Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Magazin A Ga-ata Ata Ma Gbarie’

‘Magazin A Ga-ata Ata Ma Gbarie’

Magazin A Ga-ata Ata Ma Gbarie’

DAVID bụ nwa akwụkwọ na-amụ banyere iwu na Mahadum Obafemi Awolowo dị na Nigeria. N’oge na-adịbeghị anya, o degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ahụ akwụkwọ, sị: “Mgbe mgbe, ana m ewegara otu prọfesọ a na-akwanyere ùgwù, bụ́ onye dị afọ 70, nke na-akụzi iwu ná ngalaba a na-akụzi banyere iwu, Teta! N’otu ụtụtụ, mgbe o nwetasịrị mbipụta ndị ọhụrụ, ọ gwara onye ọbịa bịara n’ọfịs ya, sị: ‘Ụfọdụ akwụkwọ bụ ndị a ga-edetụ ire, ndị ọzọ bụ ndị a ga-elo elo, ole na ole bụ ndị a ga-ata ata ma gbarie. Teta! bụ magazin a ga-ata ata ma gbarie.’”

N’oge ọzọ, mgbe ọ hapụsịrị ọfịs prọfesọ ahụ, David kwuru na ya nụpeere mgbe ọ na-atụrụ onye ọbịa ọzọ aro ka ọ na-agụ Teta! “O toro nnyocha miri emi a na-eme n’ide Teta! nakwa ụzọ kwesịrị ekwesị na nke asọghị anya a na-esi ede isiokwu dị iche iche na ya. Anụrụ m mgbe ọ sịrị: ‘Ana m e ji nnọọ nlezianya na-agụ magazin ndị ahụ. Chineke aghaghị ịbụ onye na-enye ndị na-ede ya amamihe ha ji na-ede isiokwu ndị ahụ magburu onwe ha.’”

Teta! na-enye ihe mmụta ma na-ede banyere ọtụtụ isiokwu. Nke kachasị mkpa, ọ na-eme ka e nwee obi ike ná nkwa nke Onye Okike dị n’ime Bible maka ụwa ọhụrụ nke udo nke na-aga ịnọchi usoro ihe dị ugbu a. Broshuọ nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na-eme ka nzube Chineke ahụ pụta ìhè, na-enye ihe ọmụma sitere na Bible iji gosi ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji nweta ihu ọma ya. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.