Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu?

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu?

“Egbugbu ụfọdụ na-ama mma. A na-eji nnọọ nkà egbu ha.”—Jalene. *

“Echeere m egbugbu nke mbụ m echiche ruo afọ abụọ.”—Michelle.

EGBUGBU bụ ihe a na-ahụ ebe nile—ma ọ bụkwanụ, o yiri ka ọ̀ dị otú ahụ. Ndị na-akụ egwú rock, ndị na-eme egwuregwu, ndị a na-eji egosi ejiji, na ndị na-eme ihe nkiri na-eji nganga egosipụta egbugbu ha. Ọtụtụ ndị na-eto eto eṅomiwo ihe nlereanya ha site n’iji egbugbu ndị ha gburu n’ubu, n’aka, n’úkwù, nakwa na nkwonkwo ụkwụ ha na-akpa nganga. Andrew na-ekwu, sị: “Egbugbu amaka. Igbu egbugbu ma ọ bụ egbughị egbugbu bụ ihe mmadụ na-ekpebiri onwe ya.”

Akwụkwọ bụ́ World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Igbu egbugbu bụ omume nke ise ihe ndị na-adịgide adịgide n’ahụ́. A na-eme ya site n’iji mkpịsị osisi pịrị ọnụ, ọkpụkpụ pịrị ọnụ, ma ọ bụ agịga na-arụrụ ink ndị a na-agwaghị ihe ma na-adụpu akpụkpọ ahụ́.”

Ọ bụ ezie na o siri ike inweta ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị gburu egbugbu, otu akwụkwọ na-eme atụmatụ na pasent 25 nke ndị nile nọ n’afọ 15 ruo afọ 25 n’obodo United States egbuwo egbugbu. Sandy na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe na-ewu ewu.” Gịnị mere igbu egbugbu ji amasị nnọọ ụfọdụ ndị ntorobịa?

Gịnị Mere O Ji Ewu Nnọọ Ewu?

Nye ụfọdụ ndị, igbu egbugbu bụ ụzọ pụtara ìhè ha si egosi na ha nwere ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha nọ. Michelle na-akọ, sị: “Nwanne m nwoke ji egbugbu dee na nkwonkwo ụkwụ ya, aha nwa agbọghọ ya na ya na-emebu enyi.” Gịnị bụ nsogbu dị na nke ahụ? “Ya na ya abụghịzi enyi.” Dị ka magazin bụ́ Teen si kwuo, “ndị dọkịta na-eme atụmatụ na ihe karịrị pasent 30 nke egbugbu nile a na-ehichapụ bụ n’ahụ́ ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma, bụ́ ndị chọrọ ka e hichapụ aha nwoke ha na ha na-emebu enyi.”

Ụfọdụ ndị ntorobịa na-ele egbugbu anya dị ka ọrụ nkà. Ndị ọzọ na-ele ya anya dị ka ihe na-egosipụta na mmadụ nweere onwe ya. “Ọ bụ m nwe onwe m,” ka Josie kwuru, ma gbakwụnye na igbu egbugbu bụ “nanị mkpebi m metụrụla ná ndụ m.” Igbu egbugbu n’ahụ́ na-enye ụfọdụ ndị ntorobịa ohere ịnwale ihe ndị ọhụrụ—inwe mmetụta na ha nweere onwe ha ikpebi otú ha ga-adị n’ile anya. Igbu egbugbu pụkwara igosipụta àgwà nnupụisi ma ọ bụ ụzọ ndụ ndị na-ekwekọghị n’ụkpụrụ omume ọma. N’ihi ya, ụfọdụ egbugbu nwere okwu na ihe osise ndị rụrụ arụ ma ọ bụ ihe odide ndị na-akpasu iwe.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa pụrụ ịbụ nnọọ ndị ihe na-ewu ewu na-eri isi. Ma nanị n’ihi na o yiri ka onye ọ bụla ọ̀ na-egbu egbugbu, ò kwesịrị ime ka i gbuo egbugbu?

Nkà nke Igbu Egbugbu n’Oge Ochie

N’ezie, igbu egbugbu amaliteghị taa. N’Ijipt nakwa na Libia, a chọtawo ọtụtụ ozu ndị a gbasiri agbasi bụ́ ndị e gburu egbugbu n’ahụ́ ha, ndị nọworo ọtụtụ narị afọ tupu oge Kraịst. A chọtawokwa ozu ndị a gbasiri agbasi bụ́ ndị e gburu egbugbu n’ahụ́ ha n’Ebe Ndịda America. Ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji egbugbu see nwere kpọmkwem ihe jikọrọ ha na ikpere arụsị. Dị ka otu onye na-eme nchọpụta bụ́ Steve Gilbert si kwuo, “egbugbu kasị ochie a maara bụ́ nke nwere ihe o yiri kama ịbụ nke na-eyighị ihe ọ bụla, na-anọchi anya chi bụ́ Bes. N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke Ijipt, Bes bụ chi nke oriri oké mkpọtụ e ji omume mmekọahụ mara.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, Iwu Mozis machibidoro ndị Chineke igbu egbugbu n’ahụ́ ha. Levitikọs 19:28 sịrị: “Unu egbula egbugbu n’anụ ahụ́ unu n’ihi mkpụrụ obi mmadụ, unu etinyekwala ihe odide, bụ́ egbugbu ọkụ, n’ahụ́ unu: Mụ onwe m bụ Jehova.” Ndị na-ekpere arụsị, dị ka ndị Ijipt, na-eji egbugbu ede aha chi ha ma ọ bụ ihe nnọchianya ha n’ara ma ọ bụ n’ogwe aka ha. Site n’irube isi n’iwu Jehova nke machibidoro igbu egbugbu, a ga-amara ndị Izrel dị ka ndị dị iche n’ebe mba ndị ọzọ nọ.—Deuterọnọmi 14:1, 2.

Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru Iwu Mozis, mmachi iwu ahụ machiri igbu egbugbu kwesịrị ịkpali anyị iche echiche. (Ndị Efesọs 2:15; Ndị Kọlọsi 2:14, 15) Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, n’ezie ị gaghị achọ igbu egbugbu n’ahụ́ gị—ọbụna igbu nke ga-anọ nwa oge—nke ga-eme ka i yie onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-efe ofufe ụgha.—2 Ndị Kọrint 6:15-18.

Ihe Ize Ndụ Ahụ́ Ike

E nwekwara nsogbu ahụ́ ike nke i kwesịrị ịtụle. Osote prọfesọ na-ahụ maka akpụkpọ ahụ́, bụ́ Dr. Robert Tomsick, na-ekwu, sị: “Ihe ị na-eme bụ ịdụpusi akpụkpọ ahụ́ gị ma na-etinye ink na ya. Ọ bụ ezie na agịga ahụ adịghị abami n’ahụ́ gị, mgbe ọ bụla ị dụpuru akpụkpọ ahụ́ gị, ị nọ n’ihe ize ndụ nke inweta nje bacteria ma ọ bụ ọrịa ndị nje virus na-akpata. Echere m na [igbu egbugbu] na-abụkarị ihe ize ndụ.” Nwoke ahụ bụ́ Dr. Tomsick gara n’ihu ikwu, sị: “Ozugbo ink ahụ banyere n’ahụ́ gị, ọ bụrụgodị na i buteghị ọrịa, ahụ́ gị pụrụ ịsọ ihe ahụ e tinyere na ya, na-ekpo gị ọkụ, ọ pụkwara ịchawa ọbara ọbara, zaa aza, kpọọ nkụ ma na-akọ gị ọkọ.”

N’agbanyeghị na a na-ebu n’uche ka egbugbu dịgide n’ahụ́, e nwere ụzọ dị iche iche a na-anwa isi hichapụ ha: Iji ọkụ ígwè laser rechapụ egbugbu ahụ, ibepụ akpụkpọ ahụ́ ebe e gburu egbugbu ahụ, iji ihe echipụ akpụkpọ ahụ́ ebe e gburu egbugbu ahụ, ite egbugbu ahụ ọgwụ e ji nnu mee iji mee ka ọ gbazee, na iji acid erichapụ egbugbu ahụ ma nwee apa n’ọnọdụ ya. Ụzọ ndị a e si ehichapụ egbugbu n’ahụ́ na-adị oké ọnụ ma na-afụ ụfụ. “Iji ọkụ ígwè laser erechapụ egbugbu na-afụ ụfụ karịa igbu egbugbu n’onwe ya,” ka magazin bụ́ Teen na-ekwu.

Gịnị Ka Ndị Ọzọ Ga-eche?

I kwesịkwara ichesi echiche ike banyere ihe ndị ọzọ pụrụ iche mgbe ha hụrụ egbugbu n’ahụ́ gị, n’ihi na ọtụtụ ga-emeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma. (1 Ndị Kọrint 10:29-33) Otu nwanyị nọ na Taiwan, bụ́ Li, gburu egbugbu n’echeghị eche mgbe ọ dị afọ 16. Ugbu a, ọ dị afọ 21 ma na-arụ ọrụ n’ọfịs. “Otú ndị ọrụ ibe m na-esi elegide anya n’egbugbu ahụ na-enye m nsogbu n’obi,” ka Li na-ekweta. Otu onye Britain na-arụ ọrụ ahụ́ ike uche bụ́ Theodore Dalrymple na-ekwu na, nye ọtụtụ ndị, egbugbu “na-abụkarị ihe àmà a na-ahụ anya nke na-egosi na mmadụ . . . so n’òtù ndị na-eme ihe ike, ndị obi tara mmiri, ndị na-adịghị eso ndị ọzọ emekọ ihe, na ndị na-eme mpụ.”

N’otu aka ahụ, otu isiokwu dị na magazin bụ́ American Demographics kwuru, sị: “O doro anya na ihe ka ọtụtụ ná ndị America na-ele egbugbu a na-ahụ anya anya dị ka ihe ize ndụ. Pasent 85 [nke ndị ntorobịa] kwenyere n’okwu ahụ bụ́ na ‘ndị gburu egbugbu a na-ahụ anya . . . kwesịrị ịghọta na mmadụ isi n’ụzọ dị otú a egosipụta ụdị onye ọ bụ pụrụ ime ka o nwee ihe mgbochi n’ọrụ ma ọ bụ ná mmekọrịta ya na ndị ọzọ.’”

Tụleekwa ma egbugbu ị chọrọ igbu ọ̀ ga-eme ka a matakwuo gị dị ka Onye Kraịst ka ọ̀ ga-eme ka a ghara ikwetacha na ị bụ Onye Kraịst. Ò nwere ike ịbụrụ ndị ọzọ “ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ?” (2 Ndị Kọrint 6:3) N’eziokwu, ụfọdụ ndị ntorobịa gburu egbugbu n’akụkụ ahụ́ ha ndị dị nzuzo. Ọbụna ndị mụrụ ha nwere ike ghara ịma banyere ya. Ma lezie anya! Nanị ịsa ahụ́ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ịhụ dọkịta n’ọnọdụ mberede pụrụ ime ka ndị mmadụ hụ ihe ahụ ị na-ezo ezo! Ọ kaara anyị mma “ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile,” na-ezere izuzuru na-aghọgbu onwe anyị.—Ndị Hibru 13:18.

Dịkwa ka ihe nile na-ewu ewu, egbugbu pụkwara ịkwụsị iwu ewu ka oge na-aga. N’ezie, ọ̀ dị uwe—ọ sọ ya ya bụrụ jean, ma ọ bụ ụdị uwe ndị ọzọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ—nke na-amasị gị nke ukwuu nke na ị ga na-eyi ya ná ndụ gị nile? Ọ dịghị ma ọlị! Otú e si kwaa ákwà, ọdịdị ya, na àgwà ya na-agbanwe agbanwe. Otú ọ dị, na-adịghị ka ákwà, ọ na-esi ike ihichapụ egbugbu n’ahụ́. Ọzọkwa, ihe “mara mma” nye gị mgbe ị dị afọ 16 nwere ike ghara ịmasịcha gị mgbe ị dị afọ 30.

Ọtụtụ ndị akwawo ụta maka mgbanwe na-adịgide adịgide ha meworo n’ọdịdị ahụ́ ha. “Egburu m egbugbu tupu m mụta banyere Jehova,” ka Amy na-akọ. “Ana m agbalị ikpuchi ya. Ọ na-eme m ihere mgbe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ hụrụ ya.” Gịnị ka nke a na-akụzi? Ọ bụ ka i chee echiche nke ọma tupu ị na-egbu egbugbu. Emela mkpebi nke ị pụrụ ịkwa ụta maka ya n’ikpeazụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 20]

A na-ejikọkarị igbu egbugbu na àgwà nnupụisi

[Foto dị na peeji nke 20]

Ka oge na-aga, ụfọdụ na-akwa ụta n’ihi egbugbu ha gburu

[Foto dị na peeji nke 21]

Chee echiche nke ọma tupu ị na-egbu egbugbu