Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ 6 Isi Chekwaa Ahụ́ Ike Gị

Ụzọ 6 Isi Chekwaa Ahụ́ Ike Gị

Ụzọ 6 Isi Chekwaa Ahụ́ Ike Gị

Ihe Ịma Aka n’Ala Ndị Na-emepe Emepe

ỌTỤTỤ ndị taa aghaghị itinye mgbalị dị ukwuu iji nọgide na-adị ọcha, karịsịa n’ala ndị mmiri dị ọcha na usoro mkpofu ihe kwesịrị ekwesị dị ụkọ. Ma, mgbalị ọ bụla e mere iji nọgide na-adị ọcha efughị ọhịa. A na-eme atụmatụ na ihe na-akpata ihe karịrị ọkara nke nrịanrịa nile na ọnwụ nke ụmụaka bụ nje ndị na-abanye ha n’ọnụ site n’aka ruru unyi ma ọ bụ nri na-adịghị mma ma ọ bụkwanụ mmiri na-adịghị ọcha. A pụrụ igbochi ọtụtụ nrịanrịa, karịsịa afọ ọsịsa, site n’itinye aro ndị na-esonụ, ndị e depụtara na Facts for Life, bụ́ akwụkwọ Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, n’ọrụ.

1 Na-ekpofu nsị n’ụzọ kwesịrị ekwesị

Ọtụtụ nje na-adị na nsị. Mgbe nje ndị na-akpata ọrịa banyere na mmiri nakwa ná nri ma ọ bụ mesa mmadụ n’aka, banye n’arịa ndị e ji eme ihe n’ụlọ, ma ọ bụ n’ihe ndị e ji akwadebe ma na-ekunye nri, ha pụrụ ịbanye n’ọnụ, e loo ha, ha akpata ọrịa. Ụzọ kasị mma isi mee ka nje ndị dị otú ahụ ghara ịgbasa bụ site n’ikpofu nsị nile. E kwesịrị ịdị na-anyụ nsị n’ụlọ mposi ma ọ bụ n’ogwe. Hụ na e nweghị nsị anụmanụ n’ụlọ, n’ebe ndị a na-esi agafere, ma ọ bụ n’ebe ụmụaka na-egwuri egwu.

N’ebe ndị a na-enweghị ụlọ mposi ma ọ bụ ogwe, lie nsị n’ala ozugbo a nyụrụ ya. Cheta na nje ndị pụrụ ịkpata ọrịa na-adị nansị nile, ọbụnakwa nsị ụmụ ọhụrụ. E kwesịkwara ịdị na-ekpofu nsị ụmụaka n’ogwe ma ọ bụ lie ya n’ala.

Na-edebe ogwe na ụlọ mposi ọcha mgbe nile. Na-ekpuchi ogwe ekpuchi, ọ bụrụ ụlọ mposi nke a na-eji mmiri eme ihe na ya, hụ na i ji mmiri wụba nsị.

2 Na-akwọ aka gị

I kwesịrị ịdị na-akwọ aka gị mgbe nile. Iji ncha na mmiri ma ọ bụ ntụ na mmiri akwọ aka na-asachapụ nje ndị dị na ya. Iji nanị mmiri akwọ aka ezughị—ọ dị mkpa ka i jiri ncha ma ọ bụ ntụ kwoo aka gị.

Ọ dị oké mkpa ka ị na-akwọ aka gị mgbe ị nyụsịrị nsị nakwa mgbe i hichasịrị ikè nwa ọhụrụ ma ọ bụ nwatakịrị ka nyụpụrụ nsị. Ọzọkwa, kwọọ aka gị mgbe i metụsịrị anụmanụ aka, tupu i metụ nri aka, nakwa tupu i nye ụmụaka nri.

Ịkwọ aka na-eme ka arị ndị na-akpata ọrịa ghara ịbanye mmadụ n’ahụ́. Arị ndị a na-epe nnọọ mpe nke na a pụghị ịhụ ha ma ọ bụrụ na e jighị ígwè ọrụ e ji ahụ ihe ndị anya na-apụghị ịhụ. Ha na-ebi n’ime nsị nakwa na mamịrị, na mmiri dọọrọ adọrọ nakwa n’ala, n’anụ a na-esighị esi ma ọ bụ nke a na-esigheghị esighe. Ụzọ bụ́ isi e si egbochi arị ịbanye mmadụ n’ahụ́ bụ site n’ịkwọ aka. Ọzọkwa, site n’iyiri akpụkpọ ụkwụ mgbe ị nọ nso n’ogwe, ị pụrụ igbochi arị ndị pụrụ ịdị n’ebe ahụ ịbanye gị n’ahụ́ site n’ọbụ ụkwụ gị.

Ụmụaka na-etinyekarị aka ha n’ọnụ, n’ihi ya, na-akwọ ha aka mgbe nile, karịsịa mgbe ha nyụsịrị nsị nakwa tupu ha eriwe nri. Kụziere ha ịdị na-akwọ aka ha na ịghara igwuri egwu n’akụkụ ogwe, ụlọ mposi, ma ọ bụ ebe ndị a na-anyụ nsị.

3 Na-asa ihu gị kwa ụbọchị

Iji nye aka mee ka ị ghara ibute ọrịa anya, na-eji ncha na mmiri asa ihu gị kwa ụbọchị. E kwesịkwara ịdị na-asa ụmụaka ihu. Ihu ruru unyi na-adọta ijiji, bụ́ ndị na-ebu nje. Nje ndị a pụrụ ịkpata ọrịa anya na ọbụna ikpu ìsì.

Na-enyocha anya ụmụ gị mgbe nile. Anya ndị na-ebughị ọrịa na-enwe mmiri ma na-egbuke egbuke. Ọ bụrụ na anya nwatakịrị enweghị mmiri, na-acha ọbara ọbara, ma ọ bụ na-afụ ya ụfụ ma ọ bụkwanụ nwee nsị anya, onye ọrụ ahụ́ ike ma ọ bụ dọkịta kwesịrị inyocha anya ya.

4 Na-eji nanị mmiri dị ọcha eme ihe

Ezinụlọ agaghị na-arịakebe ọrịa mgbe ha na-eji mmiri dị ọcha eme ihe ma na-eme ka nje ghara ịbanye na ya. Mmiri gị pụrụ ịdị ọcha ma ọ bụrụ na o sitere na paịpụ mmiri a rụrụ nke ọma ma na-elekọta nke ọma ma ọ bụ n’olulu mmiri na iyi a na-emetọghị emetọ. Mmiri sitere n’ọdọ mmiri, osimiri, na tankị mmiri ma ọ bụ n’olulu mmiri ghere oghe, eyikebeghị ka ọ̀ ga-adị ọcha, ma a pụrụ ime ka ọ ghara ịdịcha ize ndụ site n’isi ya n’ọkụ.

E kwesịrị ịdị na-ekpuchi olulu mmiri ekpuchi. E kwesịrị ịdị na-asa bọket, ụdọ, na ite ndị a na-eji esere mmiri nakwa ndị a na-eji agbanye mmiri mgbe nile ma na-edebe ha n’ebe dị ọcha, ọ bụghị n’ala. E kwesịghị ịhapụ ụmụ anụmanụ ka ha gaa n’ebe ndị a na-esi enweta mmiri ọṅụṅụ nakwa na gburugburu ụlọ. Ejila ọgwụ ahụhụ ma ọ bụ kemikal eme ihe na nso ebe a na-ekute mmiri.

N’ụlọ, e kwesịrị ịdị na-edebe mmiri n’arịa dị ọcha, nke e kpuchiri ekpuchi. Ọ kasị mma inwe arịa e ji agbanye mmiri, nke nwere isi pọmpụ. Ọ bụrụ na arịa mmiri ahụ enweghị isi pọmpụ, e kwesịrị iji efere ma ọ bụ iko dị ọcha na-ekuru mmiri na ya. E kwesịghị mgbe ọ bụla imetụ aka ruru unyi na mmiri ọṅụṅụ.

5 Ekwela ka nje banye ná nri

Site n’isighe nri esighe, ị pụrụ igbu nje ndị dị na ya. E kwesịrị isighe nri esighe, karịsịa, anụ. Ụmụ nje na-amụba ngwa ngwa ná nri na-adịchaghị ọkụ. N’ihi ya, e kwesịrị iri nri ngwa ngwa o kwere mee mgbe e sisịrị ya. Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa idebe nri ruo ihe karịrị awa abụọ, jide n’aka na i debere ya n’ebe dị ọkụ ma ọ bụ n’ebe jụrụ oyi. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i debe nri e siri esi ruo mgbe ọzọ ị ga-eri nri, kpuchie ya ekpuchi. Nke a ga-eme ka ijiji na ụmụ ahụhụ ghara ịbanye na ya. Tupu i rie nri ahụ, daa ya n’ọkụ.

Mmiri ara nne bụ mmiri ara kasị mma na nke kasị bụrụ nke na-adịghị ize ndụ nye ụmụ ọhụrụ. Mmiri ara ụmụ anụmanụ a ka sipụrụ n’ọkụ ma ọ bụ nke e siri n’ọkụ tinye na frig adịchaghị ize ndụ ka nke a na-esighị n’ọkụ. Zere iji karama ndị a na-eji enye ụmụ ọhụrụ mmiri eme ihe, ọ gwụla ma i ji mmiri gbọrọ agbọ saa ya mgbe ọ bụla ị chọrọ iji ya mee ihe. Karama ndị a na-eji enye ụmụ ọhụrụ mmiri na-ebukarị nje ndị na-akpata afọ ọsịsa. Ọ ka mma inye ụmụaka ara ma ọ bụ iji iko dị ọcha na-enye ha nri.

Na-eji mmiri dị ọcha asa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri. Nke a dị mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na a na-enye ha ụmụ ọhụrụ na obere ụmụaka n’esighị ha esi.

6 Na-ekpofu dọtị nile a zapụtara n’ụlọ.

Ijiji, ọchịcha, òké, na nkapị na-ebucha nje. Ụmụ anụ ndị a na-amụba nnọọ n’ihe mkpofu. Ọ bụrụ na e nweghị usoro ikpofu ihe n’ebe i bi, na-etinye dọtị ị zapụtara n’ụlọ n’olulu ahịhịa, bụ́ ebe a pụrụ ili ya ma ọ bụ suo ya ọkụ kwa ụbọchị. Na-edebe ụlọ gị ọcha ma mee ka dọtị na mmiri ruru unyi ghara ịdị na ya.

Ọ bụrụ na ị na-agbaso aro ndị a mgbe nile, n’oge na-adịghị anya, ị ga-achọpụta na ha ga-ama gị ahụ́. Ha esighị ike ịgbaso, a dịghịkwa achọ ego buru ibu iji tinye ha n’ọrụ, ma ha ga-echekwa ahụ́ ike gị nakwa nke ezinụlọ gị.

[Foto dị na peeji nke 13]

N’ebe a na-enweghị ụlọ mposi ma ọ bụ ogwe, na-eli nsị n’ala ozugbo

[Foto dị na peeji nke 13]

Na-akwọ aka gị mgbe nile

[Foto dị na peeji nke 14, 15]

Ezinụlọ agaghị na-arịakebe ọrịa mgbe ha na-eji mmiri dị ọcha eme ihe ma na-eme ka nje ghara ịbanye na ya

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Na-eji ncha na mmiri asa ihu gị kwa ụbọchị

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ bụrụ na ọ dị mkpa na ị ga-edebe nri e siri esi ruo oge ọzọ ị ga-eri nri, kpuchie ya ekpuchi

[Foto dị na peeji nke 15]

E kwesịrị ịdị na-eli unyi ndị a zapụtara n’ụlọ n’ala ma ọ bụ na-esu ha ọkụ kwa ụbọchị