Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ọ̀ Na-eme Ka A Ghọta Asụsụ Nkịta?

Otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ụmụaka ji egwuri egwu na Japan emepụtawo ígwè ọrụ a sị na ọ na-asụgharị ụja nkịta gaa n’asụsụ ụmụ mmadụ, ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nzirịta Ozi na Japan na-akọ. Ígwè ọrụ ahụ nwere ígwè na-enweghị eriri nke na-eme ka okwu daa ụda bụ́ nke a na-ekenye n’olu nkịta, ọ na-emekwa ka ụja nkịta ahụ na-abanye n’obere ígwè ọrụ na-eme ka a nụ ụda ya. A sịrị na obere ígwè ọrụ ahụ na-atụle ụja nkịta ma na-ekewagasị ha ụzọ isii iji mee ka a mata otú obi dị nkịta ahụ: obi nkoropụ, iwe, obi ụtọ, obi ilu, ọchịchọ, na obi ọjọọ. A na-ahụ ihe si ná ntụle ahụ pụta n’otu ugegbe dị n’obere ígwè ọrụ ahụ, ha na-agụnyekwa nkebi ahịrịokwu ndị dị ka “Obi dị m nnọọ ụtọ!” “Iwe ewegbuola m!” na “Ngwa, bịa ka anyị gwurie egwu!” Ndị mepụtara ya kwuru na ha rere 300,000 nke ígwè ọrụ a na-ada 100 dollar na Japan ma na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ ahụ ga-eru otu nde mgbe ha ga-amalite ibuga ya South Korea nakwa na United States.

A Tụkwasịghị Chọọchị Obi

“Ndị Germany tụkwasịrị nnọọ ndị uwe ojii na ndị agha obi, ma ha atụkwasịghị chọọchị obi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Leipziger Volkszeitung na-akọ. Ná “nnyocha o mere banyere ntụkwasị obi,” Nzukọ Na-eleba Anya n’Akụ̀ na Ụba Ụwa chọpụtara na n’ime òtù 17 ndị bụ́ isi ọha na eze na-aga na ha, chọọchị nọ n’ọnọdụ ikpeazụ. Ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Armin Nassehi kwuru na n’oge a nke enweghị ntụkwasị obi na-arị elu, ndị Germany na-enwe ntụkwasị obi karị n’òtù ndị “na-eme ka a mata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ,” dị ka ndị uwe ojii na ndị agha. N’ihi gịnị ka a na-ejighị atụkwasị chọọchị obi? Nassehi na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị mmalite a maliteghachiri iji okpukpe akpọrọ ihe, ndị mmadụ ekweghị na chọọchị pụrụ idozi nsogbu ha ndị bụ́ isi.” Ihe chọọchị ndị dị na Germany “na-eme agwụla ememe okpukpe,” ka ọ na-ekwu.

Ịgba Alụkwaghịm Mgbe A Katarala Ahụ́

Na Germany, “ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke di na nwunye na-ekewa mgbe ha lụsịrịla ruo ogologo oge,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Berliner Morgenpost na-akọ. Gina Kästele, bụ́ ọkà n’idozi nsogbu di na nwunye, bụ́ onye si Munich, Germany, na-ekwu na nnwere onwe na-arịwanye elu nke ndị inyom na-enwe, karịsịa n’ihe gbasara ego, bụ otu isi ihe na-akpata ya. “A maghịzi nwoke dị ka onye na-akpa afọ ezinụlọ,” ka Kästele na-ekwu. Otu echiche e nwere ebe nile bụ na ihe na-akpata ịgba alụkwaghịm mgbe a katarala ahụ́ bụ na di na nwunye na-ahapụ ịgba alụkwaghịm ahụ ruo mgbe ụmụ ha torola ma pụọ n’ụlọ. Otú ọ dị, ka Kästele na-ekwu, ihe na-akpatakarị ịgba alụkwaghịm mgbe a katarala ahụ́ bụ mgbe di so nwanyị ọzọ na-enwe mmekọahụ́.

Ike Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Nwere

“Ihe ruru pasent 74 nke ndị zaghachirinụ ná nnyocha e mere kwuru na ha agaghị enwe mmasị iso ndị na-agbarụ ihu azụkọ ahịa, pasent 69 kwukwara na ha apụghị ime ha enyi.” Ihe a ka magazin bụ́ Wprost na-akọ banyere otu nnyocha Ngalaba A Na-amụ Banyere Mmekọrịta Ọha na Eze, na Mahadum Jagiellonian, nke dị na Kraków, Poland, mere. Otu ihe e kwuru kpatara ya bụ na a na-elekarị ndị na-agbarụ ihu anya dị ka ndị na-ezochi ihe. Ọ dịla anya ndị na-arụ ọrụ ndị metụtara ọha na eze matara nke a, ọ bụ ya mere “ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị na-achụ nta ego, ndị a ma ama n’egwuregwu, ndị na-ama ọkwà na TV, nakwa ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mmekọrịta ọha na eze, ndị na-azụ ahịa, na ndị na-ere ahịa ji amụmụ ọnụ ọchị” mgbe mgbe, ka magazin ahụ bụ́ Wprost na-ekwu. Ndị na-eme nchọpụta chọpụtakwara na ọ bụrụ na anyị amụmụọ ọnụ ọchị, ụbụrụ anyị na-enwetakwu ọbara, nke a na-emekwa ka ihu na-adị anyị mma karị. Otu nwanyị na-achụ nta ego kwuru, sị: “Ana m agbalị ịmụmụ ọnụ ọchị ọbụna mgbe m na-achọghị ịmụmụ ọnụ ọchị. Mgbe m mụmụrụ ọnụ ọchị, ana m ahụ ihe dị iche n’ahụ́ m, ọ na-emekwa n’ezie ka ahụ́ dị m mma karị.”

Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ọkụ A Kwara n’Ebe Ndị Mmadụ Gbakọtara

Ihe karịrị pasent 70 nke ọkụ na-ere ụmụaka n’Australia n’ebe ndị mmadụ gbakọtara “na-esite n’icheku ọkụ kama isite n’ọkụ n’onwe ya,” ka magazin bụ́ Medical Journal of Australia (MJA) na-akọ. Ọzọkwa, n’Australia, ihe ka ọtụtụ n’ọkụ ndị na-ere mmadụ n’ebe ndị mmadụ gbakọtara na-ewere ọnọdụ “n’ụtụtụ nke ụbọchị sochiri ụbọchị e chere na a wụnyụọla ọkụ ahụ.” N’ihi gịnị? Ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na mgbe e ji mmiri wụnyụọ ọkụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke icheku ahụ na-agbadata ruo 16 degree Celsius mgbe awa asatọ gasịrị. N’ụzọ dị iche, ọkụ e ji ájá wụnyụọ na-anọgide na-adị ọkụ ruo 91 degree Celsius mgbe awa asatọ gasịrị—nke zuru ireba mmadụ n’ime uru ahụ́ n’ime otu sekọnd o metụrụ ya n’ahụ́. “Ebe ọ bụ na iji ájá na-awụnyụ ọkụ na-eme ka a ghara ịhụ ihe ize ndụ ahụ,” ka magazin ahụ bụ́ MJA na-ekwu, “nanị ihe dị nchebe iji na-awụnyụ ọkụ bụ mmiri.”

Akpụ Ndị Nwere Ọrịa Cancer

Ihe ka ọtụtụ n’akpụ ndị dị n’akpụkpọ ahụ́ adịghị enye nsogbu. Otú o sina dị, ọ dị mma ilepụ anya maka akpụ ndị nwere ọrịa cancer. Dị ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Mexico City bụ́ Milenio si kọọ, ihe ndị na-esonụ bụ ihe mgbaàmà ndị ga-egosi na i kwesịrị ịgakwuru dọkịta ka o nyochaa akpụ dị gị n’ahụ́: Otu ọkara nke akpụ ahụ na ọkara nke ọzọ ya ahaghị nhata, akpụ ahụ adịchaghị gburugburu, ụcha ya na ibu ya na-agbanwe agbanwe, ọ karịrị sentimita 0.6 n’ibu [ha ka nchicha pensịl], ma ọ bụ na akpụ ahụ na-agba ọbara ma ọ bụkwanụ na-akọ gị ọkọ. Dr. Nancy Pulido Díaz, nke na-arụ n’ụlọ ọgwụ La Raza National Medical Center, na-ekwu, sị: “Akpụ ndị chọrọ nlebara anya karị bụ ndị dị mmadụ n’ahụ́ mgbe a mụrụ ya na ndị dị n’ọbụ aka nakwa n’ọbụ ụkwụ ya.”

Ịmụ Asụsụ Ala Ọzọ

Ọ̀ ga-amasị gị ịmụta asụsụ ala ọzọ? Magazin a na-ebipụta na Poland bụ́ Poradnik Domowy na-enye ndụmọdụ na-esonụ bụ́ ndị na-enye aka. “Otu ihe ya na ịmụ asụsụ na-agakọ bụ ikwuhie ihe. Ịnakwere eziokwu a bụ nzọụkwụ mbụ na-eduga n’inwe ihe ịga nke ọma.” Ihe ọzọ bụ “ịdị njikere ikwu okwu n’agbanyeghị na ị pụrụ ikwuhie ihe.” Ọ bụrụ na anyị amaghị otú anyị ga-esi kwuo ihe ụfọdụ, “mgbe ụfọdụ anyị aghaghị ikwere na ihe gbatara anyị n’uche bụ ya ma ọ bụ anyị ekwuo nnọọ ihe anyị chere na ọ bụ,” bụ́ nke dị mma karịa ịghara ikwu ya ekwu. “Anyị adịghị aghọtakebe na isi ihe na-akpata nsogbu anyị na-abụ egwu ma ọ bụ ihere,” ka magazin ahụ na-ekwu. “Ọ bụrụ na anyị ejisie ike merie adịghị ike ndị a, obi abụọ adịghị ya na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma ngwa ngwa karị.” Ezigbo onye nkụzi pụkwara inyere mmadụ aka imeri egwu ma mee ka o nwee ọganihu ngwa ngwa karị.

“Ime Ihe Ike Tara Isi Nde Mmadụ 1.6

“Ime ihe ike tara isi nde mmadụ 1.6 n’afọ 2000, ya na ọnụ ọgụgụ ndị ụkwara nta gburu hà nhata ma o gburu karịa ọnụ ọgụgụ ndị ịba gburu, dị ka akụkọ ọhụrụ Òtù Ahụ́ Ike Ụwa wepụtara si dị, bụ́ nke nwara na nke mbụ ya ịchọpụta ókè ime ihe ike dịgasị nnọọ iche iche dịruru ná njọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-ekwu. Atụmatụ ahụ e mere dabeere n’ọnụ ọgụgụ ndị e si ná mba 70 nweta, ọ na-agụnye ndị nwụrụ n’agha, mwakpo, igbu onwe onye, na ndị égbè gbagburu. “Ndị nnyocha chọpụtara na ndị nwụrụ n’ime ihe ike bụ pasent 3 nke ndị nile nwụrụ n’ụwa,” ka akụkọ ahụ na-agbakwụnye. “Ọnụ ọgụgụ ihe ike a na-eme—megide ndị inyom, ụmụaka, ndị agadi, ụmụ okorobịa na ógbè dị iche iche n’ozuzu ha—karịrị nnọọ ihe ha tụrụ anya ya. Ndị nnyocha na-enye echiche na otu ihe kpatara ya bụ na ndị e mesoro ihe ike adịkarịghị akọ banyere ya.” Nkezi nke ndị ime ihe ike tara isi ha bụ: Igbu onwe onye—pasent 50, igbu ọchụ—pasent 30, nakwa agha—pasent 20. Ọ bụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ka e nwere ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ndị gburu onwe ha, Mba Russia na Lithuania esochiekwa. Nkezi nke ndị égbè gbagburu kasị elu n’Albania—mmadụ 22 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla. Na United States, nkezi ahụ bụ mmadụ 11.3 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla, ebe United Kingdom bụ mmadụ 0.3 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla, Japan abụrụkwa mmadụ 0.1 n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla.

‘Asọmpi Ụda Redio Ụgbọala’

Ókè ha aṅaa ka ụda redio ụgbọala otu onye ji karịa nke onye ọzọ? Ajụjụ a akpalitewo asọmpi ọhụrụ mba dị iche iche na-enwe bụ́ nke a maara dị ka asọmpi ụda redio ụgbọala bụ́ nke e ji usoro ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ́ dB atụ, ka ụlọ ọrụ National Public Radio, bụ́ nke dị na United States na-ekwu. Mgbe a gbakọtara maka asọmpi ahụ, a na-eji ígwè ọrụ ndị a kwụnyere n’ime ụgbọala ndị ahụ atụle ụda redio dị n’ụgbọala ndị ahụ—ndị e ji usoro ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ́ decibel, ma ọ bụ dB atụ. A dịghị atụ ụda ndị onye na-anọghị n’ime ụgbọala ahụ pụrụ ịnụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ, n’ihi ya, ndị na-asọ mpi ahụ na-emeziwanye ọdịdị ụgbọala ha iji gbochie ụda ndị ahụ ịpụta apụta. “N’ụgbọala ndị e meziwanyere nnọọ ọdịdị ha nke ọma, . . . ugegbe windo ha na-adị sentimita 7 [ma ọ bụ] 10 n’ibu,” ka onye na-asọ mpi ahụ bụ́ Wayne Harris na-ekwu, “a na-ejikwa kọnkịrị na ígwè eme ka ibo ụzọ ụgbọala ndị ahụ sikwuo ike.” Ndị na-asọ mpi ahụ adịghị anọ n’ime ụgbọala ha mgbe ha gbanyere redio ụgbọala ha—e nwekwara ezi ihe kpatara ya.