Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Mụtara na Chineke Hụrụ Ha n’Anya

Ha Mụtara na Chineke Hụrụ Ha n’Anya

Ha Mụtara na Chineke Hụrụ Ha n’Anya

Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikwere na onye ọ bụla—ọbụna Chineke—pụrụ ịhụ ha n’anya nke ukwuu. Ya mere, mgbe ọtụtụ ndị gụsịrị akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, ha detara akwụkwọ ozi iji gosi ekele ha nwere maka mmesi obi ike o nyere ha. “O riri m ọnụ ịhụ ókè ọ hụruru m n’anya , n’agbanyeghịdị amaghị eme m nile,” ka otu nwanyị si Decatur, Illinois, U.S.A., dere.

O dekwuru, sị: “Ebere m ákwá ọṅụ mgbe m gụrụ ihe e kwuru [na peeji nke 117]: ‘Dị ka Nna nke na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi ma ọ bụ nke na-eme ezi omume, Jehova na-eji ọmịiko o nwere n’ebe ụmụ ya nọ n’ụwa nọ, bụ́ ndị enyemaka ya dị mkpa, ndị ọ dịkwa mkpa ka ọ gbaghara ha mmehie ha, na-atụgwa ịkwụsi ike ya maka ezi ihe’”

Otu nwoke si Ripon, California, dere, sị: “Ana m ekele unu nke ukwuu maka igosi m na Jehova hụrụ m n’anya n’ezie. Ọ na-eche banyere m n’ezie. Abụghị m nnọọ onye e ji nọmba e dere ná mpempe akwụkwọ amata.” Otu nwanyị nọ na New Hampshire kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m edorula akwụkwọ ahụ ala.” Ọ kọwara, sị: “O sibuuru m ike ikwere n’ezie na Jehova pụrụ ịhụ m n’anya.” Ya mere, akwụkwọ ahụ bụ nnọọ ihe dị ya mkpa.

Anyị kwekwara na ị ga-erite uru site n’ịgụ akwụkwọ a. A gafesịa isiakwụkwọ mmalite atọ, e kewara akwụkwọ ahụ gaa ná nkebi anọ, ndị isiokwu ha bụ “O Nwere Ume n’Ike,” “Onye Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya,” “O Nwere Obi nke Maara Ihe,” na “Chineke Bụ Ịhụnanya.” Nkebi nke ọ bụla na-elekwasị anya n’otu n’ime àgwà ndị bụ́ isi nke Chineke. E ji isiokwu bụ́ “Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso” mechie akwụkwọ a na-akpali akpali.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 320 nke mkpo ya dị nro, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.