Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ntọala M Maka Ndụ Nwere Nzube

Ntọala M Maka Ndụ Nwere Nzube

Ntọala M Maka Ndụ Nwere Nzube

DỊ KA ERNEST PANDACHUK SI KỌỌ

A mụrụ m n’ala ahịhịa dị larịị nke Saskatchewan, Canada. Mgbe m dị afọ 23, ejere m Africa, bụ́ ebe m biri ndụ magburu onwe ya dị ka onye ozi ala ọzọ ruo afọ 35. Olee otú ndụ m si ruo n’ụdị a? O meghị na mberede. Ka m kọọrọnụ gị.

ỤLỌ mbụ m biri na ya bụ ụlọ e ji osisi, ụrọ, na ahịhịa rụọ—o chebechaghị ezinụlọ anyị pụọ n’oké oyi nke ala ahịhịa ahụ dị larịị. N’afọ 1928, tupu a mụọ ihe ka ọtụtụ n’ime anyị bụ́ ụmụaka itoolu, papa m na mama m natara akwụkwọ e ji amụ Bible n’aka otu onye bịara n’ụlọ anyị. N’ime oge oyi sochirinụ bụ́ nke were ogologo oge, ha ji akwụkwọ ndị a mụọ Bible. Ka ọ na-erule n’oge opupu ihe ubi, ha bịara kwenyesie ike na ha achọtawo eziokwu ahụ. Ha gwara ndị ezinụlọ, ndị enyi, na ndị agbata obi ha banyere ya, ma, ọ bụ ụmụ ha ka ha kasị gwa ya.

A mụrụ m na 1931, a mụkwara mmadụ ise ndị m tọrọ n’oge na-adịghị anya a mụsịrị m. Ịgụ na ịmụ Bible so n’ihe ezinụlọ anyị na-eme mgbe dum. Eji m obi ụtọ echeta otú anyị si emekọ ihe ọnụ kwa ụtụtụ. Papa m na-eduziri anyị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ọbụna mgbe anyị nwere ndị ọbịa. Mama m na papa m, nakwa ụmụnne m ndị tọrọ m, na-eme otu onye gụpụta akwụkwọ ndị dabeere na Bible taa, onye ọzọ agụpụta echi.

E wezụga ịkụziri anyị ịgụ na ide ihe, papa m kụzikwaara anyị otú e si eji ndepụta okwu ndị dị na Bible eme nnyocha. N’oge na-adịghị anya, anyị mụtara otú e si eji Bible akọwara ndị ọzọ ihe anyị kweere. Mkparịta ụka ndị a dị ụtọ nyeere m aka ịtụgharị uche n’ihe ndị e kwuru na Bible. Ka oge na-aga, abịara m nwee ike iji Bible na-agbagha ozizi okpukpe ụgha. Abịara m nwee ike igosi na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, na e nweghị ọkụ ala mmụọ, nakwa na Chineke na Jizọs ahaghị nhata ma ọ bụ soro n’ihe a sị na ọ bụ Atọ n’Ime Otu.—Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4; Jọn 14:28.

Papa m na mama m kụzikwaara anyị ihe site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya, ha gbakwara anyị ume iguzosi ike maka ezi ihe, ọbụna ma a sị na nke ahụ ga-eme ka ọha na eze lewe anyị anya ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mgbe ha sere ụtaba, ha dọkwara anyị aka ná ntị banyere otú o si emebi ihe n’ahụ́ nakwa banyere nrụgide a ga-arụgide anyị ka anyị see ya n’ụlọ akwụkwọ. Ana m echeta ihe papa m gwara m: “A pụrụ ịsị na ị bụghị nwoke ma ọ bụrụ na ị jụ ise ụtaba. Ma jụgodị onye ahụ, sị, ‘Olee onye nke bụ́ nwoke? Ọ̀ bụ onye ahịhịa na-achịkwa ka ọ̀ bụ onye na-achịkwa ahịhịa?’”

Mgbe m dị afọ 11, enwetara m ule ọzọ nke na-ekpebi ma m̀ ga-agbaso ọzụzụ dabeere na Bible nke e nyere m na nwata. N’oge ahụ, Agha Ụwa nke Abụọ ebirila ọkụ, a tụkwara anya ka ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ na-ekwe ukwe e ji eto ọkọlọtọ. Amatara m site n’ọmụmụ Bible m na ukwe dị otú ahụ bụ ofufe, n’ihi ya, ajụrụ m ikere òkè na ya. Nke a mere ka a chụọ m n’ụlọ akwụkwọ ruo ọnwa isii.

Otú o sina dị, ka oge na-aga, agụsịrị m akwụkwọ, na March 1947 kwa, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptizim ime mmiri. Ọnwa isii ka e mesịrị, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ, onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Ebu m ụzọ jee ozi n’ebe ndịda Saskatchewan, na-agbara ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ n’ókèala a buru ibu àmà. N’oge ọkọchị, ana m eji ịnyịnya eme njem, n’oge oyi, ana m eji ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ n’elu snow, bụ́ nke anyị na-akpọ caboose. A na-eji stovu nke a na-awụnye unyì eme ka ọ na-ekpo ọkụ, n’ihi ya, aghaghị m ịkpachapụ anya ka ụgbọala ahụ ghara ịda.

Ndị bi n’ime obodo ahụ nwere omume enyi na nke ile ọbịa. M bịa ná mgbede, ha na-agwakarị m ka m hie na nke ha. Lee ka m si enwe mmasị ná mkparịta ụka Bible ndị anyị na-enwe! Ezinụlọ Peterson bụ otu ezinụlọ nke meghachiri omume n’ụzọ dị mma mgbe anyị nwesịrị mkparịta ụka were abalị dum. Earl na nne ya ghọrọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi.

Ije Ozi na Quebec

Na 1949, azara m òkù a kpọrọ ka ndị ọsụ ụzọ nye aka n’ọrụ nkwusa ahụ n’ógbè Quebec. Ihe dị ka ndị ọsụ ụzọ 200 si n’ebe ọdịda anyanwụ Canada, zara òkù ahụ. Ha rutere n’obodo Montreal na September, dịrị njikere ịnara ọrụ a ga-ekenye ha n’ebe nile na Quebec. Nke a bụ n’oge onye Katọlik ahụ bụ́ onyeisi ọchịchị bụ́ Maurice Duplessis na-achị, bụ́ onye tara ụkwa jaa ezé na ya ga-ekpochapụ Ndịàmà n’ógbè ahụ.

Oge ahụ bụ oge na-akpali akpali anyị ji nnọọ ọrụ n’aka, nke ihe ịma aka jupụtara na ya. Nke a na-agụnye ịmụ asụsụ French na ịbụ ndị e jidere nakwa ndị ìgwè mmadụ iwe ji kpaara aka, tinyekwara ịbụ ndị ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè kpaghasịrị mgbakọ Ndị Kraịst ha. Otú ọ dị, omume dị otú ahụ nke ekweghị ibe nọrọ emenyeghị m ụjọ ma ọ bụ mee ka m ghara iguzosi ike n’ọrụ m dị ka onye ozi Chineke. Ndị mụrụ m akụnyewo ịhụnanya maka ezi ihe n’ime obi m ma mee ka m kwenye na a ghaghị ịrụ ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ nke Jizọs buworo n’amụma, n’agbanyeghị mmegide.—Matiu 24:9, 14.

N’oge m nọ na Quebec, ezutere m Emily Hawrysh, bụ́ onye ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi nke si Saskatchewan. Kemgbe anyị gbasịrị akwụkwọ na January 27, 1951, Emily abụrụwo onye ọrụ ibe m na-eguzosi ike n’ihe na onye ibe na-agba ume nye m. Ebe ọ bụ na ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ikere òkè zuru ezu karị n’ozi ahụ, anyị tinyere akwụkwọ, a kpọọkwa anyị dị ka ụmụ akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead, bụ́ nke na-enye ọzụzụ na-ewe ọtụtụ ọnwa iji kwadebe ndị ozi maka ozi ala ọzọ. Anyị gụsịrị akwụkwọ na klas nke 20 nke Gilead na February 1953.

Ka anyị nọ na-eche inweta akwụkwọ ikike ịbanye Africa, a gwara anyị ka anyị nyere ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’Alberta nakwa n’Ontario, Canada, aka. N’oge ahụ, anyị na-eji ụgbọ njem ọha na eze esi n’otu ọgbakọ aga n’ọzọ. N’ihi ya, anyị mụtara ime ka ndụ anyị dị mfe na iji otu akpa etinye ngwongwo anyị nile. Ọnwa ole na ole ka e mesịrị, mgbe e nwetasịrị akwụkwọ njem na nke ga-enye anyị ikike ịbanye ná mba ọzọ, anyị tinyere isi na Southern Rhodesia, nke a na-akpọzi Zimbabwe.

Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ ná Ndụ A Na-ebi n’Africa

N’ime ọnwa ise anyị rutere, e nyere anyị ọrụ ileta ìgwè Ndịàmà Jehova nọ na Zimbabwe nakwa na Botswana nakwa n’ebe ndịda nke Northern Rhodesia (nke bụzi Zambia). N’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, a gbawo anyị ume ịghara iji ebe e nyere anyị ọrụ n’ala ọzọ na-atụnyere obodo anyị si bịa, na icheta na ọnọdụ ọ bụla ọ sọkwara anyị nọrọ na ya, anyị pụrụ ịmụta ihe n’ahụmahụ ndị anyị ga-enweta na ya. Okwu amamihe ndị dị otú ahụ nyere aka gbanwee echiche anyị. Ruo taa, mụ na Emily kwenyere n’okwu bụ́, “Jiri ọnọdụ ọ bụla ị nọ na ya mee ihe n’ụzọ kasị mma; e nwere ike ị gaghị anọ na ya ọzọ.”

Anyị ji ụgbọ okporo ígwè, bọs, gwongworo, ma ọ bụ ịnyịnya ígwè—ihe ọ bụla anyị hụrụ—mee njem site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Ọ bụ ezie na nke a na-agwụ ike, e nwere ọnọdụ ndị ọzọ nwalere mkpebi anyị mere ‘iji ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya mee ihe n’ụzọ kasị mma.’ N’afọ abụọ mbụ anyị rutere ebe ahụ, e kweghị ka Emily na-abanye n’ókèala ndị nwe ala bi, n’ihi iwu ndị e tiri. N’ihi ya, nwunye m ka lụrụ nnọọ afọ ole na ole gara aga aghaghị ịnọ n’obodo ndị dị nso n’ebe ụzọ ụgbọ okporo ígwè jedebere, bụ́ ebe, mgbe mgbe, a na-adịghị enwe Onyeàmà ọ bụla ọzọ. Ọ bụghị nanị na okwukwe, obi ike, na mkpebi siri ike nke Emily mere ka m nwekwuo mmasị na ịhụnanya n’ebe ọ nọ kamakwa o wetara mkpụrụ Alaeze ahụ n’ógbè ndị a.

Ozugbo Emily chọtara ebe ọ ga na-ehi n’ụlọ otu n’ime ndị bi n’ebe ahụ, ọ na-amalite ịgba àmà gburugburu ebe ahụ ruo mgbe m ga-esi n’ime obodo lọta. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eje ozi nanị ya ruo otu ọnwa. O nwetara ike na nchebe site n’ịdabere n’aka dị ike nke Jehova, ozi ya mịkwara mkpụrụ. N’otu oge, Rita Hancock nabatara eziokwu Bible, e mesịa, di ya sonyekwaara ya. Ọ ghọrọ nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi ma jee ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye ruo mgbe ọ nwụrụ. Taa, e nwere ọgbakọ ndị na-eme nke ọma n’ụfọdụ n’ime obodo ndị ahụ Emily ghara mkpụrụ nke eziokwu Bible.

Ile Ọbịa na Ịdị Nkọ nke Ndị Africa

Ka ọ dịgodị, n’ókèala ndị ahụ ndị nwe ala bi, ekele dị ukwuu ndị Africa bụ́ Ndịàmà nwere maka nzukọ Jehova na ndị nnọchianya ya na-ejegharị ejegharị metụrụ m n’ahụ́. Ụmụnna ndị a bụ́ Ndị Kraịst na-ahụ n’anya lekọtara m nke ọma. Kwa ụbọchị Monday, ana m esi n’otu ala mgbakọ aga n’ọzọ. Ụlọ a na-enye m na-abụ ụlọ ata a rụrụ ọhụrụ, bụ́ nke na-echetara m ụlọ ezinụlọ m biri na ya na Saskatchewan. Ihe ndina m bụ ùkwù ata dị sentimita 30 n’ibu, bụ́ nke a na-atụ n’ala ma tọọ ákwà n’elu ya.

N’ógbè ndị ahụ ndị nwe ala bi, ebe a na-anọ enwe mgbakọ na-abụ n’ime ọhịa. Ndị bịaranụ na-asụ ahịhịa ndị dị n’okpuru osisi, na-ahapụ osisi ndị ahụ maka ndo. A na-eji ùkwù ahịhịa ndị e kere nke ọma ma debe n’ahịrị ndị dị n’usoro, emere oche. N’ikpeazụ, a na-eji ata gbaa ebe ahụ a sụrụ asụ ogige. N’ebe a dị otú e si kee ya, olu ụtọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Africa ji abụku Jehova abụ otuto na-emetụkarị m n’ahụ́.

Ahụmahụ M Na-adịghị Echefu Echefu

N’oge m na-eje ozi, ezutere m Gideon Zenda, bụ́ onyeisi ndị na-eleta ụlọ akwụkwọ nke Chọọchị Anglican nwe. Ọ bụ chọọchị ahụ zụrụ Gideon n’akwụkwọ, gụnyere ụlọ akwụkwọ mahadum. Otú ọ dị, o nwetabeghị azịza ndị na-eju afọ nye ọtụtụ ajụjụ ya ndị dabeere na Bible. Ya mere, ọ rịọrọ ka mụ na ya na ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe ya nwee nzukọ iji zaa ya ajụjụ ndị a. Ihe dị ka mmadụ 50 bịara nnọkọ ahụ, gụnyere ndị nleta ụlọ akwụkwọ, ndị isi ụlọ akwụkwọ praịmarị, na ndị nkụzi. Gideon bụ onyeisi oche nke nnọkọ ahụ. N’ụzọ dị n’usoro, anyị nọ na-eme anyị tụlesịa otu isiokwu, anyị abanye n’ọzọ. A na m ekwu okwu ruo minit 15 n’isiokwu nke ọ bụla, e mesịa, ha ajụọ m ajụjụ. Nnọkọ ahụ were ọtụtụ awa.

Ihe si ná nnọkọ a a na-adịghị enwekebe pụta bụ na Gideon, ezinụlọ ya, na ọtụtụ ndị ọrụ ibe ya ghọchara ndị ohu Jehova raara onwe ha nye e mere baptizim. Onye bishọp nọ n’ógbè ahụ chụrụ ha n’ọrụ n’ụlọ akwụkwọ chọọchị Anglican nwe. Otú ọ dị, ha nile nwere obi ike ma nọgidesie ike n’ozi Jehova, ụfọdụ n’ime ha banyere n’ozi ọsụ ụzọ.

Mmeghachi Omume Banyere Otu Ihe Nkiri Na-akpali Akpali

Na 1954, Ndịàmà Jehova wepụtara ihe nkiri ahụ a na-emegharị ahụ́ na ya bụ́ The New World Society in Action. N’afọ na-esonụ, a kagburu iwu ahụ e tiri na mbụ nke machibidoro nwanyị iso di ya gaa n’ebe ndị nwe ala bi. Nke a mere ka Emily soro m na-aba n’ókèala ndị ahụ ndị nwe ala bi. N’oge ahụ, e nyere anyị ụgbọala, ígwè na-enye ọkụ, na ígwè e ji egosi ihe nkiri, iji na-egosi ihe nkiri ahụ n’ókèala ndị ahụ ndị nwe ala bi. Ọtụtụ ndị ahụtụbeghị ihe nkiri, n’ihi ya, ihe nkiri ahụ anyị na-egosi dọtara ọtụtụ mmadụ. N’ihe nkiri ahụ, e gosiri n’usoro n’usoro, otú e si ebipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ná nnukwu ụlọ obibi akwụkwọ anyị nke dị na Brooklyn, New York.

N’ihe nkiri ahụ, e gosikwara ebe òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-efekọ ofufe ọnụ n’Ámá Egwuregwu Yankee, nke dị na New York, na 1953. Ndị Africa a ahụtụbeghị ebe ndị si agbụrụ dị iche iche gosipụtara ụdị ịdị n’otu na ịhụnanya ahụ n’etiti onwe ha. Ihe nkiri a kpaliri ọtụtụ ezinụlọ nọ na Zimbabwe ịmụ Bible na iso Ndịàmà na-akpakọrịta. N’ezie, ọtụtụ ndị isi ụlọ akwụkwọ praịmarị nọ n’ebe nile ná mba ahụ, bụ́ ndị ghọtara uru ihe nkiri dị otú ahụ bara n’ịkụziri ụmụ akwụkwọ ha ihe, rịọrọ ka anyị bịa gosi ha ihe nkiri a.

N’otu ime abalị, Ndịàmà kpọtere m n’ụra, na-arịọ ka m gosi ha ihe nkiri ahụ. N’ụzọ tụrụ m n’anya, ihe dị ka mmadụ 500 ejiwo ụkwụ gaa ije ruo ọtụtụ awa iji bịa kirie ya. Ha nụrụ na m nọ n’ógbè ahụ, na anọwokwa m na-egosi ya. Ka ọ na-erule oge ìgwè mmadụ ahụ lara, ìgwè mmadụ ọzọ dị 300 abịala. Ya mere, egosiri m ihe nkiri ahụ ọzọ. Ọ bụ n’elekere anya atọ nke abalị ka ndị ikpeazụ kiriri ya lara! N’ime ihe karịrị afọ 17, na Zambia nanị, ihe karịrị otu nde mmadụ kiriri ihe nkiri ahụ bụ́ ịgba!

Ọrụ Ọhụrụ Ndị E Nyere Anyị n’Africa

Mgbe anyị jesịrị ozi ruo ihe karịrị afọ ise na ọkara na Zimbabwe, e zigara anyị South Africa. Nke a pụtara na anyị aghaghị ịmụ asụsụ Afrikaans. E mesịa, anyị mụtakwara ịsụ asụsụ Sesotho na nke Zulu. Inwe ike ịkụzi Okwu Chineke n’asụsụ ndị ọzọ mere ka anyị dịkwuo irè n’ozi, meekwa ka anyị nwee echiche nke ịbụ ndị rụpụtara ihe.

Ná mmalite afọ 1960, e nyere anyị ọrụ njegharị n’ebe ndịda Africa. N’ime afọ 27 sochirinụ, anyị jegharịrị nnọọ n’ebe nile na Lesotho, Namibia, South Africa, na Swaziland nakwa n’àgwàetiti Ascension na nke St. Helena, bụ́ ndị dị n’Ebe Ndịda nke Oké Osimiri Atlantic. Ná ngụkọta, anyị gara ọtụtụ narị puku kilomita, na-ejere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst ozi. Okwukwe na iguzosi ike n’ihe ha n’okpuru ọnọdụ ọjọọ abụrụwo ihe agbamume nye anyị ịghara ịda mbà ma ọlị.

Dị ka ihe atụ, amatara m Ndịàmà nọ na Swaziland bụ́ ndị na-emebighị okwukwe ha mgbe Eze Sobhuza nke Abụọ nwụrụ. Ebe ha jụrụ ikere òkè n’ememe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ́ ndị e mere mgbe onye ukwu a nwụrụ, a chụrụ ha n’ọrụ ma napụ ha ihe ndị ruuru ha dị ka ụmụ amaala. N’agbanyeghị ọtụtụ afọ a napụrụ ha ihe ndị ruuru ha ma tinye ha n’ihe isi ike, ha adaghị mbà n’okwukwe ha ma ọlị. Ịmara ọmarịcha ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a bụ́ Ndị Kraịst na iso ha kwurịta okwu ihu na ihu bụ ihe ùgwù dị ebube nke m ga na-enye Jehova ekele maka ya mgbe nile.

Ka ọ̀ bụnụ Philemon Mafereka, bụ́ ọsụ ụzọ nke si Mokhotlong, Lesotho, bụ́ nke dị n’ugwu dị ihe karịrị mita 3,000 n’ịdị elu. Ebe ọ bụ na ụgbọ njem adịghị, ya na nwunye ya ọ hụrụ n’anya, ụmụ ha abụọ, na mmadụ anọ a na-aga ime baptizim, ji ụkwụ gaa ihe karịrị 100 kilomita iji gaa mgbakọ nke dị n’ebe dị 1,200 mita n’ịdị elu. N’ọtụtụ ebe n’ụzọ ahụ, ha aghaghị ịgafe ebe kpọdara nnọọ akpọda. Ha si n’ụzọ ndị kpọliri elu ma kpọdaa ala gafee, gafeekwa ọtụtụ iyi na osimiri.

Ka ha na-ala mgbe e mechisịrị mgbakọ ahụ, ha bu otu narị nke akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ha bu n’uche iwegara ha ndị nọ n’obodo ha bụ́ Mokhotlong. Ma n’ihi mmasị nile ha hụrụ ndị nọ n’ụzọ ahụ ha si ala nwere n’akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ha nyefechara akwụkwọ ndị ahụ tupu ha alaruo. Iji anya m hụ ịnụ ọkụ n’obi na nraranye nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst dị ka Philemon na nwunye ya, abụrụwo ihe ùgwù nye mụ na Emily, bụ́ nke anyị ji kpọrọ ihe ruo taa.

Mgbe ụfọdụ, anyị na-enweta ihe ize ndụ nke agwọ ndị dị ize ndụ, dị ka ubí, nakwa nke idei mmiri na-achị ọkụ, na ọtụtụ ihe ize ndụ ndị ọzọ. Ahụmahụ ndị a, ọ bụ ezie na ha na-eyi egwu n’oge ahụ, adịghị abụ ihe ọ bụla ma e jiri ha tụnyere ụgwọ ọrụ na ọṅụ nke ijere Jehova ozi. Anyị mụtara na ọ dịghị mgbe ọ na-agbahapụ ndị ya na-eguzosi ike n’ihe.

Mgbe Emily nwere ajọ nsogbu ahụ́ ike, Jehova nyere anyị amamihe iji hụ maka nsogbu ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ịgbanwere ya nri na ime ndokwa ka ọ na-anọ n’ebe dị ọcha karị, mere ka ọ gbakee ngwa ngwa. Anyị rụrụ obere ụlọ n’elu otu nnukwu ụgbọala, ka Emily wee nwee ike ịdị na-anọ n’ebe ga-adị ya mma n’ahụ́ mgbe anyị na-eme njem, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ gbakere.

Ịlaghachi Canada

N’afọ 1988, mgbe anyị jesịrị ozi ala ọzọ n’ọmarịcha kọntinent Africa ruo afọ 35, e nyeghachiri anyị ọrụ na Canada. E mesịa, na 1991, amalitere m ije ozi ọzọ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Afọ asatọ ka e mesịrị, adara m ọrịa strok. Ọ bụ ezie na ihe m pụrụ ime abụrụwo nke a kpaara nnọọ ókè kemgbe ahụ, aka m na-enweta ọṅụ n’ije ozi dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na London, Ontario.

Taa, ana m eji afọ ojuju eleghachi anya azụ n’oge m malitere ije ozi dị ka ọsụ ụzọ, bụ́ mgbe m na-anọkwasị n’elu ịnyịnya, n’ebe ndịda Saskatchewan n’ihe dị ka afọ 56 gara aga. Lee ekele m na-enwe na papa m kụziiri anyị otú e si eche echiche dị ka ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’atụghị egwu ma ọlị banyere ịgbachitere eziokwu na ezi omume! Ọ kụziiri m Okwu Chineke, bụ́ nke mere ka m bie ndụ nwere nzube. Ihe nketa ahụ abaworo m uru ná ndụ m nile. Agatụghị m eji ndụ m n’ozi Jehova gbanwere ihe ọ bụla ụwa ochie a nwere inye.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ezinụlọ anyị nke nwere ụmụaka itoolu na 1949, mama m ku onye nke anyị tọchara. Eguzo m n’akụkụ ya

[Foto dị na peeji nke 24]

Arụrụ m “caboose” a iji na-eje ozi m

[Foto dị na peeji nke 24]

Ụmụ nwanyị nọ na Quebec bụ́ ndị e jidere n’ihi ime nkwusa

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Ekeere m òkè n’ịkụziri ndị nlekọta a na-ejegharị ejegharị ihe na Zimbabwe

[Foto dị na peeji nke 27]

Anyị rụrụ obere ụlọ a iji hụ na Emily gbakere

[Foto dị na peeji nke 27]

Foto mụ na Emily sere n’oge na-adịbeghị anya