Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?

Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?

Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?

“KA ÌHÈ dị.” Na United States, na narị afọ nke 19, ọ bịara dị mkpa ka e nwee ihe ọhụrụ e ji amụ ọkụ bụ́ nke ga-akwụsị ihe isi ike a na-enwe n’ọkụ na-enwu inyoghi inyoghi bụ́ ndị e ji abụba, mmanụ azụ̀ whale, na ihe ndị ọzọ na-amụ. Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Ọ bụ mmanụ ala! Ebee ka a pụrụ ịchọta ya?

N’afọ 1859, Edwin L. Drake, bụ́ onye laworo ezumike nká n’ọrụ ire tiketi n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, ji injin ụgbọ òlòkó meworo ochie gwuo olulu dị mita 22 n’omimi iji gwute mmanụ mbụ e gwutere na nso Titusville, Pennsylvania, U.S.A. Nke ahụ kara akara mmalite nke ọgbọ e nwere mmanụ ala. Ka a na-achọta mmanụ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, o metụtara akụ̀ na ụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụzọ dị ukwuu. Ọ bịara ghọọ ezigbo ihe e ji amụ ọkụ nke ụwa nọworo na-atụsi anya ya ike.

N’oge na-adịghị anya, ịzụ ala n’ike n’ike na igwu mmanụ ghọrọ ọrụ bụ́ isi a na-arụ n’ebe ndị a sị na ha bụ ógbè mmanụ nke United States. N’afọ ndị ahụ, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ banyere ndị bara ọgaranya n’otu ntabi anya na ndị ọzọ bụ́ ndị mesịrị daa ogbenye. N’ụzọ dị ịtụnanya, Edwin Drake, bụ́ nwoke ahụ gwutere mmanụ mbụ na Pennsylvania, so ná ndị mesịrị daa ogbenye.

N’agbanyeghị ụzọ dị ịrịba ama o si na-aga ahịa, ma ọ bụ ikekwe n’ihi otú o si na-aga ahịa, n’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-egwu mmanụ na Pennsylvania na-ere mmanụ ha, dalatara na nke mbụ ya. Ọnụ ahịa otu barel mmanụ si na $20 dalata ruo cent 10! Igwupụta mmanụ n’ụzọ gabigara ókè na ịtụ anya uru ahịa mere ka ọnụ ahịa mmanụ dalata, mmanụ gwụkwara ngwa ngwa n’ebe ụfọdụ a na-egwupụta ya. Ihe na-echetara anyị banyere oge ahụ karịsịa bụ obodo Pithole City, Pennsylvania, nke bụzi ebe tọgbọrọ chakoo. E guzobere ya, ya enwee ihe ịga nke ọma, a gbahapụkwa ya—ihe a nile mere n’ime ihe ji nke nta karịa otu afọ na ọkara. Ọnọdụ a gatụ ihu a gatụ azụ a ga-aghọ akụkụ bụ́ isi nke akụkọ ihe mere eme nke mmanụ ala.

N’afọ 1870, John D. Rockefeller na ndị enyi ya ole na ole debara ụlọ ọrụ Standard Oil Company n’akwụkwọ iwu. Ụlọ ọrụ a bụ ụlọ ọrụ bụ́ isi na-ere kerosin ruo mgbe ụlọ ọrụ ndị ọzọ, karịsịa ụlọ ọrụ ndị na-egwu mmanụ na Russia, pụtara ma malite ịma ya aka. Otu n’ime ndị mara ya aka bụ Marcus Samuel, bụ́ onye mepere ụlọ ọrụ a maara taa dị ka Royal Dutch/Shell Group. Tụkwasị na nke ahụ, n’ihi ịdị nkọ nke ụmụnne ahụ si n’ezinụlọ Nobel, * e mepere nnukwu ahịa mmanụ na Russia, bụ́ nke a na-enweta n’olulu mmanụ ndị dị na Baku.

Oge ahụ bụ mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke ahịa mmanụ. Kemgbe ahụ, e guzobewo òtù dị iche iche iji zere akwụsighị ike n’ọnụ ahịa mmanụ nakwa nsogbu nke enweghị ike ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ mmanụ a na-egwupụta, bụ́ nke e nwere n’oge mbụ. Otu n’ime ha bụ Òtù Mba Ndị Na-ebupụ Mmanụ Ala ná Mba Ọzọ (OPEC), bụ́ nke mba 11 nọ na ya jikọrọ aka nwee ihe ka ọtụtụ n’olulu mmanụ ndị e nwere n’ụwa.—Lee igbe dị na peeji nke 7.

Olee Otú Mmanụ E Nwere Haruru, Oleekwa Ebe Ọ Dị?

Ka ọ na-erule ná ngwụsị narị afọ nke 19, ojiji e ji ọkụ eletrik na-eme ihe n’ebe nile gaara emewo ka ahịa mmanụ daa. Otú ọ dị, ihe ọzọ dị ịrịba ama e mepụtara agbanwewo ọnọdụ ahụ n’ụzọ dị ukwuu—injin dị ka nke ụgbọala. Mmanụ petrol, bụ́ nke e si na mmanụ ala emepụta, dịzi oké mkpa maka ụgbọala ndị nwere injin, bụ́ ndị e nwerela enwe n’ọtụtụ mba ndị mepere anya ná ngwụsị afọ ndị 1920. Ugbu a, a chọkwuru nnọọ mmanụ ka ihe wee na-aga aga n’ụwa, ma olee ebe a pụrụ ịchọta ya?

Ka afọ na-aga, nchọpụta a ka na-achọpụta ebe ndị ọhụrụ a na-egwupụta mmanụ n’akụkụ dị iche iche nke ụwa—ihe dị ka 50,000 n’ime ha—emewo ka ahịa mmanụ bụrụ azụmahịa bụ́ isi n’ụwa! Ma a bịa n’igwupụta mmanụ, ihe dị mkpa abụghị ọnụ ọgụgụ nke ebe ndị a chọpụtara mmanụ kama ọ bụ otú mmanụ dị na ha haruru. Olee otú ha hà?

Ebe ndị a pụrụ igwute mmanụ na ha bụ́ ndị nwere, ma ọ dịkarịa ala, ijeri barel ise bụ ndị kasị ukwuu n’ụzọ e si kegasịa ha, ebe ndị na-esote ha bụ ndị nwere site na narị nde barel ise ruo ijeri barel ise. Ọ bụ ezie na “U.S. Geological Survey World Petroleum Assessment 2000” depụtara ihe dị ka mba 70 dị ka ndị nwere ebe ndị a na-egwupụta mmanụ, ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha so ná ndị a kọwara dị ka ndị nke kasị ukwuu nakwa ndị na-esote ha. (Lee igbe dị na peeji nke 7.) Ebe ndị ahụ a na-egwupụta mmanụ bụ́ ndị a kọwara dị ka ndị kasị ukwuu kasị dịrị n’ógbè ndị dị n’ime nakwa na gburugburu Ọwara Oké Osimiri Pesia.

A kwụsịbeghị ịchọ ebe ndị ọhụrụ a pụrụ inweta mmanụ ala. Kama nke ahụ, e jiriwo nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ ndị kasị bụrụ ọkpọka na-achọ ha. Ka ọ dị ugbu a, ógbè Oké Osimiri Caspian, bụ́ nke mba Azerbaijan, Iran, Kazakhstan, Russia, Turkmenistan, na Uzbekistan mejupụtara, adọrọwo mmasị ndị na-egwu mmanụ. Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Inye Ihe Ọmụma Banyere Ihe Ndị Na-enye Ígwè Ọrụ Ike na United States si kwuo, e nwere ohere dị ukwuu nke igwupụta mmanụ ala n’ógbè a. A nọwo na-eme nchọpụta iji mara ma è nwere ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi na-ebupụ mmanụ, dị ka site n’Afghanistan. A hụwokwa ógbè ndị ọzọ e nwere ohere nke igwupụta mmanụ na ha n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Greenland, nakwa n’ebe ụfọdụ n’Africa. Usoro nke iji mmanụ ala ndị a chọtaworo emepụta ihe ndị na-enye ígwè ọrụ ike nakwa ihe ndị a pụrụ iji mee ihe kwa ụbọchị bụkwa ihe akụkọ n’onwe ya.

Olee Otú E Si Egwute Mmanụ?

Ndị ọkà mmụta ihe banyere ala na ndị na-enyocha ala na-achọ ebe mmanụ pụrụ ịdị n’ime ala. Mgbe ha tụsịrị ihe ụfọdụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ma were ihe ụfọdụ mee nnyocha, ha na-egwu ala iji jide n’aka na mmanụ dị ebe ahụ n’ezie. N’oge mbụ, ọ bụrụ na a gbapuo mmanụ, mmanụ na ụrọ pụrụ ịgbapụta n’ike ma wụọ mmadụ n’ahụ́, na-eme ka mmanụ mbụ ahụ gbapụtaranụ wụfuo ma mee ka e nwee ihe ize ndụ nke ihe inwuru ọkụ. Otú ọ dị, site n’inwe ngwá ọrụ ndị e ji atụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na valvụ ndị pụrụ iche, ígwè ọrụ ndị e ji egwu mmanụ taa na-egbochi nke ahụ ime. O kwekwara omume taa igwumi ala egwumi n’egwusaghị ya egwusa.

E mesịa, ikike nke ihe na-eme ka mmanụ ala na-agbapụta na-ebelata, a ghaghịkwa ime ka ikike ahụ dịgide site n’ịdị na-agbanye ya mmiri, kemikal dị iche iche, gas carbon dioxide, ma ọ bụ gas ndị ọzọ, dị ka nitrogen. Dabere n’ebe ọ dị, ọ̀tụ̀tụ̀ ịrọ arọ nke mmanụ ala pụrụ ịdịgasị iche iche. Dị ka o kwesịrị ịdị, a na-aka achọ mmanụ na-arọghị arọ nke ukwuu, n’ihi na ọ na-aka adị mfe ngwute, na-adịkwa mfe ịza aza.

Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mmanụ Ala n’America kọwara, ụzọ nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ e si egwu mmanụ na-agụnye igwu ya ùhiè ùhiè, bụ́ nke na-ebelata ọnụ ọgụgụ olulu mmanụ a ga-egwu. Igwu mmanụ n’ime mmiri, bụ́ nke malitere na 1947 n’Ọwara Oké Osimiri Mexico, mere ka mmanụ a na-egwupụta mụbaa n’ụzọ dị ukwuu. N’ezie, ụzọ e si egwu mmanụ na-emetụta nnọọ ọnụ ahịa mmanụ. *

Olee Otú E Si Ebu Mmanụ Ala?

N’afọ 1863 na Pennsylvania, a rụrụ obere paịpụ osisi ndị nwere oghere dị nta iji na-ebu mmanụ ala, ebe ọ bụ na ha dị ọnụ ala karị ma dị mfe iji mee ihe karịa barel ndị dị lita 159, bụ́ ndị e ji ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ ebu. * Usoro paịpụ mmanụ nke oge a abụrụwo ọkpọka karị ma mụbaa. Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Paịpụ Mmanụ Ala si kwuo, United States nanị nwere njikọ nke paịpụ mmanụ ruru kilomita 300,000!

Ọ bụghị nanị na e ji usoro paịpụ mmanụ ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị a na-ejikarị ígwè eme, ebuga mmanụ n’ụlọ ọrụ a na-anọ esi ya, kamakwa e ji ha ebuga mmanụ ndị nke e sirila esi n’ebe ndị a ga-anọ ree ha. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ e ji arụ paịpụ mmanụ nwere ngwá ọrụ ndị na-achọpụta otú mmanụ si agba na paịpụ ya. E mepụtawokwa obere ngwá ọrụ ndị bụ́ ịgba bụ́ ndị na-enyocha paịpụ mmanụ ruo ọtụtụ narị puku kilomita, ngwá ọrụ ndị na-achọpụta ebe paịpụ mmanụ na-ehi mmanụ, na ngwá ọrụ ndị na-achọpụta ebe e nwere mgbawa n’ahụ́ paịpụ mmanụ. Ma, nanị ihe mmadụ nkịtị nke ji mmanụ ala eme ihe ga-ahụ ma eleghị anya bụ ihe ịrịba ama na-egosi na e liri paịpụ mmanụ ebe ahụ nakwa ihe ịdọ aka ná ntị na-ekwu na e kwesịghị igwu ala ebe ahụ.

Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú paịpụ mmanụ baruru n’uru, ọ bụghị ụzọ dị irè isi na-ebuga mmanụ buru ibu ná mba ofesi. Ma, ndị zụrụ ahịa mmanụ n’oge gara aga chọtakwara ụzọ dị irè isi na-eme nke ahụ—nnukwu ụgbọ mmiri tanker ndị na-ebu mmanụ. Ha bụ ụgbọ mmiri ndị a rụrụ n’ụzọ pụrụ iche bụ́ ndị na-eru mita 400 n’ogologo. Ụgbọ mmiri tanker bụ ụgbọ mmiri ndị kasị ukwuu gbatụrụla n’oké osimiri, ha pụkwara ibu ihe ruru otu nde barel mmanụ ma ọ bụ karị. N’ụzọ dị mwute, n’agbanyeghị otú ha siruru n’ike, ha nwere nsogbu ndị a na-enwebeghị ike idozi, dị ka igbe bụ́ “Banyere Nkwafu Mmanụ” na-egosi. Ụgbọ mmiri barge na ụgbọ okporo ígwè bụkwa ihe ndị a na-ejikarị ebu mmanụ ala n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu. Otú o sina dị, ibu mmanụ ala bụ nanị otu n’ime usoro ndị mmanụ na-agabiga.

Obere ọkụ nke si n’ọnụ paịpụ toro ogologo na-apụta—nke na-arụ ọrụ dị ka valvụ nchebe—bụ ezigbo ihe na-egosi na ihe ị na-ahụ bụ ụlọ ọrụ a na-esi mmanụ ala. N’ụzọ bụ́ isi, ná nnukwu ụlọ ọrụ a, a na-esi mmanụ ala n’ọkụ ma na-eme ka ọ banye n’ebe a na-aza ya iji nweta ụdị mmanụ dị iche iche. Mmanụ ndị a dịgasị iche iche na-amalite ná ndị kasị dị goro goro—gas dị iche iche, dị ka butane—ruo ná ndị kasị rọọ arọ, bụ́ ndị a na-esi na ha emepụta mmanụ a na-atụ n’ígwè, nakwa ihe ndị ọzọ. (Lee peeji nke 8-9.) Ma ajụjụ ka bụ, Mmanụ ala ọ̀ na-eweta ngọzi na nkọcha?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Otu n’ime ha, bụ́ Alfred Bernhard Nobel, mesịrị ghọọ onye malitere Ihe Nrite Nobel.

^ par. 16 “E mewo atụmatụ na ihe ọ na-efu iji nọrọ na tower na-ese n’elu mmiri nke e ji waya mee arịlịka ya, bụ́ nke a rụrụ n’ebe dị ihe karịrị mita 300 [1,000 amaụkwụ] n’Ọwara Oké Osimiri Mexico, gwute mmanụ, ji ihe dị ka okpukpu 65 karịa ihe ọ na-efu iji gwute mmanụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.”—The Encyclopædia Britannica.

^ par. 18 N’oge mbụ, a na-eji barel ndị e ji osisi mee, bụ́ ụdị ndị e ji agbanye mmanya, ebu mmanụ.—Lee igbe dị na peeji nke 5.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

BAREL KA Ọ̀ BỤ TỌN?

Ụlọ ọrụ ndị mbụ na-egwu mmanụ na Pennsylvania ji barel mmanya ndị dị lita 180 buo mmanụ. E mesịa, a malitere ịgbanye nanị lita mmanụ 159 n’ime ya iji mee ka ọ ghara ịdị na-akwafu mgbe a na-ebu ya. A ka na-eji barel (lita 159) ere mmanụ taa.

Site ná mmalite, e si n’oké osimiri ebuga mmanụ na Europe, a na-ejikarịkwa usoro tọn atụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji mata ịdị arọ ya, dị ka a na-eme taa.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mmanụ Ala n’America

[Igbe dị na peeji nke 6]

OLEE OTÚ MMANỤ ALA SI AMALITE ỊDỊ?

Nkọwa ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta sayensị na-enye kemgbe afọ ndị 1870 bụ na mmanụ ala na-esi n’ihe ndị dị ndụ. Ná nkọwa a, a “na-ekwu na ụmụ irighiri ihe ndị si n’ahụ́ ihe ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị kpụkọtara ná nkebi ná nkebi n’ime ala, na-ere ma ghọọ mmanụ ala mgbe ogologo oge gasịworo, nakwa na mmanụ ala ahụ na-abịa nọkọta otu ebe n’obere oghere ndị dị n’okpuru nnukwu nkume ndị dị n’ebe na-emichaghị emi n’ime [ala].” Usoro a na-emezi ka mmanụ ala dịrị, bụ́ nke ihe ndị mejupụtara ya n’ụzọ bụ́ isi bụ hydrocarbon—ya bụ, gas hydrogen na carbon. Otú ọ dị, kemgbe afọ ndị 1970, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị agbaghawo nkọwa a mgbe ụfọdụ.

Ná mbipụta nke August 20, 2002, nke akwụkwọ bụ́ Proceedings of the National Academy of Sciences, e nwere isiokwu bụ́ “Mmalite nke Hydrocarbon na Mmanụ Ala.” Ndị dere ya na-ekwu na ọ ghaghị ịbụ “nnọọ n’ime ime Ala” ka mmanụ ala malitere ịdị, ọ bụghị n’ebe na-emichaghị emi, dị ka e kweere n’ebe nile.

Ọkà n’ihe ọmụmụ physics bụ́ Thomas Gold enyewo ụfọdụ nkọwa ndị ọzọ na-akpata arụmụka n’akwụkwọ ya bụ́ The Deep Hot Biosphere—The Myth of Fossil Fuels ma kọwaa, n’ụzọ zuru ezu, ihe ndị mere o ji nye nkọwa ndị ahụ. Ọ na-ede, sị: “Na United States nakwa n’ọtụtụ ebe na Europe, a nabatara nnọọ nkọwa bụ́ na mmanụ ala na-esi n’ihe ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ala, nke na o mere ka a kwụsị nchọpụta a na-eme banyere echiche megidere ya. Ọ dịghị otú ahụ ná mba ndị nọbu na Soviet Union.” Nke ahụ bụ, “ma eleghị anya, n’ihi na onye Russia bụ́ ọkà mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe bụ́ Mendeleyev, bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù, akwadowo echiche ahụ bụ́ na mmanụ ala esighị n’ihe ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ala. Arụmụka ndị o nyere gbara ọkpụrụkpụ taa ọbụna karị, n’ihi ihe ọmụma sakwuru mbara anyị nwere ugbu a.” Gịnị ka nkọwa ahụ bụ́ na mmanụ ala esighị n’ihe ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ala, pụtara?

Gold na-ekwu, sị: “Nkọwa ahụ pụtara na mmanụ ala bụ akụkụ nke ihe ndị mejupụtara ala, bụ́ nke sitere ná mkpụkọta nke ihe ndị dị n’ime ala ji nke nta nke nta kpụkọta n’ihe dị ka ijeri afọ 4.5 gara aga.” Dị ka nkọwa a si dị, ihe ndị mere ka mmanụ ala dịrị adịwo n’ime ime ala kemgbe e kere ụwa. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 37 Teta! adịghị akwado nkọwa nke ọ bụla. Ihe ọ na-eme bụ nanị ịkọ banyere ha.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10, 11]

BANYERE NKWAFU MMANỤ

▪ Ngụkọta nke mmanụ ụgbọ mmiri tanker kwafuru n’agbata afọ 1970 na 2000 bụ tọn 5,322,000

▪ Mmanụ kasị ukwuu kwafurunụ weere ọnọdụ n’afọ 1979, bụ́ mgbe ụgbọ mmiri Atlantic Empress na Aegean Captain sọkọtara isi n’oké osimiri Caribbean, na-eme ka tọn mmanụ 287,000 kwafuo

▪ Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná mmanụ ndị na-akwafu n’ụgbọ mmiri tanker na-ewere ọnọdụ mgbe a na-agbanye ha n’ụgbọ mmiri ma ọ bụ na-agbapụta ha, mmanụ ka ukwuu na-akwafu mgbe ụgbọ mmiri sọrọ isi n’ihe nakwa mgbe ọ kpụrụ n’ala

▪ Ụfọdụ ihe ndị ọzọ na-abụghị ụgbọ mmiri tanker, bụ́ ndị mere ka mmanụ kwafuo n’ụzọ dị ukwuu:

● Mgbawa e nwere n’olulu a nọ na-eme nchọpụta bụ́ Ixtoc I na 1979, n’Ọwara Oké Osimiri Mexico. Ngụkọta nke mmanụ kwafurunụ: lita 500,000,000

● Mgbawa e nwere n’ihe a rụrụ n’elu mmiri bụ́ nke a nọ na ya egwu mmanụ n’Ọwara Oké Osimiri Pesia na 1983. Ngụkọta nke mmanụ kwafurunụ: lita 300,000,000

● Mmanụ a ma ụma kwafuo na 1991, n’Ọwara Oké Osimiri Pesia. Ngụkọta nke mmanụ kwafurunụ: lita 900,000,000

[Foto]

Ụgbọ mmiri “tanker” na-ebu mmanụ nke aha ya bụ “Erika” kpuru na nso Penmarch Point, France, December 13, 1999

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe ndị e si nweta ya: International Tanker Owners Pollution Federation Limited, “Oil Spill Intelligence Report,” “The Encarta Encyclopedia”

© La Marine Nationale, France

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 8, 9]

USORO NGWUPỤTA MMANỤ E MERE KA Ọ DỊ MFE NGHỌTA

1—INYOCHA IME ALA

ÍGWÈ ỌRỤ SATELLITE

Usoro Ígwè Ọrụ Satellite Zuru Ụwa Ọnụ Bụ́ Ndị Na-eme Ka A Mata Ebe Ihe Dị na-ezite ozi dị mma e ji eme ihe maka inyocha ala

ÍGWÈ E JI ANỤ ỤDA N’IME ALA

NNUKWU ỤGBỌALA E JI EME KA ALA MAA JIJIJI

ỤGBỌ MMIRI E JI EME KA ALA MAA JIJIJI

ÍGWÈ E JI ANỤ ỤDA N’IME MMIRI

Otu n’ime usoro ndị e ji enyocha ime ala bụ site n’ịgba ihe ga-eme ka ala maa jijiji, wee site n’ụda ndị a nụrụ mata ebe e nwere mmanụ n’ala

2—IGWU MMANỤ

OLULU MMANỤ NDỊ DỊ N’ELU ALA

EBE A NA-ANỌ EGWU MMANỤ N’ELU MMIRI

OLULU MMANỤ NDỊ DỊ N’ALA MMIRI

Usoro ndị e ji egwu mmanụ na-agụnye igwu olulu mmanụ n’elu ala, n’ime mmiri, nakwa n’ala mmiri. Iji mee ka mmanụ nọgide na-agbapụta na ha, a pụrụ ịgbanye ha gas ma ọ bụ kemikal

[Foto]

OLULU MMANỤ NDỊ DỊ N’ALA MMIRI

A na-eji ụgbọ mmiri ndị na-agba n’okpuru mmiri, bụ́ ndị e ji remote control eduzi, ewu ebe ndị a na-egwupụta mmanụ n’ala mmiri

[Foto]

IGWU MMANỤ ÙHIÈ ÙHIÈ

Injin ndị onye injinia na-eji remote control eduzi, na-eme ka ọnụ paịpụ e ji egwu ala na-ahịọgharị, ihe mgbaàmà ndị na-adọta ozi na-achọpụtakwa mmanụ

3—IBU MMANỤ

PAỊPỤ MMANỤ

ỤGBỌ MMIRI TANKER

A na-esi n’otu ebe ebuga mmanụ n’ebe ọzọ site n’iji paịpụ mmanụ ndị gara n’elu ala, ndị e liri n’ala, na ndị dị n’ala mmiri eme ihe. E jikwa ụgbọ mmiri tanker, ụgbọ mmiri barge, na ụgbọ okporo ígwè ebu mmanụ

4—ISI MMANỤ N’ỌKỤ

ỤLỌ ỌRỤ A NA-ESI MMANỤ ALA

A na-esi mmanụ ala esi, zaa ya, ma si na ya nweta ihe dị iche iche a pụrụ iji mepụta ihe ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị

EBE A NA-ANỌ ESI MMANỤ

Mgbe e siri mmanụ ala na-anya anya ma na-eji oji n’ọkụ, ọ na-aghọ uzuzu ọkụ. Uzuzu ọkụ ahụ na-adịghachi goro goro dabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ e nwere. N’ụzọ dị otú a, e si na mmanụ ala enweta ụdị mmanụ dị iche iche

68°F. → GAS NDỊ A NA-ENWETA N’ỤLỌ Ha na-agụnye methane,

ỌRỤ A NA-ESI MMANỤ ethane, propane,

na butane

 

↑ ↑

70°-160°F. → MMANỤ PETROL E ji ya eme ihe dị ka mmanụ

ụgbọala nakwa dị ka ihe e ji

emepụta kemikal ndị dị ka plastik

 

↑ ↑

160°-320°F. → NAPHTHA A pụrụ iji ya mee plastik,

mmanụ ụgbọala, na kemikal ndị ọzọ

 

↑ ↑

320°-480°F. → KEROSIN E ji ya emepụta mmanụ ụgbọelu na

mmanụ a na-agbanye na stovu

 

↑ ↑

480°-660°F. → MMANỤ GAS E ji ya emepụta mmanụ diesel na

mmanụ a na-agbanye n’ekwú iji mee

ka ọkụ na-enwu

 

↑ ↑

750°F. → NSỊ MMANỤ A na-esitụkwu ya n’ọkụ iji mepụta

mmanụ a na-agbanye n’ọkụ e ji esi

mmanụ ala na ihe ndị ọzọ, wax e

ji eme kandụl, mmanụ grease,

ỌKỤ E JI E SI MMANỤ ALA na asphalt

IJI KEMIKAL BỤ́ CATALYST AGBAZE MMANỤ ALA

A na-esi mmanụ ala n’ọkụ ma na-agwakọta ya na catalyst dị ọkụ, bụ́ ntụ alumina-silica gel. Nke a na-agbaze mmanụ ala ma mee ka e si na ya nweta ihe ndị bara uru karị

Ntụ catalyst na mmanụ ala na-agwakọta n’uzuzu ọkụ

↑ ↑ ↑

ETHANOL PLASTIK IHE NA-EMEZIWANYE

MMANỤ PETROL

E ji ihe a dị goro Dị ka ihe atụ, Ihe e ji emeziwanye

goro emepụta ágbá, a na-emepụta ụdị mmanụ petrol na-eme

ihe ntecha, ncha, plastik bụ́ polystyrene ka ọ ghara ịdị

na ihe ndị e ji site n’ịgwakọta na-ere ngwa ngwa

esiji ihe styrene na polymer n’injin, si otú ahụ

na-eme ka ọ na-arụ

ọrụ nke ọma karị

 

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto Site n’Ikike nke Ụlọ Ọrụ Phillips Petroleum Company

[Ihe e sere na peeji nke 7]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EBE NDỊ BỤ́ ISI A NA-ENWETA MMANỤ ALA

Ngụkọta ha bụ n’ijeri barel. Nke a adịghị agụnye mmanụ ala ndị a na-achọtabeghị ebe ha dị

▪ O so n’òtù OPEC

• Mba nwere otu ebe a na-egwupụta mmanụ ma ọ bụ karị, bụ́ ndị a kọwara dị ka ndị kasị ukwuu

Ebe ndị a nọgidere na-egwupụta mmanụ

◆ Mmanụ a na-akpabeghị aka

▪ • ◆ 332.7 SAUDI ARABIA

• ◆ 216.5 UNITED STATES

• ◆ 192.6 RUSSIA

▪ • ◆ 135.9 IRAN

▪ • ◆ 130.6 VENEZUELA

▪ • ◆ 125.1 KUWAIT

▪ • ◆ 122.8 IRAQ

▪ • ◆ 113.3 UNITED ARAB EMIRATES

• ◆ 70.9 MEXICO

• ◆ 42.9 CHINA

▪ • ◆ 41.9 LIBIA

▪ ◆ 33.4 NIGERIA

◆ 21.2 CANADA

▪ ◆ 21.0 INDONESIA

◆ 20.5 KAZAKHSTAN

▪ • ◆ 18.3 ALGERIA

◆ 17.6 NORWAY

◆ 16.9 UNITED KINGDOM

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Olulu mmanụ mbụ, Titusville, Pennsylvania, 1859

Mmanụ nke si n’olulu mmanụ dị na Texas na-awụfu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Brown Brothers

[Foto dị na peeji nke 5]

Ebe ndị mbụ e gwuru mmanụ, Beaumont, Texas

[Foto dị na peeji nke 5]

Ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ nke bu barel mmanụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ebe a na-egwu mmanụ nke ọkụ bara na ya na Kuwait

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Foto nile: Brown Brothers