Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ịkwa Azụ̀ Shark Nku
Gburugburu ụwa, ndị ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ na-achọgharị azụ̀ shark n’ime oké osimiri dị iche iche, na-akwa ha nku, ma na-atụba ozu ha n’ime mmiri. “Ọ bụ ọchịchọ a na-achọ ofe na-ada oké ọnụ nke e ji [nku azụ̀ shark] sie na-akpata ụdị ịkwa nku a na-awụ akpata oyi n’ahụ́,” ka magazin bụ́ Science News na-akọ. N’August 2002, Ndị Nche Ụsọ Oké Osimiri United States jichiri ụgbọ mmiri si Hawaii n’ụsọ oké osimiri Mexico mgbe ha chọpụtasịrị na a kwanyejuru nku azụ̀ shark dị tọn 32 n’ime ya. Ọ dịghị akụkụ ahụ́ ọzọ nke azụ̀ shark dị n’ime ụgbọ mmiri ahụ. “Ibu ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na-anọchi anya ma ọ dịkarịa ala azụ̀ shark 30,000 e gburu egbu na ihe dị ka azụ̀ dị kilogram 580,000 a tụfuru atụfu,” ka magazin ahụ na-ekwu. “Gburugburu ụwa, ìgwè ụgbọ mmiri ndị e ji egbu azụ̀ na-egbuzi ihe e mere atụmatụ ịbụ 100 nde azụ̀ shark kwa afọ.” Ebe ọ bụ na a na-ere nku azụ̀ shark ihe karịrị $200 maka gram 450 ọ bụla n’ahịa nkịtị, a na-achọ ya n’ụzọ dị nnọọ ukwuu.
Iji Oge Eme Ihe nke Ọma
Otu nnyocha e mere na nso nso a gosiri na “ndị na-eme mkpesa na ha enweghị oge zuru ezu na-aghọgbu onwe ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Australian na-ekwu. Akwụkwọ akụkọ ahụ hotara otu nnyocha e mere na Mahadum New South Wales nakwa na Mahadum Mba Australia ma kwuo, sị: “Ọtụtụ n’ime anyị na-etinye oge ka ukwuu n’ọrụ nakwa n’ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ karịa ka ọ dị mkpa n’ezie.” Ndị nnyocha gbakọrọ oge ọ dị di na nwunye na-arụ ọrụ, bụ́ ndị na-ejighị ụmụ, mkpa ịrụ ọrụ iji nweta ihe ndị bụ́ isi e ji ebi ndụ. Mgbe ahụ, ha ji oge ahụ ha gbakọrọ tụnyere oge ha na-etinye n’ezie n’ihe omume ndị ahụ. Nnyocha ahụ gosiri na ndị di na nwunye na-arụ ọrụ, bụ́ ndị na-ejighị ụmụ, “tinyere ngụkọta nke awa 79 kwa izu n’ebe ọrụ, awa 37 n’ọrụ ụlọ nakwa awa 138 n’ilebara onwe ha anya, ma nanị ihe ọ dị mkpa ka ha jiri rụọ ọrụ bụ awa 20 kwa izu [awa 10 maka otu onye], awa 18 maka ọrụ ụlọ ma jiri awa 116 lekọta onwe ha anya [gụnyere iri ihe na ihi ụra],” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Ọ bụrụ na di na nwunye dị njikere ime ka ndụ ha dị mfe, ha pụrụ inweta ihe ruru 100 awa ọzọ ha ga-enwe ohere kwa izu. Nnyocha ahụ, dị ka The Australian si kwuo, na-egosi na ndị di na nwunye na-arụ ọrụ, bụ́ ndị na-ejighị ụmụ, “na-azọrọ na ha bụ ndị na-adịghị enwe ohere karịsịa, ma n’ezie, ọ bụ ha bụ ìgwè kasị enwe oge, ebe ndị mụrụ ụmụ na-akasị abụ ndị na-enweghị ohere.”
Ọrịa Shuga Na-arị Elu n’India
Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na ihe karịrị nde mmadụ 170 gburugburu ụwa na-arịa ọrịa shuga. India bụ mba kasị nwee ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ya—nde 32—a na-atụkwa anya na ọnụ ọgụgụ a ga-akarị nde 57 ka ọ na-erule afọ 2005, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Deccan Herald na-akọ. N’otu nnọkọ ezumezu mba nile e nwere na Sri Lanka banyere ọrịa shuga n’Eshia, ndị ọkachamara gụnyere nri na mgbanwe ụzọ ndụ dị ka isi ihe kpatara ịrị elu a dị ngwa, tinyere nrụgide, ihe ndị e ketara eketa, mmadụ adịghị arọ otú o kwesịrị mgbe a mụrụ ya, na inyebiga ụmụ ọhụrụ nri ókè. India so n’ebe ndị ọ na-efu ihe kasị ala iji gwọọ ọrịa shuga n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, nsogbu ahụ́ ike na ọnwụ ndị ọrịa shuga na-akpata ka nọgidere na-arị elu, ruo n’ókè ụfọdụ, ihe na-akpata ya bụ amaghị nke a na-akọ nakwa igbu oge tupu a chọpụta ọrịa ahụ. Otu nnyocha e mere n’obodo ndị bụ́ isi nke India gosiri na pasent 12 nke ndị toworo eto nọ n’India na-arịa ọrịa shuga, pasent 14 bụkwa ndị ahụ́ ha na-adịghị enwe ike ịgbari shuga bụ́ glucose nke ọma, bụ́ nsogbu na-abịakarị tupu mmadụ amalite ịrịa ọrịa shuga.
Ndị Europe Na-eme Agadi
“Europe Ochie na-eme nnọọ dị ka aha ya si dị,” ka akwụkwọ akụkọ Spen bụ́ El País na-akọ. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile so ná Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe, ya dịkarịa ala, pasent 20 nke ndị bi na ha agafewo afọ 60. Ndị ọkà n’ihe banyere ụba mmadụ na-ekwu na ka ọ na-erule afọ 2050, mmadụ 4 n’ime mmadụ 10 ọ bụla nọ n’ala ụfọdụ, dị ka Austria, Ịtali, na Spen, ga-agafe afọ 60. Mmewanye agadi a nke ọtụtụ mmadụ ga-achọ ka e mee mgbanwe ndị metụtara ọha na eze na akụ̀ na ụba, ka e kwuru ná Mgbakọ Ụwa Nile nke Abụọ Banyere Ime Agadi, bụ́ nke e nwere na Madrid, Spen. Ọ ga-esikwu ike ịkwụ ụgwọ ezumike nká na ịnshọransị ahụ́ ike. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ were ndị ọrụ katatụworo ahụ́, nwee atụmatụ ọrụ a pụrụ ịgbanwegharị agbanwegharị ma ọ bụ mee ka mmadụ abụọ na-arụ ọrụ otu onye gaara na-arụ, ma mee atụmatụ afọ ndụ dịgasị iche iche maka ịla ezumike nká. Ọzọkwa, “ebe ọ bụ na a ga-enwe mmadụ ole na ole na-akatabeghị ahụ́, ụlọ ọrụ ndị ga-achọ inwe ọganihu aghaghị ime ka ozi ndị ha na-eje na ihe ndị ha na-emepụta bụrụ maka ndị agadi,” ka otu onye ọchụ ntá ego Spen bụ́ Josep Maria Riera na-ekwu.
Mmụta Banyere Mmekọahụ Dị Mkpa Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ
Dị ka ọnụ ọgụgụ e nwetara n’aka gọọmenti na Germany si dị, n’agbata 1996 na 2001, ọnụ ọgụgụ nsikwopụ afọ ime ji ihe dị ka pasent 60 rịa elu n’etiti ndị dị afọ 15 ruo 17 ma jiri pasent 90 rịa elu n’etiti ụmụ agbọghọ na-erubedịghị afọ ndụ ahụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Der Spiegel na-akọ. Norbert Kluge, bụ́ onye nọ na Mahadum Koblenz-Landau, na-ekwu na n’agbanyeghị na ụmụaka na-amalitezi oké ngwa ngwa inwe mgbanwe ndị a na-enwe n’ahụ́ onye na-etopụta etopụta, ‘a naghị akụziri ha ihe ndị metụtara mmekọahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị—karịsịakwa a dịghị akụziri ha ya n’oge.’ Ọ dị mkpa ka a kụziere ụmụaka banyere ihe ndị metụtara ndụ tupu ha eruo afọ iri, ma ọtụtụ ndị nne na nna na-ezere ịrụ ọrụ dịịrị ha, ka Kluge na-ekwu. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Berliner Morgenpost si kwuo, onye nduzi nke Kansụl Mba nke Ndị Nne na Nna dị na Bonn na-adụ ndị nne na nna ọdụ ịdị na-ekwu okwu karị n’isiokwu ndị bụ́ banyere mmetụta uche, dị ka “ịhụnanya na mmekọrịta,” mgbe ha na-akụziri ụmụ ha ihe ndị metụtara mmekọahụ, karịa n’ihe banyere ụzọ e si eji akụkụ ahụ́ eme ihe.
Ozi E-Mail na Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya
Dị ka ndị nnyocha abụọ si kwuo, o yiri ka ndị e were n’ọrụ hà ga-agwa ndị ọrụ ibe ha na-arụkwa ọrụ n’otu okpukpu ụlọ ọrụ okwu site n’izigara ha ozi E-mail otú ha ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọrụ ibe ha ahụ na-arụ ọrụ ná mba ndị ọzọ nwegasịrị oge dị iche, ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Globe and Mail na-ekwu. N’ikwu banyere mmetụta ozi E-mail pụrụ inwe ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, David Crystal, bụ́ prọfesọ nke mmụta asụsụ na Mahadum Wales na-ekwu, sị: “Inweta nzaghachi mgbe mmadụ na-ekwu okwu bụ akụkụ bụ́ isi nke nkwurịta okwu,” ozi E-mail adịghịkwa ekwe ka e nwee nke a n’ihi oge ọ na-ewe inweta na ịzaghachi ozi. Ọzọkwa, onye na-ede ozi E-mail pụrụ ịdị na-ekwu nanị ya n’enweghị onye ga-akwụsịtụ ya. “Ikike nke ime onye kwutụ ibe ya ekwutụ,” ka Globe na-ekwu, “bụ akụkụ dị oké mkpa nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya.”
È Nwere Ụdị Usoro Akwara Abụọ?
Ụmụ mmadụ nwere usoro akwara pụrụ iche iji mata mgbe e gosiri ha ịhụnanya na ịdị nro, ka magazin Germany na-akọ ihe ndị metụtara sayensị bụ́ Bild der Wissenschaft na-akọ. Ndị ọkà mmụta sayensị nọ na Sweden chọpụtara na otu nwanyị nke na-enweghịzi mkpụrụ ndụ ndị bụ́ isi na-eme ka mmadụ mata mgbe e metụrụ ya aka ka nwekwararị mmetụta dị ụtọ mgbe e ji brọsh dị nro chie ya n’ahụ́. Mmetụta a dị ụtọ, ka ha chọpụtara, bụ nke usoro akwara dị iche nke dị n’ahụ́ kpatara, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ akwara ndị na-eji nwayọọ ebufe ozi bụ́ ndị a na-akpọ akwara C. Usoro akwara ahụ na-emeghachi omume mgbe e ji ụzọ dị nro metụ mmadụ aka ma kpalie akụkụ ụbụrụ ndị na-ahụ maka mmetụta uche. N’ikwu ihe mere ụmụ mmadụ pụrụ iji nwee usoro akwara abụọ dịgasị iche, akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune na-ekwu, sị: “Akwara ndị ahụ na-eji nwayọọ ebufe ozi na-amalite ọrụ ná mmalite nke ndụ mmadụ, ikekwe ọbụna n’akpa nwa, ebe usoro akwara ndị na-ebufe ozi ngwa ngwa na-eji nwayọọ nwayọọ apụta mgbe a mụsịrị mmadụ. Ụmụ ọhụrụ pụrụ inwe mmetụta ịhụnanya nke mmetụ aka nne ma ọ bụ nna ha tupu ha amatadị na e metụrụ ha aka.”