Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka M Ji Eche na Aghaghị M Izu Okè?

N’ihi Gịnị Ka M Ji Eche na Aghaghị M Izu Okè?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka M Ji Eche na Aghaghị M Izu Okè?

“Ebe ọ bụ na nna m bụ onye nkụzi, onye ọ bụla na-atụ anya na m kwesịrị inwe akara kasị elu n’ihe ọmụmụ nile. Mgbe ụfọdụ, ana m ebegide ákwá ụra eburu m.”—Leah. *

“Abụ m onye na-achọkarị izu okè. Aghaghị m ime ihe n’ụzọ kasị mma ma ọ bụ mee ya n’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe nke ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị ya, ọ dịghị uru ọ bụla ọ bara ime ya.”—Caleb.

Ị̀ NA-ECHE na ị ghaghị ime ihe mgbe nile n’ụzọ zuru okè? Ị̀ na-echegbu onwe gị mgbe nile na n’agbanyeghị ókè i mesiruru mgbalị ike, ị dịghị enwe afọ ojuju n’ihe ị rụzuru? Ọ̀ na-abụ ihe na-adịghị ekwe gị mee ịnabata ụdị nkatọ ọ bụla? Mgbe ihe na-agazighị agazi, ị̀ na-ata onwe gị ụta, na-akpọ onwe gị onye iberibe, onye na-erughị eru, ma ọ bụ onye na-abaghị n’ihe? Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e mezie ihe emezi, ị̀ na-eche na ị ghaghị ime ya n’onwe gị? Ị̀ na-atụ nnọọ ụjọ mgbe ụfọdụ na ị ga-akụ afọ n’ala nke na ị na-eyigharị ihe ma ọ bụ gharadị ime ihe ọ bụla?

Gịnị banyere mmekọrịta gị na ndị ọzọ? Ị̀ na-ahụta onwe gị dị ka onye na-enweghị enyi n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nọ gị nso nke ruru ihe ị chọrọ? Ị̀ na-echegbubiga onwe gị ókè banyere erughị eru na emezighị emezi nke ndị ọzọ? Ọ bụrụ na azịza gị nye nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a bụ ee, mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụ na gị na ihe a na-akpọ ịchọkarị izu okè na-alụ. Ọ bụrụkwa otú ahụ, ọ bụghị nanị gị nwere nsogbu dị otú ahụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa nwere àgwà ahụ—karịsịa ndị ntorobịa nwere nkà pụrụ iche ma ọ bụ ndị na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma. *

Gịnị na-akpata àgwà nke ịchọkarị izu okè? Ndị nchọpụta na-akọ nanị nkọ. Akwụkwọ bụ́ Perfectionism—What’s Bad About Being Too Good? (Ịchọkarị Izu Okè—Olee Ihe Ọjọọ Dị n’Ịdịbiga Mma Ókè?) na-ekwu, sị: “Ịchọkarị izu okè abụghị ọrịa; i buteghị ya ebute. A dịghị eketa àgwà nke ịchọkarị izu okè eketa; i bughị ya pụta ụwa. Ya mere olee otú i si ghọọ onye na-achọkarị izu okè? Ndị ọkachamara ụfọdụ kweere na àgwà nke ịchọkarị izu okè na-amalite n’oge mmadụ bụ nwata. Nrụgide ezinụlọ, nrụgide mmadụ na-akpatara onwe ya, nrụgide ndị ha na mmadụ na-akpakọrịta na-akpata, nrụgide ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akpata, na mmadụ ịgbaso ihe nlereanya nke ndị a ma ama n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya, na-ejikọ aka akpata mmetụta dị ukwuu nke na-eduba ụfọdụ ndị n’inwe nchekasị, obi amamikpe, na ịrụbiga ọrụ ókè ná ndụ ha nile.”

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, àgwà nke ịchọkarị izu okè pụrụ ibibi ndụ gị. Ka anyị lerukwuo anya n’àgwà nke ịchọkarị izu okè na ihe mere ọ pụrụ iji merụọ gị ahụ́.

Gịnị Bụ Ịchọkarị Izu Okè?

Ịchọkarị izu okè gụnyere ihe karịrị nnọọ ịgbalịsi ike ime ihe nke ọma ma ọ bụ inwe afọ ojuju n’ọrụ a rụziri arụzi. E kwuwerị, n’Ilu 22:29, (NW) Bible na-aja nwoke “nwere nkà n’ọrụ ya” mma. Bible na-ekwukwa okwu ọma banyere ọtụtụ ndị zụlitere nkà dị iche iche magburu onwe ha. (1 Samuel 16:18; 1 Ndị Eze 7:13, 14) Ya mere, ọ dị mma ịgbalịsi ike imezi ihe emezi, isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị dị elu ma bụrụ ndị a pụrụ iru eru. N’ụzọ dị otú ahụ, mmadụ pụrụ ịdị “na-emekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.”—Eklisiastis 2:24.

Otú ọ dị, onye na-achọkarị izu okè adịghị enweta afọ ojuju dị otú ahụ. Ọ dịghị ele ịrụzu ihe anya n’ụzọ ziri ezi. Dị ka ndị ọkachamara ụfọdụ si kwuo, àgwà nke ịchọkarị izu okè na-agụnye “ihe mgbaru ọsọ ndị a na-apụghị iru eru (ya bụ izu okè), na enweghị afọ ojuju mgbe nile n’agbanyeghị ihe a rụzuru.” N’ihi ya, àgwà nke ịchọkarị izu okè bụ “ihe na-anọgide na-akpata nchekasị, nke na-emekarị ka onye ahụ na-eche na ya abaghị uru.” Ya mere, otu akwụkwọ na-akọwa ịchọkarị izu okè dị ka “nkwenye ezi uche na-adịghị na ya bụ́ na gị na/ma ọ bụ gburugburu ebe ị nọ aghaghị izu okè.” Ọ bụ “àgwà na-emetụta akụkụ nile nke ndụ nke bụ́ na ị ghaghị ime ihe ọ bụla ị na-anwa ime ná ndụ n’ụzọ zuru nnọọ okè n’ehieghị ụzọ, n’emehieghị ihe, ma ọ bụ n’emeghị ihe ndị na-ekwekọrịtaghị ekwekọrịta.”

Ma, ọ̀ bụ na Jizọs ekwughị, sị: “N’otu aka ahụ unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè”? (Matiu 5:48) Ee, ma Jizọs adịghị ekwu na mmadụ pụrụ izu okè n’ụzọ nile. E kwuwerị, Bible na-akụzi na “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Gịnịzi ka Jizọs bu n’uche? N’ime Bible, okwu ahụ bụ́ “izu okè” pụtakwara izu ezu. (Matiu 19:21) Mgbe Jizọs kwuru na anyị aghaghị izu okè, ọ nọ na-ekwu banyere ịhụnanya ma na-agba ụmụazụ ya ume ịbụ ndị nwere ịhụnanya n’ụzọ zuru ezu. Olee otú ha ga-esi eme nke ahụ? Ọ bụ site n’ime ka ịhụnanya ha gbasapụ agbasapụ ruo ọbụna ndị iro ha. Luk, bụ́ onye so dee Bible, dere na Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-eme ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.”—Luk 6:36.

Otú ọ dị, ndị na-achọkarị izu okè na-enwe echiche na-ezighị ezi bụ́ na o kwere omume izu okè n’ụzọ nile. N’ihi ya, ha pụrụ ịtụ anya ihe dị ukwuu n’aka ndị ọzọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Never Good Enough—Freeing Yourself From the Chains of Perfectionism (Enweghị Afọ Ojuju n’Ihe Ọ Bụla—Ịtọhapụ Onwe Onye n’Agbụ nke Ịchọkarị Izu Okè) si kwuo, ndị na-achọkarị izu okè bụ “ndị na-enwe nkụda mmụọ banyere ụzọ ndị ọzọ yiri ka hà si arụ ọrụ ha . . . N’echiche ha, ndị nọ gburugburu ha adịghị enwe ọchịchọ ịrụ ọrụ dị mma, ha adịghịkwa enwe afọ ojuju n’ihe ha rụzuru.”

Dị ka ihe atụ, Carly na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ebe ọ bụ na e denyere aha ya n’usoro agụmakwụkwọ maka ụmụ akwụkwọ nwere nkà pụrụ iche. Otú ọ dị, o nwechabeghị ihe ịga nke ọma ná mmekọrịta ya na ndị mmadụ. Ebe ọ bụ na ọ na-achọ ka e mee ihe nile n’ụzọ zuru okè, ọtụtụ n’ime ndị enyi ya ahapụwo ya. “Echere m na ha ezutụghị nnọọ okè,” ka ọ na-akọwa.

Ndị ọzọ pụrụ ịchọ izu okè, ọ bụghị n’aka ndị ọzọ, kama n’aka ha onwe ha. Akwụkwọ bụ́ Never Good Enough na-akọwa na ndị dị otú ahụ na-eche na “ha onwe ha ma ọ bụ omume ha adịghị mma otú o kwesịrị . . . , [ha] na-echegbukarịkwa onwe ha banyere ihe ndị ọzọ na-eche banyere ha.”

Nsogbu nke Dị n’Ịchọkarị Izu Okè

Kama ịbụ nke dị mma na nke bara uru, àgwà nke ịchọkarị izu okè na-abụkarị nke dị njọ na nke na-ebibi ihe. Kama ime ka e mee ihe n’ụzọ kasị mma, echiche dị otú ahụ na-akpatakarịkwa ọdịda. Otu nwoke bụ́ Onye Kraịst nke aha ya bụ́ Daniel na-echeta na ya rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ awa n’okwu nke e kenyere ya ikwu na klas Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha. Ọtụtụ ndị na-ege ntị jara ya mma maka okwu o kwuru nke ọma. E mesịa, Daniel nwetara aro ndị bara uru, bụ́ ndị onye nduzi ụlọ akwụkwọ ahụ ji nkà nye ya. Bible na-agba anyị ume ka anyị “nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị.” (Ilu 19:20) Ma kama ịnabata ihe ndị a gwara ya ka o meziwanye, Daniel chere na ya kụrụ afọ n’ala. “Ọ dị m ka ala meghee ka m danye,” ka ọ na-echeta. O highị ụra ruo ọtụtụ izu.

N’ihi ya, àgwà nke ịchọkarị izu okè pụrụ igbochi mmadụ ịmụta ihe. N’otu isiokwu nke pụtara n’ebe a na-edebere ndị ntorobịa ihe ọmụma n’Intanet, otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Rachel dere, sị: “Mgbe m banyere ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ekpebisiri m ike na m ga-eme nke ọma. Ana m enwekarị akara ule ndị kasị elu, ahụghịkwa m ihe mere nke ahụ ga-eji gbanwee.” Ma Rachel chọpụtara n’oge na-adịghị anya na ya nwere nsogbu n’ụdị mgbakọ na mwepụ bụ́ algebra, o nwetakwara “nanị” akara ule ji obere ihe dị ala karịa ka ọ na-enwebu. “Nye onye ọ bụla ọzọ, nke a bụ ezigbo akara ule,” ka Rachel na-echeta, “ma nye m . . . ọ bụ ihe ihere. Amalitere m ịtụ ụjọ na inwe nchegbu . . . Ụjọ ekweghị m ịrịọ onye nkụzi m maka enyemaka n’ihi na echere m na ọ bụrụ na m ekweta na enyemaka dị m mkpa iji mee ihe omume m, ọ ga-abụ ikweta na m aghọtaghị ya. . . . Mgbe ụfọdụ, ọ na-afọdụ nke nta ka m kweta na ọ ka mma ịnwụ anwụ karịa ịda ule.”

N’ịbụ ndị egwu ọdịda kpaliri, ndị ntorobịa ụfọdụ ọbụna echewo echiche igbu onwe ha. Ọ dị mma na ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa adịghị eche echiche ime ihe dị otú ahụ jọgburu onwe ya. Ma dị ka ọkachamara ahụ́ ike nke uche bụ́ Sylvia Rimm na-ekwu, ha pụrụ ịnwa izere ọdịda site n’emeghị ihe ọ bụla ma ọlị. Dị ka Rimm si kwuo, ụfọdụ ndị na-achọkarị izu okè “adịghị enye onye nkụzi ha ihe omume ha, ha adịghị enwe afọ ojuju n’ọrụ ha, ha adịghị echeta ime ihe omume ha, ha na-eme ngọpụ dị iche iche.”

N’aka nke ọzọ, ndị ntorobịa ndị ọzọ pụrụ ime ihe n’ụzọ nke ọzọ gabigara ókè iji jide n’aka na ha nwere ihe ịga nke ọma. “Ana m amụ anya ruo ime ime abalị na-arụ ọrụ n’ihe omume ụlọ akwụkwọ m iji meta ha nnọọ nke ọma,” ka Daniel na-ekweta. Ihe bụ́ nsogbu bụ na imebiga ihe ókè otú ahụ adịkarịghị arụpụta ihe e bu n’uche eme ya. Nwa akwụkwọ na-ero ụra pụrụ ịda ule karịa ndị ọzọ.

Ka a sịkwa ihe mere e jiworo jikọta ịchọkarị izu okè na iwe na-enweghị nkwụsị, enwechaghị ùgwù onwe onye, obi amamikpe, enweghị nchekwube, nsogbu iri ihe, na ịda mbà n’obi. Otú ọ dị, nke kasị njọ na ha nile bụ na ịchọkarị izu okè pụrụ imerụ mmadụ ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-enye Ndị Kraịst iwu ikwupụta okwukwe ha. (Ndị Rom 10:10; Ndị Hibru 10:24, 25) Otú ọ dị, otu onye ntorobịa aha ya bụ Vivian jụrụ ịza ajụjụ ná nzukọ Ndị Kraịst n’ihi ịtụ ụjọ na ya pụrụ ikwuhie ihe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Leah kwupụtara egwu yiri nke ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na m ekwuhie ihe, ndị ọzọ ga-abịa nwee echiche na-ezighị ezi banyere m. N’ihi ya, m na-agbachiri onwe m nkịtị.”

Ya mere, n’ụzọ doro anya, àgwà nke ịchọkarị izu okè na-emerụ ahụ́ ma bụrụ nke na-adịghị mma. Ọ bụrụkwa na i nwere nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a kọwara n’isiokwu a, ị pụrụ ịhụ mkpa ọ dị ime mgbanwe ụfọdụ n’otú i si eche echiche. Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụle otú ị pụrụ isi mee nke ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 6 Dị ka otu nnyocha e mere gosiri, pasent 87.5 nke ụmụ akwụkwọ ndị nwere nkà pụrụ iche n’otu ụlọ akwụkwọ nwere àgwà nke ịchọkarị izu okè.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ịtụ ụjọ ọdịda na-egbochi ụfọdụ ndị ntorobịa imecha ihe omume ha

[Foto dị na peeji nke 13]

Àgwà nke ịchọkarị izu okè pụrụ ịkpata ịda mbà n’obi nakwa enwechaghị ùgwù onwe onye