Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma

Isi Ihe Ndị Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma

Isi Ihe Ndị Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma

“Ịghọ aghụghọ ruo nnọọ n’ókè ụfọdụ: nke ahụ bụ isi ihe na-eduga ná mmekọrịta mmekọahụ́ na-aga nke ọma,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Presse na-ekwu. Akwụkwọ akụkọ Canada ahụ nọ na-akọ banyere otu nnyocha nke mere ka ịgha ụgha yie àgwà dị mma. E bipụtara nnyocha ahụ n’akwụkwọ bụ́ Journal of Social and Personal Relationships. Onye prọfesọ bụ́ Tim Cole, onye nọ na Mahadum De Paul, nke dị na Chicago, U.S.A., na-ekwu, sị: “Site n’ịghọ aghụghọ [ma ọ bụ ịgha ụgha] ruo nnọọ n’ókè ụfọdụ, anyị pụrụ ịnọgide na-erite uru ná mmekọrịta [mmekọahụ] n’etinyeghị ya n’ihe ize ndụ.”

Otú ọ dị, ịghọ aghụghọ ọ̀ bụ n’ezie isi ihe na-eduga n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma? Bible na-agba Ndị Kraịst ume, sị: “Ebe unu wepụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Ndụmọdụ a ọ̀ na-adị irè? Mgbe a jụrụ ọkàiwu na-ahụ banyere ịgba alụkwaghịm ajụjụ bụ́, Olee otu ihe kasị eme ka di na nwunye kewaa? ọ zara, sị: “Ọ bụ enweghị ike ịgwarịta ibe ha eziokwu, ịgwarịta ibe ha ihe dị ha n’obi, na imeso ibe ha dị ka ezigbo enyi.”

Ya mere, gịnị bụ isi ihe na-eme ka e nwee obi ụtọ n’alụmdi na nwunye? Isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ nwere isiokwu bụ́ “Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide.” Ọ na-atụle ihe abụọ dị oké mkpa, ndị na-eme ka o kwe di na nwunye omume ibikọ ọnụ n’obi ụtọ, bụ́ ndị ga-eme ka ha nwee ike inweta ọtụtụ ngọzi. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.