Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ihe Ize Ndụ nke Ịgbalị Ime Ihe Karịrị Otu Ihe n’Otu Oge

Ịgbalị ime ihe karịrị otu ihe n’otu oge “pụrụ n’ezie ime ka ị ghara ịrụpụtacha ihe, ọ pụkwara ime ka ị ghara ịdị na-akpachapụ anya,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-ekwu. “Ịgbalị ime ihe abụọ ma ọ bụ atọ n’otu oge ma ọ bụ ime ha ná nsochi ná nsochi pụrụ iwe oge dị ukwuu karịa ka ime ha otu otu ga-ewe, ọ pụkwara ibelata ikike ụbụrụ gị nwere ime nke ọ bụla n’ime ha.” Ihe ụfọdụ ndị na-egosi na i nwere nsogbu ahụ bụ ichezọ ihe ngwa ngwa (dị ka ichezọ ihe ị ka mepụrụ nnọọ ma ọ bụ okwu ị kpụ n’ọnụ), etinyeghị uche n’ihe nke ọma, enweghị ike itinye uche n’ihe, ihe mgbaàmà nke nchekasị (dị ka iku ume ọkụ ọkụ), na inwe nsogbu n’iso ndị ọzọ kwurịta okwu. Nke na-akasị njọ bụ na onye ahụ agaghị enwe ike ime ihe nke ọma mgbe ihe ndị ahụ chọrọ ka e were otu akụkụ ụbụrụ ahụ mee ha, dị ka mgbe a na-ekwu okwu na fon ma na-egekwa nwatakịrị na-ekwu okwu n’ọnụ ụlọ nke ọzọ ntị. Ịgbalị ime ihe karịrị otu ihe n’otu oge dị ize ndụ karịsịa mgbe ị na-akwọ ụgbọala. Ihe omume ndị dị ka iri ihe ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ịmatị aka iwere ihe, isoro onye i bu n’ụgbọala na-akparịta ụka n’ụzọ miri emi ma ọ bụ ịkparịta ụka na fon, ite ihe ntecha, ma ọ bụ ọbụna ịgbanye redio ma ọ bụ ịgbanye ihe ndị ọzọ pụrụ ịdọpụtụ uche gị ma kpata ihe ọghọm.

Efegharịla Nwa Ọhụrụ Ma Ọlị!

Iji ike na-efegharị nwa ọhụrụ na-eme ka olu ya kwekee, bụ́ nke “pụrụ ime ka ọbara na-agba ya n’ime isi ma mụbaa nrụgide ụbụrụ ya na-enwe, na-eme ka ọ gbawaa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star na-ekwu. Ebe ọ bụ na uru ahụ́ nwa ọhụrụ akabeghị aka, ụbụrụ ya esibeghịkwa ike ma ọlị, “ifegharị nwa ọhụrụ ruo nanị sekọnd ole na ole pụrụ ịkpatara ya mmerụ ahụ́ ga-adịru oge ndụ ya nile. Mmerụ ahụ́ ndị a na-enwe pụrụ ịgụnye ọzịza ma ọ bụ mmebi nke ụbụrụ, ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka ahụ́ na-ama jijiji, isi mmebi, etoghị ngwa ngwa, ikpu ìsì, ntị ochichi, ahụ́ mkpọnwụ na ọnwụ.” Ọkà n’ọrịa ụmụaka bụ́ Dr. James King, nke na-arụ n’ụlọ ọgwụ bụ́ Children’s Hospital of Eastern Ontario, emewo nnyocha banyere mmetụta ifegharị ụmụ ọhụrụ na-enwe n’ahụ́ ha. Ọ na-ekwu na ọ dị mkpa ime ka ọha na eze mara banyere ya, n’ihi na n’ọtụtụ ọnọdụ, mmerụ ahụ́ ahụ adịghị apụta ìhè ngwa ngwa, dọkịta pụkwara ikwu na nwa ọhụrụ ahụ nwere oké azụzụ ma ọ bụ ọrịa nje virus kpatara. “A ghaghị iji olu dara ụda ma doo anya zie ozi ahụ bụ́ na e kwesịghị ifegharị ụmụ ọhụrụ ma ọlị,” ka Dr. King na-ekwu. “Ndị di na nwunye mụrụ nwa mbụ aghaghị ịmara nke a.”

Enweghị Mmasị n’Okpukpe

“O yighị ka [ndị Japan] hà na-echigharịkwuru okpukpe iji nweta ihe ngwọta ka ha na ọnọdụ ọjọọ nke oge a na-alụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ IHT Asahi Shimbun na-akọ. N’ịza ajụjụ bụ́, “Ì kweere ma ọ bụ nwee mmasị n’okpukpe?” ọ bụ nanị pasent 13 nke ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị zara ee. Pasent 9 ọzọ nke ụmụ nwoke na pasent 10 ọzọ nke ụmụ nwanyị kwuru na ha “nwetụrụ” mmasị. “Ihe dị ịrịba ama karịsịa bụ mmasị dị nnọọ nta ụmụ agbọghọ nọ n’afọ ndị nke 20 nwere, bụ́ ndị nanị pasent 6 [n’ime ha kwuru na ha nwetụrụ mmasị],” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-agbakwụnye. Nnyocha ahụ a na-eme kwa afọ kpughere na pasent 77 nke ndị ikom nọ na Japan na pasent 76 nke ndị inyom na-ekwu na ha enweghị mmasị ma ọlị n’ụdị okpukpe ọ bụla. Mmasị ndị Japan nwere n’okpukpe ejiriwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara belata ma e jiri ya tụnyere njụta echiche yiri nke ahụ bụ́ nke e mere n’afọ 1978. N’ozuzu, ọ bụ ndị kataworo ahụ́ bụ ndị zọọrọ na ha nwere mmasị, karịsịa ndị karịworo afọ 60.

Ịda Mbà n’Obi na Ọrịa Ndị Ọzọ Nwere Njikọ

“Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na ka ọ na-erule afọ 2020, ịda mbà n’obi ga-abụ ihe kasị akpata nkwarụ n’ụwa nile ma e wezụga ọrịa obi,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu. A dịkarịghị ele oké nsogbu ahụ́ ike a na-emetụta ọha na eze anya dị ka nke “nanị ọnọdụ uche na-akpata.” Dị ka Philip Gold, bụ́ onyeisi ndị ọkà mmụta na-ahụ maka ụzọ usoro akwara ozi na akụkụ ahụ́ na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ si arụkọ ọrụ, nke nọ n’Ụlọ Ọrụ Mba Maka Ahụ́ Ike Uche si kwuo, “ịda mbà n’obi bụ n’ezie nanị ọrịa na-ezu ahụ́ nke na-emetụta—na-akpaghasịkwa—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrịa ndị ọzọ nile.” Ịda mbà n’obi pụrụ ọbụna ịkpata nsogbu ndị dị ka ọrịa obi na ọrịa shuga. Dị ka ihe atụ, nnyocha e mere na-egosi na ‘obi ndị dara mbà n’obi adịghị emegharịcha emegharị, obi ha adịchaghịkwa anagide ọchịchọ dị iche iche nke ahụ́ na-enwe maka ọbara na ikuku oxygen,’ ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ọzọkwa, “ụbụrụ nke onye dara mbà n’obi na-ezipụ ozi na ya chọkwuru ihe ndị na-enye ike, bụ́ nke pụrụ ịkpali mmepụta nke mmiri ọgwụ bụ́ cortisol, wee si otú ahụ mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara rịa elu.” A na-ahụkwa njikọ dị n’etiti ịda mbà n’obi na ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis na ọrịa cancer. A na-eme nnyocha ugbu a iji chọpụta ma ịgwọ ịda mbà n’obi ọ̀ pụrụ ịgbanwe ihe nsogbu ahụ́ ike ndị dị otú ahụ na-akpata.

Alụmdi na Nwunye na Obi

“Nnyocha e mere egosiwo na ọdịdị nke alụmdi na nwunye mmadụ pụrụ inye aka mee ka a mara otú onye ahụ ga-esi gbakee mgbe a wasịrị ya obi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-ekwu. Dị ka Dr. James Coyne, onye nọ na Mahadum nke Pennsylvania, U.S.A. si kwuo, alụmdi na nwunye nke e nwere obi ụtọ na ya pụrụ ime ka onye ọrịa nwee ihe mere ọ ga-eji gbalịsie ike ịgbake, ma “alụmdi na nwunye nke obi ụtọ na-adịghị na ya pụrụ ịdịrị onye ọrịa njọ karịa alụghị alụ.” Dr. Coyne na ìgwè ndị ọrụ ya ji vidio see ebe ndị di na nwunye na-enwe arụmụka n’ebe obibi ma chọpụta na ndị nwere ọrịa obi bụ́ ndị ha na di ma ọ bụ nwunye ha na-adịchaghị ná mma nwere ohere dị okpukpu abụọ nke ịnwụ n’ime afọ anọ karịa ndị ha na di ma ọ bụ nwunye ha dị ná mma. Onye prọfesọ nke nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze, bụ́ Dr. Linda Waite, onye nọ na Mahadum nke Chicago, kwubiri na alụmdi na nwunye e nwere obi ụtọ na ya ‘na iri ezigbo nri, inwe mmega ahụ́ nakwa eseghị siga pụrụ ịnọ nnọọ n’otu ọkwá.’

“Osisi Ndị E Ji Eme Ngwá Egwú Violin” Na-achọ Ịpụ n’Anya

“Iji mepụta ngwá egwú violin bụ́ ọkpọka, a chọrọ ụdị osisi pụrụ iche—ma osisi a adịwala ụkọ,” ka magazin Germany na-ebu akụkọ sayensị bụ́ natur & kosmos na-ekwu. Osisi e ji eme ya bụ Caesalpinia echinata, bụ́ nke a makwaara dị ka Pernambuco ma ọ bụ pau brasil. Ebe ọ na-eto bụ n’oké ọhịa dị n’ụsọ oké osimiri Brazil. Ma oké ọhịa a na-apụ n’anya n’ike n’ike ka a na-asụchasị ala maka ọrụ ugbo. Osisi ndị ahụ na-eto ugbu a na nanị pasent 4 nke ọhịa ndị a na-ahụ ha, ha esonyekwala n’osisi ndị na-achọ ịpụ n’anya. Ọzọkwa, ọ bụ nanị osisi ndị ruworo afọ 20 ma ọ bụ karị na-enwe obi osisi na-acha odo odo ma ọ bụ na-achatụ uhie uhie, bụ́ nke na-adị mma maka iji mee ngwá egwú violin. Akụkọ ahụ na-ekwu na dị ka ọkà n’ime ngwá egwú violin, bụ́ Thomas Gerbeth, si kwuo, ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ yiri ya nke a ga-eji dochie anya ya n’ihi na “ndị nke e ji ihe ndị e mepụtara n’ụlọ ọrụ mee abụbeghị ọkpọka ka ya.” Ndị na-eme ngwá egwú violin na ndị na-eti egwú na-agba ume ugbu a ka a na-echekwa “osisi e ji eme ngwá egwú violin” ha.

Ọrịa Ochie nke Na-alabeghị

“A chọpụtara ihe karịrị mmadụ 700,000 ndị ọhụrụ na-arịa ekpenta n’ụwa nile n’afọ 2002, dị ka ọnụ ọgụgụ e nwetara n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-egosi,” ka akwụkwọ akụkọ Spen bụ́ El País na-akọ. Kemgbe oge Bible, ekpenta abụwo ọrịa a na-atụ ụjọ. N’ụbọchị ndị a, a pụrụ ịgwọta ụdị ekpenta a na-enwe n’oge a. N’eziokwu, ihe dị ka nde mmadụ 12 bụ́ ndị na-arịa ekpenta agbakewo n’ime ihe karịrị afọ 20 gara aga. Otú ọ dị, “anyị apụghị ikwu ka ọ dị ugbu a na e kpochapụwala ọrịa ekpenta kpam kpam,” ka onye na-eme nnyocha bụ́ Jeanette Farrell na-ekwu. Ndị ọrụ ahụ́ ike enwebeghị ihe ịga nke ọma n’ikpochapụ ọrịa ahụ, a nọgidewokwa na-enwe ndị ọhụrụ na-ebute ọrịa ahụ. Mba ndị bụ́ isi ọrịa ekpenta ka na-akpa aka ọjọọ bụ Brazil, Burma, India, Madagascar, Mozambique, na Nepal. N’ihi nghọta zuru ezu e nwere n’oge na-adịbeghị anya banyere mkpụrụ ndụ ụmụ mmadụ, ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ anya imepụta ọgwụ mgbochi kwesịrị ekwesị.

‘Ọnụ Ọgụgụ Na-ahatụghị Nhata nke Ụmụ Nwoke na Ụmụ Nwanyị Nọ na China Bụ́ nke Na-akpata Nchegbu’

“Dị ka ọgụgụ ọnụ nke ise a gụrụ ndị bi na China na-egosi, ọnụ ọgụgụ [ụmụ nwoke ma e were ya tụnyere nke ụmụ nwanyị] a na-amụ bụzi ụmụ nwoke 116.9 n’ime 100 ụmụ nwanyị ọ bụla, ebe nke a gụrụ n’afọ 1990 dị ụmụ nwoke 113.8 n’ime 100 ụmụ nwanyị ọ bụla,” ka magazin bụ́ China Today na-ekwu. “Ọnụ ọgụgụ abụọ a karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ e guzobere ná mba nile nke bụ́ ụmụ nwoke 105 n’ime 100 ụmụ nwanyị ọ bụla, ọ na-egosikwa na nsogbu e nwerela enwe n’ihe banyere ahaghị nhata nke ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na China na-akawanye njọ.” A na-eme atụmatụ na n’ọdịnihu, ihe dị ka nde 50 nke ụmụ nwoke nọ na China agaghị enwe ike ịchọta nwunye mgbe ha toruru ịlụ nwunye. Akụkọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “E hotara Zheng Zizhen, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Banyere Mmekọrịta Ọha na Eze na Ụba Mmadụ n’Ógbè Guangdong, dị ka onye kwuru na ahaghị nhata a a nọgidere na-enwe n’ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị a na-amụ, ga-enwe mmetụta dị njọ n’ọdịdị nke ndị bi na China, obodo ha, nakwa n’omume ha.”