Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Mgbawa Ndị ahụ Gasịrị

Mgbe Mgbawa Ndị ahụ Gasịrị

Mgbe Mgbawa Ndị ahụ Gasịrị

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’ECUADOR

N OVEMBER 20, 2002, bụ ụbọchị dị mma n’obodo Riobamba nke dị n’Ecuador. Ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ, ma nwee urukpuru ọcha. Ugwu ndị snow kpuchiri elu ha bụ́ ndị dị gburugburu obodo ahụ, dị nnọọ mma ise foto. Mmadụ 124,000 bi ebe ahụ, ihe dị ka mita 2,700 n’elu Ugwu Andes, nọ na-eme ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị, n’amaghị na a gaje ịkpaghasị ọnọdụ ahụ dị jụụ n’ike. Na mberede, n’ehihie ahụ dị jụụ, ihe gbawara n’ụzọ na-adachi ntị! Windo na ala ụlọ malitere ime mkpatụ. Anwụrụ ọkụ na-eyi egwu bụ́ nke yiri ero malitere ịkwụli elu ma na-agbasa ngwa ngwa.

N’ime minit iri, ihe nke abụọ gbawara, ala mara jijiji nke ukwuu nke mere ka windo dị iche iche tiwasịa, ibo ọnụ ụzọ ekwokapụsịakwa. Ọkụ na-ahịọli elu na anwụrụ ọkụ—nke karịrị nnọọ nke mbụ ahụ—pụtaziri. Ọtụtụ mgbawa na ụzarị ọkụ sochiri.

José na nwunye ya, bụ́ Ana—ndị bụcha Ndịàmà Jehova—bụ di na nwunye dị afọ 60 na ụma bụ́ ndị bi n’ebe ji ihe dị ka mita 400 dị anya site n’ebe ihe ahụ gbawara. Ikike nke ihe ahụ gbawaranụ kwaturu ha. Ana guzo n’ebe dị nso n’ọnụ ụzọ mbata mgbe ibo ọnụ ụzọ ahụ kwokapụrụ ma fere kụọ n’ahụ́ ájá nke dị n’azụ. Ka di na nwunye ahụ egwu na-atụ ji ọsọ na-agbaga n’azụ ụlọ ha, uko ụlọ ahụ malitere ịdakwasị ha. N’ụzọ ụfọdụ, ha jisiri ike gbapụ n’ebe ha nọ ma banyezie n’azụ ụlọ, bụ́ ebe ha sụkọtara onwe ha ma malite ikpe ekpere. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, mgbe minit 15 gasịrị, nwa ha nwoke bịara buru ha n’obere ụgbọala gaa ebe dị nchebe.

Ọ bụghị mmadụ nile pụtara n’emerụghị ahụ́. Oké ụjọ jidere ndị mmadụ mgbe ihe ndị ahụ gbawasịrị. Ọtụtụ ìgwè mmadụ ji ụkwụ gbapụ. Ka ndị mmadụ nọ na-eti mkpu ma na-ebe ákwá, ihe chịịrị ụfọdụ ndị, ha wee daa n’elu ugegbe ndị kụwara akụwa bụ́ ndị tọgbọgasịrị n’ebe ndị mmadụ si agafe. Obere ụgbọala, bọs, na gwongworo dị iche iche gbaara ọnwụ ọnwụ si n’obodo ahụ pụọ, ụfọdụ kwọọrọ ụgbọala ha na-aga n’ụzọ nke ọ bụ nanị ndị na-alọta alọta na-esi! Ọtụtụ ndị si n’ụlọ akwụkwọ ha ma ọ bụ n’ebe ọrụ ha gbapụ amaghị ihe bụ ọnọdụ ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ebe ha nọ ruo ihe fọrọ nke nta ka o ruo awa 24.

Gịnị kpatara ọgba aghara a nile? Ọkụ nke banyere n’ebe a na-edebe ngwá agha n’okpuru ala, bụ́ nke dị n’ogige ndị agha dị nso, mere ka ọtụtụ bọmbụ grenade, tankị, na ogbunigwe nwuru ọkụ ma na-agbawasị. Ka ihe ndị ahụ nọgidere na-agbawa, e ji ụgbọala ndị uwe ojii bụ́ ndị nwere ígwè ndị na-eme ka okwu daa ụda maa ọkwa ka mmadụ nile si n’obodo ahụ pụọ ma gaa, ọ dịkarịa ala, ebe dị kilomita 15 site n’obodo ahụ.

N’oge na-adịghị anya, Riobamba tọgbọọrọ chakoo. Ọtụtụ puku ndị bi n’obodo ahụ jupụtara n’okporo ụzọ awara awara nke dị ná mpụga obodo ahụ, sụkọta onwe ha n’abalị ahụ oyi na-atụ—ọtụtụ n’ime ha eyighị uwe oyi. Mgbe ọtụtụ awa gasịrị, mgbawa ndị ahụ kwụsịlatawara. Oyi ahụ nke na-atụru n’ọkpụkpụ mere ka ndị bi n’obodo ahụ malite iji nlezianya laghachiwa n’obodo ahụ. N’ụtụtụ echi ya, ọtụtụ chọpụtara na windo, ibo ụzọ, elu ụlọ, uko ụlọ, nakwa mgbidi dị n’ụlọ ha emebiwo n’ụzọ dị ukwuu. Otu ezinụlọ hụrụ ibé ugegbe ndị pịrị ọnụ bụ́ ndị febara n’ime matarasị dị n’ime ụlọ ihi ụra ha. Ndị ọzọ hụrụ iberibe bọmbụ n’ime nakwa na gburugburu ụlọ ha.

Ná ndekọ mbụ e mere, e kwuru na ọ dịkarịa ala, mmadụ 7 nwụrụ, mmadụ 538 merụrụ ahụ́, ebe ụlọ dị 18,000 bibiri ebibi. N’ime Ndịàmà Jehova 950 e nwere n’ógbè ahụ, ọ dịghị onye nwụrụnụ, ọ bụ ezie na a gwọrọ mmadụ abụọ n’ihi mmerụ ahụ́ dị oké njọ ha nwetara.

Ihe Enyemaka Maka Ndị Ọdachi ahụ Metụtara

N’ụtụtụ echi ya, ndị okenye si n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ malitere ileta ụmụnna ha bụ́ Ndị Kraịst iji mara otú ha dị. Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, otu onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova na ndị okenye si n’ọgbakọ 13 dị n’ime nakwa na gburugburu ógbè ahụ nwere nzukọ iji mata ókè ihe mebiruru na mmadụ ole merụrụ ahụ́. Ọ gbara ndị okenye ahụ ume ka ha gboo mkpa ime mmụọ na nke mmetụta uche nke ndị ahụ lanahụrụnụ. Ọbụna n’ọnọdụ ndị ahụ siri oké ike, ịga nzukọ Ndị Kraịst dị oké mkpa! (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ihi ya, n’uhuruchi echi ya, ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ nwekwara nzukọ ha na-enwe mgbe nile.

Na Thursday nakwa na Friday, e mere ndekọ zuru ezu banyere ụlọ Ndịàmà mebiri emebi, e zigakwara ya n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke mba ahụ bụ́ nke dị na Guayaquil. Ihe ndekọ ahụ kwuru mkpa dị ngwa e nwere bụ́ imechisi windo ndị gbawara agbawa iji chebe ndị bi n’ụlọ ndị ahụ pụọ n’oyi ahụ na-atụnụ. N’ime awa ole na ole, alaka ụlọ ọrụ ahụ zụrụ nnukwu wọtapruf na-ahụ ụzọ, ọtụtụ solo tepụ, na ntu a pụrụ ịkụba n’ahụ́ ájá, iji rụzie ụlọ ndị ahụ mebiri emebi, ruo nwa oge.

Gwongworo bú ihe ndị a ga-eji rụọ ọrụ si n’alaka ụlọ ọrụ rute n’elekere 9:00 nke ụtụtụ Saturday. Ìgwè ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị bụ́ Ndịàmà amaliteworị ọrụ inyere Ndịàmà ibe ha aka ikpochasị ugegbe ndị kụwara akụwa, ka ha wee nwee ike ịmalite itinye wọtapruf ndị ahụ. Otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ ghọrọ ebe bụ́ isi a nọ hazie ọrụ ahụ. A kara akara n’ala ụlọ maka ịtụ wọtapruf ndị ahụ ngwa ngwa. N’iji ihe e ji atụ ihe bụ́ nke ndị ọrụ enyemaka ahụ nwetara mee ihe, a chabiri wọtapruf ndị ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị ma bugazie ha n’ebe ìgwè ndị ahụ nọ na-echere iji ha mee ihe.

José, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-akọ, sị: “Mgbe anyị lọtara ụlọ n’ehihie echi ya, ụmụnna anyị nọrịị ebe ahụ na-ekpochasị iberibe ihe ndị mebiri emebi. Na Saturday, onye agbata obi m bịara ma kwuo banyere ọmarịcha ọrụ a rụrụ n’iji wọtapruf mechie windo ụlọ m ma jụọ m, sị: ‘Ego ole ka ihe a nile furu gị?’” Lee ihe ijuanya ọ bụụrụ onye agbata obi m ahụ ịnụ na a rụrụ ọrụ nile ahụ n’efu!

Ka ọ na-erule n’uhuruchi Saturday, ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo dị 200 si n’ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ ejiriwo wọtapruf mechie windo nke ebe obibi Ndịàmà dị 91. Ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà ritekwara uru. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ahụ gosiri otu ụlọ nke Ndịàmà ahụ rụrụ ọrụ na ya, na-akọwa na n’ime mmadụ asatọ bi n’ime ya, ọ bụ nanị otu onye bụ Onyeàmà Jehova.

E Nyere Nkasi Obi

Dị ka o kwesịrị ịdị, mgbawa ndị ahụ kpatara oké obi nkoropụ. Iji kasie Ndịàmà bi n’ógbè ahụ obi, e mere ndokwa maka nzukọ pụrụ iche na Monday, November 25, n’elekere 5:00 nke uhuruchi. E zigara ndị nnọchianya nke alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ahụ iduzi ya. Ebe ọ bụ na ọkụ eletrik adịghị, a pụghị inwe nzukọ ahụ n’abalị. Ebe ọ bụ na oge a ga-enwe nzukọ ahụ yiri nke na-agaghị adabachara ndị mmadụ, a tụrụ anya na ọ bụ nanị ihe dị ka mmadụ 600 ga-abịa ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ìgwè mmadụ dị 1,421, nke gụnyere ụfọdụ ndị agbata obi na-abụghị Ndịàmà, jupụtara Ụlọ Mgbakọ Riobamba! Akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ isi a tụlere n’usoro ihe omume ahụ bụ Abụ Ọma 4:8: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” Ndị nile bịaranụ kwupụtara nnukwu ekele ha nwere maka usoro ihe omume ime mmụọ ahụ na-akasi obi a haziri.

Ná ngwụsị nke usoro ihe omume ahụ, e nyere ndị nne na nna ọtụtụ narị isiokwu Teta! (Bekee) nke bụ́ “Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Inyere Nwa Gị Aka Ịnagide Ha” (June 22, 1996). Otu paragraf nke dị n’isiokwu ahụ na-asị:

“Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti Na-ahụ Maka Ọnọdụ Mberede na United States (FEMA) na-ekwu na ozugbo e nwesịrị ọdachi, ụmụaka na-atụkarị ụjọ na (1) a ga-ahapụ nanị ha, (2) a ga-ekewapụ ha n’ebe ezinụlọ ha nọ, (3) ihe ahụ merenụ ga-eme ọzọ, nakwa (4) mmadụ ga-emerụ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ.” Dabere n’isiokwu a, a gbara ndị nne na nna ume ka ha:

1. Gbalịa ka ezinụlọ ha nọkọta ọnụ.

2. Wepụta oge iji jiri olu dị nro kọwaa ọnọdụ ahụ.

3. Gbaa ụmụaka ume ikwu okwu.

4. Kwe ka ụmụaka soro rụọ ọrụ nzacha na mkpofu.

Mgbe e mesịrị, e kesaara ndị agbata obi na ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible isiokwu Teta! ahụ fọrọ afọ.

Izu atọ mgbe ihe ndị ahụ gbawasịrị, a zụtara ihe ndị a ga-eji rụzie ihe n’ụzọ na-adịgide adịgide, e tinyekwara windo, uko, ma kụọ gbam gbam ndị ọhụrụ. N’ime izu atọ ọzọ, a rụchara ọrụ ahụ nile, tinyere ịrụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ. Ọtụtụ ndị kwupụtara ekele ha nwere maka ndokwa ndị a e ji ịhụnanya mee.

Ụdị ọdachi dị iche iche jupụtara ebe nile “n’ụbọchị ikpeazụ” a. (2 Timoti 3:1-5) Otú ọ dị, nkwado Ndịàmà Jehova na-enye ibe ha nakwa ndị agbata obi ha na-egosipụta ikike nke ezi Iso Ụzọ Kraịst nwere. José kọwara ya nke ọma mgbe ọ sịrị: “Nzukọ Jehova adịghị egbu oge n’inyere anyị aka mgbe anyị nọ ná mkpa.”

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ihe dị ka Ndịàmà 200 nyere onwe ha n’afọ ofufo maka nzacha na mkpofu ahụ. A tụrụ, kwọbie ma rụnye windo ndị ọhụrụ. A gbanwere elu ụlọ ụfọdụ