Ihe Oriri Sitere n’Ubi nke Gị
Ihe Oriri Sitere n’Ubi nke Gị
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CENTRAL AFRICAN REPUBLIC
N’ỌTỤTỤ ala, nchegbu ndị mmadụ na-enwe kwa ụbọchị bụ otú ha ga-esi nyejuo ezinụlọ ha afọ. Ọnụ ego dị elu a na-ere akwụkwọ nri nkịtị na-emekarị ka ime otú ahụ bụrụ nnọọ ihe ịma aka. Otú o sina dị, ụfọdụ ndị achọtawo ihe ngwọta dị nnọọ mfe—iji aka ha kọọ ụfọdụ n’ime nri ndị ha na-eri!
Ma eleghị anya, ị pụrụ ịchọ ịkọ obere ubi n’onwe gị. N’eziokwu, ala sara mbara nwere ike ghara ịdị gburugburu ebe obibi gị, ma ikekwe e nwere ala dị nso nke ị pụrụ ime ndokwa ịkọ ihe na ya. Chegodị echiche banyere ego nile ị pụrụ ichekwa site n’ịkọ ihe oriri ndị dị ụtọ ma na-edozi ahụ́! Ịkọ ubi pụrụ ọbụna ịbụ ụzọ isi nwee mmega ahụ́ dị mkpa. Ịkọ ubi pụkwara ịbụ ọrụ ezinụlọ gị pụrụ iwere bụ́ nke ụmụ gị ga-anụ ụtọ ya. N’ezie, a na-amụta ihe site n’ịkọ ubi akwụkwọ nri. Ọ na-akụzi àgwà ndị dị ka ndidi. (Jems 5:7) Tụkwasị na nke a, ikiri ka ihe na-eto pụrụ ịdọtakwu gị nso n’ebe Onye Okike nke ezi ihe nile nọ.—Abụ Ọma 104:14.
Echekwala na ịkọ ihe oriri nke gị agaghị ara ahụ́ ma ọ bụ na ị ga-akọta ihe n’egbughị oge. Otú ọ dị, site n’itinye mgbalị siri ike na inwetatụ ihe ọmụma banyere ya, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma!
Otu Ezinụlọ Emerie Ihe Ịma Aka Ahụ
Were Timothée na Lucie—di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ji ụmụ abụọ, ndị bi na Bangui, bụ́ isi obodo Central African Republic—dị ka ihe atụ. Ha chọpụtara na ịkọ ubi nke ha bụ ụzọ bara uru na nke dị ụtọ isi na-echekwatụ obere ego ha na-akpata.
Mgbe Lucie dị afọ 13, ọ kọrọ otu obere ubi nke dị nso n’ebe obibi ha, na-arụ ọrụ na ya ma ha gbasaa akwụkwọ nakwa ná ngwụsị izu. Ọ na-atọ ya ụtọ ikiri ha ka ha na-eto. Otú ọ dị, ọ bụ nanị mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ka echiche nke ịkọ ubi maka ezinụlọ ya batara ya n’uche. O mere ndokwa ịkọ otu ala ahịhịa dị nso bụ́ ebe e ji mere ebe mkpofu ihe. Lucie hụrụ na a pụrụ iji ala ahụ mee ihe bara uru. Kama ibibi ala ahụ, orire nke ihe mkpofu ndị ahụ nọworo na-ere n’ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ mere ka ala ahụ bịa dị nnọọ mma maka ịkọ ihe oriri. Lucie na Timothée kpebiri ime ka ala ahụ ghọọ ubi na-eme nnọọ nke ọma.
Ịmalite
Otú ọ dị, nke mbụ, ha aghaghị ime nnyocha ụfọdụ. Ha sooro ndị ọzọ bụ́ ndị maara banyere ịkọ akwụkwọ nri kwurịta okwu, ha gekwara ndị ahụ ntị nke ọma. Ebe ọ bụ na ibé ala ahụ chọrọ ka a na-agba ya mmiri, ha mụtara ọbụna otú ha ga-esi gwuo olulu mmiri nke ha. Ịgụ akwụkwọ ndị metụtara ịkọ ubi nyekwaara ha aka.
Ha gụrụ banyere otú akụ́kụ́ na-esi emetụta ibe ha, ha mụtakwara na ụfọdụ akụ́kụ́ na-enyerịtara ibe ha aka ito nke ọma. Otú ọ dị, akụ́kụ́ ụfọdụ na-egbochi ibe ha n’ezie ito nke ọma. Ụfọdụ ndị na-ekwu na karọt na tomato na-eto nke ọma ma a kụkọta ha ọnụ n’ubi akwụkwọ nri. N’otu aka ahụ kwa, ahụ́ na-adị ose na aṅara mma ma a kụkọta ha ọnụ. Dil bụkwa “enyi” ahụekere, kukumba, lettuce, na ayo. Otú ọ dị, ụgụ na ọka adịghị eme nke ọma ma a kụkọta ha ọnụ. Ayo ga-ebibi akụ́kụ́ ndị dị ka àgwà. Mgbe akụ́kụ́ dịrịtara ize ndụ nye ibe ha, ha adịghị emekwa nke ọma, ọ na-adịkwa mfe ụmụ anụmanụ na ụmụ ahụhụ ndị dị ize ndụ ịwakpo ha.
Timothée na Lucie mụtakwara na ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya bụ́ ịkọ nanị otu ụdị akụ́kụ́ n’ibé ala. Ọ bụrụ na ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ọrịa akpaa ha aka, ha nwere ike ghara ịkọta ihe ọ bụla. Ịkọ ụdị akụ́kụ́ dị iche iche e ji nlezianya họrọ nyeere ha aka ibelata ihe ize ndụ ahụ. Akwụkwọ nri na okooko osisi mere ka ubi akwụkwọ nri ha nwee àgwà ndị mara mma, na-adọrọ mmasị, ma maa mma n’anya ma na-adọtakwa aṅụ na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ bara uru bụ́ ndị na-enye aka eme ka ubi ahụ nọgide na-eme nke ọma.
Di na nwunye a mụtakwara ụzọ ndị ha ga-esi na-ezere ịgba akụ́kụ́ ha ọgwụ ndị dị ize ndụ. Ha mụtara na ịkụnye garlic n’ubi ha pụrụ ịchụ ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe na ya. *
O were ha ọrụ dị ukwuu na ndidi, ma taa Timothée na Lucie nwere ubi na-eme nnọọ nke ọma. Ha na-enweta cabbage, parsley, tomato, karọt, kukumba, na aṅara na ya—mgbe ụfọdụ ihe ha na-enweta na-akarị ihe ezinụlọ ha ga-erichali!
Kọọ Ubi nke Gị!
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị n’Africa ka ndị mmadụ chọpụtaworo uru ọ bara inwe ubi nke ha. Dị ka ihe atụ, na Germany, e nwere ihe karịrị otu nde ala ubi e kenyegasịrị ndị mmadụ bi n’obodo ndị mepere emepe. N’ịbụ nke a na-akpọ Schrebergaerten mgbe ụfọdụ (nke a kpọkwasịrị aha onye Germany bụ́ dibia bụ́ Daniel Schreber), ala ubi a bụcha obere ala ndị nọkọtara ọnụ (agbata square mita 200 na 400) bụ́ ndị a na-ekenye ndị bi n’obodo ukwu. Dị ka otu onye nnyocha si kwuo, obere ubi ndị a “na-ekere òkè dị mkpa n’ime ka a na-enwe mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị e wetara nnọọ ọhụrụ.” Ubi ndị a na-abụkwara onye nwe ha “paradaịs”—ebe a na-arụ ọrụ nakwa ebe a na-ezuru ike.
Bible na-ekwe nkwa na otu ụbọchị, ụwa nile ga-abụ ubi—paradaịs nke bụ́ ezigbo ya. (Luk 23:43) Ma ka ọ dịgodị, ikekwe ị pụrụ ịchọta otu ibé ala ma nweta ọṅụ nke inweta ihe oriri n’obere ubi nke gị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ụzọ isi chụọ ụmụ ahụhụ ma ọ bụ ụmụ anụmanụ ndị na-ebibi ihe n’ubi gị n’ejighị ọgwụ mee ihe, lee isiokwu bụ́ “Gardening the Organic Way,” (Ịkọ Ubi n’Ejighị Fatịlaịza na Ọgwụ Eme Ihe) ná mbipụta Teta! (Bekee) nke March 22, 2002.
[Foto dị na peeji nke 24]
Timothée na Lucie ka ha na-esere mmiri ha ga-agba n’ubi ezinụlọ ha
[Foto dị na peeji nke 24]
Ala ubi e kenyegasịrị ndị mmadụ na Munich, Germany