Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-adịghị Ekpe Okpukpe Gị

Mgbe Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-adịghị Ekpe Okpukpe Gị

Echiche nke Bible

Mgbe Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-adịghị Ekpe Okpukpe Gị

DỊ KA otu atụmatụ e mere gosiri, e nwere ihe karịrị òtù okpukpe 10,000 n’ụwa nile. N’otu mba, e nwewo mgbe ihe dị ka pasent 16 nke ndị meworo okenye si n’otu okpukpe gafee n’ọzọ n’oge ndụ ha. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na a na-ahụ enweghị nkwekọrịta n’etiti ndị ikwu nakwa ndị enyi ma a bịa n’ihe banyere nkwenkwe okpukpe. Mgbe ụfọdụ, nke a na-akpata esemokwu. N’ihi ya, ajụjụ bụ, Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeso ndị ha hụrụ n’anya na-adịghị ekpe okpukpe ha?

Mmekọrịta Pụrụ Iche

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Bible na-ekwu banyere mmekọrịta pụrụ iche nke na-adị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. Ọ dịghị afọ ndụ mmadụ ga-eru ya etofee irube isi n’iwu ahụ dị n’Ọpụpụ 20:12, nke bụ́ “sọpụrụ nna gị na nne gị.” N’eziokwu, mgbe Jizọs na-ekwu okwu banyere iwu a, dị ka e dekọrọ na Matiu 15:4-6, o doro anya na ihe ọ na-ekwu banyere ya bụ nsọpụrụ nke ụmụ ndị toworo eto ga-enye ndị mụrụ ha.

Akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-adọ aka ná ntị megide mmadụ ịghara ịsọpụrụ ndị mụrụ ya. Ilu 23:22 na-adụ ọdụ na i kwesịghị ‘ileda nne gị anya mgbe o mere agadi.’ N’ụzọ doro anya, Ilu 19:26 na-adọ aka ná ntị na onye “na-apụnara nna ya ihe, nke na-emekwa ka nne ya gbalaga, bụ nwa na-eweta ihere na-emekwa ka e nwee ihu ihere.”

Site n’Akwụkwọ Nsọ, o doro anya na anyị ekwesịghị ileghara ndị mụrụ anyị anya. Eziokwu ahụ bụ́ na ndị mụrụ anyị adịghị ekpe okpukpe anyị akagbughị mmekọrịta nke anyị na ha. Ụkpụrụ Bible ndị a metụtakwara ndị ikwu anyị ndị ọzọ, nakwa di ma ọ bụ nwunye anyị. N’ụzọ doro anya, ọ bụ ihe kwekọrọ n’omume ọma, bụrụkwa nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro, na Ndị Kraịst ga na-ahụ ndị ikwu ha n’anya.

Inwe Ezi Uche Dị Mkpa

N’eziokwu, Bible na-adọ aka ná ntị megide mkpakọrịta ọjọọ, mkpakọrịta ọjọọ a pụkwara isite n’aka ndị ikwu. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ọtụtụ ndị ohu Chineke, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga, nọgidesiri ike n’ezi ihe, n’agbanyeghị na ndị mụrụ ha jụrụ ajụ. N’eziokwu, otú ahụ ka ọ dị n’ebe ụmụ Kora nọ. (Ọnụ Ọgụgụ 16:32, 33; 26:10, 11) Ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ime ihe ga-emebi okwukwe ha iji mee ihe ga-atọ ndị ọzọ ụtọ, ọbụnadị ndị ikwu ha.—Ọrụ 5:29.

N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị nne na nna ma ọ bụ ndị ọzọ a hụrụ n’anya na-agbasi mgba ike megide nkwenkwe Onye Kraịst. Ụfọdụ pụrụ ịghọ ọbụna ndị iro nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, Ndị Kraịst na-eme ihe ndị ezi uche dị na ha iji chebe ọnọdụ ime mmụọ ha. Jizọs kwuru n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ nke ya. Onye nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe nna ma ọ bụ nne ya nọ karịa ka o nwere n’ebe m nọ ekwesịghị m; onye nwekwara mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị nọ karịa ka o nwere n’ebe m nọ ekwesịghị m.”—Matiu 10:36, 37.

Otú ọ dị, n’ọnọdụ ka ukwuu, Ndị Kraịst adịghị enweta mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka ndị ha hụrụ n’anya. Ọ bụ nanị na ndị ikwu ha aghọtaghị ozizi Bible otú ha siri ghọta ya. Akwụkwọ Nsọ na-agba ụmụazụ Kraịst ume iji “ịdị nwayọọ” na “nkwanye ùgwù miri emi” na-emeso ndị na-ekweghị ekwe ihe. (2 Timoti 2:25; 1 Pita 3:15) Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro.” (2 Timoti 2:24) Pọl onyeozi dụkwara Ndị Kraịst ọdụ “ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla, ịghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka ha nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:2.

Na-akpọtụrụ Ha ma Na-egosi Ha Ịhụnanya

E nyere Ndị Kraịst agbamume a dị na 1 Pita 2:12, sị: “Nọgidenụ na-eme omume dị mma n’etiti mba nile [ndị na-ekweghị ekwe] ka, ha . . . wee nye Chineke otuto . . . n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” Mgbe mgbe, ndị anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị na-ekweghị n’ihe anyị kweere na-ahụ mgbanwe ndị anyị meworo site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị. Cheta na ọtụtụ ndị na-achọbughị ịma ma ọ bụ ọbụna ndị na-emegidebu eziokwu Bible agbanwewo echiche ha. Ụfọdụ ndị pụrụ ijiwo ọtụtụ afọ nyochaa àgwà ọma nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ nwa ha iji chọpụta ihe mere ha ji akpa àgwà otú ahụ. Mgbe ndị mmadụ na-anabataghị eziokwu Bible, ka ọ ghara ịbụ n’ihi na onye ezinụlọ ha bụ́ Onye Kraịst leghaara ha anya.

N’eziokwu, ọnọdụ na-adịgasị iche, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà bikwa ebe dị nnọọ anya site n’ebe ndị mụrụ ha nọ. Ọ pụghị ịdịcha mfe ileta ha mgbe mgbe dị ka mmadụ si chọọ. Ma ịdị na-edere ndị anyị hụrụ n’anya akwụkwọ ozi, na-akpọ ha na fon, ma ọ bụ na-akpọtụrụ ha mgbe mgbe n’ụzọ ndị ọzọ, ga-emesi ha obi ike na anyị hụrụ ha n’anya. Ọtụtụ ndị na-abụghị ezi Ndị Kraịst na-ahụ ndị mụrụ ha na ndị ikwu ha ndị ọzọ n’anya ma na-akpọtụrụ ha mgbe nile na-agbanyeghị okpukpe ha nọ na ya. Ọ̀ bụ na Ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà ekwesịghị ime otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 28]

Ịdị na-akpọtụrụ ndị ị hụrụ n’anya ga-emesi ha obi ike na ị hụrụ ha n’anya