Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Idei Mmiri n’Ógbè Caucasus

Ịnagide Idei Mmiri n’Ógbè Caucasus

Ịnagide Idei Mmiri n’Ógbè Caucasus

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA RUSSIA

N’AFỌ gara aga, n’ebe ugwu nke ógbè Caucasus, bụ́ nke dị na Russia, mmiri kwesịrị izo n’ime ọnwa atọ zoro n’ime ụbọchị abụọ. Ọtụtụ osimiri tojubigara ókè. Ọbụna ụmụ obere iyi ghọrọ mmiri na-achị ọkụ, na-eburu ihe nile nọchiiri ha ụzọ. Ihe ndị a rụrụ maka igbochi mmiri dakasịrị, ụlọ na ihe owuwu ndị ọzọ bibikwara. Na mberede, ọtụtụ puku ndị bi n’ógbè ahụ enwekwaghị ebe obibi. Ọtụtụ ndị na-apụghị isi n’ụlọ ha pụọ ngwa ngwa nwụrụ. Ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụghị ime ihe ọ bụla, nọ na-ele nanị anya ka mmiri na-achị ọkụ na-eburu ndị ha hụrụ n’anya.

N’obodo Nevinnomyssk, otu ezinụlọ nwara iji traktọ ha gbapụ. Otú ọ dị, ebili mmiri kwaturu traktọ ahụ, ezinụlọ ahụ dum nwụkwara. Ụfọdụ ndị nwụrụ mgbe ha na-agbalị ịzọpụta ndị ọzọ. Atụmatụ ndị ọchịchị mere na-egosi na idei mmiri ahụ metụtara mmadụ 335,000. N’ime ha, ihe karịrị mmadụ 200 nwụrụ anwụ, ọtụtụ ndị na-efukwa efu.

Mmiri rikpuru ọtụtụ iri puku ụlọ. O bibiri paịpụ mmiri na ọwara mmiri nsị. Mmiri ahụ na-achị ọkụ bọpụtara ọbụna ozu ndị e liri n’ala, gụnyere ozu anụmanụ ndị ọrịa anthrax gburu. E mere atụmatụ na ihe idei mmiri ahụ mebiri ruru ihe dị ka puku nde ruble 16, ma ọ bụ ihe dị ka nde dollar 500 nke United States.

Ala a mara mma ma na-eme nri, bụ́ nke a na-agụkarị n’egwú nakwa n’abụ uri, bụzi ihe na-akpata obi mgbawa ma a na-ele ya! Ma, ọdachi ahụ ebibighị ezi ịhụnanya ndị agbata obi na-egosi ibe ha.

E Nyere Aka Ngwa Ngwa

Ná mmalite, e nweghị mmiri dị ọcha, e nweghị ọkụ eletrik, e nweghị gas, fon adịghị arụ ọrụ. Ndị mmadụ apụghị izirita ozi. Ihe karịrị Ndịàmà Jehova 3,000 bi n’ebe idei mmiri ahụ metụtara, ihe karịrị 700 bi na Nevinnomyssk nakwa n’ebe dịdewere ya. N’ihi ya, ozugbo a nụrụ akụkọ banyere idei mmiri ahụ, Ndịàmà hiwere kọmitii ndị pụrụ iche, ndị na-ahụ maka ọnọdụ mberede, iji lekọta ndị o metụtara. Kọmitii ndị a malitere ọrụ ọbụna tupu ndị ọrụ nnapụta nke gọọmenti erute.

N’obodo nta bụ́ Orbelyanovka, nke dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Nevinnomyssk, mmiri ahụ toro ngwa ngwa. Mmadụ asatọ, gụnyere ụmụ nwanyị abụọ bụ́ Ndịàmà, rịgooro n’elu elu nke otu obere ugwu. Ma ụmụ obere anụmanụ na ọtụtụ agwọ mekwara otú ahụ. N’ihi ya, n’ime ogologo abalị nile ahụ, mmadụ asatọ ahụ na agwọ ndị ahụ nọ na-alụ.

Ka ọ na-erule n’ụtụtụ echi ya, Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ nọ na-achọ ụzọ ndị ha ga-esi ruo n’ebe ụmụnna nwanyị abụọ ahụ bụ́ Ndị Kraịst tọrọ atọ nọ. N’ikpeazụ, ka ọ na-erule n’ehihie, a chọtara otu obere ụgbọ epeepe e ji rọba mee. Ma tupu ha anapụta ụmụnna nwanyị ahụ, Ndịàmà ahụ jiri ụgbọ epeepe ahụ buru otu agadi nwoke akụkụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ gaa n’ebe na-adịghị ize ndụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ka ha bu ụmụnna nwanyị ahụ na-aga n’ebe na-adịghị ize ndụ, otu helikọpta bịara buru ndị nke ọzọ ahụ tọrọ n’ugwu ahụ.

Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, Ndịàmà ahụ nọ n’ụgbọ epeepe ahụ napụtakwara ndị ọzọ. Mgbe Ndịàmà ahụ jụrụ ha, sị: “Ùnu ma ndị anyị bụ?” ndị ahụ zara, sị: “Eenụ, unu bụ ndị Ministri Na-ahụ Maka Ọnọdụ Mberede.” O juru ha anya ịnụ na ha abụghị.

Ndịàmà ahụ nọ na Nevinnomyssk zụtara otu kichin a na-ebugharị ebugharị ma sie nri dị ọkụ a ga-enye ndị nọ ná mkpa. Ha bugaara ha ọ bụghị nanị nri kamakwa mmiri, uwe, na ọgwụ. Ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo, bụ́ Ndịàmà, zachakwara ma kpochaa ebe obibi dị iche iche ma kpopụsịa unyí ndị dị gburugburu ụlọ.

Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà nọ na Zelenokumsk, bụ́ ndị nwere ụlọ ahịa, jiri ụgbọala ha buo mmiri, nri, na uwe, bụ́ ndị ha zụtara n’ụlọ ahịa a na-ere ihe n’ùkwù. Mgbe ndị maara nwanyị ahụ jụrụ ya ndị ha zụụrụ ihe ndị ahụ, ọ kọwara na ha zụụrụ ha ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị ọdachi ahụ metụtara. N’ịbụ ndị àgwà ilekọta ndị ọzọ nke o nwere kwaliri, ha chọkwara iso nye aka. Otu nwanyị bụ́ ọchụ nta ego nyere otu nnukwu akpa nri indomie, onye ọzọ nyere nnukwu katọn ncha, ndị ọzọ nyekwara ọtụtụ nnukwu akpa shuga.

E Nweta Enyemaka Site n’Ebe Ndị Dị Anya

Ebe ọ bụ na ọtụtụ Ndịàmà nọ na Russia chọrọ ịmata otú ha pụrụ isi nyere ndị idei mmiri ahụ metụtara aka, a malitere ịnakọta ego pụrụ iche a ga-eji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọbụna ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’Ebe Nlekọta Ọrụ nke Ndịàmà Jehova na Russia, bụ́ nke dị nso na St. Petersburg, nyere aka. Ụfọdụ ndị zụrụ ihe ọhụrụ dị iche iche maka ndị idei mmiri ahụ metụtara. Otu n’ime ha kọwara, sị: “Enyewo m ihe kasị mma m nwere n’ihi na enwere m ihe, ma ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị enweghị ihe ọ bụla.”

Ebe Nlekọta Ọrụ ahụ zigakwaara ihe dị ka ọgbakọ 150 nke Ndịàmà Jehova dị na St. Petersburg na Moscow akwụkwọ ozi, na-akọwa otú ụmụnna pụrụ isi nye ego, nri, na uwe n’onyinye. N’agbanyeghị na ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere na Russia adịghị mma, ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà enwechakwaghị ihe, ha ji mmesapụ aka nye onyinye. O yiri onyinye nke Ndị Kraịst dara ogbenye, bụ́ ndị nọ na Masedonia, nyere ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ná mkpa, bụ́ ndị bi na Judia.—2 Ndị Kọrint 8:1-4.

Mgbe a họchasịrị ihe ndị ahụ e nyere n’onyinye n’ebe ndị a na-anọkọta ha, e tinyere ha na gwongworo ma buru ha gaa n’ebe ahụ e nwere ọdachi. E wezụga ihe ndị a e nyere n’onyinye, Ebe Nlekọta Ọrụ ahụ zụtara tọn ihe oriri iri, ákwà ihe ndina dị 500, ihe ndị e ji edebe ihe ọcha, nakwa ngwá ọrụ na uwe ọrụ ndị a ga-eji kpochaa ihe mgbe ọdachi ahụ gasịrị. N’ozuzu ha, e nwere ngwongworo isii, ndị dị tọn 50 n’arọ, bụ́ ndị buuru ihe enyemaka ndị ahụ gaa n’ebe ugwu nke ógbè Caucasus.

Mmesapụ Aka Gbara Àmà

Ndị mmadụ hụrụ ọrụ Ndịàmà ahụ rụrụ mgbe ha na-azacha ma na-ekpocha ihe n’ógbè ahụ e nwere ọdachi. Tụlee ọnọdụ e nwere n’ọmarịcha obodo Kislovodsk, nke nwere ebe ndị njem nleta na-aga maka ntụrụndụ, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị Ndịàmà 300. Ha gwara ndị ọchịchị obodo ahụ ka e nye ha ọrụ ha ga-arụ, e nyekwara ha ebe ha ga-ekpochasị.

Na June 28, n’elekere 8:00 nke ụtụtụ, ihe dị ka Ndịàmà 150, nke gụnyere ezinụlọ ndị bịara n’ozuzu ha, wetara ngwá ọrụ ha ma gbakọọ iji rụọ ọrụ. Ụfọdụ weere oge ezumike n’ebe ha na-arụ ọrụ, bụ́ nke a na-akwụghị ha ụgwọ ya, iji kere òkè ná nzacha na mkpocha ahụ. N’oge na-adịghị anya, otu obere ụgbọala kwụsịrị, onye nke mbụ na-esote onyeisi obodo ahụ pụtakwara. “Olee ndị bụ ndị a?” ka ọ jụrụ.

“Ha bụ Ndịàmà Jehova,” ka a gwara ya. “Ha bịara ịzacha na ịkpocha obodo a ka ọdachi ahụ gasịrị.”

N’ịbụ onye o juru anya ịhụ ọtụtụ ndị mmadụ, osote onyeisi obodo ahụ kwuru, sị: “Ha agbalịala! Ndeewonụ! Nke a amaka!”

Mgbe nke ahụ gasịrị, tupu ha erie nri ehihie, onye ọrụ gọọmenti ọzọ ji obere ụgbọala ya rute ebe ahụ. Ọ kwụsịrị, pụta, ma gakwuru Ndịàmà ahụ. “Anyị anọwo na-ahụ ihe unu na-arụ, o jukwara anyị nnọọ anya,” ka o kwuru. “Anyị ahụtụbeghị ebe ndị mmadụ rụrụ ọrụ otú unu si arụ. Unu arụworị ihe buru ibu!”

N’ihe dị ka n’otu mgbe ahụ, otu agadi nwanyị rutere ebe ahụ ma kwụsị wee jụọ, sị, “N’ihi gịnị ka ndị a ji arụsi ọrụ ike otú a?” Mgbe a gwara ya na Ndịàmà Jehova na-enyere obodo ahụ aka, anya mmiri gbara ya. “Unu bụ ezi ndị kwere ekwe,” ka o kwuru. “Ọdachi mee, a mara onye bụ́ onye.” Nwanyị ọzọ kwuru, sị: “Lee ihe magburu onwe ya ọ bụ ime! Ọ dịla anya m na-ahụbeghị ihe dị otú a.”

N’echi ya, akwụkwọ akụkọ obodo ahụ, bụ́ Na Vodakh, toro Ndịàmà Jehova, na-ekwu na ha ekpopụwo ihe karịrị 100 tọn ájá n’obodo ahụ. Ndị isi obodo Kislovodsk deere Ndịàmà ahụ akwụkwọ ozi ekele, na-ekwu, sị: “Enyemaka unu nke bara oké uru mere ka obodo a maa mma otú ọ maburu . . . Obi abụọ adịghị ya na okwu ekele nke ọtụtụ ndị nleta na-abịa n’obodo anyị ga-ekwu ga-abụ ihe kasị mma a ga-eji kwụọ unu ụgwọ.”

Ọ bụ ezie na ọdachi na-emere onwe ya, nke kpara ebe ugwu Caucasus aka ọjọọ, kpatara oké mfu na ọgba aghara, Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ igosi ndị kwere ekwe ibe ha na ndị agbata obi ha ịhụnanya. O mere ka ha nwee obi ụtọ karịsịa n’ihi na ha maara na ngosipụta dị otú ahụ nke ịhụnanya, na-ewetara Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, otuto.

[Map ndị dị na peeji 20]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Oké Osimiri Ojii

UGWU CAUCASUS

Nevinnomyssk

Orbelyanovka

Zelenokumsk

Kislovodsk

Oké Osimiri Caspian

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndịàmà zụtara kichin a a na-ebugharị ebugharị ma sie nri maka ndị nọ ná mkpa

[Foto dị na peeji nke 21]

Onyeàmà a jiri ụgbọala ezinụlọ ya buga ihe oriri na ihe enyemaka n’ebe ahụ e nwere ọdachi

[Foto dị na peeji nke 22]

Ndị isi obodo Kislovodsk jara Ndịàmà mma maka inye aka mee ka obodo ha dị otú ọ dịbu