (Lee igbe bụ́ “Olee Ozi nke Ị Ga-anabata?”) “Ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-amalite inwe atụmanya ezi uche na-adịghị na ya bụ́ nke na-akpata ntisa mmekọrịta,” ka otu akụkọ na-ekwu.

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ ibibi ntụkwasị obi na ime ihe n’eziokwu, bụ́ àgwà ndị dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye. Ebe ọ bụ na a na-ekirikarị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na nzuzo, ikiri ha na-edugakarị n’aghụghọ na ụgha. Ndị òtù ọlụlụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a ghọgburu. Ha adịghị aghọta ihe mere na onye òtù ọlụlụ ha enweghịzi mmasị n’ebe ha nọ.

Mmetụta Ọjọọ Ọ Na-enwe n’Ụzọ Ime Mmụọ

Ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-akpata mbibi dị ukwuu n’ụzọ ime mmụọ. Ọ pụrụ ịghọ ihe mgbochi n’ezie nye onye ọ bụla chọrọ isoro Chineke nwee mmekọrịta. * Bible na-ejikọta agụụ mmekọahụ na anyaukwu nakwa ikpere arụsị. (Ndị Kọlọsi 3:5) Onye nwere ọchịchọ anyaukwu n’ihe na-achọsi ya ike nke na ọ na-aghọ ihe bụ́ isi ná ndụ ya, na-anọchi ihe ọ bụla ọzọ. N’eziokwu, ndị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ riri ahụ́ na-eme ka ọchịchọ mmekọahụ ha butere Chineke ụzọ. Ha na-esi otú ahụ eme ka ọ bụrụ chi ha. Iwu Jehova Chineke na-ekwu, sị: “Gị enwela Chi ọzọ tinyere m.”—Ọpụpụ 20:3.

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ebibi mmekọrịta ịhụnanya. Pita onyeozi, bụ́ onye lụrụ nwanyị n’onwe ya, gbara Ndị Kraịst bụ́ di ume ikenye nwunye ha nsọpụrụ. Di nke na-emeghị otú ahụ ga-achọpụta na a na-egbochi ekpere ọ na-ekpegara Chineke. (1 Pita 3:7) Di ikiri foto ndị rụrụ arụ nke ndị inyom na nzuzo ọ̀ bụ imeso nwunye ya n’ụzọ na-egosi nsọpụrụ? Olee otú ọ ga-adị ya ma ọ chọpụta? Gịnịkwa ka Chineke bụ́ onye ga-eme ‘ka ọrụ ọ bụla baa n’ikpe’ nakwa onye “na-atụzi mmụọ nile nke mmadụ” ga-eche? (Eklisiastis 12:14; Ilu 16:2) Onye ọ bụla na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ọ̀ pụrụ inwe ihe ọ bụla mere ọ ga-eji tụọ anya na Chineke ga-anụ ekpere ya?

Ịchọ imejụ agụụ onwe onye n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu bụ àgwà bụ́ isi e ji mara ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. N’ihi ya, ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ adịghị egosi ịhụnanya. Ọ na-ebelata ọgụ Onye Kraịst na-alụ iji nọgide na-adị ọcha n’ụzọ mmekọahụ nakwa iji nọgide na-enwe ọnọdụ dị ọcha n’ihu Chineke. “Nke a bụ uche Chineke,” ka Pọl onyeozi dere, “ka unu na-asọ ịkwa iko asọ; ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’agụụ mmekọahụ nke ọchịchọ anyaukwu . . . , ka onye ọ bụla ghara ịgaru n’ókè nke imebi ihe ma tinye aka n’ihe ndị ruuru nwanna ya.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7.

Ọ bụ ndị inyom na ụmụntakịrị ka a na-emegbu karịsịa ma a bịa n’ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọ na-ewetu ha ala ma mebie ùgwù na ihe ndị ruuru ha. Onye na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ekere òkè ma na-akwado mmegbu ahụ. “N’agbanyeghị ókè nwoke . . . chere na ya na-emeru ihe ọma,” ka ndị nnyocha bụ́ Steven Hill na Nina Silver na-ekwu, “nkwado ọ na-akwado ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-eme ka ọ bụrụ [onye obi kpọrọ nkụ] ma e kwuo ya n’ụzọ kasị mma, onye na-egosi mkpọrọmasị, ma e kwuo ya n’ụzọ kasị njọ, n’ebe nwanyị ahụ ọ na-azọrọ na ya hụrụ n’anya nọ.”

Ịkwụsị Àgwà nke Ikiri Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ

Gịnị ma ọ bụrụ na ị na-alụ ọgụ megide ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ nke riri gị ahụ́? Ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji nwere onwe gị? Bible na-enye olileanya! Tupu ha abịa mara Kraịst, ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst oge mbụ abụwo ndị na-akwa iko, ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, na ndị anyaukwu. “Ma a sachawo unu,” ka Pọl kwuru. Olee otú nke ahụ si kwe omume? Ọ zara, sị: “E dowo unu nsọ . . . site ná mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

Ya adịla mgbe ị ga-elelị ike nke mmụọ nsọ Chineke. “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi,” ka Bible na-ekwu, “ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide.” N’ezie, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ekpere siri ike—ịgwa Chineke nsogbu gị n’esepụghị aka—ga-arụpụta ihe. Okwu Ya na-agba ume, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.”—Abụ Ọma 55:22.

N’ezie, ị ghaghị ime omume n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere gị. Ọ dị mkpa ka i mee mkpebi siri ike nakwa nke sitere n’obi ịjụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Enyi a tụkwasịrị obi ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka bara oké uru, na-enye gị nkwado na agbamume dị gị mkpa iji gbasochie mkpebi gị anya. (Lee igbe bụ́ “Inweta Enyemaka.”) Icheta na omume dị otú ahụ ga-atọ Chineke ụtọ n’ezie pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-agbaso mkpebi gị. (Ilu 27:11) Ọzọkwa, ịmata na nkiri ị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ adịghị atọ Chineke ụtọ pụkwara ịbụ ihe ọzọ ga-akwali anyị ịkwụsị ya. (Jenesis 6:5, 6) Ọ gaghị abụ ọgụ dị mfe, ma ọ bụ nke a pụrụ imeri na ya. A pụrụ ịkwụsị àgwà nke ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ!

Ihe ize ndụ nke ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dị adị. Ọ na-emerụ ahụ́ ma na-ebibi ihe. Ọ na-emerụ ma ndị na-emepụta ya ma ndị na-ekiri ya. Ọ bụ mkparị nye ndị ikom na ndị inyom, ihe ize ndụ nye ụmụaka, na omume e kwesịrị ịjụ ajụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Maka ntụle zuru ezu nke ihe ize ndụ ndị dị n’ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet, biko lee usoro isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ n’Intanet—Olee Ihe Ọjọọ Pụrụ Ịdị na Ya?” nke dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke June 8, 2000, peeji nke 3-10.

^ par. 14 Iji tụlee echiche Bible banyere ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, biko lee mbipụta Teta! July 8, 2002, peeji nke 25-27.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

Inweta Enyemaka

E kwesịghị ile ọgụ a na-alụ ịkwụsị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ anya dị ka obere ọgụ; ọ pụrụ ịbụ ọgụ tara akpụ. Dr. Victor Cline, bụ́ onye gwọworo ọtụtụ narị ndị mmekọahụ riri ahụ́, na-ekwu, sị: “Ikwe ọtụtụ nkwa adịghị ihe ọ na-emeli. Ezi nzube agaghị agbanwe ihe ọ bụla. [Onye mmekọahụ riri ahụ́] apụghị n’ụzọ nkịtị ime nke a n’onwe ya.” Ihe dị mkpa iji nweta ọgwụgwọ gara nke ọma, dị ka Cline si kwuo, bụ ime ka onye òtù ọlụlụ sonye na ya, ma ọ bụrụ na onye ahụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye.” Ọgwụgwọ ahụ na-adị irè ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ha abụọ ekere òkè n’ọgwụgwọ ahụ,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụ ha abụọ ka e merụrụ ahụ́. Enyemaka dịcha ha abụọ mkpa.”

Ọ bụrụ na onye ahụ alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ọtụtụ mgbe, enyi ya ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ ya pụrụ ịbụ idé nke ike. N’agbanyeghị onye a na-enye ọgwụgwọ ahụ, Cline nwere otu ụkpụrụ a na-apụghị ịgbagha agbagha: Kwuo okwu n’ezoghị ọnụ banyere nsogbu ahụ na ndaghachi azụ ọ bụla. “Ihe nzuzo ‘ga-egbu gị’,” ka ọ na-ekwu. “Ha na-akpata ihere na obi amamikpe.”

[Chaatị dị na peeji nke 9]

Olee Ozi nke Ị Ga-anabata?

Ozi Dị n’Ihe Ndị Na-akpali Echiche nke Bible

Agụụ Mmekọahụ

▪ Isoro onye ọ bụla nwee ▪ “Ka alụmdi na nwunye bụrụ

mmekọahụ n’oge ọ bụla, ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti

n’ọnọdụ ọ bụla, nakwa n’ụzọ mmadụ nile, ka ihe ndina alụmdi

ọ bụla adịghị njọ, o nweghịkwa na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị

ihe ọjọọ ọ na-arụpụta. mmerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe

ndị na-akwa iko na ndị di ma ọ

bụ nwunye na-akwa iko ikpe.”

​—Ndị Hibru 13:4.

 

“Onye nọgidere na-akwa iko

na-emehie megide ahụ́ nke ya.”

​—1 Ndị Kọrint 6:18;

leekwa Ndị Rom 1:26, 27.

▪ Alụmdi na nwunye bụ ihe ▪ “Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ

mgbochi nye inweta afọ n’okorobịa . . . N’ịhụnanya ya

ojuju ná mmekọahụ. ka ị ga na-awagharị mgbe nile.”

​—Ilu 5:18, 19; leekwa

Jenesis 1:28; 2:24;

1 Ndị Kọrint 7:3.

▪ Ọ bụ nanị otu nzube ka ▪ “M [Jehova Chineke] ga-emere

e ji nwee ndị inyom—igbo ya onye inyeaka kwesịrị ya.”

mkpa mmekọahụ nke ndị ikom. ​—Jenesis 2:18; leekwa

Ndị Efesọs 5:28.

▪ Ndị ikom na ndị inyom ▪ “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́

bụ ndị ohu nye agụụ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe

mmekọahụ ha. metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha,

agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ

ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu, nke

bụ́ ikpere arụsị.”

​—Ndị Kọlọsi 3:5.

 

“Ka onye ọ bụla n’ime unu mara

ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe

ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.”

​—1 Ndị Tesalọnaịka 4:4.

 

Na-ele “ụmụ nwanyị meworo

okenye [anya] dị ka ndị nne,

ụmụ agbọghọbịa dị ka ụmụnne ndị

nwanyị n’ịdị ọcha nile.”

​—1 Timoti 5:1, 2; leekwa

1 Ndị Kọrint 9:27.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị nnyocha ụfọdụ na-ekwu na nwatakịrị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ imetụta uto nke ụbụrụ ya

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ ibibi ntụkwasị obi na omume nke ezochighị ihe n’alụmdi na nwunye

[Foto dị na peeji nke 10]

Ikpesi ekpere ike ga-arụpụta ihe