Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Afọ Bible”

“Afọ Bible”

“Afọ Bible”

N’Austria, France, Germany, na Switzerland, e wepụtawo afọ 2003 dị ka “Afọ Bible.” Akwụkwọ akụkọ Germany a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung na-ekwu, sị: “Dị ka ọ dị n’oge mbụ na n’oge ikpeazụ e mere ememe ya na 1992, [chọọchị dị iche iche] na-eme atụmatụ ime ka ndị mmadụ matakwuo ‘akwụkwọ nke ndụ’ a nakwa imesi uru Akwụkwọ Nsọ bara n’ihe ndị metụtara ọdịbendị ike.”

Dị ka akwụkwọ bụ́ Bibelreport nke June 2002 si kwuo, a sụgharịwo Bible gaa n’asụsụ 2,287—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’akụkụ ya ụfọdụ. Atụmatụ e mere na-egosikwa na ka ọ dị ugbu a, e kesawo ihe ruru ijeri Bible ise. Nnukwu mgbalị dị otú a na-egosi n’ụzọ doro anya otú ndị mmadụ si eji akwụkwọ a akpọrọ oké ihe.

Taa, e nwere ike ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agaghị ekwenye na Bible bara uru. N’ezie, ọtụtụ ndị na-eche na ụkpụrụ ndị dị na Bible bụ ihe ndị oge ha gafeworo na ihe ndị na-ekwekọghị n’ihe na-eme eme. Otú ọ dị, site n’ememe nke Afọ Bible, chọọchị ndị dị na Germany nwere olileanya imezu ụzọ ihe abụọ—ịgba ndị mmadụ ume ibi ndụ n’ụzọ kwekọkwuru na Bible nakwa ime ka Bible dị ndị na-adịghị aga chọọchị ọkụ n’obi.

Ịgụchapụ Bible abụghị obere ihe, ma n’ezie, ọ bụ ụzọ dị irè isi ghọta isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, onye chọrọ irite uru kasịnụ site na Bible kwesịrị iburu n’uche okwu ndị ahụ dị na 2 Timoti 3:16, 17: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.”

Onye Germany na-ede uri bụ́ Johann Wolfgang von Goethe (1749-1832) kwuru, sị: “Ekwenyesiri m ike na Bible na-adọrọ mmasị ọbụna karị mgbe mmadụ na-aghọta ya karị.” N’ezie, ọ bụ nanị n’ime Okwu Chineke ka anyị na-achọta nkọwa ziri ezi banyere ebe anyị si bịa, ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a, na ihe ọdịnihu ga-abụ!—Aịsaịa 46:9, 10.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Site n’akwụkwọ bụ́ Bildersaal deutscher Geschichte