Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Piñata—Omenala Oge Ochie

Piñata—Omenala Oge Ochie

Piñata—Omenala Oge Ochie

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MEXICO

ỤMỤAKA ndị nọ n’ógbè anyị na-eme ememe. Anyị pụrụ ịnụ ka ha ji olu aṅụrị na-eti, sị: “Dale! Dale! Dale!” (Kụọ ya! Kụọ ya! Kụọ ya!) Anyị elepụ anya n’ebe ha nọ na-eme ememe ahụ ma hụ jakị e ji akwụkwọ mee, bụ́ nke a chọrọ mma, nke e kowere n’agbata osisi abụọ. Otu nwatakịrị e kechiri ihe n’anya ejiri osisi na-akụ jakị ahụ, na-anwa itika ya. Ndị bịara ememe ahụ ana-aja ya ike. N’ikpeazụ, jakị ahụ agbakaa, ihe nracha, mkpụrụ osisi, na ihe ụmụaka na-eji egwurị egwu awụsasịa n’ala. Ụmụaka ahụ nile ejiri ọchị gbara gaa ịtụtụrụ ihe ndị ahụ. O yiri nnọọ ihe ọchị. A gwara anyị na a na-akpọ jakị ahụ piñata nakwa na itika piñata n’ememe bụ omenala na Mexico nakwa n’ụfọdụ mba ndị ọzọ dị na Latin America.

O juru anyị anya ihe mere piñata ji na-ewu nnọọ ewu. Olee ebe ọ malitere? Ọ̀ dị ihe ọ bụla pụrụ iche itika piñata pụtara? Anyị kpebiri ime nchọpụta.

Ebe Piñata Malitere

Echiche e nwere n’ebe nile bụ na ndị China pụrụ ịbụ ndị mbụ malitere iji ihe dị ka piñata eme ihe dị ka akụkụ nke ememe Afọ Ọhụrụ ha, bụ́kwa nke na-aka akara mmalite oge opupu ihe ubi. Ha na-eme ihe oyiyi nke ehi, na atụ, na-eji akwụkwọ ndị nwere àgwà dị iche iche ekpuchi ha ma na-etinyeju ụdị mkpụrụ ise dịgasị iche n’ime ha. A na-eji osisi nwere àgwà dị iche iche etika ihe oyiyi ahụ. A na-esu akwụkwọ e ji chọọ ihe oyiyi ahụ mma ọkụ, kpokọtakwa ntụ ya, ma debe ya dị ka ihe ga na-eweta afọ ọma n’afọ na-esonụ.

A na-eche na na narị afọ nke 13, onye Venice bụ́ Marco Polo, nke na-eme njem, si China welata omenala a n’Ịtali. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e nyere ya aha ahụ a na-akpọ ya ugbu a, bụ́ nke sitere n’okwu Italian bụ́ pignatta, ma ọ bụ ite ájá, e tinyejukwara ya ihe ndị na-abachaghị uru, ọla, ma ọ bụ ihe nracha kama itinye ya mkpụrụ ákụ́kụ́. Omenala ahụ gbasaziri ruo Spen. Itika piñata ghọrọ omenala n’ụbọchị Sunday mbụ nke oge Lent. * O yiri ka ọ̀ bụ ndị ozi ala ọzọ si Spen webatara piñata na Mexico ná mmalite narị afọ nke 16.

Otú ọ dị, ọ pụrụ ijuworị ndị ozi ala ọzọ ahụ anya (dị ka o juru anyị) ịchọpụta na ndị Mexico adịlarị mbụ nwee omenala yiri ya. Ndị Aztec na-eme ememe ncheta ọmụmụ nke Huitzilopochtli, bụ́ chi ha nke anyanwụ na agha, site n’idebe ite ájá n’otu poolu nke dị n’ụlọ arụsị ya ná ngwụsị afọ. A na-etunyegasị ábụ́bà ndị tụrụ àgwà n’ite ahụ ma tinyejuo ụmụ irighiri ihe ndị dị oké ọnụ ahịa n’ime ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-eji osisi kụwaa ya, ihe ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị si n’ite ahụ wụpụtasịa na-aghọ ihe ndị e ji chụọrọ arụsị ahụ àjà. Ndị Maya na-emekwa egwuregwu nke ndị e kechiri ihe n’anya na-eji ihe na-akụ ite ájá e ji eriri kowe n’elu.

Dị ka otu ụzọ ha si zie ndị India ozi ọma, ndị ozi ala ọzọ ahụ bụ́ ndị Spen ji nkà jiri piñata mee ihe iji nọchie anya, tinyere ihe ndị ọzọ, mgbalị siri ike Ndị Kraịst na-eme iji merie Ekwensu na mmehie. Piñata nke ọdịnala bụ ite ájá e ji akwụkwọ ndị tụrụ àgwà fụchie, nke e mekwara ka o nwee ọdịdị nke kpakpando nwere aka asaa a kwụnyesịrị ihe na ha. A sịrị na aka asaa ndị a na-anọchi anya mmehie asaa ndị na-eweta ọnwụ: anyaukwu, iribiga ihe ókè, enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ, mpako, ekworo, iwe, na agụụ mmekọahụ. Mmadụ iji osisi kụọ piñata ahụ mgbe e kechiri ya ihe n’anya na-anọchi anya inwe okwukwe n’ajụghị ase na ikpebisi ike iguzogide ọnwụnwa na ihe ọjọọ. Ọ bụ ihe ndị dị n’ime piñata ahụ bụ ihe a na-eji enye mmadụ ụgwọ ọrụ.

Piñata Taa

Ka oge na-aga, a malitere iji piñata na-eme ihe n’ememe bụ́ posada * nke a na-eme n’oge Krismas, ọ dịgidewokwa otú ahụ ruo taa. (A na-eji piñata nke yiri kpakpando eme ihe iji nọchite anya kpakpando ahụ duuru ndị na-agụ kpakpando gaa Betlehem.) A na-elekwa itika piñata anya dị ka ihe dị oké mkpa n’ememe ụbọchị ọmụmụ. N’ezie, piñata aghọwo ihe ọdịnala Mexico nke na ọbụna ndị Mexico na-ebupụ ha ná mba ndị ọzọ.

Anyị chọpụtara na ọtụtụ ndị na Mexico adịghịzi ele piñata anya dị ka ihe ya na okpukpe nwere njikọ, ihe ka ọtụtụ na-elekwa ya anya dị ka ihe egwuregwu na-adịghị ihe o mere. N’ezie, a na-eji piñata eme ihe na Mexico n’ọtụtụ ememe, ọ bụghị nanị maka posada ma ọ bụ maka ụbọchị ọmụmụ. A pụkwara ịzụta ọtụtụ ụdị piñata ma e wezụga ndị nke ọdịnala ahụ nwere ọdịdị kpakpando. Mgbe ụfọdụ a na-eme ha ka ha yie anụmanụ, okooko osisi, ekpo.

Mgbe Ndị Kraịst na-atụle ma hà ga-eji piñata mee ihe ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ha kwesịrị ichebara akọ na uche nke ndị ọzọ echiche. (1 Ndị Kọrint 10:31-33) Ihe bụ́ isi e kwesịrị ichebara echiche abụghị ihe ememe ahụ pụtara n’ọtụtụ narị afọ gara aga kama o kwesịrị ịbụ otú e si ele ya anya taa n’ógbè gị. N’ụzọ kwere nghọta, echiche e nwere banyere ya pụrụ ịdịgasị iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya izere ime ka ihe ndị dị otú ahụ ghọọ okwu. Bible na-ekwu, sị: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 10:24.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’okpukpe ụfọdụ, dị ka Katọlik, oge Lent bụ ụbọchị 40 nke ọpịpịa bụ́ nke na-akwụsị n’ememe nke Izu Dị Nsọ n’oge Ista.

^ par. 11 Na Mexico, posada bụ ememe na-ewe ụbọchị itoolu bụ́ nke a na-eme tupu Krismas, bụ́ mgbe a na-eme ihe ngosi nke ebe Josef na Meri na-achọ posada, ma ọ bụ ebe obibi. A na-etika piñata iji weta ememe ndị ahụ ná mmechi na nke ọ bụla n’ime abalị itoolu ndị ahụ.

[Foto dị na peeji nke 17]

Mgbe ị na-atụle ma ị̀ ga-eji piñata mee ihe ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, chebara akọ na uche nke ndị ọzọ echiche

[Foto dị na peeji nke 17]

E nwere ụdị dị iche iche nke piñata, ha na-adịgasịkwa iche n’otú ha hà n’ibu