Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkọ Ya Nwere Mmetụta Dị Ukwuu

Akụkọ Ya Nwere Mmetụta Dị Ukwuu

Akụkọ Ya Nwere Mmetụta Dị Ukwuu

N’afọ Ginny, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na United States, na-agụsị akwụkwọ, o nwetara ohere magburu onwe ya nke ikwu okwu banyere okpukpe ya. “Onye nkụzi anyị gwara klas anyị ka anyị dee banyere otu isiokwu n’oge anyị na-agụsị akwụkwọ,” ka ọ na-ekwu. “Agwara m ya na m chọrọ ide banyere Ndịàmà Jehova nọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi.”

Onye nkụzi ahụ nyere Ginny ikike ka ọ gaa n’ihu n’ide banyere isiokwu ahụ. “Ahụ́ malitere ịma m jijiji mgbe oge ruru ka m nyefee akwụkwọ m ma kwuo okwu n’ihu klas,” ka Ginny na-ekweta. “Amaghị m ihe ụmụ klas m ga-ekwu, amaghịkwa m ma hà ga-akwa m emo.”

Ginny malitere okwu ya site n’ịjụ, sị: “Ọ̀ dị onye maara ndị a dụnyere Kpakpando Devid n’uwe ha n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi?” Mmadụ nile kwuru, sị, “Ọ bụ ndị Juu.” Mgbe ahụ, ọ jụrụ ma ọ̀ dị onye maara ndị a dụnyere purple triangle n’uwe ha. Ọ dịghị onye zaghachirinụ. “Agwara m ha na ọ bụ Ndịàmà Jehova,” ka Ginny na-ekwu.

Ihe Ginny kwuru masịrị onye nkụzi ahụ na ụmụ klas ya. “Ọ tụrụ ha n’anya mgbe ha nụrụ na Ndịàmà Jehova gaara enwere onwe ha ma a sị nnọọ na ha bịanyere aka ná mpempe akwụkwọ iji jụ okwukwe ha,” ka Ginny na-ekwu. “Ka e mesịrị, ụfọdụ n’ime ụmụ klas m gwara m na ha na-akwabu Ndịàmà Jehova emo, ma na ọ bụrụ na otu n’ime Ndịàmà Jehova abịa na nke ha ọzọ, na ha ga-ege ntị.”

Ginny nwetara akara dị nnọọ elu maka ihe omume ya. “Ọ bụghị nanị na m nwetara akara dị elu,” ka ọ na-ekwu, “enwetakwara m ohere magburu onwe ya nke ikwu okwu banyere okpukpe m!”

[Foto dị na peeji nke 30]

A gwara ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na ha ga-enwere onwe ha ma ọ bụrụhaala na ha abịanye aka n’akwụkwọ a iji jụ okwukwe ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke United States Holocaust Memorial Museum