Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu Ndị Ọrụ Ugbo na Ndị Na-akpa Anụ Na-enwe

Nsogbu Ndị Ọrụ Ugbo na Ndị Na-akpa Anụ Na-enwe

Nsogbu Ndị Ọrụ Ugbo na Ndị Na-akpa Anụ Na-enwe

RICHARD na-akọ ihe n’otu ala ahụ nna nna nna ya kọrọ ihe na ya n’ihe dị ka 100 afọ gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ 2001, onye ọrụ ugbo a bụ́ onye Canada bụ onye mbụ n’ezinụlọ ha nke na-akọtaghị ihe ọ bụla kemgbe nna nna nna ya dịrị ndụ. Oké ọkọchị kpara ubi ya aka ọjọọ. Ụsụ ahịa e nwere n’afọ bu ụzọ na oké ego ọ na-efu iji kọpụta ihe, mere ka ihe sikwuoro ya ike. Richard kwara arịrị, sị: “Ihe nọ nnọọ na-aka njọ, enweghịkwa m ụzọ mgbapụ.”

N’Ógbè A Na-akọ Ọka na United States, Larry kọrọ ihe n’otu ala nke ezinụlọ ha nwe kemgbe afọ 115. “Enwere m mmetụta na ọ bụ ọrụ m ịhụ na a na-akọ ihe n’ala ahụ, mee ka ego si na ya na-apụta . . . , ma emelighị m ya,” ka ọ na-ekwu. Larry na nwunye ya akọpụtaghị ihe ọ bụla n’ubi ahụ.

Ọ bụghị nanị Larry na Richard nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ. Na Britain, ntiwapụ nke ọrịa na-emetụta ụkwụ na ọnụ n’etiti ụmụ anụmanụ, furu ndị na-akpa anụ ego dị ukwuu ma tinye ha n’echiche. Otu ụlọ ọrụ akụkọ ụwa kọrọ, sị: “Ọnọdụ a na-enwe kwa ụbọchị n’ebe a na-akpa anụ na Britain—ọbụna n’ebe ọrịa ahụ na-erubeghị—bụ nchekasị, nnọpụ iche, na ime mgbalị siri ike izere ndị e ji ụgwọ.” N’ala ụfọdụ na-emepe emepe, agha, oké ọkọchị, mmụba ndị mmadụ na-amụba n’ike n’ike, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, emewo ka ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ kwọọ aka tiere ọkụkọ akị. A na-amanye gọọmenti dị iche iche ịtụbata nri—nri ọtụtụ ezinụlọ na-agaghị azụtali.

N’ihi ya, mmetụta nke nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ na-enwe, zuru ebe nile. Otú o sina dị, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole bi n’obodo ukwu na-echebara nnọọ nsogbu ndị dị n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ, echiche. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50 gara aga, President Dwight D. Eisenhower nke United States kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Ọrụ ugbo na-eyi nnọọ ihe dị mfe mgbe ị na-arụ n’ọfịs, ma nọrọ n’ebe dịpụrụ nnọọ adịpụ n’ugbo ọka.” N’otu aka ahụ, ndị na-arụ ọrụ ugbo taa na-eche na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ụwa amaghị banyere ọrụ ugbo na òkè dị mkpa ndị ọrụ ugbo na-ekere. “Anyị adịtụghị achọ ịma ebe e si enweta nri anyị na-eri,” ka otu onye Canada na-arụ ọrụ ugbo kwara n’arịrị. “Tupu a fụchie ya ma debe ya na shelf ụlọ ahịa, aka ọtụtụ mmadụ emetụla ya.”

Ebe ọ bụ na anyị nile na-adabere n’ebe ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ nọ, a pụghị ileghara nsogbu ha anya. Ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Don A. Dillman na Daryl J. Hobbs na-adọ aka ná ntị, sị: “N’ụwa taa nke ndị mmadụ na-adabere nnọọ n’ebe ibe ha nọ, nsogbu ime obodo adịghị anọte aka ọ ghọọ nke obodo ukwu, nke obodo ukwu adịghịkwa anọte aka ọ ghọọ nke ime obodo. Ma obodo ukwu ma ime obodo adịghị nke pụrụ inwe ọganihu ruo ogologo oge mgbe nke ọzọ nọ na-ahụsi anya.” Ọzọkwa, n’ụwa taa nke yiri otu obodo nta, nsogbu akụ̀ na ụba e nwere n’otu mba pụrụ imetụta n’ụzọ dị ukwuu, ihe ubi a na-ere ere na ihe ọ na-efu iji kọpụta ihe ná mba ndị ọzọ.

Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Ụlọ Ọrụ New York nke Na-ahụ Maka Ọgwụ E Ji Eme Ihe n’Ọrụ Ugbo na Ahụ́ Ike kọrọ, sị: “Ọrụ ugbo na ịkpa anụ so n’ime ọrụ 10 ndị kasị akpata nchegbu na United States.” Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata nsogbu ahụ a na-enwe n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ? Olee otú ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ pụrụ isi nagide nsogbu ndị a? Ọ̀ dị ihe ọ bụla mere a ga-eji kwere na a pụrụ idozi nsogbu ahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Ọrụ ugbo na-eyi nnọọ ihe dị mfe mgbe ị na-arụ n’ọfịs, ma nọrọ n’ebe dịpụrụ nnọọ adịpụ n’ugbo ọka”