Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ Ga-akwụsị

Nsogbu A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ Ga-akwụsị

Nsogbu A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ Ga-akwụsị

“ỤFỌDỤ ndị na-abụghị ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị na-ahụ ọnọdụ ndị ọrụ ugbo nọ na ya aghaghị ịjụ ihe mere mmadụ ọ bụla ga-eji nọgide na-arụ ọrụ ugbo,” ka Rodney, bụ́ onye ọrụ ugbo, nke nna ya na nna nna ya bụchakwara ndị ọrụ ugbo, na-ekwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile nọgidere na-arụ ọrụ ugbo. Ná mba ụfọdụ na-emepe emepe, a pụrụ inwe ọrụ ole na ole mmadụ pụrụ ịhọrọ; ọrụ ugbo pụrụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ime ka ezinụlọ nwee ihe ha ga-eri n’ụbọchị.

Ọzọkwa, ọtụtụ ezinụlọ na-eche na ọ bụghị nanị na ọrụ ugbo na ịkpa anụ bụ ọrụ e ji akpata ego kamakwa ọ bụ ụzọ ndụ. Ọnụ ọgụgụ ndị nọgideworo n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ n’agbanyeghị oké ọkọchị, ọrịa, ọnọdụ akụ̀ na ụba dị njọ, na nsogbu ndị ọzọ, na-agba akaebe banyere ikike ha nwere ịnagide ihe na mmasị ha na-enwe ná ndụ nke ọrụ ugbo. Tupu anyị atụlee ihe ngwọta nye nsogbu a na-enwe n’ọrụ ugbo, ka anyị leba anya n’otú e siworo nyere ụfọdụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ aka ịnagide nsogbu ha.

Otú Ụfọdụ Ndị Si Anagide Ya

Ọrụ ugbo na ịkpa anụ na-eweta ọtụtụ ihe ịma aka ndị a na-apụghị izere ezere. A ghaghị ikweta na a pụghị nnọọ ịchịkwa ihu igwe, ọnọdụ akụ̀ na ụba, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. “Ihe tara akpụ nke ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ na-amụta bụ na ịrụsi ọrụ ike adịghị eweta ihe ịga nke ọma mgbe nile,” ka otu akụkọ ụlọ ọrụ bụ́ North Carolina Cooperative Extension Service bipụtara na-ekwu. “Ụkpụrụ nke ịrụsi ọrụ ike, bụ́ nke onye ọrụ ugbo ọ bụla na-agbaso, adịghị arụpụta ihe a tụrụ anya ya mgbe nile. E nwere ọnọdụ na ihe onye ọ bụla n’ime ndị na-arụ ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ na-agaghị achịkwali.” N’ịkọwa otú o si nwee ike ịnọgide na-enwe obi ụtọ, otu onye ọrụ ugbo merela agadi kwuru, sị: “Amụtawo m nnọọ ịnagide ihe m na-agaghị egbochili.”

Otu ilu oge ochie na-ekwu, sị: “Onye na-arịba ifufe ama agaghị agha mkpụrụ; ọzọ, onye na-elekwasị igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.” (Eklisiastis 11:4) Ọnọdụ nke amaghị ihe echi ga-abụ na nke amaghị ihe a ga-ekpebi ekpebi pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike. Ilekwasị anya n’ihe ndị dị mma kama ịbụ n’ihe ndị na-adịghị mma pụrụ inye aka belata nchegbu.

Iri ezigbo nri, izu ike nke ọma, na imega ahụ́ n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụkwara ịrụpụta ihe dị mma. Akwụkwọ bụ́ The Western Producer na-akọ na ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị nwere ezi ahụ́ ike “na-eme mkpebi ndị dị mma karị.” Otu onye ọrụ ugbo aha ya bụ Eugene na nwunye ya, bụ́ Candace, gwara Teta!, sị: “Izu ike nke ọma na-enyere anyị aka ịnagide nchegbu. Nsogbu na-eyi nke na-adịghị oké njọ na nke dị mfe ndozi karị mgbe anyị zuru ike. Iri ezigbo nri na-enyekwa aka, karịsịa mgbe e rikọrọ ya ọnụ dị ka ezinụlọ.” Ndụmọdụ a kwekọrọ n’ihe Bible na-ekwu: “Mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.”—Eklisiastis 3:13.

Ịkwado Ezinụlọ

Otu onye ọrụ ugbo gwara Teta!, sị: “Ọtụtụ ezinụlọ ndị na-arụ ọrụ ugbo na-akwado onwe ha site n’ịrụ ọrụ ọzọ. Ọ bụ ezie na e bu n’uche ka nke a belata nchegbu a na-enwe maka ego, nchegbu ndị ọzọ metụtara mmekọrịta mmadụ na ibe ya pụrụ iselite isi. Ụfọdụ ezinụlọ na-arụ ọrụ ugbo bụ́ ndị na-emekọbu ihe ọnụ, adịghịzi emekọ ihe ọnụ.” Olee otú ezinụlọ dị iche iche pụrụ isi nagide ọnọdụ ahụ?

Ihe dị ka afọ 2,700 gara aga, a dọrọ ndị isi ezinụlọ aka ná ntị, sị: “Dozie ije ozi gị n’èzí, jikerekwaara ya onwe gị n’ọhịa; e mesịa wuokwa [ezinụlọ] gị.” (Ilu 24:27) Randy, bụ́ onye ọrụ ugbo nke ji ụmụ, nke ezinụlọ ha bụ ndị ọrụ ugbo kemgbe nna nna nna ya dịrị ndụ, na-ekwu, sị: “Iwepụta oge iji na-egosipụta ekele n’ebe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ nọ bụ ihe dị oké mkpa. Nkwado na ịhụnanya dị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ mkpa. Okwu ọma na omume ọma na-eme ka onye ọ bụla na-enwe mmetụta nke ịbụ onye dị mkpa na onye e ji kpọrọ ihe.”

Ọ dị mkpa imesighachi ụmụaka obi ike karịsịa mgbe ihe gbanwere n’ụzọ dị ukwuu. E jiriwo mmetụta mfu nke ụmụaka na-enwe mgbe ndị e ji ụgwọ weghaara ugbo ezinụlọ ha tụnyere nke ụmụaka ndị mụrụ ha gbara alụkwaghịm ma ọ bụ nwụọ anwụ na-enwe. Ọ dị ha mkpa ịmara na ọ bụghị ha ka nsogbu ahụ si n’aka nakwa na ezinụlọ ahụ ga-anọgide na-adị n’otu.

Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka

Ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị na-enwe nchekasị pụrụ ịdị na-anọrọ onwe ha, na-ezere ọbụna ndị enyi ha. (Ilu 18:1) Otú ọ dị, n’oge e nwere nsogbu, nkwado nke ndị ọzọ na-adị mmadụ mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ!

Ì nwere ndị enyi ma ọ bụ ndị agbata obi na-ahụju anya n’ihi nsogbu a na-enwe n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ? Mmetụta ọmịiko nkịtị e gosiri ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe enyemaka. “Ọ bụ ihe nkasi obi ịmara na ndị enyi anyị ghọtara ihe isi ike anyị na-enwe,” ka otu onye ọrụ ugbo aha ya bụ Ron na-ekwu. Ee, bute ụzọ n’ịga leta ndị enyi gị ma gee ha ntị ka ha na-akọ otú obi dị ha.

Jack ritere uru ná nleta ndị dị otú ahụ. Ọ na-akọ, sị: “Eji m obi ụtọ na-echeta oge ndị enyi m chọpụtara nchegbu m na-enwe ma jiri ịhụnanya bịa leta m iji gbaa m ume.” Ọ dịghị mkpa na mmadụ ga-amacha banyere ọrụ ugbo tupu ya enwee ike inye nkwado. Rodney, bụ́ onye e hotara ná mmalite, na-ekwu, sị: “Nanị na ndị enyi m maara na m nwere ọrụ na-anyịgbu m na-enye m ume na ọchịchọ ime ike m nile.” Nke a na-echetara anyị ilu Bible bụ́: “Ezi enyi na-ahụ n’anya mgbe nile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17, NW.

Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide

Nsogbu a na-enwe n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na mmadụ enweghị ike ilekọta ụwa na iji ihe ndị dị n’ime ya mee ihe n’ụzọ gara nke ọma. Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) N’ụzọ doro anya, enyemaka Chineke dị mmadụ mkpa. Ị pụkwara inwe obi ike na e wetawala enyemaka dị otú ahụ.

Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were mmadụ ahụ mee ka ọ nọdụ n’ubi Iden a gbara ogige ịrụ ọrụ ya na idebe ya.” (Jenesis 2:15) Ee, ọ bụ iwu Onye Okike anyị nyere mere e ji malite ịrụ ọrụ ugbo na ịkpa anụ! Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Chineke mere ka ndị ya bụ́ ụmụ Izrel banye n’ala Kenan. Banyere ala ahụ, ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Site na mmiri ozuzo nke eluigwe ka ọ na-aṅụ mmiri: ọ bụ ala nke dị Jehova, bụ́ Chineke gị, n’obi; mgbe nile ka anya Jehova, bụ́ Chineke gị, na-adịkwasị ya, site na mgbe mbụ nke afọ wee ruo mgbe ikpeazụ nke afọ.” (Deuterọnọmi 11:11, 12) Jehova nyekwara iwu ndị mere ka a ghara imebi Ala Nkwa ahụ. Dị ka ihe atụ, a chọrọ ka ụmụ Izrel hapụ ala ubi ha, ubi vaịn ha, na ubi oliv ha n’akọghị ya ihe n’afọ nke asaa ọ bụla. (Ọpụpụ 23:10, 11) N’ụzọ dị otú a, e mere ka ala ahụ nọgide na-eme nri.

Anyị pụrụ inwe obi ike na n’ọdịnihu, n’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke—ọchịchị eluigwe nke Jizọs Kraịst ga-abụ onye ọchịchị ya—ala ga-eme nri n’ụzọ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. (Aịsaịa 35:1-7) Mgbe Jizọs Kraịst, bụ́ onye a họpụtara ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze a, nọ n’ụwa, o gosipụtara ike o nwere ịchịkwa ikike ndị sitere n’okike bụ́ ndị na-emetụta ọrụ ugbo nakwa ịkpa anụ. (Mak 4:37-41) Abụ Ọma nke 72 na-akọwa ọnọdụ ndị ga-adị mgbe ọ ga-eji ike ya mee ihe iji gwọọ nsogbu ụwa na nke ihe ndị bi n’ime ya. Ọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanọn: mmadụ ga-esikwa n’obodo waa okooko osisi dị ka ihe a kụrụ n’ala.” (Abụ Ọma 72:16) N’ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ndị Chineke ga-eji ọṅụ nweta ihe ubi bara ụba, nke a na-ahụtụbeghị ụdị ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Ihe tara akpụ nke ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ na-amụta bụ na ịrụsi ọrụ ike adịghị eweta ihe ịga nke ọma mgbe nile”

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Igbo mkpa mmetụta uche na nke ime mmụọ nke ndị òtù ezinụlọ pụrụ inyere ha aka ịnagide nsogbu ndị a na-enwe n’ọrụ ugbo

[Foto dị na peeji nke 10]

N’okpuru ọchịchị Chineke, ụwa ga-eme nri n’ụzọ a na-ahụtụbeghị ụdị ya

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Garo Nalbandian