Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tahiti—Na Ọchịchọ A Na-achọ Paradaịs

Tahiti—Na Ọchịchọ A Na-achọ Paradaịs

Tahiti—Na Ọchịchọ A Na-achọ Paradaịs

Ruo ọtụtụ ụbọchị, osimiri Pacific anọwo na-ebugharị ụgbọ ahụ. N’okpuru anwụ na-achasi ike, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ike na-adịghị agwụ agwụ nọgidere na-eme otu ihe ahụ ha na-eme mgbe dum, obi abụọ adịghịkwa ya na ike ịṅụ mmanya gbara ụka, mmiri na-esi ajọ ísì, na nri mara ebu agwụla ha. Na mberede, otu olu dara, sị: “Leenụ ala akọrọ! Leenụ ala akọrọ n’ebe aka ekpe n’ihu!” N’ebe dịpụrụ adịpụ n’ihu, a pụrụ ịhụ elu elu dị inyoghi inyoghi nke otu àgwàetiti. Mgbe awa ole na ole gasịrị, anyị enwekwaghị obi abụọ ọ bụla—anyị eruwela n’otu àgwàetiti.

Kemgbe ndị Europe chọpụtara ya, Tahiti aghọwo okwu ọzọ a pụrụ iji mee ihe maka okwu ahụ bụ́ “paradaịs.” Onye France na-eme nchọpụta na narị afọ nke 18 bụ́ Louis-Antoine de Bougainville, bụ́ onye ndú nke njem ahụ a kọwara ná mmalite, mechara dee, sị: “Echere m na ọ bụ n’ogige Iden ka e bu m jee.” Narị afọ abụọ ka e mesịrị, Tahiti nọgidere na-adọta ndị ọbịa. Dịkwa ka ndị bu ha ụzọ, ọtụtụ na-abịa ịchọ paradaịs.

Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka okwu banyere paradaịs na-eji amasị nnọọ ụmụ mmadụ? Oleekwa ihe mere e ji ele Tahiti anya dị ka ebe mezuru ọchịchọ ahụ? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị laghachi azụ ná mmalite nke mmadụ.

Paradaịs Furu Efu

Ọ dị ezi ihe mere okwu ahụ bụ́ “paradaịs” ji amasị anyị. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, e kere anyị ibi n’ime Paradaịs! Dị ka Bible si kwuo, Chineke ji ebe obibi mara mma nke a kpọrọ “paradaịs”—ogige ma ọ bụ ubi mara mma—gọzie nne na nna anyị mbụ. (Jenesis 2:8) Ihe àmà na-egosi na ogige a dị n’otu akụkụ nke ógbè a na-akpọ Iden, nke pụtara “Ihe Ụtọ.” Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta nke oge a na-adị ele Iden anya dị ka akụkọ ifo, Bible na-akọwa ya dị ka ebe dịbu adị, na-enye ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya banyere akụkụ ụwa ebe ọ dịbu. (Jenesis 2:10-14) A pụghịzi ịhụ ihe abụọ e ji amata ebe ọ dị—osimiri Paịshọn na Gaịhọn. N’ihi ya, ọ dịghịzi onye maara kpọmkwem ebe ogige ahụ dị ugbu a.

Nne na nna anyị mbụ mehiere megide Chineke ma tụfuoro anyị nile Paradaịs. (Jenesis 3:1-23) Ka o sina dị, mmadụ enwebeghị ike iwepụ ọchịchọ maka paradaịs n’obi ya. Ụfọdụ ihe ndị dị n’akụkọ Bible apụtawo ọbụna n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ọtụtụ ala. Dị ka ihe atụ, ndị Gris nwere akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme banyere Ọgbọ Ọma—oge ọma mgbe ndụ na-agara ihe a kpọrọ mmadụ were were, ha dịkwa n’udo.

Ọtụtụ ndị agbalịwo ịchọta Iden ahụ bụ́ nke fuworo efu eri oge dị anya. Ụfọdụ chọrọ Iden n’Etiopia—n’ezie, ha achọtaghị ya. Ọbụna akụkọ mgbe ochie na-ekwu na otu ụkọchukwu nke biri ndụ na narị afọ nke isii nke aha ya bụ Brendan chọtara paradaịs n’otu àgwàetiti dị na ndịda ọdịda anyanwụ Atlantic. Akụkọ mgbe ochie ndị ọzọ na-akọ na paradaịs dị n’ebe zoro ezo nke otu ugwu dị elu. N’ịbụ onye ndịrịta iche ndị e nwere n’akụkọ mgbe ochie ndị a gwụrụ ike, otu onye na-eme nchọpụta a ma ama bụ́ Christopher Columbus kwara arịrị, sị: “Ahụtụbeghị m ma ọ bụ gụọ ihe ọ bụla e dere na Latin ma ọ bụ na Grik nke kwuru kpọmkwem akụkụ ụwa ebe a pụrụ ịchọta paradaịs elu ala ahụ.” N’ikpeazụ, o kwetara na ọ dị n’otu ebe n’ebe ndịda nke akara kere ụwa abụọ.

Mgbe Columbus mesịrị njem nke atọ ya gaa n’Ụwa Ọhụrụ ahụ, o kwuru, sị: “O yiri ka ala a ọ̀ bụ paradaịs elu ala, n’ihi na o kwekọrọ ná nkọwa ndị senti na ndị ọkà mmụta okpukpe ndị m kpọtụworo aha.” Otú ọ dị, Ụwa Ọhụrụ ahụ emechaghị bụrụ paradaịs ahụ Columbus chere na ọ bụ.

Ọnọdụ Izu Okè Ndị Na-abịa n’Ihu

Ka o sina dị, ike agwụghị ụfọdụ ndị ọkà mmụta. Kama ikwu na a ga-alaghachi n’Iden, ha malitere ịkụzi nkwenkwe bụ́ na a ga-enwe paradaịs mmadụ mere n’ọdịnihu. Ndị edemede malitere ịrọ akụkọ banyere obodo ebe e nwere ọnọdụ “zuru okè”—ọdịiche magburu onwe ya pụọ n’obodo ebe ndị e nwere ọnọdụ rụrụ arụ nke ha bi na ha. Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime atụmatụ ndị a mara mma nke yiri Iden n’ezie. Kama iji anya nke uche hụ ndụ nnwere onwe n’ime ogige nke na-enweghị nsọtụ, ndị ọkà mmụta a na-eche banyere paradaịs a haziri nnọọ ahazi n’obodo mepere emepe. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke 16, onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị na Britain bụ́ Sir Thomas More kọrọ banyere njem o ji uche mee gaa n’ala ọ kpọrọ Ebe Ihe Nile Zuru Okè. Okwu Bekee o ji mee ihe maka nke a pụtara “ebe na-adịghị adị.”

Ndị edemede ndị ọzọ kwalitekwuru echiche More site n’itinyekwu echiche ole na ole nke ha. N’ime narị afọ iri ndị sochirinụ, ọtụtụ ndị edemede nọ na Europe ji anya nke uche hụ “Ebe Ihe Nile Zuru Okè.” Ọzọkwa, obodo ndị a “mara mma” abụtụghị ogige nke ihe ụtọ. Ndị a na-achọ ka e nwee Ebe Ihe Nile Zuru Okè nwara iweta obi ụtọ site n’ịmanye ndị mmadụ irube isi n’iwu ndị siri oké ike. Ma site n’ime nke ahụ, ha gbochiri ikike nke mmadụ iche echiche n’onwe ya nakwa inwere onwe ya. Otú ọ dị, dị ka onye prọfesọ n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ Henri Baudet, si kwuo, ọchịchọ nke inwe Ebe Ihe Nile Zuru Okè kpughere “ọchịchọ na-adịghị ebelata ebelata maka ndụ ka mma . . . na òtù ụmụ mmadụ na-eme ezi omume karị.”

Tahiti—Mmalite nke Akụkọ Mgbe Ochie

Na narị afọ nke 18, ebe ndịda Oké Osimiri nke a na-achọbeghị ihe na ya nyere ndị na-eme nchọpụta ohere ikpeazụ maka ịchọta paradaịs ahụ a na-achọpụtabeghị. Ma mgbe Bougainville banyere ụgbọ mmiri gawa Pacific na December 1766, ebumnobi ya bụ́ isi bụ ịchọpụta ihe, imeri ógbè ndị ọhụrụ na imeghe ohere ndị ọhụrụ maka azụmahịa.

Ka Bougainville nọsịrị ọtụtụ ọnwa n’ụgbọ mmiri, ọ bịarutere Tahiti. Ọ tụdalighị arịlịka n’ala mmiri n’àgwàetiti ndị ọzọ ọ hụworo n’ihi nkume ndị jupụtara n’ime mmiri ha. Tahiti nwere ọdụ ụgbọ mmiri na-adịghị ize ndụ. N’ebe ahụ ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ike gwụworo hụrụ ndị nabatara ha nke ọma na ihe ndị ha chọrọ. Nye ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ, ihe a hụrụ n’anya ka akụkọ e chepụtara echepụta. Ọ bụghị nanị na Tahiti bụ paradaịs nke dị n’ebe okpomọkụ, kamakwa o nwere ọtụtụ ihe ndị yiri Ebe ahụ Ihe Nile Zuru Okè nke a kọrọ n’akụkọ ifo.

Ma ọ dịghị ihe ọzọ, Tahiti bụ obodo dị n’àgwàetiti, dị nnọọ ka Ebe Ihe Nile Zuru Okè nke a kọrọ n’akụkọ ifo. Ọzọkwa, o yiri paradaịs n’ezie. Ọtụtụ narị osimiri na-achị ọkụ na nsụda mmiri dịgasị n’ala ndị magburu onwe ha bụ́ ndị akwụkwọ ndụ jupụtara na ha. O yiri nnọọ ka ihe ọkụkụ ndị na-eme nke ọma bụ́ ndị a na-ahụ n’ebe okpomọkụ hà na-eto n’enweghị onye rụrụ ọrụ maka ha. Ọnọdụ ihu igwe dị mma na onwunwe Tahiti na-enweghị ihe ize ndụ ndị a na-enwekarị n’ebe okpomọkụ, tinyekwuru ihe n’ịma mma ya. Agwọ, ahụhụ ndị dị ize ndụ, ma ọ bụ ugwu ndị na-agbọpụta ọkụ adịghị n’àgwàetiti a.

Ọzọkwa, ndị obodo Tahiti n’onwe ha yiri ka hà kwekọrọ ná nkọwa e nyere ndị bi n’ebe ahụ ihe nile zuru okè—ha toro ogologo, maa mma ma gbasie ike. Ezé na-enwu ọcha nke ndị Tahiti dọọrọ mmasị ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ezé gwụrụ n’ọnụ, ndị agbụ̀ ha zara aza n’ihi ọrịa ezé. Ndị bi n’ebe ahụ nwekwara ihu ọchị; ha dọọrọ mmasị nke ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ozugbo site n’afọ ọma ha. N’ile ha anya n’elu elu, o yikwara ka ndị Tahiti nile ha hà nhata—otu n’ime isi ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ọgụgụ nke ndị na-akụzi banyere Ebe Ihe Nile Zuru Okè. Ha amaghị ihe bụ́ ịda ogbenye. Tahiti enweghị ihe mgbochi ọ bụla ma a bịa n’ihe banyere mmekọahụ. N’ezie, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ sooro ụmụ agbọghọ ndị Tahiti mara mma na-enwe mmekọahụ.

Ee, nye Bougainville na ndị òtù ya, Tahiti yiri ka ọ̀ bụ Iden e nwetaghachiri. Bougainville hapụziri àgwàetiti ahụ lawa, na-enwe oké mmasị ịga kọọrọ ụwa banyere paradaịs ọ chọtara. Mgbe o mezuru njem afọ atọ ya gbaa ụwa gburugburu, o bipụtara ihe ndị o dere banyere ahụmahụ ya. N’ịbụ nke kasị gaa ahịa n’oge ahụ, akwụkwọ ahụ kpatara echiche ụgha bụ́ na àgwàetiti ahụ mara mma bụ ebe zuru okè n’ụzọ ọ bụla. E tụfuwo paradaịs, ma o yiri ka Tahiti ọ̀ bụ paradaịs e nwere ugbu a!

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Inwe Echiche Ụgha

Otú ọ dị, echiche ụgha na-emegidekarị ihe ndị bụ́ eziokwu. Dị ka ihe atụ, ndị Tahiti na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ dị nnọọ ka ndị ọzọ. Kama ha nile ịha nhata, a na-achị ha ọchịchị aka ike, mgbe ụfọdụ ọchịchị nchịgbu site n’aka ndị nọ n’ọkwá dị elu. Ha lụrụ agha agbụrụ, jirikwa ụmụ mmadụ chụọ àjà. Dị ka ndị mmadụ n’ozuzu ha, ọ bụghị ndị Tahiti nile mara ezigbo mma. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ K. R. Howe kwetara na ọ pụrụ ịbụ na a ‘manyere ụmụ nwanyị ahụ ndị òtù Bougainville zutere isoro ha nwee mmekọahụ’ iji wee mee ka obi dị ndị ahụ bịara ịwakpo ha mma.

Ka o sina dị, echiche ụgha banyere “paradaịs e nwetaghachiri” mụbara. Ndị edemede na ndị nkà n’ise ihe osise, dị ka onye France bụ́ ọkà n’ise ihe bụ́ Paul Gauguin, gachara ebe ahụ. Ihe osise ndị magburu onwe ha Gauguin sere banyere ihe ndụ dị ka ya na Tahiti mere ka àgwàetiti ahụ bụrụkwuo ebe na-ewu ewu. Gịnị ka nke a kpataara Tahiti? Echiche ụgha ndị ahụ mere ka a na-ele àgwàetiti ahụ na ndị bi na ya anya n’ụzọ dịbigara mfe ókè. Mgbe ndị mmadụ si n’àgwàetiti ahụ lọta, a na-agwakarị ha, sị, “Gwanụ anyị otú unu na ụmụ agbọghọ ndị Tahiti si gaa.”

Paradaịs—Ọ̀ Bụ Ihe Olileanya Na-adịghịzi Maka Ya?

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Tahiti chere nsogbu ndị ọzọ ihu. Ajọ ifufe na oké mmiri ozuzo kpara ike ugboro ugboro n’àgwàetiti ahụ ná mmalite nke afọ ndị 1980 ma bibie nkume ndị dị n’oké osimiri ya. Ma iyi egwu kasị ukwuu ndị ha nwere sitere n’aka ụmụ mmadụ n’onwe ha. Ihe owuwu ndị a na-ewu n’ebe ahụ emewo ka e nwee nrichapụ nke ájá na mmetọ gburugburu ebe obibi. Donna Leong, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ikpofu unyí, kwuru, sị: “Ụlọ ọrụ na-ahụ maka njem nleta na-emepụta unyí dị nnọọ ukwuu . . . Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere banyere mmetọ a na-emetọ gburugburu ebe obibi ha, Tahiti na àgwàetiti ndị ọzọ agaghịzi abụ ebe akwụkwọ ndụ na-eto nnọọ nke ọma na nke nwere ọdọ mmiri ndị na-egbuke egbuke.”

Ka o sina dị, a ka na-enwe olileanya maka paradaịs e weghachiri. Leenụ, Jizọs Kraịst n’onwe ya kwere onye mmehie nke nwere nchegharị nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”! (Luk 23:43) Jizọs adịghị ezo aka n’otu akụkụ ụwa Ebe Ihe Nile Zuru Okè, dị ka e si kọọ ya n’akụkọ e chepụtara echepụta, kama ọ na-ezo aka na paradaịs zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke ọchịchị eluigwe ga na-ahụ maka ya. * Ihe karịrị Ndịàmà Jehova 1,700 nọ na Tahiti nwere olileanya na Paradaịs a nke na-abịa n’ihu. Ha na-ewepụta oge ha isoro ndị agbata obi ha kerịta olileanya ahụ. Ọ bụ ezie na Tahiti nke mara mma nwere ihe ndị yiri paradaịs na ya, ọ dịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Paradaịs zuru ụwa ọnụ nke Chineke ga-eweta n’oge na-adịghị anya. Ọchịchọ a na-achọ Paradaịs a abụghị n’efu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nkwa Chineke maka Paradaịs, lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

Tahiti yiri Paradaịs mara nnọọ mma

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ihe William Hoges sere, 1766

Yale Center for British Art, Paul Mellon Collection, USA/Photo: Bridgeman Art Library

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị Tahiti nwere omume enyi nabatara Bougainville nke ọma

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke e nwetara n’aka Ọ́bá Akwụkwọ Mba Australia NK 5066

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ ịkọrọ ndị agbata obi ha banyere Paradaịs nke na-abịanụ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 17]

Foto e nwetara n’aka Tahiti Tourisme

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 19]

Peeji nke 18: Ndị na-akwọ ụgbọ epeepe, nsụda mmiri, na ihe dị n’azụ ihe osise: Foto ndị e nwetara n’aka Tahiti Tourisme