Ụzọ-Ndụ Megidere Okike—Chineke Ọ Na-akwado Ya?
Echiche nke Bible
Ụzọ-Ndụ Megidere Okike—Chineke Ọ Na-akwado Ya?
“O LEE mgbe m ga-ama ụdị mmekọahụ m ga-ahọrọ?” Ihe ahụ ka otu nwa agbọghọ dị afọ 13 dere na kọlụm a na-enye ndị nọ n’afọ iri na ụma ndụmọdụ n’akwụkwọ akụkọ. Ajụjụ ya na-egosipụta àgwà nke ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-eche na ndị mmadụ nweere onwe ha inwe ụdị mmekọahụ ọ bụla ha họọrọ.
Ụdị agụụ mmekọahụ ụfọdụ ndị na-enwe pụrụ ịdị na-agbagwoju ha anya n’ezie. Ndị ọzọ na-anabata n’ụzọ pụtara ìhè, ụzọ ndụ megidere okike dị ka ndina ụdị onwe. Ọzọkwa, ndị ọzọ na-eme omume ma na-eji ejiji ndị na-abụghị nke nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha, n’asọghị anya. Ụfọdụ ndị na-awa ahụ́ iji gbanwee ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. E nwere ọbụna ndị na-arụ ụka na e kwesịrị ịhapụ ndị meworo okenye ka ha na ụmụntakịrị na-enwe mmekọahụ.
Ụdị mmekọahụ dị iche iche na ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ọ̀ bụ n’ezie ihe mmadụ pụrụ ịhọrọ n’onwe ya? Gịnị ka Okwu Chineke nwere ikwu banyere ihe ndị a?
“Nwoke na Nwanyị Ka O Kere Ha”
Dị ka akwụkwọ Jenesis nke Bible si kwuo, Chineke n’onwe ya kere ọdịiche dị n’etiti ndị nwoke na ndị nwanyị. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya . . . Nwoke na nwanyị ka O kere ha. Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.”—Jenesis 1:27, 28.
Chineke kenyere ụmụ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ ma nye ha ohere ndị ga-eme ka ha na-anụ ụtọ nnwere onwe ha. (Abụ Ọma 115:16) N’ịbụ onye e nyefere ibu ọrụ nke ilekọta ihe ndị ọzọ nile dị ndụ n’elu ụwa, e nyere mmadụ ọbụna ohere ịgụ ha aha kwesịrị ekwesị. (Jenesis 2:19) Otú ọ dị, mgbe a bịara n’okwu metụtara mmekọahụ, Chineke nyere ụkpụrụ nduzi ndị a kapịrị ọnụ.—Jenesis 2:24.
N’ihi nnupụisi nke Adam, anyị nile ketara ezughị okè. N’ihi ya, anyị aghaghị ịlụso adịghị ike nke anụ ahụ́ na ọchịchọ ndị siri ike bụ́ ndị na-ekwekọghị ná nzube mbụ nke Chineke ọgụ. N’ihi ya, n’iwu ndị Chineke nyere Mozis, Chineke kapịrị ụdị mmekọahụ ndị ọ na-asọ oyi ọnụ—ha bụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, idina onye ikwu, ndina ụdị onwe, na idina anụmanụ. (Levitikọs 18:6-23) Chineke machibidokwara kpọmkwem nwoke ime onwe ya ka o yie nwanyị ma ọ bụ nwanyị ime onwe ya ka o yie nwoke maka omume rụrụ arụ. (Deuterọnọmi 22:5) Bible anọgidewo na-akụzi na nanị mmekọahụ nke Chineke kwadoro bụ nke nwoke na nwanyị lụrụ di na nwunye. (Jenesis 20:1-5, 14; 39:7-9; Ilu 5:15-19; Ndị Hibru 13:4) Ezi uche ọ̀ dị n’ụkpụrụ ndị dị otú ahụ?
Ònye Na-eme Nhọrọ Ahụ?
Bible na-eji ọnọdụ nke mmadụ n’ebe Onye Okike ya nọ atụnyere nke ụrọ dị n’aka ọkpụite. Ọ na-asị: “Gị mmadụ, ònye, n’ezie, ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu? Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ ga-agwa onye kpụrụ ya, sị, ‘N’ihi gịnị ka i ji mee m otú a?’” (Ndị Rom 9:20) Site n’ụzọ Chineke si kee mmadụ, o doro anya na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị inwe ndọrọ mmekọahụ n’ebe ibe ha nọ bụ ihe e bu pụta ụwa. N’ihi ya, inwe ndọrọ mmekọahụ n’ebe nwoke ibe gị ma ọ bụ nwanyị ibe gị nọ, n’ebe anụmanụ nọ, ma ọ bụ n’ebe nwatakịrị nọ megidere okike.—Ndị Rom 1:26, 27, 32.
N’ihi nke a, ndị na-agbaso ụdị omume mmekọahụ ndị dị otú ahụ megidere okike, na-alụso Chineke ọgụ. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị onye na-alụso Onye kpụworo ya ọgụ! otu ejùjù n’etiti ejùjù nile nke ala! Ụrọ, ọ̀ ga-asị onye na-akpụ ya, Gịnị ka ị na-arụ?” (Aịsaịa 45:9) N’eziokwu, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya Onye mere ihe akpọrọ mmadụ inye ntụzi n’okwu metụtara mmekọahụ. Ezi uche ọ́ dịghịkwa na ya na ụmụ mmadụ kwesịrị ịgbaso ntụzi dị otú ahụ?
Mmadụ Ịchịkwa Arịa nke Onwe Ya
Otu onye so dee Bible bụ́ Pọl nyere ihe atụ yiri nke ahụ mgbe ọ na-enye Ndị Kraịst nduzi banyere omume mmekọahụ. O kwuru, sị: “ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’agụụ mmekọahụ nke ọchịchọ anyaukwu.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:4, 5) Pọl ji ahụ́ mmadụ na-atụnyere arịa. Ịchịkwa arịa ahụ pụtara mmadụ ime ka echiche ya na ọchịchọ ya kwekọọ n’iwu Chineke banyere omume.
N’eziokwu, nke a nwere ike ọ gaghị adị mfe. N’ụzọ kwere nghọta, ọ pụrụ isiri onye e metọworo n’ụzọ mmekọahụ n’oge ọ bụ nwatakịrị, onye nne na nna ya ma ọ bụ ndị ọzọ na-elekọta ya setịpụụrụ ihe nlereanya ọjọọ banyere ịbụ nwoke ma ọ bụ ịbụ nwanyị, ma ọ bụ onye si na nwata na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ike omume. Mkpụrụ ndụ ihe nketa, mmiri ọgwụ ahụ́, na ihe ndị metụtara uche pụkwara iso mee ka mmadụ nwee echiche gbagọrọ agbagọ banyere agụụ mmekọahụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Onye Okike anyị pụrụ inyere ndị enyemaka dị mkpa aka ma kwadoo ha.—Abụ Ọma 33:20; Ndị Hibru 4:16.
Kwe Ka Ọkpụite Ukwu ahụ Kpụzie Gị
A ghaghị idebe ụrọ n’etiti wiil ọkpụite tupu ọkpụite ahụ e nwee ike ịmalite ịkpụ ya. Mgbe ahụ, ka wiil ahụ na-agbagharị, ọkpụite ahụ na-eji nkà abịa ya aka n’ụzọ dị nro iji mee ka ụrọ ahụ nwee ọdịdị a chọrọ. Tupu a kpụzie anyị ịbụ ndị a na-achọsi ike n’anya Chineke, ọ dị anyị mkpa ịgbaso ụkpụrụ na iwu Chineke ndị na-adịghị agbanwe agbanwe. Ozugbo anyị malitere itinye mgbalị, Chineke na-eji ịhụnanya jiri Bible, mmụọ nsọ ya, na òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst na-akpụzi anyị n’ụzọ dị nro. Mgbe ahụ, onye ahụ na-amalite ịbụ onye Chineke na-elekọta anya ná ndụ ya.
N’ezie, anyị aghaghị ịmalite inwe obi ike n’amamihe Onye Okike, na-enwe ntụkwasị obi na ọ maara ihe ga-akasị adịrị anyị mma. A na-azụlite ntụkwasị obi a site n’ekpere na ịmụsi Bible ike. Onye ji ụdị obi ahụ na-eme ihe banyere agụụ mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị, ga-ekwe mkpụgharị n’aka Onye Okike. Na 1 Pita 5:6, 7, Bible na-ekwu, sị: “Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ya ruru; ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”
Ịgụ Bible mgbe nile na-eme ka anyị mata ọtụtụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị lụsoro ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ ma ọ dịghị mgbe ike gwụrụ ha. Lee ihe agbamume ihe atụ ndị a Ndị Rom 7:24, 25.
bụụrụ anyị! Anyị nwekwara ike inwe nkụda mmụọ nke Pọl onyeozi nwere n’ime onwe ya mgbe ụfọdụ, mgbe o ji oké olu kwuo, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-anwụ ọnwụ a?” N’agbanyeghị nke ahụ, o gosikwara anyị ebe bụ́ isi a pụrụ isi nweta enyemaka mgbe ọ zara onwe ya ajụjụ ahụ, sị: “Ọ bụ Chineke site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!”—Ihe nke Na-eme Ka E Mee Mgbanwe
Anyị pụkwara ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị. Nke a bụ ihe dị ike nke na-eme ka e mee mgbanwe. Mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ‘iyipụ ụdị mmadụ ochie ahụ’ ma “yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:22-24) Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya adịghị ahapụ ịza arịrịọ e ji ezi obi rịọ ya maka mmụọ nsọ iji nye aka ime mgbanwe a. Jizọs na-emesi anyị obi ike na Nna anyị ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Luk 11:13) Otú ọ dị, ịnọgidesi ike n’ekpere dị oké mkpa dị ka okwu ya gosiri: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu.” (Matiu 7:7) Ọ ga-adị otú ahụ karịsịa mgbe a na-agbalị ịchịkwa agụụ mmekọahụ dị ike.
Chineke na-ejikwa ezi òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst, nke ihe mejupụtara ya bụ mmadụ ndị nwere ụdị nzụlite dị iche iche, enyere anyị aka. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ Kọrint nke narị afọ mbụ bụbu “ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike” nakwa “ndị ikom na-edina ndị ikom.” N’agbanyeghị nke ahụ, ha gbanwere. Ọbara Kraịst sachara ha, ha aghọọkwa ndị a na-anara nke ọma n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ọ dị ụfọdụ ndị mkpa taa ime mgbanwe ndị yiri nke ahụ. Ndị dị otú ahụ pụkwara isi n’ọgbakọ Ndị Kraịst nweta nkwado n’ọgụ ha na-alụso ọchịchọ ọjọọ.
Nke a ọ̀ pụtara na ịghọ Onye Kraịst ga-eme ozugbo ka mmadụ kwụsị inwe ọchịchọ na-ezighị ezi ma ọ bụ echiche gbagọrọ agbagọ banyere ọbụbụ ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị? Ọ dịghị ma ọlị. Ịnọgide na-eji ụkpụrụ Bible eme ihe emewo ka ụfọdụ ndị nwee ike ibi ndụ dị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst a anọwo na-agba mgba kwa ụbọchị megide ọchịchọ na-ezighị ezi. N’ụzọ dị otú a, ndị dị otú ahụ na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị na ha nwere “ogwu n’anụ ahụ́” n’ụzọ ihe atụ. (2 Ndị Kọrint 12:7) Ọ bụrụhaala na ha anọgide na-alụso ọchịchọ na-ezighị ezi ọgụ ma na-eme ezi omume, Chineke na-ele ha anya dị ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị dị ọcha n’anya ya. Ha pụrụ ilepụ anya n’oge dị n’ihu mgbe a ga-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ ‘nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:21.
Ka ọ dị ugbu a, ndị nile chọrọ ime ihe Chineke na-achọ aghaghị ịgbaso ụkpụrụ ezi omume ya nile. Ezi Ndị Kraịst na-ahọrọ ijere Chineke ozi—ọ bụghị ịgbaso ọchịchọ maka ọdịmma onwe ha nanị. A ga-eji ọṅụ ebighị ebi na obi ụtọ kwụọ ndị nile ji obi umeala doo onwe ha n’okpuru uche Chineke n’akụkụ nile nke ndụ ha ụgwọ.—Abụ Ọma 128:1; Jọn 17:3.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
Mgbe a bịara n’okwu metụtara mmekọahụ, Chineke nyere ụkpụrụ nduzi ndị a kapịrị ọnụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ Kọrint nke narị afọ mbụ bụbu “ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike” nakwa “ndị ikom na-edina ndị ikom.” N’agbanyeghị nke ahụ, ha gbanwere
[Foto dị na peeji nke 28]
Ịmụ Bible na-enyere mmadụ aka ịzụlite ụkpụrụ omume ndị dị elu