Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Ndị Mụrụ M Na-amata M?

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Ndị Mụrụ M Na-amata M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Ndị Mụrụ M Na-amata M?

“Nna m bụ okenye a ma ama n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ana m akwanyere ya ùgwù, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-ewute m na ebe ọ bụla m gara, a na ama m nanị dị ka nwa Bill.”—Larry. *

“Ebe ọ bụ na nna m bụ okenye a ma ama, ọ bịara dị m ka onye ọ bụla ọ̀ na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka m, o sikwaara m nnọọ ike ime ihe otú m si eme.”—Alexander.

KA Ị na-etolite, ọ bụ ihe dị nnọọ otú o kwesịrị bụ́ ịchọ inweretụ onwe gị—inwe ike imere onwe gị aha. Mgbe a mụrụ gị, ndị mụrụ gị gụrụ gị aha masịrị ha. Ugbu a, ka ị nọ n’oge uto, ị chọrọ ohere nke ịhọrọ “aha” nke gị—ya bụ, imere onwe gị aha.

Eze Solomọn dere, sị: “Ihe a na-ahọpụta ka ezi aha bụ karịa ọtụtụ akụ̀, amara dịkwa mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.” (Ilu 22:1) Ọbụna mgbe ị ka na-eto eto, ikekwe ị ga-achọ ịmalite imere onwe gị aha.

Ịbụ Onye E Ji Aha Ha Amata

Dị ka Larry na Alexander, ụfọdụ ndị ntorobịa na-eche na ọ bụ aha ma ọ bụ ihe ndị mụrụ ha rụzuru ka e ji amata ha. Ikekwe, a ma ndị mụrụ ha ama n’obodo n’ihi ihe ha na-arụ ma ọ bụ akwụkwọ ha gụrụ. Ma ọ bụkwanụ, ọ pụrụ ịbụ na a maara ha nke ọma n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ ndị a ma ama n’obodo ma ọ bụ n’ọgbakọ, ọ pụrụ ịdị gị mgbe ụfọdụ ka anya nile ọ̀ na-ele gị, ka à na-enyocha ihe ọ bụla ị na-eme mgbe nile. Ị pụrụ iwe iwe n’ihi nrụgide ị na-enwe nke ịkpa àgwà n’ụzọ ụfọdụ nanị n’ihi ndị ndị mụrụ gị bụ.

Dị ka ihe atụ, nna Ivan na-eje ozi dị ka okenye n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ivan na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ na a ma nna m ama ma na-akwanyere ya ùgwù, ọ na-adị m mgbe nile ka aghaghị m isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe obibi. Ọ bịara dị m ka ndị nne na nna ndị ọzọ hà na-eji m amara ụmụ ha atụ banyere otú ha na-atụ anya ka ụmụ ha si n’akpa àgwà. Ọ bụ ezie na nke a tọrọ m ụtọ, o mere ka m nwee oké nrụgide nke ịkpa àgwà dị mma n’ihu ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, o mere ka m ghara ịma ebe ike m ruru, gharakwa ikweta banyere emezighị emezi m.” Alexander na-ekwu, sị: “Ọ bịara dị m ka à na-ele m mgbe nile nakwa na ọ bụrụ na m emehie ihe, onye ọ bụla dị njikere ịkpọ m aha ọjọọ.”

Larry, bụ́ onye e hotara ná mmalite, gbalịrị izere ịbụ onye a ga-elekwasị anya site n’izochi aha ezinụlọ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe m zutere ndị na-amaghị m ná nnọkọ ntụrụndụ, ana m asị, ‘Ndewo, aha m bụ Larry,’ ma kwụsị ebe ahụ—n’ekwughị aha nna m. Mgbe o kwere mee, ana m abịanyedị aka n’akwụkwọ site n’ide nanị aha mbụ m. Ụjọ na-atụ m na ndị mmadụ ga-emeso m ihe n’ụzọ dị iche ma ọ bụrụ na ha amata onye bụ́ nna m. Achọrọ m ka ndị ọgbọ m na-emeso m ihe otú ha si emeso ndị ọzọ.”

N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya na ndị ọzọ pụrụ ịdị na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka gị ma ọ bụrụ na nna gị na-eje ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. E kwuwerị, ndị ikom a họpụtara ịnọ n’ọnọdụ dị otú ahụ kwesịrị ịbụ ndị “na-elekọta ụmụ na ezinụlọ nke ha n’ụzọ dị mma.” (1 Timoti 3:5, 12) Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji atụ anya ka ị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya! Ma nke ahụ ọ̀ dị njọ? Ọ dịghị, ma i cheta na Pọl họọrọ Onye Kraịst ahụ na-eto eto bụ́ Timoti, ikekwe mgbe ọ ka dị afọ iri na ụma, iso ya mee njem iji kere òkè n’ọrụ ije ozi dị mkpa. (1 Ndị Tesalonaịka 3:1-3) Ya mere, i kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ihe nlereanya, ma nna gị ọ̀ bụ okenye a họpụtara ahọpụta ma ọ bụ na ọ bụghị.

Nnupụisi Bụ Nhọrọ Dị Njọ

Ma, ụfọdụ ndị ntorobịa na-agbalị ime ka a ghara iji aha ndị mụrụ ha na-amata ha site n’inupụ isi. Ivan na-ekwu, sị: “E nwere oge ọ na-ewe m iwe ịbụ ihe nlereanya. Enupụrụ m isi site n’ịhapụ ntutu isi m ka o togide ruo mgbe mmadụ ga-ekwu okwu banyere ya.”

Absalọm, bụ́ otu n’ime ụmụ Eze Devid, gbasoro ụzọ nnupụisi. A ma nna ya ama maka ofufe ọ na-efe Jehova, ọtụtụ ndị nọ ná mba Izrel hụkwara ya n’anya. Dị ka nwa Devid, a tụrụ anya ọtụtụ ihe n’aka Absalọm. Ma kama ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ezi uche dị na ha bụ́ ndị a na-atụ anya ha n’aka ya, Absalọm họọrọ imere onwe ya aha site n’inupụrụ nna ya isi. Ebe Devid bụ onye nnọchianya e tere mmanụ nke Jehova, ọ bụ Jehova ka Absalọm nọ na-enupụrụ isi n’ezie. Omume ya buteere ezinụlọ ya ihe ihere ma kpatara ya onwe ya ọdachi.—2 Samuel 15:1-15; 16:20-22; 18:9-15.

N’otu aka ahụ, inupụ isi pụrụ ịkpatara gị ọdachi. Tụlee ihe Bible na-agwa anyị banyere Nehemaịa. Ụfọdụ n’ime ndị iro ya nwara iduhie ya ịkpa àgwà asọpụrụghị Chineke. N’ihi gịnị? “Ka ha wee nweekwa ya inye m aha ọjọọ, ka ha wee taa m ụta,” ka Nehemaịa kwuru. (Nehemaịa 6:13) Inupụ isi pụrụ inye gị aha ọjọọ—nke ga-esiri ndị mmadụ ike ichefu.

E kwesịghị ileghara mmetụta àgwà nnupụisi pụrụ inwe n’ebe ndị ọzọ nọ anya. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị ga-eme ka ndị mụrụ gị ruo újú n’ụzọ na-enweghị isi. (Ilu 10:1) Omume gị pụkwara imetụta ndị ntorobịa ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ. Ivan na-ekweta, sị: “Omume m nwere mmetụta dị njọ n’ahụ́ nwanne m nwoke. Ruo oge ụfọdụ, ọ hapụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst kpam kpam, na-achụso ihe ndị ọ maara na ha ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ matara onwe ya, ọ maliteghachiwokwa ijere Jehova ozi ma na-enwe obi ụtọ.”

Ụzọ Ka Mma

Onye nna ji ya na Absalọm bụ́ Solomọn gbasoro ụzọ dị iche. Ọ dị njikere iji obi umeala mụta ihe n’aka nna ya, bụ́ Devid. (1 Ndị Eze 2:1-4) Kama ịchọ ibuli onwe ya n’ọkwá, Solomọn chọrọ ụzọ isi meere onwe ya ezi aha n’ebe Chineke nọ. Ruo ogologo oge o mere otú ahụ, o wetaara ezinụlọ ya ùgwù ma meere onwe ya aha dị ka otu n’ime ndị eze kasị ukwuu n’Izrel.—1 Ndị Eze 3:4-14.

Ezi ihe nlereanya Solomọn na-eme ka eziokwu abụọ dị mkpa pụta ìhè: Nke mbụ, ị ga-emere onwe gị aha, ọ bụghị site n’ịchọ ịnọpụ iche n’ebe ezinụlọ gị nọ, kama site n’ịmụta ihe n’àgwà ọma nke ezinụlọ gị. Akwụkwọ bụ́ Adolescence na-ekwu, sị: “Oge uto ekwesịtụghị ịbụ oge onye ntorobịa ga-ekewapụ onwe ya n’ebe ndị mụrụ ya nọ iji meere onwe ya aha.” “Nkwado nke ndị mụrụ gị adịghị emebi” ikike i nwere imere onwe gị aha, ka akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, “kama nke ahụ, [ọ na-eme ka ọ] ka mma.”

N’ụzọ na-akpali mmasị, Solomọn n’onwe ya gbara ume, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” (Ilu 23:22) O doro anya na ọ bụghị ụmụaka ka Solomọn na-edegara akwụkwọ a n’ihi na n’oge nne na nna “mere agadi,” o yiri ka nwa ha ọ̀ ga-etoruwo ogo mmadụ. Gịnị bụ isi ihe dị n’okwu ya? Ọbụna mgbe i merela okenye ma nwee ezinụlọ nke gị, ị ka pụrụ irite uru n’amamihe nke ndị mụrụ gị. Ivan bịara ghọta nke ahụ n’onwe ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ka m nọ na-etolite, agbalịrị m iṅomi ebe ndị mụrụ m na-emezi emezi ma na-agbalị izere ebe ndị ha mejọrọ ihe.”

Isi ihe nke abụọ a ga-echebara echiche bụ na ihe Solomọn butere ụzọ abụghị imere onwe ya “aha,” kama ọ bụ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. N’eziokwu, a tụrụ anya ihe dị ukwuu n’aka ya dị ka nwa Devid. Ma ndabere Solomọn dabeere n’ebe Jehova nọ mere ka o nwee ike ibu ibu ọrụ ya. Alexander enweela echiche yiri nke ahụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ugbu a, anakwerewo m eziokwu ahụ bụ́ na a na-atụkarị anya ihe dị ukwuu n’aka ụmụ ndị okenye. Ekpebiri m iji ya mee ihe n’ụzọ dị mma, ọ bụwokwara m ihe nchebe. Abịawo m ghọta na ihe kasị mkpa bụ otú Jehova si ele m anya. Ọ maara m n’ihi onye m bụ, ọ bụghị nnọọ n’ihi ndị mụrụ m.”

Daryn, bụ́ onye nna ya gụrụ akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead *—ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị ozi ala ọzọ—amụtawokwa ịnagide ọbụbụ ọ bụ onye nwere nne na nna a ma ama. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe e mere m baptizim, ọ bụ Jehova ka m raara onwe m nye, ọ dịghị onye ọzọ m raara onwe m nye. Site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nraranye m ruo ókè ike kwere m, enwere m ahụ́ iru ala nke na-abịa site n’ịmara na m na-eme ka obi dị Jehova ụtọ, ọbụna ma ọ bụrụ na apụghị m ime ihe nile ndị mụrụ m mere.”

Eze Solomọn kwuru, sị: “Ọbụna nwata na-eme ka a mata ya site n’omume ya nile, ma ọrụ ya [ọ̀] dị ọcha, ma ò zikwara ezi.” (Ilu 20:11) E mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-eji ihe i kwuru ma mee na-echeta gị. Bụrụ ihe nlereanya “n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.” Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ndị mmadụ ga-ahụ gị n’anya ma na-akwanyere gị ùgwù n’ihi onye ị bụ!—1 Timoti 4:12.

Otú ọ dị, nye ndị ntorobịa ndị ọzọ, ihe ịma aka ha nwere bụ otú ha ga-esi mee ka a ghara iji aha ụmụnne ha, bụ́ ndị nwerela ihe ịga nke ọma, na-amata ha. Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụle otú ị pụrụ isi merie ihe ịma aka a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 22 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Gilead.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ihe inupụ isi ga-eme bụ nanị ime ka ndị mụrụ gị ruwe újú na iwetara gị aha ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 14]

Ezi ihe nlereanya gị pụrụ ịbara ndị ọzọ uru