Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Echiche Ndị Na-emegide Ibe Ha

Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Echiche Ndị Na-emegide Ibe Ha

Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ—Echiche Ndị Na-emegide Ibe Ha

“Ọ na-akpali agụụ a na-ekwesịghị inwe, ọ na-akpali ọchịchọ a na-apụghị imejụ emejụ.”—Tony Parsons, onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ.

JOHN ebutụghị n’obi ịghọ onye ‘ikiri mmekọahụ n’Intanet’ riri ahụ́. * Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ na-emepe ebe ndị a na-edebe ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ nakwa ebe ndị a na-ekwurịta banyere mmekọahụ n’Intanet n’amaghị ama, ọ nọ na-achọ ihe n’Intanet otu ụbọchị wee hụ ebe a na-edebe ihe ọmụma nke gwara ya na ọ ga-achọta ebe ndị dị otú ahụ a na-ekwurịta banyere mmekọahụ n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, o mikpuru onwe ya n’ikiri mmekọahụ n’Intanet. “Ana m echere ka nwunye m gaa ọrụ,” ka ọ na-echeta, “m na-esizi n’àkwà bilie ma nọrọ n’ihu kọmputa ruo ọtụtụ awa.” Mgbe a na-eme akụkụ ndị dị ogologo, ọ naghịdị akwụsị iji rie nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri. “Adịghị m amata na agụụ na-agụ m,” ka ọ na-ekwu. Ọ malitere ịghara nwunye ya ụgha banyere ihe ọ na-eme na nzuzo. Ọ malitere imetụta otú ọ na-esi etinye uche n’ọrụ, ọ malitekwara ịtụwanye egwu. Ọ malitere imetụta alụmdi na nwunye ya n’ụzọ dị njọ, mgbe o mesịkwara mee ndokwa izute otu n’ime ndị ya na ha na-ekwurịta banyere mmekọahụ n’Intanet n’ìhè, nwunye ya chọpụtara. Taa, a na-enye John ọgwụgwọ maka ihe ahụ riri ya ahụ́.

Ndị na-emegide ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-arụtụ aka n’akụkọ ndị dị otú a dị ka ihe na-egosi mmetụta ọjọọ nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-enwe. Ha na-azọrọ na ọ na-ebibi mmekọrịta, na-eweda ndị inyom ala, na-emetọ ụmụaka, na-eme ka e nwee echiche rụrụ arụ na nke na-emerụ ahụ́ banyere mmekọahụ. N’aka nke ọzọ, ndị na-akwado ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ekwu na ọ bụ ụzọ isi gosipụta mmetụta n’enweghị ihe mgbochi, ha na-elekwa ndị na-emegide ya anya dị ka ndị na-eme nsọ nsọ. “Ndị mmadụ ekwesịghị ime ihere banyere onye ọ bụ ya dọọrọ mmasị ha n’ụzọ mmekọahụ ma ọ bụ banyere inwe agụụ mmekọahụ,” ka otu onye na-akwado ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ede. “A pụrụ iji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ mee ihe iji malite ma kpalie mkparịta ụka banyere mmekọahụ n’ezoghị ọnụ.” Ọbụna ụfọdụ ndị na-enye echiche na njupụta nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ihe e ji amata ebe e nwere ọha mmadụ nweere onwe ha, nke na-enweghị nsogbu mmetụta uche. “Ọha mmadụ nke tozuru etozu ruo n’ókè nke ịnagide ngosi a na-egosi mmekọahụ n’etiti ndị toworo eto, nke a na-ezoghị ihe ọ bụla na ya, yikarịrị ka ọ ga-abụ ọha mmadụ ga-anabata ụdị mmekọahụ dị iche iche na ịha nhata nke ndị inyom,” ka onye na-ede akwụkwọ, bụ́ Brian McNair, na-ekwu.

Ndịrịta iche nke echiche ọha mmadụ ọ̀ na-eme ka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụrụ ihe dị mma? N’ihi gịnị ka o ji jupụta nnọọ ebe nile? Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ hà bụ ihe dị ize ndụ n’ezie? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.