Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 24. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. N’ihe ndekọ Bible, olee di na nwunye mbụ e liri n’ọ́gbà Makpila nke dị nso na Hibrọn, olee ndị ọzọkwa a maara bụ́ ndị e liri n’ebe ahụ? (Jenesis 49:29-33; 50:13)

2. Olee nwa Devid a maara n’ihi mma dị egwu ọ mara? (2 Samuel 14:25)

3. Olee mba Pọl onyeozi bụ nwa amaala ya site n’ọmụmụ? (Ọrụ 22:25-28)

4. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka e nyere Adam banyere osisi ahụ a machibidoro iwu? (Jenesis 2:17)

5. Mgbe Eze Rehoboam jụsịrị arịọrọ ndị Izrel rịọrọ ya, ònye ka Rehoboam zigaara ebo ndị ahụ dị n’ebe ugwu, bụ́ ndị nupụrụ isi, gịnịkwa mere nwoke ahụ? (2 Ihe Emere 10:18)

6. Gịnị bụ isi ihe Jizọs na-ekwu mgbe ọ sịrị na “ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ”? (Matiu 6:24)

7. Mgbe Jehova nyere ndị Izrel mana ka ha rie, gịnị mere nke ọ bụla ha na-achịkọtaghị? (Ọpụpụ 16:21)

8. Ònye raara Jizọs nye? (Luk 6:16)

9. Olee chi bụ́ isi nke ndị Amọn? (2 Samuel 12:30)

10. Olee akụkụ ahụ́ mmadụ nke a na-ejikarị eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible iji gosi inwe ume na ịkpa ike? (Jeremaịa 32:17)

11. Ònye gwara Eze Ahasuerọs na e kwesịrị iwetu Vashti ma were eze nwanyị ọzọ dochie ya? (Esta 1:14-20)

12. Olee otú Mozis si mee ka mmiri Mara ahụ nke na-elu ilu dị ụtọ? (Ọpụpụ 15:23-25)

13. Olee ebe ụmụ Izrel si zọlie ije n’oge Ọpụpụ ha? (Ọpụpụ 12:37)

14. Ònye kọọrọ Josaịa ọganihu e nwere n’ọrụ ịrụzi ụlọ nsọ ahụ, ma gụọrọ eze “akwụkwọ iwu ahụ” a chọtara na ya? (2 Ndị Eze 2:8-10)

15. Olee otú ịnyịnya ndị ahụ Jọn hụrụ ná mkpughe ahụ na-acha, gịnịkwa ka ha sere onyinyo ha? (Mkpughe 6:2-8)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ebreham na Sera; ndị ọzọkwa bụ Aịzik, Rebeka, Lia, na Jekọb

2. Absalọm

3. Rom

4. “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya, ị ghaghị ịnwụ anwụ”

5. Hadoram, bụ́ onyeisi usuu ndị na-efe ofufe. E ji nkume tụgbuo ya

6. “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba”

7. “Mgbe anyanwụ dị ọkụ, ọ gbazee”

8. Judas Iskarịọt

9. Malkam

10. Ogwe aka

11. Memukan, ọnụ na-ekwuru ndị isi asaa nke Midia na Peasia

12. “Jehova mere ka ọ hụ otu osisi, ọ tụba ya na mmiri ahụ”

13. Rameses

14. Shefan, bụ́ odeakwụkwọ eze

15. Ọcha—agha ezi omume; uhie uhie—agha ụmụ mmadụ; ojii—ụnwụ nri; chanwụrụ achanwụ—ọnwụ