Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Nwanne M Na-amata M?

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Nwanne M Na-amata M?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka A Ghara Iji Aha Nwanne M Na-amata M?

“Achọrọ m ịbụ mmadụ aka m, ma ọ na-adị m mgbe nile ka m̀ kwesịrị ịkparịrị àgwà otú ụmụnne m ndị nwanyị si akpa. Ọ dị m ka apụghị m ịrụzu ihe ndị ụmụnne m ndị nwanyị rụzuru.”—Clare.

Ì NWERE nwanne nwoke ma ọ bụ nwanne nwanyị, bụ́ onye yiri ka ọ̀ na-enwe ihe ịga nke ọma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe nile? Ndị mụrụ gị, hà na-agbakarị gị ume ịkpa àgwà otú nwanne gị ahụ si akpa? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịtụ ụjọ na a ga na-ejikarị aha ya amata gị—na a ga na-atụ uru ị bara n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dabere n’ihe ịga nke ọma ị na-enwe n’ịrụzu ihe nwanne gị rụzuru.

Ụmụnne Barry * ndị nwoke abụọ tọrọ ya gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi * a na-akwanyere ùgwù, ha bụkwa Ndị Kraịst nwere ezi aha. Barry na-ekweta, sị: “Abịara m ghara inwechazi obi ike n’ime onwe m, ebe ọ bụ na echere m na apụghị m ịrụ ọrụ nkwusa nke ọma otú ha si arụ ma ọ bụ ikwu okwu nke ọma n’ihu ọha otú ha si ekwu. O siiri m ike inwe ndị enyi nke m, n’ihi na ihe m na-eme bụ nanị ịdị na-esogharị ụmụnne m mgbe ndị ọzọ kpọrọ ha òkù. Abịara m chee na nanị ihe mere ndị mmadụ ji emeso m omume enyi bụ n’ihi ndị ụmụnne m bụ.”

O siri ike ịghara ikwo ekworo mgbe i nwere nwanne a na-etokarị. N’oge Bible, nwata nwoke bụ́ Josef gbapụrụ iche n’ebe ụmụnne ya nọ. Mmetụta dị aṅaa ka nke ahụ nwere n’ebe ụmụnne ya nọ? “Ha wee kpọọ ya asị, ha apụghịkwa ịgwa ya okwu n’udo.” (Jenesis 37:1-4) N’ezie, Josef dị umeala n’obi. Ma nwanne gị pụrụ ịkpali gị ịmawa ya aka na iweso ya iwe site n’ịdị na-echetara gị mgbe nile banyere ihe ndị ọ rụzuru.

Ndị ntorobịa ụfọdụ na-emeghachi omume site n’inupụ isi—ikekwe na-enwe akara ule dị ala n’ụlọ akwụkwọ, na-ebelata òkè ha na-ekere n’ihe omume Ndị Kraịst, ma ọ bụ na-etinye aka n’àgwà ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ha pụrụ ịdị na-eche na ọ baghị uru itinye mgbali ọ bụla ma ọ bụrụ na ha agaghị eme nke ọma otú nwanne ha na-eme. Ma n’ikpeazụ, ihe nnupụisi ga-eme bụ nanị imerụ gị ahụ́. Olee ụzọ ị pụrụ isi mee ka a ghara iji aha nwanne gị na-amata gị bụ́ nke ga-eme ka i nwee obi ike n’ime onwe gị?

Nwee Echiche Ziri Ezi Banyere Ha

Mgbe ị na-ahụ otuto nile nwanne gị na-enweta, ị pụrụ ịbịa kwere na o zuru okè, nakwa na ọ gaghị ekwe gị omume ịdị na-eme ihe nke ọma otú o si eme. Ma nke ahụ, ọ̀ bụ eziokwu? Bible ezoghị ọnụ mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23.

Ee, n’agbanyeghị nkà ụmụnne anyị pụrụ inwe, ha ka bụkwa “mmadụ ndị nwere otu ụdị ahụ́ esighị ike ahụ” anyị nwere. (Ọrụ 14:15) Ọ dịghị ihe mere ị ga-eji na-ebuli ha elu ma ọ bụ na-efe ha ka chi. Ọ bụ nanị Jizọs Kraịst bụ mmadụ setịpụtụworo ihe nlereanya zuru okè.—1 Pita 2:21.

Mụta Ihe n’Aka Ha!

Ọzọ, gbalịa ịhụ ọnọdụ gị dị ka ihe ị pụrụ ịmụta ihe na ya. Dị ka ihe atụ, tụlee ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom Jizọs Kraịst. (Matiu 13:55, 56) Chee nnọọ echiche ihe ha gaara enwe ike isi n’aka nwanne ha zuru okè mụta! Ka o sina dị, “n’eziokwu, ụmụnne ya ndị ikom adịghị egosipụta okwukwe na ya.” (Jọn 7:5) Ikekwe, nganga na ekworo gbochiri ha inwe okwukwe. Ọ bụ ụmụnna ime mmụọ Jizọs—ndị na-eso ụzọ ya—zara òkù o ji obiọma kpọọ, sị: “Mụtakwanụ ihe n’aka m.” (Matiu 11:29) Ọ bụ nanị mgbe mbilite n’ọnwụ Jizọs gasịrị ka ụmụnne ya bịaziri nwee mmasị n’ebe ọ nọ. (Ọrụ 1:14) Tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ohere magburu onwe ya ha nwere iji mụta ihe n’aka nwanne ha na-eme nnọọ nke ọma, funahụrụ ha.

Ken hiere ụzọ otú ahụ. Nwanne ya nwoke, bụ́ Ebel, bụ ohu Chineke na-eme nnọọ nke ọma. Bible na-ekwu na “Jehova [lere] Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya, anya ọma.” (Jenesis 4:4) Otú ọ dị, n’ihi ihe ụfọdụ, Chineke ‘eleghị Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, anya ọma.’ Ken gaara egosiwo ịdị umeala n’obi ma mụta ihe site n’aka nwanne ya nwoke. Kama nke ahụ, “Ken [were] iwe dị ọkụ nke ukwuu” wee gbuo Ebel.—Jenesis 4:5-8.

Ọ bụghị na ọ dị mgbe ị ga-ewe iwe ọkụ otú ahụ megide nwanne gị. Ma ohere dị otú ahụ magburu onwe ya pụkwara ifunahụ gị onwe gị ma ọ bụrụ na i kwe ka nganga na ekworo gbochie gị iji ya mee ihe. Ọ bụrụ na i nwere nwanne na-eme nke ọma karị n’ihe ọmụmụ mgbakọ na mwepụ, n’akụkọ ihe mere eme, n’egwuregwu na-amasịkarị gị, nwee ihe ọmụma dị ukwuu nke Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na-ekwu okwu nke ọma n’ihu ọha, ị ghaghị iguzogide ekworo! E kwuwerị, “ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ,” ọ pụkwara nnọọ imerụ gị ahụ́. (Ilu 14:30; 27:4) Kama ịdị na-ewe iwe, gbalịa ka ị mụta ihe n’aka nwanne gị. Nakwere eziokwu ahụ bụ́ na nwanne gị nwere nkà ị na-enweghị. Leruo ụzọ nwanne gị si eme ihe anya—ma ọ bụ, nke ka mma, rịọ ya maka enyemaka.

Barry, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, ritere uru site n’ezi ihe nlereanya nke ụmụnne ya ndị nwoke setịpụrụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ahụrụ m obi ụtọ ụmụnne m ndị nwoke na-enwe n’ihi ọchịchọ ha na-enwe inyere ndị nọ n’ọgbakọ na ndị ha zutere n’ọrụ nkwusa, aka. N’ihi ya, ekpebiri m iṅomi ihe nlereanya nke ụmụnne m, amalitekwara m ikere òkè n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa nke Betel. Ahụmahụ m nwetara enyewo m obi ike ma nyere m aka ime ka mmekọrịta mụ na Jehova sikwuo ike.”

Ịchọpụta Ebe Ị Na-eme nke Ọma

Ikekwe, ị na-atụ ụjọ na iṅomi àgwà ọma nke nwanne gị ga-eme ka ị ghara ịbụ mmadụ aka gị. Ma nke ahụ ekwesịghị ime. Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi m.” (1 Ndị Kọrint 4:16) Nke a ọ̀ pụtara na Pọl achọghị ka ha bụrụ mmadụ aka ha? Ọ dịghị ma ọlị. E nwere ọtụtụ ohere maka ndịrịta iche. Ọ bụrụ na ị dịghị eme nke ọma n’ihe ọmụmụ mgbakọ na mwepụ dị ka nwanne gị, ọ pụtaghị na ị bụ iti. Ihe ọ pụtara nanị bụ na ị dị iche n’ebe nwanne gị nọ.

Pọl na-enye ndụmọdụ a bara uru, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.” (Ndị Galeshia 6:4) Gịnị ma ị gbalịa inwe nkà na ikike ndị pụrụ iche n’onwe gị? Ịmụ asụsụ nke ndị mba ọzọ, ịmụ otú e si eji ngwá egwú akụ egwú, ma ọ bụ ịmụ otú e si eji kọmputa eme ihe pụrụ inyere gị aka inwekwu ùgwù onwe onye, ọ pụkwara ime ka i nwee nkà ndị bara uru. Echegbula onwe gị banyere ime ihe n’ụzọ zuru okè! Mụta iji nlezianya na ịdị uchu na-arụ ọrụ nke ọma. (Ilu 22:29) O nwere ike ịbụ na i nwechaghị ikike ebumpụta ụwa n’ime ihe ụfọdụ, ma “aka ndị dị nkọ ga-achị achị,” ka Ilu 12:24 na-ekwu.

Otú ọ dị, ọ dị gị mkpa inwe ọganihu ime mmụọ karịsịa. Nkà ime mmụọ na-aba nnọọ uru n’ụzọ na-adịte anya karịa nkà ọ bụla pụrụ ịdọrọ mmasị ndị mmadụ karị. Tụlee ihe banyere ụmụ ejima bụ́ Ịsọ na Jekọb. Nna Ịsọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu n’ihi na ọ bụ “nwoke maara ịchụ ntá, onye ọhịa.” Na mbụ, nwanne ya bụ́ Jekọb pụrụ ịbụwo onye ọ dị mfe ileghara anya, ebe ọ bụ na ọ bụ “nwoke zuru okè, na-ebi n’ụlọikwuu.” (Jenesis 25:27) Ịsọ hapụrụ ịzụlite ọnọdụ ime mmụọ ya ma ghara inweta ngọzi. Jekọb zụlitere ịhụnanya maka ihe ime mmụọ ma bụrụ onye Jehova gọziri n’ụzọ dị ukwuu. (Jenesis 27:28, 29; Ndị Hibru 12:16, 17) Gịnị bụ ihe mmụta dị na ya? Zụlite ọnọdụ ime mmụọ nke gị, ‘kwe ka ìhè gị na-enwu,’ ‘ọganihu gị ga-apụtakwa ìhè nye mmadụ nile.’—Matiu 5:16; 1 Timoti 4:15.

Clare, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite na-ekwu, sị: “Ana m enwe afọ ojuju ịbụ onye e ji aha ụmụnne m ndị nwanyị tọrọ m na-amata. Ma emesịrị m kpebie ịgbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ ‘ịgbasapụ’ n’ịhụnanya m. Mụ na ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ rụkọrọ ọrụ n’ozi ubi, achọkwara m ụzọ ndị bara uru isi na-enyere ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị nwere mkpa aka. Akpọkwara m ụmụnna ndị nwoke na ụmụnna ndị nwanyị nọ n’afọ ndụ dị iche iche òkù n’ebe obibi anyị ma lee ha ọbịa. Ugbu a, enwewo m ọtụtụ ndị enyi, ma nwekwuo obi ike.”—2 Ndị Kọrint 6:13.

Site n’oge ruo n’oge, ndị mụrụ gị pụkwara ịmaliteghachi ịgba gị ume ime ihe otú nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwanyị si eme. Ma icheta na ndị mụrụ gị bu ọdịmma gị kasịnụ n’obi pụrụ ibelata mwute ị na-enwe. (Ilu 19:11) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya iji ụzọ nsọpụrụ gwa ndị mụrụ gị otú iji onye ọzọ na-atụnyere gị na-adị gị. Ikekwe, ha ga-agbalị ịchọpụta ụzọ ndị ọzọ ha pụrụ isi na-ekwupụta nchegbu ha nwere banyere gị.

Echefula mgbe ọ bụla na Jehova Chineke n’onwe ya ga-amara gị ma ọ bụrụ na i jeere ya ozi. (1 Ndị Kọrint 8:3) Barry chịkọtara ihe nile site n’ikwu, sị: “Achọpụtara m na ka m nọgidere na-ejere Jehova ozi ruo ogologo oge karị, otú ahụ ka m na-enwekwu obi ụtọ. Ugbu a, ndị mmadụ maara m dị ka mmadụ ma nwee mmasị n’ahụ́ m dịkwa ka ha nwere mmasị n’ahụ́ ụmụnne m.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 5 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ahazi ya.

[Foto dị na peeji nke 17]

Nwanne gị ọ̀ bụ onye a na-etokarị?

[Foto dị na peeji nke 18]

Chọpụta nkà nke gị na ihe ndị na-amasị gị

[Foto dị na peeji nke 18]

‘Kwe ka ìhè gị na-enwu’ site n’inwe nkà n’ụzọ ime mmụọ