Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 27. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee ihe ndị Jehova nyere iwu na ha agaghị akwụsị akwụsị? (Jenesis 8:22)

2. Olee mkpá akwụkwọ ndị Jizọs sịrị na ndị Farisii na-eji ịdị uchu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri ha, ebe ha na-eleghara “ikpe ziri ezi anya nakwa ịhụ Chineke n’anya”? (Luk 11:42)

3. Ụzọ dị aṅaa ka Jizọs kwuru na ya ga-esi alọghachi? (Mkpughe 16:15)

4. Ndị Filistia ole ka Samsin ji “ọkpụkpụ agbà ọhụrụ nke ịnyịnya ibu” tigbuo? (Ndị Ikpe 15:15)

5. Gịnị ka a na-akpọ Jizọs n’ihi ịbụ nanị onye Jehova kere n’onwe ya? (Jọn 3:18)

6. Gịnị bụ ntụziaka Pọl nyere ndị Tesalọnaịka banyere ndị umengwụ? (2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12)

7. Gịnị ka Jizọs kwuru na mmadụ nile aghaghị ime iji ‘si n’ọnụ ụzọ dị warara banye’? (Luk 13:24)

8. Olee obodo e ji mara nsọtụ ebe ugwu nke Izrel? (1 Samuel 3:20)

9. Olee ụzọ Chineke si dọọ ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị letara Jizọs, aka ná ntị na ha ekwesịghị ịlọghachikwuru Eze Herọd na-egbu ọchụ? (Matiu 2:12)

10. Ebe ọ bụ na a naghị ede utu aha abụọ ma ọ bụ karịa n’ihu ma ọ bụ n’azụ aha Jizọs n’ime Akwụkwọ Nsọ, olee ndekọta ndị a na-ahụtụbeghị na ya?

11. Gịnị mere e ji achọ ka onye nlekọta ọgbakọ bụrụ onye “ndị nọ n’èzí na-agbara ezi akaebe”? (1 Timoti 3:7)

12. Olee ebe Filip nọ hụ ma zie ọnaozi onye Etiopia ahụ ihe? (Ọrụ 8:26)

13. Gịnị bụ ntaramahụhụ e nyere Sọl n’ihi inupu isi n’iwu Jehova bụ́ ka o bibie ndị Amalek tinyere ìgwè anụ ụlọ ha? (1 Samuel 15:23, 26, NW)

14. N’ihi gịnị ka Ebreham ji bie ihe ka ukwuu ná ndụ ya dị ka onye ala ọzọ na onye bi nwa oge? (Ndị Hibru 11:10; 12:22)

15. Olee mpụ ndị Barabas, bụ́ onye Paịlet tọhapụrụ n’ọnọdụ Jizọs, mere? (Luk 23:25; Jọn 18:40)

16. Gịnị bụ aha nwoke Lida ahụ Pita gwọrọ, “bụ́ onye nọworo na-atọgbọ n’ihe ndina nta ya kemgbe afọ asatọ” n’ihi ahụ́ mkpọnwụ? (Ọrụ 9:32-34)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Ọghịgha mkpụrụ na owuwe ihe ubi, na oyi na okpomọkụ, na udu mmiri na ọkọchị, na ehihie na abalị”

2. Mint na akwụkwọ ruu

3. “Dị ka onye ohi”

4. 1,000

5. “Ọkpara Chineke ahụ a mụrụ nanị ya”

6. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” “Site n’ịrụ ọrụ n’ịdị nwayọọ, ha kwesịrị iri nri ha onwe ha na-akpata”

7. “Tinyesienụ mgbalị ike”

8. Dan

9. Site ná nrọ

10. “Onyenwe Anyị Kraịst Jizọs” na “Eze Kraịst Jizọs”

11. Ka o wee “ghara ịdaba ná nkọcha na n’ọnyà Ekwensu”

12. N’ụzọ ọzara nke sitere na Jeruselem gaa Geza

13. Jehova jụrụ ya “ịnọgide na-abụ eze Izrel”

14. N’ihi na ọ nọ na-echere “obodo ahụ nke nwere ezi ntọala,” bụ́ Jeruselem nke eluigwe

15. Imegide ọchịchị, igbu ọchụ, na ịpụnara mmadụ ihe

16. Anias