Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oké Ibu Ọ̀ Ghọwala Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ?

Oké Ibu Ọ̀ Ghọwala Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ?

Oké Ibu Ọ̀ Ghọwala Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ?

“ERI ogologo oge, e lewo oké ibu anya dị ka ihe ndụ ọgbara ọhụrụ a na-ebi ná mba ndị bara ọgaranya ma mepee emepe na-akpata, ugbu a, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe ebuwakwuola oké ibu,” ka akwụkwọ Britain nke na-ekwu banyere ahụ́ ike, bụ́ The Lancet, na-akọ. O kwuru na ndị ọkachamara n’ihe oriri ndị na-edozi ahụ́ na-adọzi aka ná ntị banyere “nsogbu zuru ụwa ọnụ” a na-enwe banyere ọrịa ndị oké ibu na-akpata dị ka ọrịa shuga, ọbara mgbali elu, ọrịa cancer, na ọrịa obi.

Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke buru oké ibu na China ejiriwo okpukpu atọ mụbaa, nke ụmụ nwanyị ejirikwa okpukpu abụọ mụbaa n’ime afọ asatọ gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọbara mgbali elu ná mba ahụ hazi ka nke ndị na-arịa ya na United States. Ihe karịrị ọkara nke ndị ọhụrụ a chọpụtara na ha na-arịa ọrịa shuga bi n’India na China. Ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọrịa shuga n’Ijipt hà ka nke ndị na-arịa ya na United States, ọkara nke ụmụ nwanyị bi ná mba ahụ ebuokwala oké ibu ugbu a. Ọnụ ọgụgụ ndị buru oké ibu, bụ́ ndị nọ n’ọkwá dị iche iche n’akụkụ nile nke Mexico, amụbaala nke ukwuu, na-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọrịa shuga ná mba ahụ mụbaakwa. Ọbụna ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara bụ́ ndị dara nnọọ ogbenye, ọnụ ọgụgụ ndị buru oké ibu na ndị na-arịa ọrịa shuga na-amụba.

Ọ bụ ezie na oriri a na-eri nri onye ọ dị ngwa, bụ́ ndị na-enye abụba, pụrụ iso na-akpata oké ibu ndị mmadụ na-ebu ná mba ụfọdụ, ihe bụ́ isi na-akpata ya bụ na ọtụtụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe oriri na-etinyezi shuga ka ukwuu ná nri ndị ha na-emepụta “iji mee ka ha na-atọ ụtọ karị.” Ọzọkwa, mmanụ na-adịkarị ná nri ndị a na-eri n’Eshia nakwa n’Africa, bụ́ nke na-enyekwu calorie. Nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji eme ihe n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe nakwa n’ọrụ ugbo, na-eme ka a ghara ijicha ike ọkpụkpụ aka na-emepụta ihe. Ndị mmadụ chọrọ iji oge ka nta na-arụ ọrụ ma jiri oge ka ukwuu na-atụrụ ndụ. Ugbu a kọmputa na telivishọn juziri ebe nile, ndị ọrụ adịchaghịzi enwe mmega ahụ́, ‘ozi e-mail emewokwa ka ndị mmadụ gharazie iji ụkwụ ha na-aga ezi ozi, na-emekwa ka ha gharazie ịdị na-eji ụkwụ ha aga na nke ndị enyi ha iji kọrịa akụkọ.’

Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-aga akwụkwọ bụ́ ndị buru oké ibu ji ike na-arịwanye elu, karịsịa n’ebe a na-adịchaghịzi enwe ntụrụndụ nakwa n’ebe a na-adịchaghịzi arụ ọrụ ọkpụkpụ aka, ọ dị oké mkpa ka ndị nkụzi mata njikọ dị n’etiti ihe oriri na-edozi ahụ́ na ịmụta akwụkwọ. Gail Harrison, nke Ngalaba A Na-amụ Maka Ahụ́ Ike Ọha na Eze, na Mahadum California, na-adọ aka ná ntị na, tụkwasị n’usoro ndị e ji na-egbochi oké ibu n’ógbè dị iche iche, “ọ dị oké mkpa ka e nwee usoro mgbochi a ga na-agbaso n’ụwa nile, tinyere ụkpụrụ ime ihe, nkà, nakwa nhazi na ngwá ọrụ ha na ya kwekọrọ,” iji na-achịkwa nsogbu nke oké ibu na ọrịa ndị ọ na-akpata.