Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bịa, Nụrụ Okwu Ihu Ọha Bụ́ “Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?”

Bịa, Nụrụ Okwu Ihu Ọha Bụ́ “Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?”

Bịa, Nụrụ Okwu Ihu Ọha Bụ́ “Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?”

Nye ndị na-eji okpukpe akpọrọ ihe, echiche nke inye Chineke otuto pụrụ ịbụ ihe na-eju anya. Ọ̀ bụ na Chineke abụghị Eze Kachasịnụ nke eluigwe na ala? Oleezi otú mmadụ nkịtị pụrụ isi nye ya otuto? Nke ahụ ga-ekwe omume, n’ihi na Bible na-agba anyị ume ka anyị ‘na-atụ egwu Chineke ma na-enye ya otuto.’ (Mkpughe 14:7) Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a bụ site ‘n’ịnụ okwu Chineke ma na-edebe ya.’ (Luk 11:28) N’ezie, site n’ịmụ Bible na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya, anyị na-ewetara Onye Chepụtara ya, bụ́ Jehova Chineke, otuto na nsọpụrụ.

Ma olee ndị na-enye Chineke otuto taa n’ụzọ dị otú a? Ọtụtụ ijeri mmadụ na-azọrọ na ha na-eji okpukpe akpọrọ ihe, ma nke a ọ̀ gwụla ihe a chọrọ? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ụzọ anyị na-esi efe ofufe na-amasị Chineke ma na-enye ya otuto? A ga-aza ajụjụ ndị a n’okwu na-akpali akpali bụ́ “Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?” A ga-ekwu okwu ihu ọha a ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova nke ga-amalite n’October. A ga-enwe ọtụtụ narị mgbakọ dị otú ahụ gburugburu ụwa. Iji chọta ebe kasị dịrị gị nso, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ógbè unu, ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. Magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche, mbipụta nke May 1, 2003, nwere ndepụta nke ebe ndị a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.