Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbalị Ịhụ na Mba na Mba Dị ná Mma Ọ̀ Ga-eweta Udo n’Ụwa?

Ịgbalị Ịhụ na Mba na Mba Dị ná Mma Ọ̀ Ga-eweta Udo n’Ụwa?

Echiche nke Bible

Ịgbalị Ịhụ na Mba na Mba Dị ná Mma Ọ̀ Ga-eweta Udo n’Ụwa?

Ọ̀ GA-AMASỊ gị ịhụ ka a kwụsịrị agha nile? N’ezie, iji dozie esemokwu a na-enwe n’ime mba nakwa ndị a na-enwe n’etiti mba na mba, ọ ghaghị ịdị mkpa ka e mee mgbalị ụfọdụ iji hụ na e nwere mmekọrịta udo. Ọtụtụ ndị na-eche na a pụrụ ịkwụsị agha ma ọ bụrụ nanị na ndị ndú ụwa na-emekọ ihe ọnụ. Otú ọ dị, ma eleghị anya, ihe siworo ná mgbalị ndị e mere ịhụ na mba na mba dị ná mma pụta, ejughị gị afọ. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche abịanyewo aka n’akwụkwọ nkwekọrịta dị iche iche, nakwere mkpebi dị iche iche, ma nwee nzukọ dị iche iche, ma, ọ bụ esemokwu ole na ole ka e doziworo n’ụzọ na-adịgide adịgide.

Bible nwere nnọọ ọtụtụ ihe ikwu banyere udo nakwa mba na mba ịdị ná mma. Ọ na-aza ajụjụ ndị na-esonụ: N’agbanyeghị mgbalị ndị a na-eme n’oge a ịhụ na mba na mba dị ná mma, olee ihe ndị mere na udo adịbeghị? Ndị Kraịst hà kwesịrị ikere òkè n’ịgbalị ịhụ na mba na mba dị ná mma? Olee otú a ga-esi nweta ezi udo n’ikpeazụ?

Gịnị Mere na Udo Adịbeghị?

Ihe ndekọ dị iche iche nke Bible na-akọ otú mmadụ na ibe ya ikwu okwu ihu na ihu pụrụ isi mee ka udo dị. Dị ka ihe atụ, Abigail ji nkà mee ka Devid na usuu ndị agha ya kwenye ịghara ịbọrọ onwe ha ọbọ megide ezinụlọ ya. (1 Samuel 25:18-35) Jizọs nyere ihe atụ nke otu eze nke na-enweghị ihe ọzọ ezi uche dị na ya ọ pụrụ ime ma e wezụga izipụ ndị nnọchiteanya ịga rịọ maka udo. (Luk 14:31, 32) Ee, Bible na-ekweta na a pụrụ idozi esemokwu site n’ime mgbalị n’ụzọ ụfọdụ iji hụ na a dị ná mma. Mgbe ahụ, gịnị mere na nzukọ ndị mba na mba na-enwe maka udo adịghị enwekarị ezigbo ihe ịga nke ọma?

Bible buru amụma nke ọma na oge anyị ga-ejupụta nnọọ ná nsogbu. N’ihi mmetụta ọjọọ nke Setan bụ́ Ekwensu, ndị mmadụ agaghị abụ ndị dị “njikere ime nkwekọrịta ọ bụla” ma ha ga-abụ “ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” (2 Timoti 3:3, 4; Mkpughe 12:12) Tụkwasị na nke a, Jizọs buru amụma na a ga-eji “agha na akụkọ agha” mara ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a. (Mak 13:7, 8) Ònye pụrụ ịrụ ụka na ihe ndị a ejupụtawabeghị ebe nile n’ụzọ na-arị elu? Ebe ọ dị otú ahụ, ọ̀ bụ ihe ijuanya na mgbalị ndị a na-eme ịhụ na e nwere udo n’etiti mba na mba na-akụkarị afọ n’ala?

Ọzọkwa, chebara eziokwu a echiche: Ọ bụ ezie na ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche pụrụ ịgbalịsi ike izere agha, ebumnobi bụ́ isi nke onye ọ bụla n’ime ha bụ ịkwalite ọdịmma nke mba ya. Nke ahụ bụ isi ihe mere ndị ọchịchị ji eme mgbalị dị otú ahụ. Ndị Kraịst, hà kwesịrị ikere òkè n’ihe ndị dị otú ahụ?

Ndị Kraịst na Ịgbalị Ịhụ na Mba na Mba Dị ná Mma

Bible na-adụ ọdụ, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Nke a pụtara na n’agbanyeghị ihe bụ́ ebumnobi ha, ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche enweghị ikike nke ichepụta ihe ngwọta ga-adịgide adịgide.

Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe n’ihu Pọntiọs Paịlet, o kwuru, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.” (Jọn 18:36) Ịkpọasị mba na mba na ịchọ ọdịmma onwe onye n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-emetụtakarị atụmatụ udo ndị a na-eme. N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst na-ezere ikere òkè n’esemokwu nke ụwa a nakwa mgbalị ndị ọ na-eme ịhụ na mba na mba dị ná mma.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst adịghị enwe mmasị n’ihe ndị na-eme n’ụwa? Hà bụ́ ndị na-achọghị ịma banyere nhụsianya nke ụmụ mmadụ? Ee e. N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-akọwa ndị na-efe Chineke ezi ofufe dị ka ndị “na-eze ume ma na-asụ ude” n’ihi ihe ọjọọ nile a na-eme gburugburu ha. (Ezikiel 9:4) Ndị Kraịst na-adabere nnọọ n’ebe Chineke nọ maka iweta udo dị ka o kwere ná nkwa. Ihe ị ma dị ka udo ọ̀ bụ ọnọdụ nke enweghị agha? N’ezie, Alaeze Chineke ga-emezu nke ahụ. (Abụ Ọma 46:8, 9) Tụkwasịkwa na nke ahụ, ọ ga-eme ka ndị nile bi n’ụwa nwee nchebe zuru ezu na ezi ahụ́ ike. (Maịka 4:3, 4; Mkpughe 21:3, 4) A pụghị ma ọlị inweta udo kasị udo dị otú ahụ site n’ịgbalị ime ka mba na mba dị ná mma ma ọ bụkwanụ site ná mgbalị nke òtù ndị “ome udo.”

Amụma Bible na ahụmahụ ndị e nwere n’oge ndị gara aga na-egosi n’ụzọ doro anya na ịtụkwasị obi na mba na mba ịdị ná mma ga-eme ka e nwee udo, pụrụ nanị iweta ndakpọ olileanya. Ndị olileanya ha bụ na Jizọs Kraịst ga-eweta udo, bụ́kwa ndị na-akwado Alaeze Chineke, ga-ahụ ka e mezuru ọchịchọ ha maka ezi udo. Ọzọkwa, ha ga-anọ n’udo ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 37:11, 29.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

N’agbanyeghị ihe bụ́ ebumnobi ha, ndị na-ekwuchitere mba dị iche iche enweghị ikike nke ichepụta ihe ngwọta ga-adịgide adịgide

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

N’okpuru: Foto e si n’aka Stephen Chernin/Getty Images nweta